Ọ̀ Bụ Nnwale Ahụ Ike Dịịrị Gị?
Watch Tower Society adịghị agwa ndị mmadụ n’otu n’otu ihe ha ga-eme ma ọ bụ emere ha mkpebi n’ihe banyere usoro ọgwụ na nke ịchọpụta ọrịa. Otú ọ dị, ọ bụrụ na usoro ụfọdụ nwere akụkụ ndị a na-enyo enyo dabere n’ụkpụrụ dị iche iche nke Bible, a pụrụ ilebara ndị a anya. Onye ọ bụla nweziri ike ịtụle ihe ndị ọ gụnyere ma kpebie ihe ọ ga-eme.
Ezi Ụmụnna M: Ọ ga-amasị m ịmata ihe bụ echiche unu. Otu [onye na-agwọ ọrịa] yiri ka ọ na-enwe ezi ihe ịga nke ọma, ma otu usoro ọ na-eji eme ihe na-eme ka m na-enyo ya enyo. . . . Site n’ime nchọpụta ọ na-ekpebi ihe bụ nsogbu. Ijizi chọpụta ụdị ọgwụ na ókè a ga-eji mee ihe, ọ na-atụkwasị olu karama ọgwụ ahụ n’akpụkpọ ahụ dịdewere akụkụ ahụ na-emepụta mmiri ahụ dị iche iche ma ọ bụ akụkụ ahụ ndị bụ isi. Ọ na-agbalị ịdọdata ogwe aka nke onye ọrịa ahụ weliri elu. Ihe ga-ekpebi ụdị ọgwụ ma ọ bụ ókè ọ ga-enye bụ otú ike o ji dọtuo ogwe aka ahụ e weliri elu haruru. Ihe a na-ekwu bụ na “electron” na-aga dị ka ike eletrik site na ihe nkwụchi ígwè nke karama ahụ gaa n’otu akụkụ ahụ, na-eme ya ka o sie ike. Nke a ò yiri iji mkpara achọpụta mmiri?
AKWỤKWỌ ozi nke a sitere Oregon, U.S.A., bụ banyere otu usoro nke ụfọdụ na-eji ekpebi ihe na-edozi ahụ ndị a chọrọ, tụọ okwu ndị metụtara nrụgide nke mmetụta uche n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, nwalee ike ncheta ihe, ma zaa ajụjụ dị iche iche banyere ndụ a na-adị kwa ụbọchị. N’agbanyeghị otú usoro ahụ gbasaruru, ọ̀ dị ezi ihe kpatara obi abụọ nke onye dere akwụkwọ ozi ahụ?
Ahụ Ike—Ruo n’Ókè Há Aṅaa?
Kemgbe oge ochie, ndị mmadụ agbalịwo ịghọta ihe mere ha ji na-arịa ọrịa na ụzọ isi gbakee. Ndị Israel nọ n’ọnọdụ ka mma n’ihi na ha maara na ha bụ ndị mmehie, ha nwekwara iwu ndị sitere n’aka Chineke bụ́ ndị nyeere ha aka izere ibute ma ọ bụ ịgbasa ọtụtụ ọrịa. (Levitikọs 5:2; 11:39, 40; 13:1-4; 15:4-12; Deuterọnọmi 23:12-14) Ma, ndị Chineke ka chọkwara enyemaka site n’aka ndị dibịa ruru eru n’oge ha.—Aịsaịa 1:6; 38:21; Mak 2:17; 5:25, 26; Luk 10:34; Ndị Kọlọsi 4:14.
Lee ka nke a si dị iche n’ebe ndị nọ na Babilọn na Ijipt oge ochie nọ! “Ndị dọkịta” ha nwere ọgwụ ụfọdụ ndị e ji ihe okike dị iche iche mee, ma ugbu a a ga-akpọ ọtụtụ n’ime “ọgwụgwọ” ha adịgboroja. Ihe odide mkpọ́ nke ndị Ijipt na-ekwu banyere onye dibịa nke ji ngwakọta na-esi isi ọjọọ nke anya ézì, antimony, ájá na-acha ọbara ọbara, na mmanụ aṅụ wee na-agwọ ikpu ìsì. A na-awụnye ngwakọta nke a n’ime ntị nke onye na-arịa ọrịa! Ihe odide oge ochie na-azọrọ na ọgwụgwọ nke a “magburu onwe ya n’ezie.” Ịdị mgbagwoju anya ya ma ọ bụ ịbụ ihe omimi ya pụrụ ọbụna ịkwaliteworị mmasị e nwere na ya.
Ndị Babilọn na ndị Ijipt na-akpọkukarị ike anwansị.a Onye dibịa/onye nchụàjà pụrụ ịgwa onye ọrịa ka o kunye ume n’oghere imi atụrụ, na-ekwere na ikike ụfọdụ, ma ọ bụ ume, pụrụ isite n’ahụ onye ọrịa ahụ gafere n’ihe ọzọ e kere eke ma rụpụta ihe. A na-egbu atụrụ ahụ, dịkwa ka e chere, imeju ya pụrụ ikpughe ihe na-arịa onye ọrịa ahụ ma ọ bụ ọdịnihu ya.—Aịsaịa 47:1, 9-13; Ezikiel 21:21.
N’ezie, onye dibịa nke na-atụ egwu Chineke n’Israel oge ochie agaraghị eji usoro mgbaasị mee ihe. Chineke ji amamihe nye iwu, sị: “A gaghị ahụta n’etiti gị . . . onye na-ajụ ase, ma ọ bụ onye na-eji igwe ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ, ma ọ bụ onye na-agba afa, ma ọ bụ onye mgbaasị . . . N’ihi na ihe arụ nke Jehova ka onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ.” (Deuterọnọmi 18:10-12; Levitikọs 19:26; 20:27) Ọ bụkwa otu ihe ahụ taa n’ebe ndị ohu Chineke bụ ndị Kraịst nọ. N’ezie o kwesịrị ekwesị ịkpachara anya.
N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ mmadụ echigharịkwuruwo usoro nchọpụta ọrịa na ọgwụgwọ “ndị ọzọ.” Nke a bụ n’ụzọ bụ isi ebe mmadụ ga-emere onwe ya mkpebi. (Matiu 7:1; tụlee Ndị Rom 14:3, 4.) N’ezie, ọ gaje ịbụ ihe mwute ma ọ bụrụ na onye Kraịst ọ bụla etinyebiga uche ókè n’okwu ahụ ike ndị na-akpata ịrụ ụka ruo n’ókè nke na ndị a kpuchiri ozi ahụ, nke bụ nanị ụzọ e ji n’aka isi azọpụta ndụ. (1 Timoti 4:16) Bible adịghị ekwu na a ga-agwọta ọrịa ma nweta ahụ ike zuru okè n’ime ụwa ọhụrụ ahụ site n’iji ọgwụ eme ihe, mkpá akwụkwọ, ihe oriri, ma ọ bụ usoro ịgwọ uche na ahụ. N’ezie, a ga-enweta mgbake zuru ezu nanị site ná mgbaghara mmehie dabere n’àjà mgbapụta nke Jisọs.—Aịsaịa 33:24; Mkpughe 22:1, 2.
Olee Ikike Ndị O Metụtara?
Gịnị ka onye Kraịst pụrụ ịchọ ịtụle n’ime mkpebi nke onwe ya banyere usoro nnwale uru ahụ nke e hotara n’akwụkwọ ozi ahụ e ji meghee?
Usoro ụfọdụ nke ịnwale ịdị ike ma ọ bụ nzaghachi nke uru ahụ bụ akụkụ nke ọgwụ ndị a nabatara, ọ bụkwa mmadụ ole na ole ga-arụ ụka banyere izi ezi ha. Dị ka ihe atụ, ọrịa poliomyelitis pụrụ ime ka uru ahụ ghara isi ike, usoro ọgwụgwọ maka nke a pụkwara ịgụnye ihe a na-akpọ kinesiology—“ihe ọmụmụ nke uru ahụ na mmegharị nke uru ahụ.” A na-ejikwa ụdị kinesiology dị otú ahụ eme ihe n’usoro ọgwụgwọ nnwetaghachi onwe nke ndị na-arịa ọrịa ahụ mkpọnwụ. Ihe ka ná ndị mmadụ ga-aghọta ụdị ọgwụgwọ dị otú ahụ.
Ma gịnị banyere nnwale uru ahụ nke a kọwara na akwụkwọ ozi ahụ dị ná mmalite nke isiokwu a? E jiwo ụdị “kinesiology” dị otú a mee ihe ná mgbalị iji chọpụta ma ihe oriri ụfọdụ, mkpá akwụkwọ, ma ọ bụ vitamin, hà pụrụ inyere mmadụ aka ma ọ bụ imerụ ya ahụ. Dị ka a na-emekarị, onye ahụ na-agbatịpụ ogwe aka ya, onye dibịa na-abịadata ya iji chọpụta ike uru ahụ. E mesịa onye ahụ a na-ele ahụ na-akpụnye ihe na-edozi ahụ ma ọ bụ ihe ọzọ n’ime ọnụ ya, ma ọ bụ tụkwasị ya n’elu afọ ya, ma ọ bụ n’elu aka ya. Mgbe ahụ a na-anwalegharị uru ahụ nke aka. A na-azọrọ na ọ bụrụ na ihe ahụ na-edozi ahụ dị ya mkpa, ogwe aka ya ga-esi ike karị; ọ bụrụ na ọ dịghị mma nye ya, uru ahụ ga-adị nro karị.b
Ụfọdụ ndị nwaleworo nke a kwetara na ọ na-arụ ọrụ nakwa na mmetụta ya dabeere n’ike dị iche iche dị n’ime ahụ. Ha na-ekwu na e nwere ọtụtụ ihe nke nkà mmụta sayensị ọgbara ọhụrụ na-apụghị ịkọwa ma bụrụ nke na-eme eme ma ọ bụ nke a pụrụ ịhụ. Otú a ha na-azọrọ na a pụrụ inwe ọwara nke ike ma ọ bụ njikọ dị n’etiti ikike dị iche iche na ihe dị iche iche, ọbụna a sị na ndị dibịa achọpụtabeghị ma ọ bụ nakwere ndị a.
N’aka nke ọzọ, akwụkwọ bụ́ Applied Kinesiology na-ekwu, sị: “Mgbe ụfọdụ [akwụkwọ dị iche iche] na-akụzi na mmiri ọgwụ dị iche iche, dị ka ihe ndị na-edozi ahụ, bụ nke a na-atụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ site n’ijide ihe ahụ n’aka na ịnwale uru ahụ ahụ. E nweghị ihe àmà ọ bụla nke na-egosi na a pụrụ ịdabere n’ụdị nnwale a ma ọlị. . . . Echiche e nwere pụrụ isi nnọọ ike nke na ihe onye ahụ na-eme ya bubu n’obi pụrụ imetụta inweta ihe ọmụma ziri ezi n’usoro nnwale ahụ.” “Onye na-eme nnyocha nke nweworo ahụmahụ ná nnwale uru ahụ nke e ji ike ọkpụkpụ aka na-eme pụrụ ime ka uru ahụ nke onye a na-ele ahụ yie nke na-esighị ike ma ọ bụ nke siri ike n’ụzọ dị mfe n’uche ya site nanị n’ịgbanwetụ . . . nnwale ahụ.”
Kpachara Anya!
Otú ọ dị, ụfọdụ nnwale uru ahụ na-agafe nke a. Tụlee ihe a na-akpọ “nnwale nnọchianya.” A pụrụ ime nke a n’ihe banyere onye meworo agadi ma ọ bụ nwa ọhụrụ ike gwụrụ nke ukwuu nke na a pụghị ime ya nnwale. Ka onye nnọchianya na-emetụ nwa ọhụrụ ahụ aka, onye ahụ na-agwọ ọrịa na-anwale ogwe aka nke onye nnọchianya ahụ. E jiwo nke a mee ihe ọbụna n’ebe ụmụ anụ ụlọ nọ; a na-anwale ogwe aka nke onye nnọchianya ka ọ na-atụkwasị n’elu ahụ nkịta collie, German shepherd, ma ọ bụ anụ ụlọ ọzọ na-arịa ọrịa.
Ọ dịghịrị anyị ikpe omume ndị dị otú a ikpe, ma ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Ọ̀ bụ ikike dị iche iche nke ahụ na-akpata ihe ndị a na-eme?’ Ndị ọkà mmụta sayensị anwapụtawo ịdị adị nke ìhè mbara igwe, ụzarị, na ụdị ụzarị ọkụ dị iche iche. Ma, ihe nile e kere eke, ọbụna ụmụ ọhụrụ na anụ ụlọ, hà nwere n’ime ha ikike ndị pụrụ isi n’ime ha pụta ma nwee mmetụta ndị a pụrụ ịnwale anwale n’ahụ onye ọzọ? Ndị Babilọn chere na ikike dị iche iche pụrụ isi n’ime ahụ rubanye ma nwee mmetụta n’ahụ atụrụ. Ị pụrụ ịjụ onwe gị, sị, ‘Èkwere m na ihe yiri ya pụrụ ime ụmụ mmadụ ma ọ bụ anụmanụ taa? Ka mmetụta ndị ahụ hà pụrụ inwe nkọwa ọzọ?’
Ụfọdụ ndị na-agwọ ọrịa na-azọrọ iji ihe ndị dị ka ígwè a gbakụrụ agbakụ ma ọ bụ ihe ndị a kwụfenyere n’elu atụ “ikike” mmadụ nwere n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. A na-asị na ihe ndị a na-emegharị ahụ ka “ike mmetụta” nke onye ahụ na-agwọ ọrịa na nke onye ọrịa ahụ na-emetụta ibe ha. Otu onye na-agwọ ọrịa na onye edemede na-ede banyere ihe a, bụ́ onye bụbu onye ọkà mmụta sayensị na-eme nnyocha, na-eji ihe a kwụfenyere n’elu achọpụta ọrịa mgbe ụfọdụ. Ọ na-ekwukwa na ya pụrụ ịhụ “ike mmetụta nke mmadụ” ma ọ bụ ọcha nke ìhè nwere àgwà nke a sịrị na ọ na-agba ndị mmadụ gburugburu. Ọ na-azọrọ iji “ike ịhụ ihe ndị dị n’ime” elenye anya n’ime ahụ iji hụ akpụ, mkpụrụ ndụ nke ọbara, ma ọ bụ microbe, na ịhụ ihe ndị gara aga.c
Dị ka e buru ụzọ kwuo, e jiwo iji ịdị ogologo nke ogwe aka tụọ ikike n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ mee ihe iji nwalee mmetụta uche. Otu akwụkwọ e kesara n’ụzọ sara mbara kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ọ bụ ọchịchọ gị imekọta [n’ime ya] ntakịrị nnwale nke mmetụta uche n’otu mgbe ahụ, jụọ n’olu dara ụda, sị, ‘Ì nwere nsogbu?’ megharịakwa nnwale. Mgbe ụfọdụ nke a ga-eme ka ike gwụ ogwe aka ahụ ma ọ bụrụ na ihe ahụ na-edozi ahụ adịchaghị mma nye ya. Ụfọdụ na-eji nnwale dị otú ahụ eme ihe “iji chọpụta n’afọ ndụ mgbe otu nsogbu anụ ahụ, mmetụta uche ma ọ bụ nke ime mmụọ” weere ọnọdụ. E jikwa ya eme ihe iji mee mkpebi ‘ee ma ọ bụ ee e’ n’ihe omume kwa ụbọchị.
Ma eleghị anya, ọtụtụ ndị na-eme nnwale dị otú ahụ nke uru ahụ (kinesiology) ga-asị na usoro nke ha ji eme ihe dị iche na nke ahụ a ka kọwachara, na ọ dịghị mgbaasị dị na ya, ma ọ bụ na ha adịghị eme nnwale mmetụta uche ọ bụla. Ka o sina dị, ihe ha na-eme ọ̀ ka dabeere ná nkweta n’ikike ndị dị n’ime onye ọ bụla bụ mmadụ bụ́ ndị ọ bụ nanị mmadụ ụfọdụ ndị na-azọrọ na ha nwere ike ndị pụrụ iche pụrụ ịnwale ma ọ bụ hụ?
Ndị Kraịst adịghị ewere okwu ndị dị otú ahụ dị ka ihe ndị na-enweghị isi. Chineke dụrụ ndị Israel ọdụ, sị: “Ọnwa ọhụrụ na ụbọchị izu ike, ịkpọ mkpọkọta,—apụghị m ịnagide ajọ omume n’ụbọchị mgbochi.” (Aịsaịa 1:13) Mgbe mba ahụ ghọrọ nke si n’ezi ofufe dapụ, ha ‘na-ajụ ase na-agbakwa afa.’ (2 Ndị Eze 17:17; 2 Ihe Emere 33:1-6) Ọ pụtara ìhè na ha chọrọ ihe ọmụma site n’usoro ihe omume ndị pụrụ iche, ha wee kwuzie “ajọ ihe.”—Zekaraịa 10:2.
Ọ pụrụ ịbụ na e nweghị ihe dị njọ ná nnwale ụfọdụ nke uru ahụ, nke a na-eme n’emerụghị onye ọrịa ahụ ma ọ bụ onye ahụ na-agwọ ọrịa ahụ. Otú ọ dị, n’ụzọ doro anya, ụfọdụ pụrụ inwe ihe ndị dị njọ ma ọ bụ akụkụ ndị sitere n’ike karịrị ike mmadụ, dị ka ịhụ ihe dị n’ime, ọcha ìhè ndị dị omimi, na iji ihe ndị a kwụfenyere n’elu eme ihe. Ndị Kraịst agaghị eji ike ndị a na-amaghị ama eme ihe. Ha ekwesịghị ọbụna iji ihe ndị dị otú ahụ mee nchọpụta, n’ihi na ha enweghị ọchịchọ siri ike ịmata ihe ndị dị omimi nke Setan. (Mkpughe 2:24) Kama nke ahụ, e nwere ezi ihe mere a ga-eji kpachara anya banyere ihe ọ bụla nke pụrụ iyi nke e jikọtara ya na mgbaasị, nke Okwu Chineke na-ama ikpe.—Ndị Galetia 5:19-21.
Ihe onye na-agwọ ọrịa na-eme gbasara ya, ọ bụghịkwa ebumnobi anyị ịtụleghachi na inye mkpebi ikpe ná nzọrọ ma ọ bụ usoro ime ihe nke mmadụ nile. Ọbụna a sị na ị na-eche na ụfọdụ n’ime ihe omume ndị a metụtara ike ndị a na-amaghị ama, o doro anya na ọtụtụ n’ime ndị nwalere ha mere otú ahụ n’ebughị ihe ọjọọ ọ bụla n’obi, n’amaghị banyere ntinye aka ná mgbaasị. Ọ pụrụ ịbụ nanị ihe àmà nke ọchịchọ ha na-achọsi ezi ahụ ike ike. Ma, ụfọdụ ndị tinyeworo aka n’ihe omume ndị dị otú ahụ emesịwo kpebie na uru ọ bụla a pụrụ ịhụ anya bụ́ ndị a pụrụ irite na ya erughị ka ihe ize ndụ ime mmụọ dị ya.
Ọzọkwa, onye ọ bụla aghaghị ikpebi ihe ọ ga-eme n’ihe banyere okwu ndị dị otú ahụ dịịrị onwe onye. Ma, ndị Kraịst kwesịrị icheta ndụmọdụ Chineke: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” (Ilu 14:15) Nke a na-emetụtakwa nzọrọ dị iche iche banyere ahụ ike.
Setan na-achọsi ike ịdọpụ uche ndị ohu Chineke n’ebe ezi ofufe dị. Ekwensu ga-aṅụrị ọṅụ ma ọ bụrụ na ọ pụrụ ime otú ahụ site n’ime ka nchụso ndị ọzọ kpalie mmasị ndị Kraịst. Ọ ga-enwe obi ụtọ ọbụna karị ma ọ bụrụ na ihe ndị bụ, ma ọ bụ ndị yiri ka ha bụ, ihe omume ndị sitere n’ike ndị a na-amaghị ama bụ́ ndị pụrụ ịdọbanye ha ná mgbaasị akpalie mmasị ha.—1 Pita 5:8.
Ọ bụ ezie na ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mosis, echiche Jehova Chineke n’ebe ihe omume dị iche iche nke mgbaasị agbanwebeghị. Dị ka e buru ụzọ kwuo, Chineke nyere ndị Israel iwu na a gaghị ahụ onye ọ bụla “na-ajụ ase, ma ọ bụ onye na-eji igwe ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ, ma ọ bụ onye na-agba afa, ma ọ bụ onye mgbaasị, ma ọ bụ dibịa nrafu,” n’etiti ha. “Ihe arụ nke Jehova ka onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ . . . Onye zuru okè ka ị ga-abụ n’ebe Jehova . . . nọ.”—Deuterọnọmi 18:10-13.
Mgbe ahụ, lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya nye ndị Kraịst taa ịnọgide ‘na-eyikwasị ihe agha nile nke Chineke . . . n’ihi na ịgba mgba anyị . . . bụ imegide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe’!—Ndị Efesọs 6:11, 12.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọtụtụ ndị ka na-ejekwuru ndị shaman, ndị dibịa ime obodo, ma ọ bụ ndị yiri ha bụ́ ndị na-agwọ ọrịa. Onye shaman bụ “onye nchụàjà nke na-eji majik eme ihe ná nzube nke ịgwọ ndị ọrịa, na-agba afa ịchọpụta ihe ndị zoro ezo ma na-achịkwa ihe omume dị iche iche.” Onye dibịa ime obodo, ma ọ bụ shaman, pụrụ ijikọta mkpá akwụkwọ na usoro mgbaasị (na-akpọku ike ndị a na-amaghị ama). Onye Kraịst nke na-elezi anya, nke na-eguzosi ike n’ihe ga-ajụ ụdị itinye aka dị otú ahụ ná mgbaasị, a sịgodị na o yie ka ọ ga-abụ ngwọta.—2 Ndị Kọrint 2:11; Mkpughe 2:24; 21:8; 22:15.
b Nke a bụ ịkọwa ya n’ozuzu, ma usoro nnwale ahụ pụrụ ịdịgasị iche iche. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ịgwa onye a na-ele ahụ ka ọ pịchikọta mkpịsị aka ukwu na osote mkpịsị aka ukwu ya, onye ahụ na-agwọ ọrịa na-agbalịkwa ịdọsa ha.
c Ọ na-ede, sị: “Olee otú ihe omume ndị a yiri ọrụ ebube si ewere ọnọdụ? . . . A na-akpọ usoro m na-eji eme ihe ibikwasị aka n’isi, iji okwukwe agwọ ọrịa ma ọ bụ iji mmụọ nsọ agwọ ọrịa. Ọ bụghị usoro ihe omimi ma ọlị, kama nke doro anya . . . Onye ọ bụla nwere ike mmetụta ma ọ bụ ọcha ìhè nke dị ya gburugburu ma na-abanyerịta n’ime ahụ nkịtị. E jikọtara ike mmetụta nke a na ahụ ike n’ụzọ chiri anya. . . . Ike Nghọta Dị Elu bụ ụdị ‘ịhụ ụzọ’ nke ị na-anọ na ya jiri uche gị hụ otu onyinyo n’ejighị anya gị nkịtị mee ihe. Ọ bụghị ihe e chepụtara echepụta. Mgbe ụfọdụ a na-akpọ ya iji uche hụ ihe ndị anya na-adịghị ahụ.”