N’agbanyeghị Ịbụ Ndị Gbara Ọsọ Ndụ, Obi Dị Ha Ụtọ Ịdị Na-ejere Chineke Ozi
AGHA, ụnwụ nri, ọdachi, na ọgba aghara. Nye ụfọdụ ndị, ndị a bụ nanị isiokwu ndị e ji mere akụkọ. Nye ọtụtụ ndị ọzọ ha bụ akụkụ nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị. N’ịbụ òtù ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ, Ndịàmà Jehova maara nke ọma na mgbe ọ bụla agha tiwapụrụ ma ọ bụ mgbe ọdachi mere, otu akụkụ nke òtù ụmụnna ha zuru ụwa ọnụ pụrụ ịta ahụhụ. Mgbe ndị mmadụ na-aghaghịkwa ịgba ọsọ maka ndụ ha, ọ pụrụ ịdị mkpa na ụmụnna anyị ga-emekwa otu ihe ahụ.
Ruo ọtụtụ afọ Ndịàmà nọ n’ime ọtụtụ mba n’Africa aghaghị idi ahụmahụ ndị dị otú ahụ. Ọtụtụ n’ime ha aghaghị ịkwakọrọ ihe ọ bụla ha ga-ebuli wee chọọ nchebe n’ebe ọzọ. Ọ bụ ezie na ole na ole enwewo ụzọ isi mee njem, ma eleghị anya ịnyịnya ígwè, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ aghaghị iji ụkwụ na-eje, na-eje, na-eje—ruo ọtụtụ ụbọchị, ọbụna izu—iji ruo ebe ha na-eje.
Otu ebe dị otú ahụ a na-eje bụ ntakịrị obodo aha ya bụ Mboki, na Central African Republic. Ruo ọtụtụ afọ, ndị ikom na ndị inyom, ụmụaka na ndị agadi, abịawo n’ọtụtụ puku. E nwere n’etiti ha ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị ndị Kraịst ndị nwoke na ndị nwanyị, ha na ndị nwere mmasị. Otú ọ dị, ndị Kraịst ibe ha n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Bangui, bụ́ isi obodo nke Central African Republic, nwere mmasị dị ukwuu izute ndị a gbara ọsọ ndụ iji nye aka. E zipụrụ onye nnọchiteanya ugboro ise ya na ego, ihe oriri, uwe, na ọgwụ, nke Ndịàmà nọ na Bangui, nke dị ihe dị ka 1,130 kilomita n’ịdị anya ji afọ ofufo weta. Ọ bụ ezie na ndị na-enye enyemaka afọ ofufo nke a nwere ntakịrị ihe n’ụzọ ego, obi dị ha ụtọ ime ihe ha nwere ike ime.
Ijeru Mboki
Ụmụnna nọ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ chọrọ ịhụ ihe ọzọ a pụrụ ime na otú a pụrụ isi nyere ndị ahụ gbara ọsọ ndụ aka n’ụzọ ime mmụọ. Ya mere mụ na nwunye m jiri ụgbọ ala Land Cruiser anyị malite njem, anyị na Symphorien, bụ́ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche na nwunye ya. Symphorien maara ụzọ nke ọma, ọ na-asụkwa asụsụ Zande, bụ́ asụsụ nke ndị ahụ gbara ọsọ ndụ nọ ná Mboki. O were anyị ogologo ụbọchị anọ iji ruo ebe ahụ.
Narị kilomita anọ ndị ikpeazụ bụ nke gafere ebe mara mma nke ime obodo nwere mkpọgo na mkpọda na ọtụtụ oké osisi baobab. Site n’otu ebe ruo n’ebe ọzọ anyị gbafere ntakịrị obodo dị iche iche. N’ogologo ụzọ a, nwunye m gụtara kpọmkwem 50 àkwà mmiri—ọtụtụ nọ n’ọnọdụ jọrọ njọ nke ukwuu, ụfọdụ bụ ndị a na-apụghị ịga na ha. Anyị ji osisi na ógwè osisi ndị rere ure rụzie àkwà mmiri ụfọdụ, malite ịdọkpụ ụgbọ ala ahụ, kpee ekpere, ma jiri ezi nlezianya gaa n’ihu. Ọ bụrụ na ọ dị ntakịrị obodo dị nso, ndị ntorobịa ga-agbara ọsọ bịa inye aka—maka ntakịrị ego. O juru anyị anya na mgbe nile ha na-ahụ mkpirisi ógwè osisi na ibe osisi site n’àkwà mmiri ahụ n’ime nnukwute ahịhịa ahụ na n’ime ọhịa ndị dị nso. O mere ka anyị na-eche ma e wepụrụ ha ewepụ zoo n’ebe ahụ maka ndị ahịa nọ ná mkpa.
Anyị jụrụ enyemaka ndị ntorobịa ndị ahụ ugboro atọ, n’ihi na àkwà mmiri ndị ahụ yiri ihe dị oké ize ndụ ịgafe. Anyị nyaara ụgbọ ala ahụ si n’ụzọ pụọ banye n’ime ọnụ mmiri ahụ, gafere nkume ndị ahụ, rịgotaghachi, wee bataghachi n’okporo ụzọ. Lee ka anyị si nwee obi ụtọ na ọ bụ oge ọkọchi, ebe ọ bụ na ọ dịghị ụzọ anyị gaara e si mee njem ahụ, ọ gwụla ma eleghị anya site n’iji helikọpta!
Olee otú Mboki ga-adị? Nke a gbatara anyị n’uche ọtụtụ mgbe ka anyị na-agbafe “piste” nke a na-adịghị agwụ agwụ, bụ́ okwu French e ji eme ihe na Central African Republic maka okporo ụzọ ma ọ bụ ogologo ụzọ dị ájá ájá, nkume, na mkpọmkpọ ihe—na ọtụtụ puku okokoro.
N’ụbọchị nke anọ, ka ọ ka gafesịrị etiti ehihie, Symphorien tụrụ aka n’ụlọ akịrịka ndị ọkwụrụ bekee na ubi akpụ gbara gburugburu. “Ehee! Ebe a ka Mboki malitere,” ka o tiri ná mkpu. Ihe anyị hụrụ juru anyị nnọọ anya. “Ọ̀ bụ ebe a bụ Mboki? Olee ebe ogige ndị ahụ gbara ọsọ ndụ dị?” ka anyị jụrụ, n’ihi na ihe anyị hụrụ abụghị ogige ndị gbara ọsọ ndụ, ọ bụ nanị ụlọ ndị dịsasịrị adịsasị. Ha dị ntakịrị ma bụrụ ụmụ obere ụlọ akịrịka dị ọcha. E nwekwara osisi na ọhịa ebe nile. Ndị mmadụ na-akụ mkpụrụ ákụ́kụ́ n’akụkụ ụlọ ha. Mboki abụghị ụdị ogige ndị gbara ọsọ ndụ nke anyị tụrụ anya ịhụ; ọ bụ nnukwu ime obodo, nke dị ihe dị ka 35 kilomita n’ogologo.
Izute Ụmụnna Ahụ
Ụmụnna nọ na Mboki maara na anyị na-abịa, ọ bụ ezie na ha chere na njem anyị ga-ewe ụbọchị ise. Mgbe ha nụrụ ụda ụgbọ ala anyị, ha ji ọsọ gbara na-abịa. Ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị si n’ime ụlọ nta na èzí ha, sikwa n’ubi ha dị iche iche tikapụta ịbịa kelee anyị. Onye ọ bụla na-amụmụ ọnụ ọchị, na-achị ọchị, na-ekwe n’aka, ọtụtụ ugboro ma o kwe mee. Ha ku ụmụ ọhụrụ ha na-agbatịpụ aka ha. Mmadụ nile chọrọ ịsị unu abịala, ha nyekwara anyị nnabata kasị na-ekpo ọkụ.
Ọ dịghị nnukwu ihe mụ na nwunye m ga-eme mgbe ahụ n’ihi ihe mgbochi nke anụghị asụsụ. Anyị ji ntakịrị asụsụ French, ntakịrị asụsụ Sango, ntakịrị Bekee, na Arabic, gbalịtụ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụnna anyị na-asụ, na-agụ, ma na-ede Zande. Symphorien ga na-asụgharị, na-akọwa usoro ihe omume maka ọbịbịa anyị.
Anyị gakwuru maịlụ ole na ole wee rute n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụ “chọọchị” mbụ nke ndị gbara ọsọ ndụ nọ na Mboki nke okpukpe ọ bụla wuru. Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ụmụnna na ụmụ ha na ndị nwere mmasị bịara ikwe anyị n’aka. Ọbụna ọtụtụ ụmụaka ndị agbata obi sooro ụmụnna bịa ikwe anyị n’aka.
Ụmụnna anyị akwadebeworo anyị bụ́ ndị ọbịa ha ụmụ obere ụlọ abụọ. Ha dị nnọọ ọcha. E nwere bọket mmiri dị ọcha ndị dị adị ma na-echere anyị. Anyị burị ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ nke anyị bịa, na-atụ anya ịhụ ọnọdụ jọkarịsịrị njọ nakwa ka anyị ghara ịbụrụ ụmụnna anyị ibu. Ka anyị nọ na-ebutusị ibu na moto, otu nwa agbọghọ bịara wee jụọ anyị otú anyị ga-achọ ka e si siere anyị ọkụkọ n’abalị ahụ, ịmị ya amị ka ọ bụ isi ya n’ime mmiri ofe? Ọ dịghị mgbe anyị tụrụ anya nke ahụ wee jụọ ihe ha mere atụmatụ iji ya rie. Azịza ya: akpụ. Ya mere anyị họọrọ ka e sie ọkụkọ ahụ n’ime mmiri ofe e tinyere ihe ndị na-esi isi ọma. E gboro oké agụụ na-agụ anyị nke ọma n’abalị ahụ. Ma ha nọgidere na-enye anyị ihe oriri kwa ụbọchị—ehihie na abalị. O siiri anyị ike ikweta—ndị gbara ọsọ ndụ inye anyị ihe oriri na ilekọta anyị, n’agbanyeghị na ha n’onwe ha nwere ntakịrị ihe.
Ntakịrị Ọgbakọ Nwere Obi Ụtọ
Leenụ ebe anyị nọ, n’ebe dịmiri adịmi otú a kama ọ bụ n’etiti 21 n’ime ụmụnna anyị. Ọ bụ nanị abụọ n’ime ha ka e mere baptism tupu ha abịa n’ebe a. Ndị ọzọ bụ ndị nwere mmasị mgbe ha bịara. Ha nọgidere na-amụ ihe ma bụrụ ndị e mere baptism n’ime afọ abụọ gara aga. E mere anọ ọzọkwa baptism n’ime osimiri dị nso n’oge anyị bịara nleta.
Otu ihe atụ pụtara ìhè bụ Faustino. Tupu ọ bịa Mboki, ọ mụtara eziokwu Bible ndị bụ́ isi site n’aka otu enyi ya. Faustino nwere mmasị n’ihe ọ na-amụta. N’oge na-adịghị anya, ya na enyi ya malitere ime nkwusa gwa ndị ọzọ, ma ha zutere mmegide, e wee tinye ha n’ụlọ mkpọrọ n’ihi iji okpukpe ha “na-akpali ọha obodo.” Ka ha nọ n’ụlọ mkpọrọ enyi Faustino ji n’ihi ụjọ kwụsị, e wee tọhapụ ya. Ọnwa abụọ ka e mesịrị, e kpere Faustino ikpe. Otú ọ dị, o doro anya na ebubo nile e boro ya bụ ụgha, ya mere a tọhapụrụ ya. Mgbe agha bịara n’ógbè ya, Faustino gbagara Central African Republic, bụ́ ebe ọ nọ zute ụmụnna ahụ wee maliteghachi ọmụmụ Bible ya. E mere ya baptism na July 1991, na 1992 kwa o weere ozi oge nile dị ka ọsụ ụzọ oge nile.
Ihe mejupụtara ntakịrị ọgbakọ ahụ nke nwere obi ụtọ nke nwere omume enyi nke dị na Mboki ugbu a bụ otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche na 21 ndị nkwusa. Ụmụnna nwoke abụọ na-asụ asụsụ Bekee na-eje ozi dị ka ndị okenye, nweekwa ike ha na alaka ụlọ ọrụ dị na Bangui inwe nzirịta ozi dị mma. Anyị tụrụ anya ka ụmụnna anyị gbara ọsọ ndụ nọrọ n’ọnọdụ jọrọ oké njọ, nke enweghị olileanya, ma ọ dịghị otú ahụ. Ọ bụ ezie na ha bụ ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe, ọ dịghị onye na-eme mkpesa, na-echegbu onwe ya, ma ọ bụ na-atamu ntamu. Kemgbe ha bịarutere ụmụnna ahụ ewuwo ụlọ nta ha na ụlọ dị iche iche, ha amalitewokwa ịkọ ihe oriri na ịzụ ọkụkọ. Ha enwerughị ihe otú ha nwere na mbụ, ma ha dị ndụ, sorokwa ndị Kraịst ibe ha nọrọ.
Ebe ọ bụ na e nwere ihe nọ n’agbata 17,000 na 20,000 ndị gbara ọsọ ndụ nọ na Mboki, na-enwekwa ọtụtụ ndị ọzọ na-abịa kwa ọnwa, ụmụnna anyị nwere ubi buru ibu maka ozi ha. Anyị sooro ha mee nkwusa, bụ́ nke na-adọrọ mmasị n’ezie. Ha na-eji Bible e dere n’asụsụ Zande eme ihe ọtụtụ mgbe, nsụgharị nke a nwekwara aha Chineke n’Akwụkwọ Nsọ Hibru na n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Nye ndị a, Chineke abụghị nanị “Mboli” (okwu Zande maka “Chineke”) kama “Yekova,” nke bụ otú ha si akpọ aha onwe onye nke Chineke. “Mboli Yekova” bụ okwu a na-anụkebe. Nsụgharị dị iche iche nke ndị Protestant n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ nke Africa adịghị agbaso nsụgharị nke a ziri ezi; kama nke ahụ, ha na-eji “Nzapa,” “Nzambe,” ma ọ bụ aha Africa ndị ọzọ maka Chineke edochi “Jehova.”
N’imezu amụma Jisọs, a na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ugbu a n’ụwa nile, ọbụna na Mboki. (Matiu 24:14) Ọgbakọ ahụ na-enwetazu ugbu a Bible, akwụkwọ, magazin, akwụkwọ nta, na traktị ndị dị ha mkpa n’asụsụ nile. Ma eleghị anya n’ọdịnihu, a ga-enwekwu mbipụta dị iche iche n’asụsụ Zande.
Ịnọ Na-echere Ebe Obibi Ga-adịgide Adịgide
N’uhuruchi mbụ, anyị gosiri usoro ihe ngosi slide Society bụ́ “Ndị Na-enwe Obi Ụtọ Bịara Mgbakọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe Etoo Jehova.” N’abalị echi ya usoro ihe omume bụ “Iweta Ọtụtụ n’Ezi Omume n’Oge Ikpeazụ.” Igosi ihe ngosi ahụ weere ọnọdụ n’èzí, n’ebe dịdewere Ụlọ Nzukọ Alaeze n’okpuru ihu igwe gbachapụrụ agbachapụ na ọnwa na-eti zaa. Lee aha ọnọdụ ọma ọ bụ! Ọtụtụ narị mmadụ bịara ikiri ngosi slide ndị a, ụmụnna anyị nwekwara obi ụtọ na nganga nke inye ndị obodo ahụ ihe pụrụ iche.
Mgbe o ruru Monday, anyị jikeere maka njem ụla anyị. Ọ gaje ịbụ njem ụbọchị anọ ọzọ n’otu ụzọ ndị ahụ, na-agafe 50 àkwà mmiri ndị ahụkwa. Otu nwanna nwanyị siri ọnwụ ịkwadebe ihe oriri ụfọdụ maka njem ahụ—ọkụkọ abụọ ọzọ, ndị a mịworo amị ma jiri garlic mee ka ha tọọ ụtọ. Ha na-esi nnọọ ísìsì ọma n’ime ụgbọ ala Land Cruiser ahụ n’oge ụtụtụ ahụ. N’ehihie anyị kwụsịrị n’akụkụ ọhịa ịta ọkụkọ a mịrị amị ka anyị nọkwa na-eche banyere ụmụnna anyị nọ na Mboki. Ọ bụ ezie na ha bụ ndị a manyere ịbụ ndị gbara ọsọ ndụ, ha na-anọgide na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, na-echere ebe obibi na-adịgide adịgide nke udo n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke kwere ná nkwa. (2 Pita 3:13)—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.