Ezinụlọ Ndị Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Emee Ka Mmụba na Sri Lanka Gaa Ngwa Ngwa
BỤ́ NKE a maara dị ka Ceylon ruo 1972, Sri Lanka bụ àgwàetiti mara mma nke nwere ụsọ osimiri ndị osisi nkwụ jupụtara, ugwu dị iche iche, na ụmụ obere ọzara. N’ebe ugwu, ugwu Adam’s Peak, nke dị 2,243 mita n’ịdị elu, bụ ebe dị nsọ nye okpukpe anọ ndị bụ́ isi.a World’s End dịdewere ya, nke bụ́ mgbidi e wusiri ike bụ́ ebe ugwu ahụ jupụtara n’okwute kpọdara nnọọ ruo ihe karịrị 1,500 mita. Ebe ahụ so n’otu ebe kasị mma nkiri na Sri Lanka.
Nde mmadụ 18 bi na Sri Lanka nwekọtara otu akụkọ nke na-adọrọ mmasị. Kemgbe narị afọ nke ise T.O.A., ndị India nke Europe ndị sitere n’ebe ugwu nke India ebijuwo àgwàetiti ahụ. Ha bụ ndị Sinhalese, ndị na-emejupụta ugbu a ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ nke ndị bi n’ebe ahụ. Mgbe ahụ, ruokwa ihe dị ka narị afọ nke 12, e nwere nnubata nke ndị Tamil site n’ebe ndịda nke India; ndị a bizi ugbu a n’ụzọ ka ukwuu n’ebe ugwu na n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke àgwàetiti ahụ. Ndị Portugal, ndị Netherlands, na ndị Britain enwewokwa mmetụta nke ha maliterị n’oge ọchịchị ndị ọcha. Tụkwasị, ndị ahịa ji ụgbọ mmiri aga bụ́ ndị sitere n’ókèala dịịrị banye n’ime mmiri nke Arebia na Malay ebinyewokwara ndị obodo ahụ. E nwekwara ìgwè ndị dị nta nke ndị Europe, ndị Peasia, ndị China, na ndị ọzọ.
E wezụga ngwakọta ahụ nke agbụrụ, asụsụ na okpukpe dị na Sri Lanka na-egosi ọdịdị ya gwara ọgwa. Asụsụ ndị bụ́ isi n’àgwàetiti ahụ bụ Sinhalese, Tamil, na Bekee. Ọtụtụ ndị Sri Lanka na-asụ asụsụ abụọ n’ime atọ ndị ahụ ma ọ dịkarịa ala. Ọdịdị nke agbụrụ dị iche iche na-enwekwa mmetụta dị ukwuu n’okpukpe nke ndị ahụ. Ihe ka ná ndị Sinhalese bụ ndị Buddha, ebe ihe ka ná ndị Tamil bụ ndị Hindu. Ndị sitere n’Arebia ma ọ bụ Malay na-araparakarị n’Alakụba, ndị sitekwara Europe na-abụkarị ndị òtù nke chọọchị dị iche iche nke Krisendọm, Katọlik na Protestant.
Izute Ihe Ịma Aka Ahụ
Ihe ndị a nile na-echere Ndịàmà Jehova nọ na Sri Lanka aka mgba dị ukwuu. Ndị a na-arụsi ọrụ ike ịrụzu ọrụ Jisọs nyere n’iwu: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) E wezụga inwe ọtụtụ asụsụ ndị ha na ha ga na-agba mgba, ndị nkwusa ozi ọma ahụ pụrụ ịgwa ndị Buddha, ndị Hindu, na ndị òtù chọọchị dị iche iche nke Krisendọm, tinyere ndị na-ekweghị na Chineke okwu—ha nile n’ime hour ole na ole nke ime nkwusa.
Iji dị irè n’ozi ha, ndị nkwusa ahụ aghaghị ibu magazin Ụlọ Nche na Teta! na akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ Bible n’asụsụ Tamil, Sinhalese, na Bekee. Ndị siri ike ibu ya ọbụna na-ebu Bible n’asụsụ ndị ahụ. Ndị nkwusa ahụ nwere ọṅụ dị ukwuu na nso nso a mgbe e wepụtakọrọ broshuọ ndị bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? na Our Problems—Who Will Help Us Solve Them? na traktị bụ́ Ụwa nke a Ọ̀ Ga-alanarị? n’asụsụ atọ ahụ n’otu mgbe. Nke a pụtara inwekwu ngwá ọrụ maka ọrụ ahụ.
Ndịàmà ahụ anọwo na-arụsi ọrụ ike kemgbe 1912, mgbe Charles Taze Russell, onye bụ onye isi oche nke òtù International Bible Students Association n’oge ahụ, mere nleta dị mkpirikpi na Ceylon. Otú ọ dị, uto dị ukwuu aghaghị ichere ruo mgbe ndị gụsịrị akwụkwọ na Watchtower Bible School of Gilead bịarutere na 1947. Kemgbe ahu, ndị nkwusa nọ na Sri Lanka arụpụtawo ihe ndị dị mma n’ọrụ ime nkwusa ha. Na 1994, 1,866 ndị nkwusa Alaeze ahụ duziri ná nkezi 2,551 ọmụmụ Bible ebe obibi kwa ọnwa. Ọnụ ọgụgụ bịara Ememe Ncheta nke bụ́ 6,930 bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu anọ nke ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa n’ọgbakọ nile. Lee aha ngọzi dị ebube ọ bụ!
Ọ bụrụ na e jiri ya tụnyere ala ụfọdụ, ọganihu a na-enwe na Sri Lanka pụrụ iyi ihe na-arị arị. Otu ihe kpatara ya yiri ka ọ bụ nkekọ ezinụlọ ndị siri ike. Otú ọ dị, ihe pụkwara ịga aka nke ọzọ. Mgbe ọchịagha Rom bụ́ Kọniliọs weere nguzo maka eziokwu ahụ, ezinụlọ ya sooro ya guzoro. (Ọrụ 10:1, 2, 24, 44) Akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi hotakwara ezinụlọ ndị Kraịst ndị ọzọ siri ike, gụnyere ndị nke Lidia, Krispọs, na onye nche ụlọ mkpọrọ nke na-eche Pọl na Saịlas nche.—Ọrụ 16:14, 15, 32-34; 18:8.
N’ezie, nkekọ ezinụlọ ndị siri ike pụrụ ịrụpụta ihe ọma n’ebe e nwere nhazi dị mma na nnọgidesi ike n’ikwesị ntụkwasị obi. N’iburu okwu ndị dị n’Aịsaịa 60:22 n’uche, onye ozi ala ọzọ nọteworo aka bụ́ Ray Matthews na-ekwu, sị: “O yiri ka Jehova ọ̀ na-eme ugbu a ka ihe bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya, ọ bụghị nanị site n’aka ndị mmadụ n’otu n’otu kamakwa site n’ezinụlọ dị iche iche.”
Ezinụlọ A Haziri Ahazi Eweta Otuto
E nwere n’ezie ezinụlọ ndị dị otú ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi na Sri Lanka taa. Dị ka ihe atụ, e nwere ezinụlọ Sinnappa nke a haziri nke ọma ndị bi na Kotahena, bụ́ otu ógbè nke Colombo, obodo ukwu bụ́ isi nke Sri Lanka. Ọ bụ ezie na onye isi ezinụlọ, bụ́ Marian, nwụrụ n’oge na-adịbeghị anya, nwunye ya, bụ́ Annamma, na 12 n’ime ụmụ ha 15 ndị gbara malite n’afọ 13 ruo 33, nọgidere na-ejere Jehova ozi dị ka otu ezinụlọ. N’oge e ji dee ihe a, e meela asatọ n’ime ụmụaka ahụ baptism, atọ n’ime ha nọkwa n’ozi oge nile, na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile. Atọ ndị ọzọ edenyewo aha n’ozi ọsụ ụzọ inyeaka site n’oge ruo n’oge. E nwere ndị nkwusa anọ a na-emebeghị baptism n’etiti ndị ntakịrị n’ezinụlọ ahụ. Tụkwasị, ụmụ ụmụ anọ, ọ bụ ezie na ha ka dị ntakịrị, na-amụ Bible ma na-eje nzukọ ndị Kraịst n’Ọgbakọ Colombo North nke Ndịàmà Jehova.
Ọ bụ na 1978 ka Annamma nụrụ ozi ọma Alaeze ahụ nke mbụ ya mgbe ọ nakweere otu mkpụrụ Ụlọ Nche. A malitere ọmụmụ Bible, mgbe ọ mụsịkwara akwụkwọ ahụ e ji amụ Bible bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi, Annamma raara ndụ ya nye Jehova Chineke, e meekwa ya baptism, si otú a na-esetịpụ ihe nlereanya mbụ nye ọtụtụ n’ime ndị ezinụlọ ya.
Dị ka onye ọchịagha ahụ bụ́ Kọniliọs, Annamma nwere nhazi mara mma n’ezinụlọ ya. “Anyị aghaghị ime atụmatụ maka nzukọ ndị Kraịst na mgbakọ dị iche iche—ka a hapụgodị okwu ije akwụkwọ,” ka Annamma na-echetaghachi. “Uwe oyiyi bụ nsogbu, ma site ná ngọzi Jehova anyị nwere ike ịkwa uwe ndị ọhụrụ maka mgbakọ ọ bụla. Ezinụlọ ahụ dum yi uwe dị mma wee bịa, rijuokwa afọ—na-amụmụkwa nnọọ ọnụ ọchị.”
Ụmụaka ahụ ji ịhụnanya na-echeta nhazi ezinụlọ ha. Iji nyere ezinụlọ ahụ dum aka ije nzukọ ndị Kraịst, a na-enyekarị ndị meworo okenye karị ibu ọrụ ndị pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, Mangala na-asa uwe, Winnifreda na-agbatị ya. Winnifreda, bụ́ onye na-enyekwara ndị obere aka iyiri uwe, na-asị: “Onye ọ bụla na-adị nnọọ mma ile anya ka ha na-ahapụ ụlọ.”
A hazikwara ihe ime mmụọ nke ọma n’otu aka ahụ. Ada ha bụ́ Pushpam, bụ́ onye ọsụ ụzọ oge nile ugbu a na-echeta, sị: “Kwa ụbọchị, ezinụlọ anyị na-enwe ọgụgụ Bible, na-atụlekọkwa ihe mmụta dịịrị ụbọchị sitere na Bible ọnụ.” Annamma na-atụkwasị: “Nwatakịrị nke ọ bụla nwere Bible, Ụlọ Nche, na mbipụta ndị ọzọ nke ya. M na-aṅa ntị nke ọma n’azịza nile ha na-aza ná nzukọ. Mgbe o yiri ihe dị mkpa, m na-eji agbamume na mgbazi olu esochi ya n’ụlọ. N’abalị, anyị na-ejikọ ọnụ iji jiri ekpere ezinụlọ anyị mechie ụbọchị ahụ.”
Ụmụaka ndị meworo okenye karị bara oké uru n’inyere Annamma aka inye mmadụ nile nọ n’ime ezinụlọ ahụ ezi mmụta ndị Kraịst. Otú ọ dị, usoro ihe omume chiri anya adịghị egbochi ọchịchọ ha isoro ndị nọ n’èzí kerịta ozi ọma ahụ. Ná nchịkọta, ndị òtù dị iche iche nke ezinụlọ ahụ na-eduziri ndị bi n’agbata obi ahụ 57 ọmụmụ Bible ebe obibi. Rajan, bụ́ di nwa ya nwanyị, na-ekwu, sị: “Ezinụlọ ahụ na-eduzi ọmụmụ Bible ndị na-aga n’ihu. Nwunye m bụ́ Pushpam, enweelarị ihe ùgwù nke ịhụ ka otu n’ime ndị ọ na-eduziri ọmụmụ ihe raara ndụ ya nye Jehova.”
Ọ kpọtụrụ nnọọ akpọtụ na Kotahena mgbe ezinụlọ buru ibu otú ahụ hapụrụ Chọọchị Roman Katọlik. Ọ bụ ezie na onye ụkọchukwu ahụ adịghị mgbe ọ bịara leta ezinụlọ ahụ n’onwe ya iji chọpụta ihe merenụ, ọ gwara ndị nkịtị na-abịa chọọchị ka ha chọpụta ihe merenụ. Ọtụtụ mkparịta ụka bilitere, karịsịa banyere ozizi Atọ n’Ime Otu. Annamma na-adabere mgbe nile n’ebe Jehova na Bible nọ iji kwadoo okwukwe ya. Akụkụ akwụkwọ nsọ kasị amasị ya ná mkparịta ụka ndị a bụ Jọn 17:3.
Ezinụlọ Sinnappa na-egosi n’ụzọ doro anya na ezi nhazi na mgbalị a nọgidere na-eme pụrụ ịrụpụta ihe ndị na-enye afọ ojuju. Site ná mgbalị ịnụ ọkụ n’obi ha, ọgbọ ọhụrụ nke ndị nkwusa Alaeze na-etolite, ha nile iji nye Jehova otuto.
Mmegide Emee Ka Ezinụlọ Dị n’Otu n’Ezi Ofufe
Ezinụlọ Ratnam ebighị ebe dị anya site n’ebe ezinụlọ Sinnappa bi, na Narhenpitya, bụ́ ógbè ọzọ nke Colombo. Ha onwe ha bụbukwa ndị Roman Katọlik. Na 1982, Ndịàmà nọ n’ozi ụlọ na ụlọ zutere Balendran, di ada ha, bụ́ Fatima. A maliteere ezinụlọ ahụ dum ọmụmụ Bible. N’oge na-adịghị anya ụmụ ha atọ nọ na-ajụ nne papa ha bụ́ Ignasiamal banyere aha Chineke. Mgbe ụmụaka ahụ nyere azịza bụ́ “Jehova,” ha kpaliri mmasị nke nne papa ha, a malitekwaara ya ọmụmụ Bible. Ka e mesịrị, ụmụ ya ndị nwanyị abụọ, bụ́ Jeevakala na Stella, sonyere n’ọmụmụ ihe ahụ, ka ọ na-erukwala 1988 e mere ha atọ baptism.
Ka ọ dị mgbe ahụ, Balendran na Fatima sooro otu n’ime ụmụnne nwanyị Fatima, bụ́ Mallika, na di ya, bụ́ Yoganathan, kerịta eziokwu ahụ. Ka ọ na-erule 1987, e mere di na nwunye a baptism, ha akụnyewokwa n’ime ụmụaka ha abụọ ịhụnanya na-eto eto maka Jehova. Pushpa, bụ́ nwanne nwanyị ọzọ nke Fatima, sochiri. O mere nraranye ya, e meekwa ya baptism na 1990. Ka ọ nọ na Tokyo, di ya, bụ́ Eka, sonyeere otu ọgbakọ Bekee, Pushpa nyekwaara obere nwa ha nwoke, bụ́ Alfred, aka ịbụ onye a zụlitere n’ụzọ nke Jehova.
Ka ọ dị ugbu a, anọ n’ime ụmụ iri nke ezinụlọ Ratnam ewerewo nguzo ha maka ezi ofufe. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, atọ ndị ọzọ na-enwe ọganihu dị mma n’ọmụmụ Bible onwe onye ha. N’ime ụmụ ụmụ 11, e meelarị otu nwa agbọghọ, bụ́ Pradeepa, baptism. A na-ezi asaa ndị obere ndị ọzọ ihe n’ụzọ chiri anya site n’ọmụmụ Bible ezinụlọ ha. Tụkwasị, a na-eduziri ndị nwere mmasị n’agbata obi ahụ ngụkọta nke 24 ọmụmụ Bible ebe obibi.
Ihe ndị a nile abịaghị n’ụzọ dị mfe. Na mbụ, e nwere mmegide ezinụlọ. Nna ha bụ́ Muthupillai na ụmụnne ha ndị meworo okenye karị megidere onye ọ bụla n’ezinụlọ ha ije nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ikere òkè n’ọrụ nkwusa ihu ọha. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ná mmegide nke a bụ n’ihi nchegbu banyere nchebe onwe onye, Muthupillai na-atụkwasị: “Eweere m onwe m kpam kpam nyefee ‘ndị saint,’ akwadoghịkwa m ezinụlọ m ịhapụ Chọọchị Katọlik.” Otú ọ dị, ugbu a, o kwenyere na ha na-efe ezi Chineke ofufe n’ihi na ọ pụrụ ịhụ uru ndị okwukwe ha wetawooro ha.
Dị ka ihe atụ, n’otu oge, onye Buddha ha bi n’ụlọ ya nwara ịchụpụ ha n’ụlọ ya site n’ịkọ ha ọgwụ. Ọ bịara n’otu abalị wee tụsa oroma nkịrịsị “e tinyere ọgwụ” gburugburu ụlọ ahụ. Ụjọ bịara ndị agbata obi ahụ nwere nkwenkwe ụgha dị iche iche, bụ́ ndị na-atụ anya ịhụ ka ihe ọjọọ ụfọdụ dakwasịrị ezinụlọ Ratnam. Otú ọ dị, mgbe Ignasiamal chọpụtara nke a, nanị ihe o mere bụ na ya na ụmụ ya wepụrụ mkpụrụ osisi ndị ahụ n’atụghị ụjọ ma ọ bụ maa jijiji—ọ dịghịkwa ihe ọjọọ ọ bụla mere ha. Omume atụghị ụjọ ha ghọrọ nnọọ àmà dị ukwuu n’ógbè ahụ, na-eme ka ndị mmadụ na-enye ha oké nkwanye ùgwù. Stella nwere ike ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi abụọ n’ezinụlọ ndị dịdewere ha. N’ịbụ onye nke a gbara ume, nwunye nwa ya nakwerekwaara ọmụmụ Bible.
N’ileghachi anya azụ n’ọtụtụ ngọzi ndị bịawooro ezinụlọ ya, Ignasiamal na-ekwu, sị: “Obi dị m ụtọ nke ukwuu ịhụ uto ime mmụọ n’ime ezinụlọ anyị. Jehova agọziwo anyị n’ihi na mmegide ebelatawo, ịdị n’otu ezinụlọ anyị ebuwokwa ibu karị.”
Lee aha ngọzi ezinụlọ ndị a buru ibu bụworo. Ha esonyerewo ezinụlọ ndị ka nta, ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna, na ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ndị na-agbalịsi ike ime ka mkpọsa nke ozi ọma Alaeze ahụ “n’ala ahụ na-egbukepụ egbukepụ” nke bụ ihe aha ahụ, bụ́ Sri Lanka, pụtara gaa ngwa ngwa. N’isonyere ndị Kraịst ibe ha n’ụwa nile, Ndịàmà nọ na Sri Lanka na-elepụ anya n’ihu ná mweghachi nke Paradaịs, bụ́ nke pụrụ ịgbata anyị n’uche ọbụna ugbu a ka anyị na-ahụ ụsọ osimiri na ugwu ndị dị na Sri Lanka mara mma.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A na-akọ na nnukwu okokoro dị n’ebe ahụ bụ ebe Adam, Buddha, Siva, na “Saint” Thomas zọrọ ụkwụ n’otu n’otu, n’akụkọ mgbe ochie nke ndị Alakụba, ndị Buddha, ndị Hindu, na nke chọọchị.
[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]
Ọtụtụ ndị nọ na Sri Lanka na-aṅa ntị ná nkwusa na izi ihe nke ndị Kraịst