Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 5/15 p. 8-9
  • Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Sweden

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Sweden
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Uto Na-achọ Iwu Ihe
  • Ịgbara Na-aga n’Ụwa Ọhụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ịrụ Ụlọ Ndị E Ji Na-eto Jehova
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Mmụba Dị Ịrịba Ama Emee Ka Iwusawanye Ihe Ngwa Ngwa Dị Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Gịnị Mere Anyị Ji Arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze? Oleekwa Otú E Si Enweta Ego E Ji Arụ Ha?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 5/15 p. 8-9

Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Sweden

SWEDEN dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke ala Scandinavia fọrọ nke nta ka mmiri gbaa ya gburugburu ma gbatịrị gafere Okirikiri Arctic. N’ịbụ nke a mazuru gburugburu ụwa n’ihi ala ọhịa ndị jupụtara n’akwụkwọ ndụ tinyere ọdọ mmiri na ugwu Sweden bụ otu n’ime mba ndị na-ejubigaghị ókè na mmadụ na Europe. Ka o sina dị, Ndịàmà Jehova enwewo ihe ịga nke ọma n’ịchọta ndị hụrụ eziokwu n’anya n’ebe ahụ eri afọ ndị ikpeazụ nke 1800. Tụlee ihe atụ na-adịbeghị anya.

Otu nwanyị sooro Ndịàmà Jehova mụọ Bible, ma di ya enweghị mmasị na nke a. Ọ gwara nwunye ya ka ọ kwụsị ịmụ ihe, ọ kwụsịkwara. Nwoke a rụrụ ọrụ n’otu ụlọ nkwakọba nke ihe ndị e ji emepụta mmanya. Otu ụbọchị otu onye ọkwọ ụgbọ ala gwongworo bịara n’ụlọ nkwakọba ihe ahụ ya na nwa nwa ya dị afọ iri. Nna ochie ahụ gwara nwoke ahụ ka o lekọtara ya nwatakịrị nwoke ahụ ka ọ na-akwanye ngwongwo na gwongworo ya. Maka mkparịta ụka, nwoke ahụ jụrụ nwatakịrị ahụ onyinye ndị ọ natara maka ụbọchị ọmụmụ ya na nso nso a. Dị ka ihe ijuanya nye nwoke ahụ, nwatakịrị ahụ gwara ya na ya na ezinụlọ ya adịghị eme ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ n’ihi na ha bụ Ndịàmà Jehova. Nwatakịrị ahụ gwakwara ya na ya na-enweta onyinye n’oge ndị ọzọ n’afọ, na ọ dịghị ihe na-efunarị ya, ebe o nwere ezinụlọ na-ekpo nnọọ ọkụ ma na-ahụ n’anya. Ọ dịghị onyinye ndị ruru ka nke ahụ, ka ọ gbakwụnyere.

Nwatakịrị ahụ na nna ya ochie laghachitere ọtụtụ mgbe. Oge nke ọ bụla, nwoke ahụ ga-ajụ nwatakịrị ahụ ọtụtụ ajụjụ, ụzọ nwatakịrị ahụ si enye azịza ndị bụ eziokwu, kwụ ọtọ n’egbughị oge ọ bụla tụrụ ya n’anya nke ukwuu. A kpalikwara ya site n’ihe dị iche iche nwatakịrị ahụ ji kpọrọ ihe n’ezie. N’otu abalị ka nwoke ahụ kirisịrị otu ihe omume telivishọn nke gosiri ọnọdụ ọjọọ ndị dị n’ụwa, ọ chọpụtara na ya aghaghị inyocha ihe ime mmụọ n’ụzọ siri ike. Ọ kpọrọ Onyeàmà ahụ na-amụburu nwunye ya ihe na fon ma gwa ya ka ọ bịaghachi. N’oge na-adịghị anya otu Onyeàmà maliteere nwoke ahụ ọmụmụ ihe, o nwekwara ọganihu dị ngwa. E mere ya baptism n’April 10, 1994. Ugbu a e mewokwa nwunye ya baptism n’otu aka ahụ.

Uto Na-achọ Iwu Ihe

Sweden bụ ebe obibi nke ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ sitere n’ala ndị ọzọ, ndị Sweden bụ́ Ndịàmà arụpụtawokwa ihe dị mma n’ikwusara ha ozi ọma. N’ozuzu, ọrụ ahụ enwewo ihe ịga nke ọma dị ukwuu nke na Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ adịwo mkpa iji nabata mgbasawanye ahụ. Malite na 1986 ruo 1993, e wuwo Ụlọ Nzukọ Alaeze 37 site n’usoro iwu ihe owuwu ọsọ ọsọ, ebe e wusawanyeworo ma rụzigharịakwa ụlọ nzukọ 8. Na 1994 nanị, e wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze asaa ndị ọzọ, a rụzigharịwokwa atọ.

Ka ọ dị ugbu a, e nwere 65 ọgbakọ na-echere maka enyemaka iji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ma ọ bụ iji wusawanye ma ọ bụ rụzigharịa nke ha ka nwere. Ihe dị ka 2,500 ndị ọrụ afọ ofufo na-enye aka n’ọrụ ihe owuwu ndị dị otú ahụ, ọgbakọ ndị ahụ na-enwekwa obi ekele dị ukwuu maka enyemaka ịhụnanya ha.

Akụkụ ebe ugwu nke Sweden, bụ nke gbatịịrị gabiga Okirikiri Arctic, bụ nke a na-akpọ mgbe ụfọdụ ala nke anyanwụ ime abalị. Nke a dị otú ahụ n’ihi na n’akụkụ ụfọdụ nke oge okpomọkụ anyanwụ adịghị ada ada n’ebe ahụ. Otú ọ dị, gburugburu Sweden dum, ìhè nke eziokwu ahụ nọgidekwara na-egbukepụ egbukepụ. Site ná ngọzi Jehova, ìhè ime mmụọ ahụ agaghị adị inyoghị inyoghị mgbe ọ bụla kama ọ ga-aga n’ihu na-egbukepụkwa egbukepụ.

[Igbe dị na peeji nke 8]

IHE ỌMỤMA BANYERE MBA AHỤ

Afọ Ije Ozi 1994

ỌNỤ ỌGỤGỤ KASỊ ELU NA-AGBA ÀMÀ: 24,246

NKEZI: 1 Onyeàmà maka 362

ỌNỤ ỌGỤGỤ NDỊ BỊARA EMEME NCHETA: 40,372

NKEZI NDỊ NKWUSA BỤ́ NDỊ ỌSỤ ỤZỌ: 2,509

NKEZI ỌMỤMỤ BIBLE: 11,306

ỌNỤ ỌGỤGỤ NDỊ E MERE BAPTISM: 850

ỌNỤ ỌGỤGỤ ỌGBAKỌ: 358

ALAKA ỤLỌ ỌRỤ: ARBOGA

[Foto dị na peeji nke 9]

Alaka ụlọ ọrụ na Ebe Obibi Betel n’Arboga

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndịàmà oge mbụ na Hjo jiri obere bọs nke a jezuo ókèala dị ihe dị ka 5,000 square kilomita

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya