Ịgbasa Eziokwu Bible na Portugal
MALITE na Caminha nke dị n’ebe ugwu ruo Vila Real de Santo Antônio nke dị n’ebe ndịda, ọtụtụ puku ụgbọ epeepe ndị tụrụ àgwà mara mma dịsasịrị n’Ụsọ Osimiri Atlantic nke Portugal nke dị 800 kilomita. Ndị ọ́kụ̀ azụ ‘ejiriwo ụgbọ mmiri ha banye n’ime osimiri’ kemgbe ọtụtụ narị afọ, na-eme azụ ihe oriri bụ isi nke ndị Portugal.—Abụ Ọma 107:23.
Kemgbe 70 afọ gara aga, ụdị ịkụ azụ ọzọ anọwo na-ewere ọnọdụ na Portugal. Ndịàmà Jehova anọwo na-eji ọrụ n’aka n’iwetara ọtụtụ iri puku azụ ihe atụ ozi ọma ahụ. (Matiu 4:19) Na May 1995 e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 44,650 ndị nkwusa Alaeze—nkezi nke 1 onye maka ihe dị ka 210 ndị bi n’ebe ahụ. N’obodo ukwu ụfọdụ nkezi ya bụ ọkara ọnụ ọgụgụ ahụ.
N’inwe ọtụtụ ndị ọrụ, a na-arụzu ókèala ịgba àmà kwa izu abụọ ọ bụla ma ọ bụ ihe yiri ya n’ọtụtụ ógbè. N’ihi ya Ndịàmà bụ́ ndị Portugal na-adị ngwa n’iji ụdị iche okwu n’ihu dị iche iche eme ihe iji soro ndị ọzọ kerịta olileanya ha nke Bible. Ee, ha na-aghọta ịdị mkpa nke ime ka a mara eziokwu Bible n’ụzọ ọ bụla o kwere mee.—1 Ndị Kọrint 9:20-23.
Inyere Ndị Nwere Mmasị n’Okpukpe Aka
Dị ka ịgụ ọnụ e mere na 1991 si dị, 70 pasent nke ndị dị afọ 18 ma ọ bụ karị na Portugal na-ekwu na ha bụ ndị Roman Katọlik. N’agbanyeghị nke a, ihe ọmụma Bible dị ala n’etiti ndị ahụ. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Jornal de Notícias kwuru, sị: “Nke a bụ otu n’ime ọdachi kachasịnụ dakwasịrị ógbè ndị Katọlik: Amaghị Bible!” N’ihi gịnị ka o ji dị otú a? Akwụkwọ akụkọ Portugal bụ́ Expresso na-ezo aka n’azịza ya. N’ịkọ banyere nzukọ nke 500 ndị ụkọchukwu nwere na Fátima, akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu, sị: “Dị ka onye ụkọchukwu ahụ gbagotere n’ọkwa si kwuo, ọ dị mkpa na onye ụkọchukwu ga-enwere onwe ya pụọ n’ọtụtụ ihe omume na-enweghị ọgwụgwụ ka o wee nwee ike ime ka ọnọdụ ya pụta ìhè n’ụzọ dị iche dị ka ‘onye mkpọsa.’ . . . Ọ bụrụ na onye ụkọchukwu etinye mmụọ ya n’ikwusa Oziọma, ọ gaghị enwe ohere maka ihe omume ọ bụla ọzọ.”
N’ụzọ dị iche na nke ahụ, Ndịàmà Jehova nọ na Portugal na-arụsi ọrụ ike na-eme ka a mara eziokwu Bible n’ụzọ ọ bụla o kwere mee. N’ihi ya, ọtụtụ ndị Katọlik nwere obi eziokwu na-enweta ihe ọmụma nke Bible.
Carlota bụ ezigbo onye Katọlik nakwa onye so n’òtù ndị ntorobịa n’otu òtù okpukpe. Ọ bụkwa onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ ọta akara ebe Antônio, bụ́ Onyeàmà, rụrụ ọrụ. Dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile, ma ọ bụ onye ozi oge nile, Antônio na-agbalị mgbe nile ịgwa ndị ọrụ ibe ya banyere Bible n’oge nri ehihie. Otu ụbọchị Carlota jụrụ ya ajụjụ banyere nkwenkwe ọkụ ala mmụọ na òtù Meri. Antônio gosiri ya ihe Bible na-akụzi n’isiokwu ndị a, nke ahụ bụkwa mmalite nke ọtụtụ nkwurịta okwu Bible. Mgbe Carlota jere nzukọ mbụ ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè ahụ, ọ masịrị ya nke ukwuu. Otú ọ dị, oge nzukọ ndị ahụ na oge òtù okpukpe nke o so na ya dabakọtara. Ọ ghọtara na ya aghaghị ime mkpebi. Gịnị ka ọ ga-eme?
Carlota kpọkọtara ndị nile so n’òtù ndị ntorobịa ahụ wee kọwaara ha site n’ime Bible ihe mere o ji na-apụ. Ha nile katọrọ ya maka mkpebi ya, e wezụga otu nwa agbọghọ aha ya bụ Stela, bụ́ onye ṅara ntị nke ọma. Mgbe Carlota sooro ya nwee mkparịta ụka ka e mesịrị, Stela jụrụ ọtụtụ ajụjụ banyere mmalite na nzube nke ndụ. Carlota nyere ya akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation?a wee malitere ya ọmụmụ Bible.
Ka ọ dịgodị, Carlota nwere ọganihu ime mmụọ dị mma, e mere ya baptism na June 1991, ọnwa isii n’ihu, ọ malitekwara ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile. Na May 1992, ya na Antônio lụrụ di na nwunye, ha abụọ na-aga n’ihu n’ozi ọsụ ụzọ n’ọgbakọ dị nso bụ́ ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Stela kwanụ? E mere ya baptism na May 1993, ọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile.
Francisco na-eto eto ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu. Ọ na-eje Mas kwa Sunday ọ bụla n’ụtụtụ ma na-eje maka ịgụ Rosari n’ehihie. O jere ozi dị ka onye na-elekọta ebe a na-edebe arịa ndị dị nsọ, na-enyere ụkọchukwu aka n’oge Mas. Ọbụna na o kpere ekpere ka Chineke mee ya onye “senti” otu ụbọchị!
Francisco chọrọ n’ezie inwe Bible, otu ụbọchị kwa otu enyi ya gbazinyere ya otu. O juru ya anya ịchọpụta na Chineke nwere aha, bụ́ Jehova. (Ọpụpụ 6:3; Abụ Ọma 83:18) Mgbe ọ gụtara n’Ọpụpụ 20:4, 5 na Chineke machibidoro iji ihe oyiyi efe ofufe, o juru ya anya ọbụna karị! N’ịhụ na chọọchị jupụtara n’ihe oyiyi, o kpesiri ekpere ike ka Chineke nyere ya aka ịghọta ihe mgbagwoju anya a nile. Ọtụtụ ụbọchị ka e mesịrị, o zutere otu onye ya na ya jekọrọ akwụkwọ wee jụọ ya ihe mere o ji kwụsị ịbịa akwụkwọ mgbede.
“M na-eje ụlọ akwụkwọ mgbede ka mma ugbu a,” ka enyi ya zara ya.
“Olee ụlọ akwụkwọ ọ bụ, gịnịkwa ka ị na-amụ?” ka Francisco jụrụ. Azịza enyi ya nyere juru ya nnọọ anya.
“Ana m amụ Bible n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova,” ka enyi ya gwara ya. “Ị̀ ga-enwe mmasị iso m jee?”
O siiri Francisco ike ikweta ihe ọ hụrụ ná nzukọ mbụ o jere—ndị obi dị ụtọ, na-amụmụ ọnụ ọchị; ndị na-agwa ibe ha okwu n’ụzọ na-ekpo ọkụ, n’ụzọ enyi; ụmụaka so ndị mụrụ ha na-anọdụ ma na-aṅa ntị n’ihe a na-ekwu.
“Leenụ m, onye bụ nnọọ onye ọbịa, ọ dị m nnọọ ka m bụ otu akụkụ nke ezinụlọ ahụ!” ka Francisco tiri ná mkpu. Ọ nọwo na-ejechi nzukọ anya kemgbe ahụ. Ugbu a Francisco na-eje ozi dị ka okenye n’ọgbakọ, ya na nwunye ya na ụmụaka ya abụọ kwa, ọ na-aṅụrị ọṅụ ná nkwa Alaeze ndị dị ebube dị n’ime Okwu Chineke.
Iso Ndị Ikwu Kerịta Eziokwu Ahụ
Manuela, bụ́ onye ọsụ ụzọ oge nile n’ógbè Lisbon, anwụdewo azụ ime mmụọ bara ụba n’ihi nnọgidesi ike ya n’iji obi ọma na-agbara mmadụ nile àmà, tinyere ndị ikwu. Nwanne ya nwoke n’anụ ahụ, bụ́ José Eduardo, so n’ime ha, bụ́ onye a zụrụ azụ n’ịgba karate na n’iji ngwá agha eme ihe. Ọ dawo iwu ọtụtụ mgbe nke na e mesịrị kpụpụ ya ụlọikpe n’ihi ebubo 22 ma tụọ ya nga 20 afọ. Ọ na-eme ihe ike nke ukwuu nke na ọbụna ndị a tụkọrọ ya na ha nga na-atụ ya ụjọ, a tụnyekwara ya n’ime ọnụ ụlọ nga e wusiri ike.
Ruo afọ asaa Manuela ji ndidi na-eje eleta José Eduardo, ma ọ na-ajụ ozi ya nke Bible mgbe nile. N’ikpeazụ, mgbe e bipụtara akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? ọ nakweere ya, e wee malitere ya ọmụmụ Bible. N’egbughị oge o mere mgbanwe ndị dị egwu n’àgwà ya. Otu izu ka nke a gasịrị, ọ gbaara 200 ndị nga àmà n’onwe ya, n’izu na-esokwa ya gwa 600 ndị ọzọkwa. Ọbụna na o nwetara ikike ije leta ndị nọ n’ụlọ ndị ọzọ nke ogige ụlọ nga ahụ. N’ihi mgbanwe ahụ dị ịrịba ama e nwere n’akparamàgwà ya, e gbubilatara amamikpe ahụ ịbụ afọ 15. Mgbe ọ nọsịrị afọ 10, a tọhapụrụ ya ná nnwale. Eri mgbe ahụ afọ ise agaala, José Eduardo bụkwa Onyeàmà Jehova e mere baptism ugbu a, na-eje ozi dị ka ohu na-eje ozi n’ọgbakọ dị n’ógbè ya. N’ezie ọ bụ ihe a ga-asị na ọ bụ ‘anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ịnọ’!—Aịsaịa 11:6.
N’ihi mgbalị ọ nọgidere na-eme n’ịgbara ezinụlọ ya àmà, Manuela enwewo ọṅụ nke inyere di ya na mmadụ anọ ọzọ n’ezinụlọ ya aka ịghọ ndị na-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova. Di ya bụ ohu na-eje ozi ugbu a.
“M Ga-eji Ịgba Ụkwụ na Ụtarị Chụpụ Ha”
Maria do Carmo bi n’ógbè dịpụrụ adịpụ nke Lisbon mgbe Ndịàmà kpọtụụrụ ya. O nwere mmasị n’ihe ọ nụrụ wee rịọ di ya, bụ́ Antônio, ma ya pụrụ inwe ọmụmụ Bible n’ebe obibi. “Echedịla ya ọbụna n’echiche!” ka ọ zaghachiri. “M nwaa anwaa hụ Ndịàmà Jehova n’ụlọ anyị, m ga-eji ịgba ụkwụ na ụtarị chụpụ ha.” Dị ka o si daba, Antônio bụ onye nkụzi na-akụzi karate nakwa onye nọ n’ọkwá nke atọ nke belt ojii nke ndị ọkaibe. Ya mere Maria do Carmo kpebiri ịdị na-enwe ọmụmụ Bible ya n’ebe ọzọ.
Ka e mesịrị, ọ dịrị mkpa na Antônio ga-eje England maka ọzụzụ ga-ewe ụbọchị asatọ na karate, Maria do Carmo jikwa nlezianya kwanye akwụkwọ bụ́ Akwukwọm nke Akukọ Bible n’ime igbe ya.b Ebe ọ bụ na Antônio nwere oge buru ibu na njem ya, ọ gụrụ akwụkwọ ahụ. Mgbe ọ na-alọta, otu oké ifufe nunyara ụgbọ elu ahụ nke ọjọọ, o nwekwara ihe isi ike n’ịda. Nke mbụ ná ndụ ya, Antônio kpegaara Jehova ekpere.
Mgbe Antônio lọrutere ụlọ, Onyeàmà ahụ na-eduziri nwunye ya ọmụmụ ihe kpọrọ ya òkù ịbịa nzukọ. Ọ nakweere ya ma hụ na onye ọ bụla nwere nnọọ omume enyi. E mere ndokwa maka ọmụmụ Bible, n’ime mkpirikpi oge, Antônio matara na ya aghaghị ime mkpebi ụfọdụ. Ihe si na ya pụta bụ na ọ kwụsịrị ịkụzi karate wee malite ịkụziri ụmụ akwụkwọ ya otú e si ebi ndụ udo ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi. Otu n’ime ha, onye nwekwara belt ojii nke ndị ọkaibe, bụ ugbu a onye Kraịst e mere baptism.
Banyere Antônio, e mere ya baptism n’April 1991. Ụbọchị na-esote ụbọchị e mere ya baptism, ọ malitere ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka. Ọnwa isii n’ihu, ọ malitere ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile, n’oge na-adịghịkwa anya ọ nọ na-eduzi ọmụmụ Bible 12. Na July 1993, a họpụtara ya ịbụ ohu na-eje ozi n’ọgbakọ.
N’ókèala A Na-ejekarị Ozi na Ya
N’ọtụtụ ógbè ná mba ahụ, a na-arụzu ókèala ahụ kwa izu ma ọ bụ ihe yiri ya. Olee otú Ndịàmà si arụ ọrụ “ịkụ azụ” ha n’ụzọ na-arụpụta ihe?
João na-agbalị ịkpọtụrụ onye ọ bụla n’ebe obibi ọ bụla. Mgbe o jere ileta otu nwaada, ọ jụrụ ma ọ̀ dị ndị ọzọ bi n’ụlọ ahụ. Nwaada ahụ sịrị na di ya na ụmụ ya nwoke abụọ bi n’ebe ahụ, ma ọ gaghị adị mfe ịhụ ha ebe ọ bụ na ha na-arụ ọrụ, ha ga-anọkwa n’ụlọ nanị ná mgbede. Ya mere João gara n’ihu jee leta ndị ọzọ nọ n’ógbè ahụ. Ihe dị ka otu hour na ọkara ka e mesịrị, otu nwoke bịakwutere ya.
“I kwuru na ị chọrọ ịgwa m okwu,” ka nwoke ahụ gwara João. “Biko gwa m ihe ị chọrọ.”
“Ewekwala iwe, ma amaghị m onye ị bụ,” ka João zara, ná mgbogwoju anya. “Ị̀ bụ ònye?”
“Abụ m Antônio, ebikwa m ná mgbago okporo ámá a. Ị gwara mama m na ị chọrọ ịgwa ndị ezinụlọ anyị ndị ọzọ okwu, ya mere, abịala m ka m mara ihe ị chọrọ.”
João gbaara Antônio àmà nke ọma wee malitere ya ọmụmụ Bible. Mgbe ọmụmụ ihe nke abụọ gasịrị, Antônio jụrụ ma a pụrụ ịdị na-enwe ọmụmụ ihe ahụ ugboro abụọ n’otu izu. N’ọnwa anọ nanị, o sonyeere João wee malite ikwusa ozi ọma n’okporo ámá nke o bi na ya. Ọnwa atọ n’ihu, e mere ya baptism. N’oge na-adịbeghị anya mama ya malitekwara ịmụ Bible. Lee ka o si dị mkpa ịgbalị isoro ndị òtù nile nke ezinụlọ kwurịta okwu n’ozi!
Ahụmahụ ndị dị otú ahụ na-akpali akpali na-egosi na a ka nwere ịkụ azụ ime mmụọ buru ibu ime ná mmiri nile nke Portugal. Jehova ejiriwo ọtụtụ puku ọmụmụ Bible na-aga n’ihu gọzie Ndịàmà na-arụsi ọrụ ike n’ebe ahụ. Ka ha na-aga n’ihu ịchọtakwu ụzọ ndị ọzọ isi mee ka mmadụ nile mara eziokwu Bible, okwu Pọl onyeozi ndị ọ gwara ndị Kraịst nọ na Filipaị na-emezu n’ezie taa na Portugal: “N’ụzọ ọ bụla . . . a na-ekwusa Kraịst.”—Ndị Filipaị 1:18.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Map dị na peeji 23]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
SPAIN
PORTUGAL
[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]
Ndịàmà nọ na Portugal na-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ eme ihe iji mee ka a mara eziokwu Bible