Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 5/15 p. 31
  • Ozi Ọma Site na Malawi!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ozi Ọma Site na Malawi!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 5/15 p. 31

Ozi Ọma Site na Malawi!

ỌBỤ ihe na-akpali akpali ịnụ na na November 15, 1993, e debanyere aha Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania n’akwụkwọ ndị ọchịchị ná mba ndịda ọwụwa anyanwụ Africa bụ́ Malawi. Nke a ga-enye Ndịàmà Jehova nkwado iwu na nnwere onwe ikwusa eziokwu Bible gwa ndị Malawi.

Laa azụ na 1948, e hiwere otu alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society na Malawi iji chịkọta ọrụ Ndịàmà Jehova n’ala ahụ. Na January 8, 1957, e debanyere aha Watch Tower Society n’ebe ahụ na nke mbụ ya. Ruo ọtụtụ afọ Ndịàmà Jehova nwere mmụba dị ngwa. Ma ajọ mkpagbu tiwapụrụ na 1964. N’ihi gịnị?

N’irubere Chineke isi, Ndịàmà Jehova jigidere nnọpụiche siri ike pụọ ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 17:16) Ihe àmà na-egosi na ụfọdụ aghọtachaghị nguzo Akwụkwọ Nsọ nke a wee gosipụta Ndịàmà dị ka okpukpe na-achọ oké mgbanwe na dị ka ndị na-adịghị ekwenyere iwu. N’ihi ya, o yiri ụfọdụ ka ha ziri ezi n’ịkpagbu ndị Kraịst ndị a na-achọ udo. A chụrụ ọtụtụ Ndịàmà n’ọrụ ha, tie ha ihe, ma ọ bụ menye ha ihere. E ji ike kewapụ ụfọdụ n’ebe ụmụ ha nọ.

Na 1972 ihe karịrị 30,000 Ndịàmà na ụfọdụ ndị so ha na-amụ Bible aghaghị ịhapụ mba ahụ n’ihi egwu nke ịtụfu ndụ ha. Ọtụtụ puku nọdụrụ n’ogige ndị gbara ọsọ agha dị iche iche na Mozambique, bụ́ ndị gbara ha agbata obi. Ma na 1975 e zighachiri ndị a gbara ọsọ agha na Malawi, ebe ha na-aghaghị ichekwu mkpagbu ihu. E tinyere ọtụtụ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. N’etiti ọgba aghara a dum, a kachapụrụ aha Watch Tower Society n’akwụkwọ ndị ọchịchị nke nzukọ ndị e nyere ikike na Malawi. Kemgbe ahụ Ndịàmà Jehova na nzukọ ha iwu kwadoro anọwo n’okpuru mmachibido iwu.

N’agbanyeghị ihe a nile na-eme, Ndịàmà emegwaraghị. Ọ dịghị mgbe ha hiwere òtù ndị na-eme ihe ike ma ọ bụ mee ngagharị iwe iji mee mkpesa megide gọọmenti. Kama nke ahụ, ha ji ekpere nọgide n’ibu ọrụ ha nke ndị Kraịst igosi nsọpụrụ na nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị maka ‘ndị gọọmenti na-achị isi.’ (Ndị Rom 13:1-⁠7; 1 Timoti 2:​1, 2) Ndịàmà ahụ jigidekwara ụkpụrụ nile dị elu nke ibi ndụ ndị Kraịst bụ́ ndị e setịpụrụ n’ime Bible, wee si otú ahụ setịpụ ihe nlereanya magburu onwe ya n’omume.

Site ná nnwere onwe ọhụrụ ha nwetara, Ndịàmà Jehova nọ na Malawi kpebisiri ike ịnọgide na-ekwusa eziokwu nile nke Bible ngwa ngwa, “n’oge kwesịrị.”​—⁠2 Timoti 4:2.

[Foto dị na peeji nke 31]

M. G. Henschel na ezinụlọ Betel dị na Malawi n’afọ ndị 1960

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya