Singapore Emebie Nnwere Onwe nke Ofufe
N’UHURUCHI nke February 24, 1995, ndị uwe ojii wakporo ebe obibi anọ n’obodo ukwu nke Singapore. E jidere ngụkọta nke 69 mmadụ.a N’ime ha e nwere nwanyị dị 71 afọ na ụmụ agbọghọ abụọ dị afọ 15. N’ihi gịnị? Ọ̀ bụ n’ihi omume mpụ ka ọ bụ ịgba mgba okpuru? Ee e. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha tinyere aka n’ihe ọ bụla nke a pụrụ iledị anya n’echiche dịkarịsịrị nta dị ka ihe dị ize ndụ, rụrụ arụ, ma ọ bụ na-emegide ọha mmadụ. Ha abụghị ihe iyi egwu nye ụkpụrụ omume ọma, nchebe, na ọdịmma nke ụmụ amaala Singapore ibe ha. Ma, mgbe a fọkasịchara ebe obibi anọ a, ndị uwe ojii kpọọrọ mmadụ 69 ahụ, bụ́ ndị zukọtaworo ọnụ ịmụ Bible na inwe nnọkọ ntụrụndụ, gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. N’ebe ahụ e jichiri ha chi abọọ, gbaa ha ajụjụ ọnụ, ha abịanye akara mkpịsị aka ha n’akwụkwọ, ma see ha foto—ee, yie ha egwu dị ka ndị ome mpụ nkịtị! N’oge a—ihe ruru hour 18 n’ọnọdụ dị njọ—e kweghị ka ha nweta onye ọkà ikpe ga-ekwuchite ọnụ ha, ọbụna machibidokwa ha ịkpọ òkù fon iji gwa ndị òtù ezinụlọ ha ebe ha nọ. Mmadụ pụrụ nanị icheli echiche otú ihe ahụ e mere ngwa ngwa si metụta ndị amaala a bụ ndị udo, na-agbaso iwu!
Ihe ahụ merenụ na-echetara anyị ọnọdụ ndị e nwere n’oge ndị ahụ dị oké njọ nke Nazi Germany na n’oge mmekpọ ọnụ nke ndị Kọmụnist na Soviet Union na Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe. Ọ bụghị ihe onye bịara Singapore maka nlegharị anya ga-atụ anya ịhụ n’obodo ọgbara ọhụrụ ahụ dị ọcha ma baa ụba n’ụzọ ihe onwunwe. Singapore emeworo onwe ya aha dị ka ihe ịtụnanya nke narị afọ nke 20 n’ihe banyere ọganihu akụ̀ na ụba na nke ọha mmadụ. Ọ bụ obodo a ma ama dị ka nke ọchịchị onye kwuo uche ya nke nwere ụkpụrụ iwu na-ekwe ndị amaala ya nkwa ikike ndị bụ́ isi ruuru mmadụ, gụnyere nnwere onwe nke ikwu okwu, okpukpe, na mgbakọ.
Ma, ndị ahụ e jidere na February bụ ndị e lekwasịrị anya ijide nanị n’ihi na ha bụ Ndịàmà Jehova na-ezukọ ọnụ ịmụ Bible na ikere òkè ná nnọkọrịta ndị Kraịst. Ebubo e boro ha bụ “ịga nzukọ nke òtù iwu machibidoro.”
N’ezie, e kwebeghị ịnabata Ndịàmà Jehova n’ụzọ iwu kwadoro na Singapore kemgbe 1972 mgbe e wepụrụ Ọgbakọ Singapore n’akwụkwọ ndị ọchịchị, machibidokwa akwụkwọ dị iche iche, tinyere Bible, ndị Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara iwu. E nyeghị ohere ọ bụla iji gbaghaa ihe ndị ha chere, bụ́ ebe a gbakwasịrị ụkwụ mee ihe ahụ. Na nso nso a, a mara ịkpa ókè nke a nke ndị isi ịbụ ihe iwu kwadoro aka n’ụlọikpe Singapore n’okwu metụtara Ndịàmà anọ, bụ́ ndị a mara ikpe na February 1994 ịbụ ndị a hụrụ akwụkwọ Bible a machibidoro iwu n’aka ha. Akwụkwọ e tinyere maka mkpegharị ikpe megide ikpe a mara ha bụ nke a nụrụ n’August 1994 ma kagbuo ozugbo ahụ. Ọkà Ikpe Ukwu bụ́ Yong Pung How nke Ụlọikpe Ukwu wepụtara echiche ya n’ọnwa na-esonụ. O kwuru na e nweghị mmebi nke nnwere onwe okpukpe nakwa na ikpe ọmụma ndị ahụ ziri ezi ná ndabere nke na Ndịàmà Jehova bụ ihe iyi egwu nye nchebe nke mba ahụ n’ihi na ndị òtù ya agaghị etinye aka n’ije ozi agha. Na February 17, 1995, Ndịàmà anọ ahụ chọrọ ka e nye ha ikike itinye akwụkwọ mkpegharị ikpe ná mkpebi a dị njọ n’Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe nke Singapore. A jụrụ akwụkwọ ahụ e tinyere.
E mere ka mkpebi ikpe ikpeazụ a pụta ìhè n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi ndị gọọmenti Singapore na-achịkwa. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mkpebi ikpe nke a nke ụlọikpe a na mkpọsa a kpọsara ya mere ihe atụ ihe omume ndị sochirinụ. Ka ọ na-erule otu izu njide nke 69 Ndịàmà ahụ weere ọnọdụ. E mesịrị kagbuo ebubo e boro anọ n’ime ndị a—ụmụ amaala nke Britain, France, na Luxembourg. Otú ọ dị, ọbụna nye ndị a, ahụmahụ ahụ na-atụ egwu. Otu nwoke ebiwo ma rụọ ọrụ na Singapore ruo ọtụtụ afọ ya na nwunye ya. A chụrụ ha n’ọrụ ma chụpụ ha n’ụlọ ha na-akwụ ụgwọ na ya, a manyekwara ha ịgwa ọtụtụ ezi ndị enyi ha nọọ nke ọma.
E boro mmadụ 63 ndị meworo okenye fọdụrụnụ ebubo ịnọ n’òtù a machibidoro iwu, e bokwara ndị ụfọdụ ebubo ịbụ ndị a hụrụ akwụkwọ ndị a machibidoro iwu n’aka ha. Ha na-eche ihu ọ dịkarịa ukwuu mkpọrọ afọ atọ ma ọ bụ nhá S$3,000 ($2,100, U.S.) ma ọ bụ ha abụọ. Ụmụ agbọghọ abụọ ahụ gbara afọ 15 pụtara iche iche n’ụlọikpe ndị na-eto eto.
Ha Abụghị Ihe Iyi Egwu Nye Ịdị n’Otu na Njikọ nke Mba
Gburugburu ụwa, n’ihe karịrị 200 ala ebe ha bi, a ma Ndịàmà Jehova ama dị ka ndị na-akwanyere onwe ha ùgwù, na-eme ihe n’eziokwu, na-agbaso iwu. A maara ha maka ọjụjụ siri ike ha na-ajụ ikere òkè n’ụdị ọ bụla nke ihe omume na-emegide gọọmenti, nke na-agba ya mgba okpuru—ihe omume na-abụghị nke ndị Kraịst nke pụrụ ime ka a chụpụ ha n’ọgbakọ. N’ezie, gọọmenti Singapore enweghị ihe ọ bụla ha ga-atụ ụjọ banyere ha. Ha abụtụghị ihe iyi egwu nye nchebe mba Singapore ma ọ bụ echiche nke njikọ na ịdị n’otu nke mba ahụ nile. (Ndị Rom 13:1-7) E kwuru nke a n’ụzọ doro anya n’akwụkwọ ozi e dere na March 21, 1995, nke sitere n’aka Milton G. Henschel, bụ́ onye isi oche nke Watch Tower Bible and Tract Society, nye Prime Minister Goh Chok Tong nke Singapore. E bipụtaghachiri akwụkwọ ozi a n’ebe a maka abamuru nke ndị na-agụ akwụkwọ anyị.
Ndị na-ahụ nnwere onwe n’anya nọ n’azụmahịa, ọchịchị, na ngalaba onwe onye ga-eji mmasị na-ele anya ịhụ otú ọnọdụ a dị na Singapore ga-esi gaa n’ihu. Ọchịchị nke Singapore ọ̀ ga-eme ihe n’ikwekọ n’ikike ndị bụ́ isi ruuru mmadụ na nnwere onwe ndị ụkpụrụ iwu ya na òtù mba nile? N’ezie, Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa nwere nchegbu dị omimi banyere ndị ofufe ibe ha na Singapore. Ha na-echeta ha n’ekpere ha ma na-eburu n’uche nkwa dị na Bible: “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya, Ọ dịghị ahapụkwa ndị ebere Ya.”—Abụ Ọma 37:28.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’ime ọtụtụ ọnwa kemgbe e jidesịrị 69 mmadụ ndị a, e jidewokwa Ndịàmà 11 ọzọ ma boo ha ebubo ịbụ ndị a hụrụ akwụkwọ ndị a machibidoro iwu n’aka ha.
[Igbe dị na peeji nke 30]
March 21, 1995
Goh Chok Tong
Prime Minister
Istana Annexe
Singapore 0923
Republic of Singapore
Lee Kuan Yew
Senior Minister
Prime Minister’s Office
460 Alexandra Road
37-00 PSA Bldg
Singapore 0511
Republic of Singapore
Ezi Ndị Isi:
Ozi e nwetara na nso nso a site n’aka ụlọ ọrụ mgbasa ozi bụ́ Reuters site na Singapore bụ́ nke akara ụbọchị ya bụ February 25, 1995, kpatara oké nchegbu. Ọ kọrọ na ndị uwe ojii kụghasịrị nzukọ ọmụmụ Bible nke Ndịàmà Jehova, e jidekwara 69 mmadụ. Akụkọ a emewo ka ụwa nile lekwasị anya n’ọnọdụ nke Ndịàmà Jehova na Singapore, ebe a machibidoworo ọrụ na akwụkwọ ha iwu kemgbe ihe karịrị 20 afọ.
O siri ike ịghọta ihe mere nzukọ okpukpe nke na-arụ ọrụ n’ụzọ pụtara ìhè, na-enwe nchebe zuru ezu nke iwu n’ihe karịrị 200 mba ji bụrụ nke a machibidoro iwu na Singapore, mba nke na-akwado ụkpụrụ nke ọchịchị onye kwuo uche ya. Ọ na-akpata nchegbu karị n’ihi ụkpụrụ iwu nke Singapore na-ekwe ndị amaala ya nkwa nnwere onwe nke ofufe.
Ndịàmà Jehova abụtụbeghị ihe iyi egwu nye nchebe nke mba n’ebe ọ bụla. N’ezie, n’ụwa nile a ma ha ama dị ka ndị udo, ndị na-arụsi ọrụ ike, ndị nwere omume kwụ ọtọ, ndị na-agbaso iwu—àgwà ndị m ji n’aka na ị na-akwalite ná mba gị.
Ọ bụ eziokwu na ná nrapagidesi ike ha n’ụkpụrụ Bible maka ndị Kraịst, ọnọdụ nke Ndịàmà Jehova abụrụwo nke a ghọtahiere ma kwuo ihe na-abụghị eziokwu banyere ya mgbe ụfọdụ. Ma, ọ̀ bụ na nke ahụ abụghị eziokwu banyere onye hiwere Iso Ụzọ Kraịst bụ́ onye e kwuru ihe na-abụghị eziokwu banyere ya dị ka onye na-emegide “Siza,” gọọmenti nke oge ya? Nanị ihe Ndịàmà Jehova na-eme bụ ịgbaso ihe nlereanya nke Jisọs na ndị Kraịst oge mbụ. Ha na-akwanyere gọọmenti ebe ọ bụla ha bi ùgwù, na-atụ ụtụ isi ha, na-akwalitekwa omume ọma. Ha bụ ụmụ amaala ji ihe a kpọrọ ihe na ndị ezigbo mmadụ. E nwetụbeghị mgbe Ndịàmà Jehova tinyere aka n’ụdị ọ bụla nke omume ịgba ọchịchị mgba okpuru ná mba ọ bụla, m ga-emesikwa gị obi ike na ọnụnọ ha nọ na Singapore abụghị ihe iyi egwu nye ọdịmma mba gị ma ọlị.
N’ihi akụkọ nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi ndị e nwetara na nso nso a, ụzọ mmegbu e werewooro megide Ndịàmà Jehova na Singapore site n’aka gọọmenti gị abụrụwo ihe a mazuuru. Ọ bụ ihe nchegbu nye karịsịa 12 nde ndị na-esonyere ha gburugburu ụwa. M na-arịọ gị ka i jiri ezi ọkwá gị mezie ọnọdụ ahụ ma nye Ndịàmà Jehova nọ ná mba gị nnwere onwe nke ife ofufe na nke akọ na uche nke Ụkpụrụ Iwu gị kwere nkwa ya.
Ekwenyere m na isoro ndị nnọchianya nke Ndịàmà Jehova kwurịta okwu n’ezoghị ihe ọ bụla ga-enye aka iwepụ nghọtahie ọ bụla e nwere banyere nzukọ na ọrụ anyị, ọ ga-emesighachikwa gị obi ike na gọọmenti nke Singapore enweghị ihe ọ bụla ọ ga-atụ egwu site n’aka Ndịàmà Jehova. Obi ga-adị m ụtọ ịhazi maka ụdị nzukọ ahụ.
M na-elepụ anya maka nzaghachi gị.
Onye na-akwanyere gị ùgwù,
Milton G. Henschel
Onye Isi Oche
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]
Nik Wheeler/H. Armstrong Roberts