Lee! Ụlọ Nzukọ Alaeze na Niue
NIUE bụ obere àgwàetiti jupụtara na coral ná Ndịda Pacific, 2,160 kilomita ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke New Zealand. Dị ka otu broshuọ ime njem na-ekwu, aha ahụ bụ́ Niue sitere n’okwu abụọ, Niu, nke pụtara “osisi akụ bekee,” na e, nke pụtara “lee.” Broshuọ ahụ na-asị: “Akụkọ mgbe ochie sịrị na ndị Polynesia mbụ biri n’ala ahụ kwuru okwu ndị a mgbe ha rutere ka ha na-ahụ osisi akụ bekee na-eto n’ala ahụ.”
Taa, Ndịàmà Jehova na Niue na-anya isi ịgwa ndị ọbịa sị, “E! Fale he Kautu ha mautolu!” nke pụtara, “Lee! Ụlọ Nzukọ Alaeze Anyị!” N’ihi gịnị ka ha ji nwee mmetụta dị omimi otú a banyere ụlọ nzukọ nke a? Ndịàmà Jehova n’ebe ọ bụla ji Ụlọ Nzukọ Alaeze ha anya isi, karịsịa ma ọ bụrụ na ha bụ ndị wuru ha. Ma iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’àgwàetiti dịpụrụ adịpụ n’etiti nnukwute Ndịda Pacific ahụ pụrụ nnọọ iche. E kwuwerị, Niue kpuchitere nanị 260 square kilomita, e nwekwara nanị 2,300 mmadụ n’àgwàetiti ahụ dum.
E nwere okwu nke onye ga-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Otu ọgbakọ ahụ dị na Niue nwere nanị 32 Ndịàmà. Ihe ọrụ nile bụ isi a chọrọ, dị ka ụgbọ tipa, buldoza, na katapịla ndị na-ebuli ihe elu, bụcha gọọmenti nwe ha. Ọzọkwa, a gajekwa isi New Zealand bubata ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile dị mkpa e ji ewu ụlọ—ígwè, blọkụ kọnkriti, gbam gbam, ngwá ọkụ eletrik na paịpụ mmiri, ígwè okwu, na oche—na-eji ụgbọ mmiri nke na-arụ ọrụ nanị otu ugbo n’ime izu ise. N’ikpeazụ, mbara ala àgwàetiti ahụ bụ nkume nkume ga-eme ka owuwu ihe sie ike. a gajekwa iwu ụlọ nzukọ ahụ ka o guzogide ajọ ifufe ndị a na-enwe n’ala mmiri na-ezo. N’ezie, ọ bụ ọrụ na-ebu aka nye onye ọ bụla!
Otú ọ dị, e nwere ọdịiche gbara ọkpụrụkpụ n’ebe a. Nye Ndịàmà Jehova, Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ebe bụ isi nke ezi ofufe n’ógbè ọ bụla, ha na-elegakwara Jehova Chineke anya maka nduzi na enyemaka. (Abụ Ọma 56:11; 127:1) Ụmụnna bụ́ ndị Kraịst na New Zealand, gụnyere ndị nọ n’ọgbakọ asụsụ Niuean n’Auckland, bịara nyere ìgwè nta a nke Ndịàmà na Niue aka, na-enye nkwado sitere n’obi dum n’ọrụ owuwu ihe ahụ.
Mkpebi Ịga n’Ihu
Na June 1994 n’ala a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Rotorua, New Zealand, a kpọrọ òkù maka ndị nwere mmasị ikere òkè n’ihe owuwu Niue ahụ. N’ụzọ na-atụ n’anya, 200 ụmụnna nwoke na nwanyị bụ́ ndị Kraịst nyere onwe ha. Site ná ndị a, a họọrọ 80 mmadụ, gụnyere ndị kapịnta, ndị ọrụ ígwè, ndị plọmba, ndị na-akụ gbam gbam, ndị mesin, ndị na-ete ụlọ ágbá, ndị ọrụ eletrik, ndị ọrụ ígwè okwu, ndị ọrụ kọnkriti, ndị na-edo blọkụ, na ndị ọrụ nkịtị.
Ụmụnna ahụ tụrụ ụkpụrụ ma gaa n’ihu, na-atụkwasị Jehova obi. Otu n’ime ndị okenye abụọ n’ọgbakọ dị na Niue, bụ́ o ji ego achụ ego n’obodo ahụ, malitere ime ndokwa maka ibubata ngwá ọrụ nile dị mkpa. E mere nkwekọrịta maka ụgwọ njem ụgbọ elu na ebe obibi pụrụ iche maka ndị ọrụ ofesi ahụ, bụ́ ndị kwere ịkwụrụ onwe ha ụgwọ, e setịpụkwara ụbọchị owuwu ihe ahụ. A gaje iwuzu ihe owuwu ahụ n’ime 20 ụbọchị, malite March 4 ruo March 23, 1995, mgbe a ga-arara Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ nye.
“Akụjara m na nke mbụ ya mgbe m hụrụ ala ihe owuwu ahụ,” ka onye ntụzi ọrụ ahụ kwuru, bụ́ onye si New Zealand bịa otu izu tupu mmalite ya iji hazie ihe. “Ala ya bụ nanị nkume. Ọ ga-ewe izu abụọ nanị iji gwuo ala ebe a ga-asụnye mgbidi ndị ahụ.” Ma o lelịwo Ndịàmà obodo ahụ anya, ka o mesịrị kweta. “Ụmụnna Niue ji anya amata nkume,” ka o kwuru. “Ha maara ebe ha ga-akụ nkume ihe ka ibe ndị buru ibu wee dapụ.” A sụnyesịrị mgbidi ndị ahụ n’ime izu abụọ!
Na March 4 ìgwè mbụ nke Ndịàmà si New Zealand rutere, a rụkwara ọrụ kọnkriti ya. Ka ìgwè ndị ọzọ nke ndị ọrụ na-erute, a rụzuru akụkụ dị iche iche nke ihe owuwu ahụ. Ụbọchị ndị a na-arụ ọrụ malitere n’elekere 7:00 nke ụtụtụ site ná ntụle dị mkpirikpi nke ihe mmụta Bible dịịrị ụbọchị. Ụmụnna ụfọdụ rụrụ ọrụ hour 12 kwa ụbọchị n’ọ̀tụ̀tụ̀ oyi 36 degree Celsius. N’ikpeazụ, ka ọ na-eru March 23, a kparisịwo ala ahụ. Saịn bọọdụ na-adọrọ anya nke e ji osisi mango mee kọwara ụlọ ahụ dị ka “Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova.”
Mmụọ Imekọ Ihe Ọnụ na Ile Ọbịa nke Ọma
Otu ihe dị mkpa so kpata ihe ịga nke ọma nke ihe owuwu a bụ mmekọ ihe ọnụ nke ndị Niue. Ndị bi n’obodo nta ahụ, n’ịbụ ndị mmụọ nke ihe omume ahụ rikpuru, nyere onyinye nri na ego. Ọtụtụ lere owuwu ụlọ nzukọ ahụ anya dị ka ọrụ ha. Ndị ọrụ gọọmenti na ndị o ji ego achụ ego jere ozi ndị gabigara ihe ọrụ ha gụnyere. E mere ka ihe ọrụ nile dị mkpa dịrị, dịkwa ka otu ụlọ ọrụ ndị ọkwa nkà ghere oghe nye ha. Ọbụna na ụlọ ọrụ ụgbọ mmiri ahụ gbanwere ụzọ ụgbọ mmiri ahụ na-eso iji hụ na ihe ndị dị mkpa rutere kpọmkwem n’oge kwesịrị ekwesị.
Ndị ahụ si esi bịa nwere ekele n’ezie maka nrụsi ọrụ ike na afọ ọma nke Ndịàmà Niue, bụ́ ndị soro ha kerịta ebe obibi na ihe onwunwe ha. “Ụmụnna nwanyị obodo ahụ dị ebube,” ka otu onye owuwu ihe kwuru. Gụnyere nri ehihie dị ọkụ kwa ụbọchị, ụmụnna nwanyị ahụ kere nri ụtụtụ e siri esi kwa ụtụtụ n’elekere 6:30. Ụfọdụ na-eteta ụra n’elekere 4:30 nke ụtụtụ ịkwadebe nri. Otu onye ọrụ owuwu ihe kwuru, sị: “Echere m na anyị ebiwo ndụ ka mma n’ebe a na Niue karịa n’ebe obibi anyị.”
Na March 10 akwụkwọ akụkọ Niue Star kọrọ banyere ihe omume ahụ n’akụkọ ihu akwụkwọ akụkọ n’okpuru isiokwu bụ́ “Ụlọ Nzukọ Alaeze Mbụ na Niue” na foto ndị New Zealand na ndị Niue ka ha na-arụ ọrụ n’ala ahụ. Ọ kọrọ na ụlọ nzukọ ahụ dị 280 square mita n’ibu ma na-anabata malite 70 mmadụ ruo 100. Isiokwu ahụ kwukwasịrị: “A pụrụ n’ezie ịrụzu ọrụ ahụ n’ime [izu] abụọ, ma n’ọnọdụ nke a a ga-agbatịwanye ya. Ka ọ dị ugbu a, nanị ụbọchị abụọ eri mmalite ọrụ, e guzobewo ntọala, mgbidi, osisi uko, na elu ya, na-aga ọsọ ọsọ karịa otú a tụrụ anya.”
Otu o ji ego achụ ego n’obodo ahụ kwupụtara ọchịchọ ya ka ndị nile bi n’Àgwàetiti Niue kirie ihe owuwu a ma mụta ihe na ya. Ọ sịrị na ya na-ele anya na ọ ga-egosi mmadụ nile ihe a pụrụ ime site n’ịhụnanya na imekọ ihe ọnụ.
Ìgwè 204 mmadụ bịara nraranye ya. Ihe ghọrọ ahụmahụ na-akpali nnọọ akpali nye ndị nile bịara bụ ihe ngosi pụrụ iche ebe ụmụnna nwoke, ụmụnna nwanyị, na ụmụaka na Niue gosipụtara n’abụ na egwú ọgbụgba owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. E kwuru okwu ekele nye ìgwè ndị owuwu ihe ahụ na nye Jehova, onye mmụọ ya kpaliri uche, obi, na aka ndị mmadụ ịrụzu ọrụ ahụ.—Aịsaịa 40:28-31.