Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 5/15 p. 32
  • “Ndịàmà Jehova Chebere M!”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ndịàmà Jehova Chebere M!”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 5/15 p. 32

“Ndịàmà Jehova Chebere M!”

N’OGE ikpeazụ ndị a, ụfọdụ egosipụtawo onwe ha ịbụ ndị “dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya.” (2 Timoti 3:​1, 3) Isaac, onye ozi afọ ofufo n’otu alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, chọpụtara na nke a bụ eziokwu, Ọ na-akọ, sị:

“Na January 1992, m si n’ogologo ụzọ tọgbọ chakoo jiri tagzi mụ na mmadụ ise ndị ọzọ nọ n’ime ya na-eme njem. Amalitere m iso nwanyị nọ m n’akụkụ na-ekwurịta okwu, o jikwa obi ụtọ nara otu akwụkwọ e ji amụ Bible.

“Na mberede, n’ihe dị ka n’elekere anya anọ n’ehihie, ụgbọ ọhụrụ nke na-enweghị nọmba gbafetara anyị n’ihu, ụgbọ ala anyị kwụsịkwara n’ike. Mmadụ atọ gbara agba, nke ọ bụla bu égbè, mapụtara n’ụgbọ ala nke ọzọ ahụ ma kwaghepụ ụzọ anyị oghe. ‘Unu nile, pụta,’ ka otu n’ime ha tiri ná mkpu.

“Nwoke ọzọ pụụrụ m akpa akwụkwọ m. Mgbe ọ hụrụ na o bu akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, ọ tụpụrụ akpa ahụ. ‘Gịnị ọzọ ka i ji?’ ka ọ jụrụ, na-atụ m égbè ya. Eji m ọsọ ọsọ nye ya ego dị n’akpa ego nta m. ‘Ọ̀ gwụla?’ ka ọ jụrụ. Agwara m ya na abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova nakwa na Ndịàmà adịghị agha ụgha. Ọ pụụrụ m akpa ego nta ahụ, hụ kaadị e ji amata mmadụ m nke Watch Tower, wee sị, ‘Ọ dị mma, Watchtower. Chere n’ebe a.’

“Ọzọ, o chigharịkwuuru nwa ada ahụ mụ na ya na-ekwurịtabu okwu n’ime tagzi ahụ. O ji ọsọ yipụ ihe olu ya nye ha, nyekwa ha ego dị na pọọsụ ya. Mgbe onye oji égbè eje ahụ hụrụ akwụkwọ nta dị n’aka ya na-ama jijiji, o chere na anyị abụọ so, ya mere ọ tụụrụ ya aka ka ọ nọnyere m.

“Ka ọ dị mgbe ahụ, ndị oji égbè eje ndị ọzọ ahụ ji obi ọjọọ wakpo ndị anyị na ha na-emekọ njem. Ha tiri draịva na nwoke nke ọzọ so anyị na-eme njem ihe ma zuo ha ohi. Otu onye ohi mara aka n’ihe olu nke nwanyị nke abụọ. Mgbe o guzogidere ya, ha ji isi égbè ha kụọ ya n’isi na n’obi ruo mgbe ọ nwụrụ. Nwanyị nke atọ ka ha dọpụtara n’ime ụgbọ ahụ ma gbaa ya égbè n’obi. Ọ bụ ihe mwute na ya onwe ya nwụkwara. Nanị mụ na nwa agbọghọ nke ọzọ ahụ ka a hapụrụ n’emerụghị anyị ahụ ọ bụla.

“Mgbe onye ọzọ na-akwọ ụgbọ ala mesịrị buru anyị, nwanyị ahụ egwu ji nọgidere na-ekwughachi sị, ‘Ndịàmà Jehova chebere m!’”

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya