Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 6/15 p. 24-27
  • Ịrịgo Ugwu Dị Elu Karịa Usoro Ugwu nke Himalaya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịrịgo Ugwu Dị Elu Karịa Usoro Ugwu nke Himalaya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Nepal—Alaeze nke Ugwu
  • Mmalite Ndị Dị Nta
  • Mgbasapụ n’Agbanyeghị Ihe Isi Ike
  • Nepal Taa
  • Rịa Elu Karịa Usoro Ugwu nke Himalaya
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 6/15 p. 24-27

Ịrịgo Ugwu Dị Elu Karịa Usoro Ugwu nke Himalaya

USORO Ugwu nke Himalaya! Gịnị ka okwu ndị ahụ na-agbakọ n’uche gị? Ọ̀ bụ ugwu ndị dị ebube, ndị elu ha jupụtara na ice ma na-enwe ikuku na-efesi ike? Ọ̀ bụ obi ụtọ nke mmeri, na-eguzo n’elu ugwu kasị elu n’ụwa? Nye ihe ka ọtụtụ n’ime anyị, ịrị Ugwu Everest, nke so n’usoro Ugwu nke Himalaya dị n’ime Nepal, ga-abụ ihe na-agaghị ekwe omume. Ma, taa ọtụtụ ndị nọ na Nepal na-arị ugwu nke ka usoro Ugwu nke Himalaya elu! Tupu anyị achọpụta banyere njem nke a a gara n’ugwu ahụ dị ebube, ka anyị leba anya n’Alaeze nke Nepal mara mma ma dị ntakịrị.

Nepal—Alaeze nke Ugwu

Alaeze nke Nepal pụrụ iche n’ihi na ọ bụ otu n’ime ole na ole fọdụrụ n’ime alaeze ndị onyeeze na-achị n’ime ụwa nakwa n’ihi na ọ bụ alaeze okpukpe, ọ bụghị nke nkịtị. Nepal bụ nanị mba Hindu e nwere n’ụwa. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke 20 nde ndị bi na ya bụcha ndị Hindu. Otú ọ dị, e nwere ọdịiche dị ukwuu n’ebe agbụrụ nile nke ndị ya si malite. Ndị bi n’akụkụ ebe ugwu nke nwere ugwu dị iche iche bụ n’ụzọ bụ isi ndị sitere Tibeto-Burman, ebe ọ bụ na n’ala dị larịị nke ndịda, ndị nọ ebe ahụ bụkarị ndị sitere Indo-Aryan. Nepali bụ asụsụ bụ isi nke mba ahụ nakwa asụsụ e ji mụọ ihe dị ka 60 pasent nke ndị ya. Ihe fọdụrụ na-asụ ihe karịrị 18 asụsụ agbụrụ dị iche iche.

Nepal dịtụ nkuku anọ n’ọdịdị, 880 kilomita site n’ọwụwa anyanwụ gaa n’ọdịda anyanwụ nakwa 200 kilomita site n’ebe ugwu gaa n’ebe ndịda. Usoro Ugwu nke Himalaya ahụ na-atụ egwu, bụ́ nke ghọrọ ókèala nke ebe ugwu, gụnyere Ugwu Everest, ugwu kasị ogo n’ụwa nke dị 8,848 mita, na ebe asatọ ọzọ dị ogo karịrị 8,000 mita. N’ebe etiti Nepal e nwere ugwu ndị dị ala karị na ọdọ mmiri na ndagwurugwu dị iche iche. Ịgakwu n’ihu n’ebe ndịda, n’ókèala ha na India, e nwere Tarai na-eme nri, ógbè bụ isi nke ọrụ ubi.

Isi obodo ha, bụ́ Kathmandu, nke dị n’ógbè ebe etiti, bụ n’ezie ebe mara mma nye onye na-abịa njem nlegharị anya. Ọ na-enye mmadụ ohere ifegharị ụgbọ elu n’elu usoro ugwu ndị ahụ dị ebube, ime njem gaa n’ogige ebe anụ ọhịa nọ, na ọtụtụ ebe a na-elegharị anya n’ógbè ahụ. A na-akpọ Nepal mgbe ụfọdụ ndagwurugwu nke chi dị iche iche n’ihi na okpukpe na-ekere òkè dị ukwuu ná ndụ nke ndị ya. Okpukpe bụkwa ihe mere ọtụtụ nde gburugburu ụwa ji na-eje ‘n’ugwu’ ahụ dị elu karịa usoro Ugwu nke Himalaya.

Ihe dị ka 2,700 afọ gara aga, e nyere onye amụma Hibru bụ́ Aịsaịa ike ibu amụma na “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ya elu karịa ugwu nta nile . . . Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova . . . Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.” (Aịsaịa 2:2, 3) N’ebe a ofufe dị ọcha e buliri elu nke Jehova, bụ́ Onye Okike na Ọkaaka Onye Ọchịchị nke eluigwe na ala, bụ ihe e ji tụnyere ugwu, nke e buliri elu karịa ụdị ofufe ndị ọzọ yiri ugwu. Ọ bụ isiokwu nke ọrụ nkụzi zuru ụwa ọnụ nke na-enyere ndị agụụ eziokwu na-agụ aka ịmụta banyere ụzọ nile nke Jehova. Olee otú e si malite ọrụ a na Nepal?

Mmalite Ndị Dị Nta

Onye soja nke Ndị Agha Britain n’Agha Ụwa nke Abụọ nọ na-achọ ezi okpukpe. Ndị mụrụ ya bụ́ ndị amaala Nepal na-ekpe okpukpe Hindu abụrụwo ndị a tọghatara n’okpukpe Katọlik. Ka o tolitere, ọ hụrụ ihe nzuzu nke ikpere arụsị, jụ ozizi ndị dị ka ozizi ọkụ ala mmụọ wee malite inyocha nkwenkwe nke chọọchị Protestant dị iche iche. Ma o nweghị afọ ojuju.

Mgbe ndị Japan tụrụ ya mkpọrọ n’ebe a na-akpọ mgbe ahụ Rangoon, Burma, onye soja a kpere ekpere ka o nwee ike ịlanarị ndọlị nile nke ogige a na-amanye mmadụ ịrụ ọrụ iji gaa n’ihu n’ọchịchọ ọ na-achọ ezi ofufe. E mesịa, ọ gbalịrị gbapụ n’aka ndị jichiri ya, onye nkụzi ụlọ akwụkwọ nyekwaara ya aka bụ́ onye ọ hụrụ akwụkwọ nta bụ́ Where Are the Dead?, nke J. F. Rutherford dere, n’ụlọ ya. N’ịghọta eziokwu dị n’ime ya, o ji ịnụ ọkụ n’obi kwere ịmụ ihe mgbe Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ya na Rangoon na 1947. N’ime ọnwa ole na ole, e mere ya baptism, nwunye ya bụ nwa agbọghọ sochiri ya azụ n’oge na-adịghị anya. Ha kpebiri ịlaghachi India, biri na Kalimpong a mụrụ ha, n’ugwu dị iche iche nke ebe ugwu ọwụwa anyanwụ. N’ebe a ka a mụrụ ụmụ ha abụọ, kụziekwara ha ihe. Na March 1970, ha kwagara Kathmandu.

Ụkpụrụ Iwu nke Nepal machibidoro ịtọghata mmadụ. Onye ọ bụla a hụrụ na-akpọsa ihe a kpọrọ okpukpe mba ọzọ kwesịrị mkpọrọ afọ asaa, a pụkwara ịma onye sonyeere okpukpe dị otú ahụ ikpe ịga ngá afọ atọ tinyere ịkwụ nhá gbara ọkpụrụkpụ. Ya mere a ghaghị iji oké mkpachapụ anya na-agba àmà. Ozi ụlọ n’ụlọ pụtara ịkpọtụ n’otu ebe obibi, gazie n’akụkụ ebe ọzọ ma kpọtụrụ mmadụ ebe ahụ. N’ụzọ a pụrụ ịghọta, ịgba àmà mberede keere òkè bụ́ isi n’ịgbasa ozi ọma ahụ.

Ọganihu na-arị nnọọ arị. N’inwe ihe dị ka nde mmadụ iri bi n’ime ya, ubi ahụ yiri ihe na-akụda mmụọ. A na-akụ mkpụrụ nke eziokwu ka otu ezinụlọ a na-agbara ndị enyi, ndị ha ma ama, ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ, na ndị ọrụ ibe ha àmà. Ha na-enwe nzukọ n’ebe obibi ha mgbe mgbe ma na-akpọ ndị nwere mmasị òkù isonyere ha. N’ikpeazụ, na March 1974, mgbe afọ anọ nke ịnọgide na-agha mkpụrụ na ịkwọsa mmiri gasịrị, mkpụrụ mbụ sitere Nepal bịara—nke ahụ bụkwa site n’ebe a na-atụghị anya ya!

Mgbe ọ na-eleta otu ebe obibi, onye nkwusa ahụ gwara otu nwoke aka ji akụ̀ bụ́ onye odeakwụkwọ nke otu onye òtù nke ezinụlọ ndị eze okwu. “Gwa nwa m nwoke okwu,” ka nwoke ahụ kwuru. Nwa ya nwoke kwetara ịmụ Bible. Mgbe oge na-aga, ọ gbanwere ebe ọ na-arụ ọrụ, ebe ọ bụ na ọ rụwo ọrụ n’ebe a na-agba chaa chaa. Nna ya, onye ji okpukpe Hindu kpọrọ ihe, megidere ya. Ma, nwa okorobịa nke a weere nguzo ya maka Jehova. Gịnị si na nke a pụta? Nna ya mesịrị kwụsị imegide ya, ìgwè ndị ikwu ya nọ ya nso nakwerekwaara eziokwu Bible. Ọ na-eje ozi dị ka onye okenye nke ọgbakọ ndị Kraịst ugbu a.

Iji nọgide na-agbasi ike n’ime mmụọ na ịṅa ntị n’iwu Akwụkwọ Nsọ ịghara ịhapụ nzukọ nke onwe ha, ìgwè nta ahụ nọ na Kathmandu nwechiri nzukọ dị iche iche anya n’ebe obibi mmadụ. Ma ruo n’ókè dị ukwuu, ụmụnna ahụ enweghị ike ịga mgbakọ ndị buru ibu karị. Ndị pụrụ ịga India maka mgbakọ dị iche iche mere otú ahụ—njem tere anya ma dị oké ọnụ gafere usoro ugwu ndị ahụ.

Lee oge ọṅụ ọ bụ mgbe e mere usoro ihe omume nile nke mgbakọ distrikti n’ebe obibi ha na-enwe nzukọ! Cheedị echiche ụmụnna anọ, tinyere onye òtù nke alaka nke India, ime usoro ihe omume ahụ nile! E mere ọbụna ihe nkiri ahụ dabeere na Bible. N’ụzọ dị aṅaa? E sewo foto slide mgbe e ji ihe nile kwesịrị ekwesị mụgharịa ihe nkiri ahụ n’India. Na Nepal, e gosiri slide ndị a n’elu ihe dị mbadamba, ka a nọ na-akpọ mkparịta ụka ndị a gụnyere na kaseti. Ndị na-ege ntị nwere mmasị na ya. Ruo ókè ha aṅaa ka ndị ahụ na-ege ntị dịruru ukwuu? Mmadụ 18!

Enyemaka sitere ná mba ndị ọzọ n’ọrụ nkwusa ahụ dị ntakịrị. Ọrụ ozi ala ọzọ ekweghị omume, ọ dịghịkwara ndị ala ọzọ mfe inweta ọrụ ego. Otú ọ dị, ndị India abụọ bụ́ Ndịàmà nwetara ọrụ na Nepal n’oge ndị dịgasi iche, na-anọ ọtụtụ afọ na Kathmandu, na-enyekwa aka iwulite ọgbakọ ahụ e guzobere ọhụrụ. Ka ọ na-erule 1976 e nwere ndị nkwusa Alaeze 17 na Kathmandu. Na 1985 ụmụnna ahụ wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze nke onwe ha. Mgbe e wusịrị ya, a malitere ịdị na-enwe mgbakọ distrikti a na-eme kwa afọ, nakwa mgbakọ ndị ọzọ n’ebe ahụ mgbe mgbe. Ụlọ nzukọ ahụ n’ezie bụ ebe bụ isi nke ofufe dị ọcha n’ókèala ahụ dịpụrụ adịpụ, nke ugwu jupụtara.

Mgbasapụ n’Agbanyeghị Ihe Isi Ike

N’afọ ndị mbụ ahụ, ọrụ nkwusa ahụ, nke e ji oké mkpachapụ anya na-eme, adọrọbeghị uche ndị ọchịchị. Otú ọ dị, ka ọ na-eru ná ngwụsị nke 1984, a malitere itinye ihe mgbochi dị iche iche. E jidere otu nwanna nwoke na ụmụnna nwanyị atọ ma jichie ha ruo ụbọchị anọ tupu a tọhapụ ha, na-adọ ha aka ná ntị ịghara ịga n’ihu n’ọrụ ha. N’otu ime obodo, e jidere mmadụ itoolu mgbe ha na-enwe ọmụmụ Bible n’ebe obibi ha. A tụrụ mmadụ isii mkpọrọ ruo 43 ụbọchị. Ọtụtụ njide ndị ọzọ werekwaara ọnọdụ, ma ọ dịghị akwụkwọ ọ bụla a gbara n’ụlọikpe.

Na 1989 ka gara aga, e jidere ụmụnna nwoke na nwanyị nile nọ n’otu Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, kpọchie ha ụbọchị atọ, ma tọhapụ ha. Mgbe ụfọdụ, a na-agwa ha ka ha bịanye aka n’okwu na-asị na ha agaghị eme nkwusa. Ha jụrụ. A tọhapụrụ ụfọdụ nanị mgbe ha bịanyere aka n’okwu na-asị na ha ga-adị njikere iche ihe ndị ga-esi na ya pụta ihu ma ọ bụrụ na e jide ha ka ha na-eme nkwusa ọzọ.

N’agbanyeghị ihe isi ike ndị dị otú ahụ, ụmụnna ndị ahụ gara n’ihu n’ikwusa ozi ọma Alaeze n’ịnụ ọkụ n’obi. Dị ka ihe atụ, na 1985, afọ ahụ mgbe ntinye aka nke gọọmenti malitesịrị, e nwere ịrị elu 21 pasent n’ọnụ ọgụgụ ndị na-eme nkwusa. Ndị nkwusa 35 ahụ tinyere nkezi nke hour 20 kwa ọnwa n’ịgwa ndị ọzọ okwu banyere ofufe dị ọcha.

Ka oge na-aga, ikuku nke mgbanwe ndọrọ ndọro ọchịchị malitere iku na Nepal. Ndị ọchịchị gọọmenti malitere ịghọta na Ndịàmà Jehova abụghị ndị na-eyi egwu. N’ezie, ọrụ nkụzi Bible ha nwere mmetụta ọma, nke na-ewuli elu n’ebe ndị ahụ nọ, na-eme ha ndị amaala ka mma. Ndị ọchịchị hụrụ na ịkwụwa aka ọtọ, ịrụsi ọrụ ike, na akparamàgwà ziri ezi bụ nke e mesiri ike dị ka ihe bụ isi a chọrọ maka ndị na-efe Jehova ofufe.

A gbara ezi àmà mgbe otu nwanyị bụbu onye ji okpukpe Hindu kpọrọ ihe ghọrọ Onyeàmà ma jụ ịnara mmịnye ọbara. Nguzo ya kwụ chịm, nke si n’ezi ihe ọmụma juru ndị dọkịta anya. E ji broshuọ bụ́ Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! nyere nwanyị a aka ịmụta eziokwu. N’agbanyeghị mmegide na ime akaja ndị sitere n’ezinụlọ ya, e mere ya baptism na 1990 ka ọ na-eru nso 70 afọ. Ka oge na-aga ọ gbajiri ụkwụ ma, tinyere nsogbu ndị ọzọ ọ na-ata ahụhụ ha, ọ ghaghị iche ịwa ahụ siri ike ihu. Ruo izu abụọ o guzogidere nrụgide sitere n’aka ndị dọkịta na ndị ikwu ịnara ọbara. N’ikpeazụ, òtù ndị dọkịta ahụ na-awa ahụ wara ya ahụ n’ejighị ọbara. Ọ bụ ezie na a kpaara ịga ije ya ókè ugbu a, nwanna nwanyị a na-ekwesị ntụkwasị obi na-anọdụ n’ọnụ ụzọ ámá ya kwa ụtụtụ ma na-akpọ ndị na-agafenụ òkù isoro ya nọdụ ma nụrụ ụfọdụ ozi ọma ndị na-eme obi ụtọ.

Nepal Taa

Gịnị ka ọ dị ka ya na Nepal taa? Ndịàmà Jehova nwere ókè dị ukwuu nke nnwere onwe ife ofufe dị ka ụmụnna ha na-eme n’ụwa nile. Site n’oge otu ma ọ bụ ndị njem abụọ ihe atụ ahụ malitere isonyere ndị na-arị ugwu nke ezi ofufe, ọnụ ọgụgụ na-aba ụba nke ndị mmadụ asịwo, ‘Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova.’ Ka ọ na-erule 1989 e nwere nkezi nke 43 ndị na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ kwa ọnwa, 204 bịakwara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst n’afọ ahụ.

Mgbe ahụ, dị ka e kwere ná nkwa, Jehova malitere ime ka nchịkọbata nke ndị na-achọ eziokwu n’ụlọ ya gaa ngwa ngwa. (Aịsaịa 60:22) Ọ dịbeghị anya e guzobere ọgbakọ nke abụọ na Kathmandu, e nwekwara ugbu a ìgwè abụọ ndị dịpụrụ adịpụ ná mpụga isi obodo ahụ. N’April 1994, e nwere 153 ndị Kraịst nyere akụkọ ọrụ nkwusa ha—ịrị elu nke 350 pasent n’ihe na-erughị afọ ise! Ha duziiri ndị nwere mmasị 386 ọmụmụ Bible ebe obibi. N’Ememe Ncheta na 1994, e nwere ọnụ ọgụgụ na-akpali akpali nke 580. Maka ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, 635 mmadụ jupụtara n’ụlọ nzukọ ahụ, 20 nyekwara onwe ha maka baptism. Ya mere mmụba dị ukwu nke Ndịàmà Jehova na-enwe n’ụwa nile na-ewerekwa ọnọdụ na Nepal dị oké nta.

N’afọ ndị na-adịbeghị anya ọnụ ọgụgụ nke akwụkwọ a na-ebipụta n’asụsụ Nepali amụbawo nke ukwuu, na-enyere ndị dị umeala n’obi aka ijidesi eziokwu ahụ aka ike. Ndị nsụgharị a zụrụ n’alaka ụlọ ọrụ India na nkà nsụgharị na ụzọ e si eji ígwè kọmputa eme ihe na-eje ozi oge nile ugbu a na Kathmandu. Ịbụ ndị e jikeere maka mgbasapụ, ndị na-arị elu ugwu n’ụzọ ọchịchị Chineke na Nepal na-aga n’ihu!

Rịa Elu Karịa Usoro Ugwu nke Himalaya

Gị onwe gị pụkwara ịnụ ụtọ nke ije n’elu ugwu nke dị elu karịa usoro Ugwu nke Himalaya. Mgbe ị na-eme nke ahụ, ị ga na-esonyere ọ bụghị nanị ndị sitere Nepal kama ọtụtụ nde “ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile.” (Mkpughe 7:9) Ọ bụrụ na i sonyere ha, ị ga-abụ onye Onye Okike nke ugwu ndị dị ebube dị ka ndị ahụ dị na Nepal na-ezi ihe. Ị ga-ahụ ka Onye Okike ‘ga-edozi okwu,’ ị ga-elepụkwa anya ibi ruo ebighị ebi n’ụwa mara mma nke e mere ka ọ dị ọcha.—Aịsaịa 2:4.

[Map dị na peeji 24]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Kathmandu

Ugwu Everest

[Foto dị na peeji nke 25]

N’èzí nke Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Kathmandu

[Foto dị na peeji nke 26]

Ọtụtụ ndị Nepal na-erite uru site n’ọmụmụ Bible

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya