Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 7/15 p. 8-9
  • Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Colombia

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Colombia
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Dọọrọ Mmasị Ndị Isi Azụmahịa
  • Eziokwu Eruo Ụdị Ndị Nile
  • Nke Mbụ Otu Narị Afọ Gara Aga
    Teta!—2001
  • Gịnị Ka A Na-eme n’Alaka Ụlọ Ọrụ?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Anyị Kpọrọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Kirie Alaka Ụlọ Ọrụ Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ntọhapụ Ime Mmụọ na Colombia
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 7/15 p. 8-9

Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Colombia

COLOMBIA bụ ala pụrụ iche n’Ebe Ndịda Kọntinent America. Ma oké osimiri Atlantic ma Pacific nọdebere akụkụ ikpere mmiri nke mba a jupụtara n’ugwu ndị na-agbawa agbawa. Okpomọkụ nke ebe ndị dị ala n’akụkụ mmiri ndị ahụ na n’ebe ndị dị larịị na-enye ohere maka oyi nke ebe ndị dị elu snow na-ada na ha nke Ugwu Andes.a

Ọ bụ ezie na a ma Colombia ama maka ọlaedo na nkume emerald, ndị obodo ahụ bụ ihe onwunwe ya ndị kasị ọnụ ahịa. Taa, Jehova ji ebube na-emejupụta ụlọ ime mmụọ ya. Ndị mara mma, ndị a na-achọsi ike, bụ́ ndị na-efe ofufe, na-enuga na ya n’akụkụ nile nke ụwa, gụnyere Colombia.​—⁠Hagaị 2:7.

A Dọọrọ Mmasị Ndị Isi Azụmahịa

Sunday, November 1, 1992, kara akara nraranye nke alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ na ebe obibi akwụkwọ nke Watch Tower Society na Facatativá, 42 kilomita site n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Bogotá. Ndugharị e mere ndị mmadụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ enwewo mmetụta dị ukwuu n’ahụ ndị nleta. Mgbe ọ laghachiri n’ụlọ mmepụta ihe ebe ọ na-arụ ọrụ, otu onye nleta ji obi ụtọ gbaa ndị maneja ya ume ka ha gaa kirie nhazi nke bụ ‘ọkachamma nke ịdị irè, ịdị n’usoro, na ọnọdụ uche ndị e were n’ọrụ.’ N’oge ndugharị ndị ọzọ ha mere n’ọdịnihu, ndị isi ọrụ ndị ahụ gosiri mmasị dị ukwuu ma jụọ ọtụtụ ajụjụ.

Ndị isi ọrụ ndị a chọrọ izite ndị inyeaka ha, ndị nlekọta ọrụ ha, na ndị isi ngalaba ọrụ​—⁠n’ezie, ndị ọrụ ha dum⁠—​ka ha bịa maka ndugharị. N’izu ọ bụla, ha ga-edokwa ka malite ná mmadụ 15 ruo 25 ndị ha were n’ọrụ bịa nleta ruo mgbe ndị ọrụ ha dum dị 1,300 ga-enwe ike ikiri ịdị irè nke nhazi dị otú ahụ.

E dugharịwo ọtụtụ narị ndị ọrụ ha n’ogige alaka ahụ, ha ekiriwokwa vidio ahụ bụ́ Jehovah’s Witnesses​—⁠The Organization Behind the Name. N’ịbụ ndị ọ̀tụ̀tụ̀ nke nhazi ahụ na ịbụ nke zuru ụwa ọnụ nke ọrụ nkwusa Alaeze ahụ masịrị, ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke nkà na ụzụ e ji eme ihe n’ihe nile Society na-arụ tụrụ ha n’anya. Mgbe ha lara, a na-anụ ka ọtụtụ n’ime ha na-ekwu na ọ dị ha ka ha ‘na-ahapụ Paradaịs ịlaghachi n’ime ụwa ghasasịrị aghasasị.’

Eziokwu Eruo Ụdị Ndị Nile

E ji ozi ọma ahụ na-erute ụdị mmadụ nile. (1 Timoti 2:​3, 4) Dị ka ihe atụ, onye na-arọbu egwú na onye ndú nke òtù egwu rock na-ada oké ụda nakweere eziokwu Bible, mee mgbanwe dị iche iche ná ndụ ya, ghọọkwa onye ọsụ ụzọ oge nile n’oge na-adịghị anya. E mesịa a họpụtara ya ịbụ ohu na-eje ozi. Ọtụtụ ndị mmadụ nọ n’òtù dị iche iche na-agba ọchịchị mgba okpuru amụtawo itinye ntụkwasị obi na olileanya ha n’Alaeze Jehova. Ha na-ekeresi òkè ike ugbu a n’ikwusa ozi ahụ nke ụwa ọhụrụ nke udo.

Ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ na ndị na-azụ ahịa ya amụtawokwa eziokwu ahụ. Otu nwa okorobịa onye bụ ugbu a Onyeàmà lekọtaburu otu ugbo ọgwụ ọjọọ na ụlọ ọrụ nnyocha ọgwụ cocaine n’ime ọhịa ruo afọ ise tupu ọ hapụ ụdị ndụ ahụ. Ọ chọtawo obi ụtọ n’ịmụta na itinye ụkpụrụ dị iche iche nke Bible n’ọrụ. N’otu ụlọ mkpọrọ ndị e goro ọrụ igbu mmadụ bụ́ ndị a mara ikpe na-ekpesi ekpere ike ka Jehova gbaghara ha mmehie ha ma nabata ha dị ka ndị na-ejere ya ozi n’ihi ịbụ ndị ọmụmụ Bible site n’ezi obi kwaliri.

Otú a ka o si bụrụ na ụdị mmadụ nile na-anabata ozi Alaeze ahụ. Na Colombia, dị ka n’ebe ndị ọzọ, Jehova si otú a jiri ebube na-emejupụta ụlọ ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee 1994 Calendar of Jehovah’s Witnesses.

[Igbe dị na peeji nke 8]

IHE ỌMỤMA BANYERE MBA AHỤ

Afọ Ije Ozi 1993

ỌNỤ ỌGỤGỤ KASỊ ELU NA-AGBA ÀMÀ: 60,854

NKEZI: 1 Onyeàmà maka 558

NDỊ BỊARA EMEME NCHETA: 249,271

NKEZI NDỊ NKWUSA BỤ NDỊ ỌSỤ ỤZỌ: 8,487

NKEZI ỌMỤMỤ BIBLE: 100,927

ỌNỤ ỌGỤGỤ NDỊ E MERE BAPTISM: 5,183

ỌNỤ ỌGỤGỤ ỌGBAKỌ: 751

ALAKA ỤLỌ ỌRỤ: FACATATIVÁ

[Foto dị na peeji nke 9]

ndị na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ na ndị ozi ala ọzọ na 1956

[Foto dị na peeji nke 9]

alaka ụlọ ọrụ ahụ ma a nọrọ n’elu lee ya anya

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya