Iweli Ihe Mkpuchi nke Ebe Ikpeazụ E Wusiri Ike nke Alaska
RUO ụbọchị abụọ ugbu a, anyị anọ akwụkwụkọtawo ọnụ n’otu obere ọnụ ụlọ dị n’obodo ukwu a ma ama bụ́ Nome, Alaska, nke ọtụtụ ndị gbatara na ya maka ọlaedo. Na 1898 ihe karịrị 40,000 mmadụ na-achọ uru nutere ebe a ịchọ otu ihe—ọlaedo! Anyị onwe anyị, n’aka nke ọzọ, na-achọ akụ̀ dị iche.
Mmasị anyị, n’oge a, bụ ‘n’ihe a na-achọsi ike’ bụ́ ndị pụrụ ibi n’obodo nta ndị dịpụrụ adịpụ nke Gambell na Savoonga dị na St. Lawrence Island, 300 kilomita ịga n’akụkụ ọdịda anyanwụ na Bering Strait. (Hagaị 2:7) N’ebe ahụ ndị Inuit na-eji obi ike banye ná mmiri ndị jụrụ oké oyi nke ebe Arctic ma na-achụ nta anụ mmiri whale nanị kilomita ole na ole site n’ebe bụbu Soviet Union. Ma ikuku snow na oké aluluu gbachiri agbachi nwụchiri anyị. Ụgbọ elu anyị apụghịkwa ifeli elu.
Ka anyị na-echere, echeghachiri m echiche n’ihe ndị mere n’afọ ole na ole gara aga ma kelee Jehova Chineke maka ngọzi ya n’àmà anyị gbara n’ime ọhịa. N’Alaska—nke ụfọdụ na-akpọ ebe ikpeazụ e wusiri ike nke ụwa—e nwere ihe karịrị 60,000 ndị obodo ahụ bi n’ihe karịrị 150 ógbè ndị dịpụrụ adịpụ, dịsasịa n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1,600,000 square kilomita nke ọzara, na-enweghị ụzọ ọ bụla jikọtara ha. Site n’ụgbọ elu ndị Watch Tower Society nwere, anyị eruworị ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke obodo nta ndị a dịpụrụ adịpụ, na-ewetara ha ozi ọma nke Alaeze Chineke.—Matiu 24:14.
Iji rute ógbè ndị a dị n’ime ime, ụgbọ elu ahụ aghaghị itiwara urukpuru na aluluu pụrụ ikpuchite elu ala ruo ọtụtụ ụbọchị iji ruo ala. Ozugbo o rutere ala, a ka nwere aluluu ọzọ nke a na-aghaghị ịwabanye. Dị ka ákwà mkpuchi, ọ na-ekpuchite uche na obi ndị a dị obi ọma ma dị udo.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 3:15, 16.
Mgbanwe Na-egbu Mgbu
Ndị bi n’ime obodo Alaska bụ ndị Inuit, ndị Aleutian, na ndị India. Nke ọ bụla ná ndị a nwere omenala na mjimara ndị nke ya e ji mara ndị nna nna ha kpọmkwem. Iji lanarị oge oyi nke ebe Arctic ahụ, ha amụtawo iji ihe ndị a na-enweta n’ala na-ebi ndụ site n’ịchụ nta, ịkụ azụ na igbu anụ mmiri whale.
Mmetụta ofesi bịakwasịrị ha n’etiti afọ ndị 1700. Ndị Russia na-azụ ahịa ajị anụ hụrụ ndị na-eyi akpụkpọ anụ na-esi mmanụ anụ seal mmanụ anụ seal, bụ́ ndị bi, ọ bụghị n’ụlọ oyi ndị e ji ice wuo, kama n’ụlọ ahịhịa ndị e wunyere ọkara ha n’ime ala bụ́ ndị nwere uko ahịhịa na ọnụ ụzọ ndị dị n’okpuru ala. Ndị ahịa ahụ wetaara ndị na-ekwu okwu n’ụzọ dị nro, ndị dị nwayọọ, ma gbasie ike ọtụtụ nsogbu ndị siri ike, gụnyere ọdịbendị ndị ọhụrụ na ọrịa ndị ọhụrụ, bụ́ ndị ji ọkara belata ọnụ ọgụgụ nke ebo ụfọdụ. Ngwa ngwa ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ghọrọ ọnụ a bụrụ ndị ahụ. Ọnọdụ akụ̀ na ụba ọhụrụ mere ka e nwee mgbanwe site n’ụzọ ndụ nke inweta ihe na-ezuru onwe onye gaa na nke ịchụ ego. Ruo taa, ụfọdụ na-eche na ọ bụwo mgbanwe na-egbu mgbu.
Mgbe ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm rutere, e bokwasịrị ndị obodo Alaska mgbanwe nke ụdị ọzọ. Ebe ụfọdụ lara azụ n’ịhapụ ihe omume okpukpe ọdịnala ha—ofufe ndị mmụọ nke ikuku, ice, anụ ọhịa bear, ugo, na ihe ndị ọzọ—ndị ọzọ welitere ngwakọta nke nchepụta, na-arụpụta njikọ, ma ọ bụ ọgba aghara, nke okpukpe dị iche iche. Ọtụtụ mgbe, ihe a dum na-akpatakakarị inyo ndị a na-amaghị enyo na atụkwasịghị ha obi. A dịghị anabata onye ọbịa mgbe nile n’obodo nta ụfọdụ.
Ya mere, ihe ịma aka chere anyị ihu bụ, Olee otú anyị ga-esi jekwuru ndị nile nwe obodo bụ́ ndị bisasịrị n’ebe a sara mbara e wusiri ike? Olee otú a pụrụ isi kwụsị ha inyo anyị enyo? Gịnị ka anyị pụrụ ime iji welie ihe mkpuchi ahụ?
Mgbalị Ndị Mbụ Iji Gbaa Àmà
Ná mmalite afọ ndị 1960, ụfọdụ Ndịàmà ahụ dị mma bụ́ ndị Alaska kara obi chee ihe ndị ahụ ihu—ifufe dị ike, ọ̀tụ̀tụ̀ oyi ọtụtụ gabigara ókè, ọnọdụ ihu igwe nke na-adịghị eme onyinyo—ma fere ụgbọ elu nta ndị nke aka ha nwere otu injin gaa njem nkwusa n’obodo nta ndị dịsasịrị n’ebe ugwu. N’ileghachi anya azụ, ụmụnna ndị a nwere obi ike n’ezie na-ekpughepụ onwe ha nye ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ihe ize ndụ. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe e ji n’aka na injin ịkwụsị ọrụ ga-edujeworị n’ọdachi. Ọbụna ma ọ bụrụ na o kwe omume inweta ebe na-adịghị ize ndụ ifetu, ha ga-anọ ọtụtụ kilomita pụọ n’ebe a pụrụ inyere ha aka n’ọ̀tụ̀tụ̀ oyi ọtụtụ gabigara ókè, n’enweghịkwa usoro njem ọ bụla. Nlanarị ga-adabere n’inweta nri na ebe obibi, bụ́ ihe ndị ga-adị ụkọ. Ọ bụ ihe ọma na ọ dịghị oké ihe ọjọọ merenụ, ma a gaghị eleghara ihe ize ndụ ndị dị otú ahụ anya. Ya mere alaka ụlọ ọrụ Alaska nke Watch Tower Society agbaghị usoro nke a ume.
Iji jiri ọrụ ahụ gaa n’ihu, ụmụnna kwesịrị ntụkwasị obi n’Ọgbakọ Fairbanks na North Pole tinyere mgbalị ha n’obodo ndị katụ ibu, dị ka Nome, Barrow, na Kotzebue, bụ́ ndị ndị ụgbọ elu azụmahịa na-efeta na ha. Ha jiri ego ndị nke ha na-aga n’ebe ndị a, ihe karịrị 720 kilomita n’ebe ugwu na ọdịda anyanwụ. Ụfọdụ nọrọ na Nome ruo ọnwa ole na ole iji duziere ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible. Na Barrow e nwetara otu ụlọ iji nwee ebe nchebe pụọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ oyi gafere 50 degree Fahrenheit bụ́ nke na-akpụkọ ihe. Ruo ọtụtụ afọ, ndị na-eburu n’obi ihe Jisọs nyere n’iwu bụ́ ikuwsa ozi ọma ahụ gaa ná nsọtụ nile ụwa mefuru ihe karịrị $15,000.—Mak 13:10.
Enyemaka A Na-atụghị Anya Ya Erute
Ọchịchọ a na-achọ ụzọ isi rute ógbè ndị dịpụrụ adịpụ karị nọgidere, Jehova meghekwara ụzọ ahụ. E nwetara ụgbọ elu nwere injin abụọ—kpọmkwem ihe a chọrọ iji gafere Usoro Ugwu Alaska n’enweghị ihe ize ndụ. E nwere ọtụtụ ugwu ndị dị oké elu karịa 4,200 mita n’Alaska, ọ̀tụ̀tụ̀ kasịkwa elu nke Ugwu McKinley (Denali) a ma ama bụ 6,193 mita site n’ọ̀tụ̀tụ̀ elu osimiri.
N’ikpeazụ, ụgbọ elu ahụ rutere. Cheedị echiche mmechuihu anyị nwere mgbe otu ụgbọ na-efe efe kaworo nká, nke ike gwụworo, nke nwere àgwà dị iche iche, rutere ala n’ebe ụgbọ elu na-ada. Ọ̀ ga-efelinwu elu n’ezie? Ànyị pụrụ itinye ndụ ụmụnna anyị na ya? Ọzọ, aka Jehova adịghị mkpụmkpụ. N’ịbụ ndị ọrụ mekanik nwere laịsensị na-eduzi, ihe karịrị 200 ụmụnna jere ozi n’afọ ofufo, na-etinye ọtụtụ puku hour iji rụzigharịsịa ụgbọ elu ahụ kpam kpam.
Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ ikiri! Ka ọ na-efeli n’igwe Alaska, ụgbọ elu nke na-egbukepụ egbukepụ, yiri nke ọhụrụ, nke e dekwasịrị nke ọma nọmba e debanyere n’akwụkwọ bụ́ 710WT n’ọdụ ya! Ebe ọ bụ na a na-ejicha ma asaa ma iri na-egosi izu ezu n’ime Bible, a pụrụ iche na 710 na-emesi ike nkwado nzukọ Jehova nyeworo n’iweli ihe mkpuchi pụọ n’obi ndị a fụchiworo n’ọchịchịrị.
Ịgbada n’Agwaetiti Ndị nke Aleutian
Kemgbe a natara ụgbọ elu ahụ, anyị ejezuwo 80,000 kilomita nke ọzara, na-ewetara ihe karịrị 54 obodo nta ozi ọma Alaeze ahụ na akwụkwọ Bible. Nke a bụ ihe hà ka ịgabiga United States hà ka otu kọntinenti ugboro 19!
Ugboro atọ anyị eruwo ala site n’Agwaetiti Ndị nke Aleutian dị 1,600 kilomita, bụ́ ndị kewapụrụ Oké Osimiri Pacific site n’Oké Osimiri Bering. Ihe karịrị 200 agwaetiti fọrọ nke nta ka ọ ghara inwe otu mkpụrụ osisi dị na ha n’usoro agwaetiti ndị ahụ bụ ebe obibi nye ọ bụghị nanị ndị obodo Aleutian kamakwa nye ọtụtụ puku nnụnụ mmiri, ugo isi nkwọcha, na eze ọbọgwụ ọhịa, nke nwere isi na-acha ka snow na abụba ndị tụrụ àgwà ojii na ọcha.
Otú ọ dị, ịma mma na-adọrọ adọrọ nke ógbè ahụ, adịghị n’enweghị ihe ize ndụ ya. Ka a na-efefe osimiri ahụ, anyị pụrụ ịhụ ifufe mmiri dị 3 ruo 5 mita n’elu mmiri ice ahụ na-agba ụfụfụ, jụọ oyi nke ukwuu nke na n’oge okpomọkụ mmadụ pụrụ ịnọgide ndụ n’ime ya nanị 10 ruo 15 minit. Ọ bụrụ na a manye ya amanye ifetu, nhọrọ ndị onye na-akwọ ụgbọ elu nwere agwụla agwaetiti ahụ bụ nkume nkume, nke na-adịghị larịị ma ọ bụ osimiri ahụ kpụkọrọ akpụkọ nke ọ na-adịghị anụ bi n’ime ya. Lee aha ekele anyị nwere maka ụmụnna anyị nwere nkà, bụ́ ndị mekanik nwere satifiketi A & E (Ahụ ụgbọ na Injin), bụ́ ndị rụrụ ọrụ n’afọ ofufo iji hụ na ụgbọ elu ahụ nọ n’ọnọdụ kasị mma!
N’otu n’ime njem ndị ahụ, anyị chere ihu n’ọdụ ụgbọ mmiri Dutch Harbor na obodo nta na-akụ azụ bụ́ Unalaska. A ma ógbè ahụ ama maka oké ikuku ya na-efe n’ọ̀tụ̀tụ̀ 130-190 kilomita maka otu hour. Ọ bụ ihe obi ụtọ na ọ dị jụụ n’ụbọchị ahụ karịa n’oge ndị ọzọ ma ọ na-akpakwarị ike zuru ezu iji mee ka ahụ ghara iru anyị ala ọtụtụ mgbe. Lee ihe ijuanya ọ bụ mgbe anyị hụrụ ụzọ ahụ ụgbọ elu si agba ọsọ ma ọ daa—nanị ọwara egbuwapụtara n’akụkụ ugwu! N’otu akụkụ nke ụzọ ahụ e nwere nnọọ ala mkpọda bụ nkume nkume, n’akụkụ nke ọzọ, mmiri ice nke Osimiri Bering! Mgbe anyị feturu ala, ọ bụ n’elu ụzọ ọsọ ụgbọ elu nke dị mmiri mmiri. Mmiri na-ezo n’ebe ahụ ihe karịrị 200 ụbọchị kwa afọ.
Lee ihe ọṅụ ọ bụ iso ndị bi n’ógbè ahụ tụlee Okwu na nzube Chineke! Ọtụtụ ndị agadi kwupụtara ekele ha maka olileanya maka ụwa agha na-adịghị ya. Ha ka nwere ncheta doro anya nke bọmbụ ndị Japan tụrụ n’ọdụ ụgbọ mmiri Dutch Harbor n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Ncheta anyị nke njem ịgba àmà ndị dị otú ahụ bụkwa n’otu aka ahụ ihe a na-apụghị ichefu echefu.
Usoro nke Na-ekpowanye Ọkụ Nwayọọ Nwayọọ
N’ịtụle ọnọdụ ihu igwe ọzọ, anyị chọpụtara na ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ rịtụrụ elu nke nta. Nke ahụ na-eme ka m chee banyere ọrụ anyị n’ime ọhịa. Nwayọọ nwayọọ ma n’ụzọ na-aga n’ihu anyị ahụwo usoro na-ekpowanye ọkụ n’obi ndị ahụ.
O wewo oge iji wepụ ihe mkpuchi nke inyo mmadụ enyo na atụkwasịghị ha obi nke ndị ahụ nwere n’ebe ndị ọbịa nọ. Ná mgbalị ndị mbụ anyị mere, ọ bụghị ihe a na-adịghị ahụkarị bụ́ ndị ndú chọọchị obodo nta ahụ izute ụgbọ elu ahụ, chọpụta nzube nke nleta anyị, wee nye anyị iwu ozugbo ịla. N’ezie, nnabata ndị dị otú ahụ na-akụda obi. Ma anyị chetara ndụmọdụ Jisọs nke a na-achọta na Matiu 10:16: “Bụrụnụ ndị nwere uche dị ka agwọ, ndị na-adịghịkwa aghụghọ dị ka nduru.” Ya mere anyị laghachitere na-ebuju ụgbọ elu ahụ n’akwụkwọ nri lettuce, tomato, cantaloupe, na ihe ndị ọzọ na-adịghị adị mfe inweta n’obodo ahụ. Ndị bi ebe ahụ na-enwebughị omume enyi nwere obi ụtọ ugbu a ịhụ ụgbọ elu anyị.
Ka otu nwanna na-ahụ maka “ụlọ ahịa” ahụ, na-anara ụtụ maka ihe ndị ahụ, ọtụtụ ndị ọzọ gara site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-agwa ndị nwe ụlọ banyere mbịarute nke ụgbọ ahụ butere ihe ndị ọhụrụ. N’ọnụ ụzọ ndị ahụ ha jụkwara, sị: “Ee em, ị̀ na-agụdị Bible? Amaara m na ihe enyemaka nke a maka ịgụ Bible, bụ́ nke na-egosi na Chineke ekwewo anyị nkwa paradaịs, ga-amasị gị.” Ònye pụrụ ịjụ onyinye dị otú ahụ na-adọrọ adọrọ? Onye ọ bụla nwere mmasị ná nri anụ ahụ ahụ nakwa na nke ime mmụọ. Nnabata ahụ dị ụtọ, e tinyere ọtụtụ akwụkwọ, e mere ka obi kpoo ụfọdụ ndị ọkụ.
Ịgabiga n’Ókèala Ahụ
Gafere n’Ókèala Yukon, Ọgbakọ Whitehorse kpọrọ anyị òkù “Masedọnia” ka anyị “gabita na” Canada ileta ụfọdụ n’ógbè ndị dị dịpụrụ adịpụ n’Ókèala Ebe Ugwu Ọdịda Anyanwụ. (Ọrụ 16:9) Anyị dị ise n’ime ụgbọ mgbe anyị chere ihu na Tuktoyaktuk, obodo nta dị Mackenzie Bay n’Osimiri Beaufort nso, ebe ugwu nke Arctic Circle.
‘Olee ụzọ e si akpọ aha nke a pụrụ iche?’ ka anyị na-eche mgbe anyị rutere.
“Tuk,” ka otu nwa okorobịa ji nnukwute ọnụ ọchị zaa.
“Gịnị mere anyị echeghị banyere nke ahụ?” bụ ihe jụrụ anyị anya.
Ọ tụrụ anyị n’anya ịhụ na ndị Tuktoyaktuk maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma. N’ihi ya, anyị nwere ọtụtụ nkwurịta okwu nke ndị enyi, e tinyekwara ọtụtụ akwụkwọ. Otu n’ime ndị ọsụ ụzọ anyị na-eto eto nwere ahụmahụ na-enye ihe ọmụma n’ebe otu onye nwe ụlọ nọ.
“Abụ m onye Anglikan!” ka onye nwe ụlọ kwuru.
“Ị̀ maara na Chọọchị Anglikan kwadoro ndina ụdị onwe?” ka ọsụ ụzọ anyị jụrụ.
“Ọ̀ kwadoro ya?” ka nwoke ahụ ji nwayọọ kwuo. “Mgbe ahụ, abụkwaghị m onye Anglikan.” E nwere olileanya na onye ọzọ na-emeghepụ obi ya nye ozi ọma nke Bible.—Ndị Efesọs 1:18.
Otu agadi nwere mmasị ná mkpebisi ike anyị iru n’ụlọ ọ bụla dị n’ógbè ahụ. Dị ka ọ na-adịkarị anyị aghaghị ịrụ ọrụ anyị nile n’ije ụkwụ. A na-ejikarị ụkwụ eje otu kilomita ma ọ bụ karịa site n’ebe ụgbọ elu na-ada banye n’obodo nta ahụ. Mgbe ahụ, iji ruo n’ụlọ nke ọ bụla, anyị aghaghị ijisi ike gabiga ala ajịrịja nkume ma ọ bụ ụzọ ụrọ. Nwoke ahụ gbazinyere anyị ụgbọ ala pikọp ya, leekwa ihe ngọzi ọ bụ! Ịgabiga n’ókèala ahụ na inye aka n’ókèala Canada bụ ihe ùgwù mara mma.
Ọ̀ Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ?
Mgbe ihu igwe na-adịghị mma, ejichiekwa anyị n’otu ebe ma ọ bụ gbuo anyị oge ruo mgbe a na-amaghị ama, dị ka a na-eme anyị ugbu a, ma ọ bụ mgbe ogologo ụbọchị nke ịgba àmà yiri ka ọ dịghị ihe ọ rụzuru e wezụga enweghị mmasị ma ọ bụ ọbụna ibu iro, mgbe ahụ anyị amalite iche ma oge, ume, na mmefu ahụ dum hà na-enweta ụgwọ ọrụ zuru ezu. Anyị pụrụ iche banyere ndị o yiri ka ha nwere mmasị ma kwee nkwa ide akwụkwọ ozi ma hapụ ime otú ahụ. Mgbe anyị na-echeta na ọ bụghị omenala nke ọtụtụ ndị amaala obodo ahụ ide akwụkwọ ozi, ọ pụkwara ịdị mfe ịghọtahie ịbụenyi dị ka mmasị n’ozi Bible. Mgbe ụfọdụ ọ na-eyi ihe siri ike nke ukwuu ịtụ ihe ịga nke ọma n’ọ̀tụ̀tụ̀.
Echiche ndị a na-adịghị mma na-apụ ngwa ngwa mgbe anyị chetara ahụmahụ ọma ndị nke ndị nkwusa Alaeze ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, otu Onyeàmà si Fairbanks kwusara n’obodo nta Barrow dị n’ime ime ebe ugwu. N’ebe ahụ o zutere otu onye nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu onye lọtara ụlọ site na kọleji dị na California. Nwanna nwanyị ahụ hụrụ na mmasị ahụ dịgidere site n’ide akwụkwọ ma nọgide na-agba nwa agbọghọ ahụ ume ọbụna mgbe ọ laghachisịrị kọleji. Taa, nwa agbọghọ ahụ bụ onye na-ejere Jehova ozi nke nwere obi ụtọ, nke e mere baptism.
Aka a kụrụ n’ọnụ ụzọ akpaghasịa ihe ndị m na-eche ma nye ihe nnwapụta ọzọkwa nke na ọ na-akwụ ụgwọ ihe nile ọ na-efu. N’ebe ahụ n’ọnụ ụzọ ka Elmer guzo, onye Inuit nanị ya ka bụ Onyeàmà raara onwe ya nye, nke e mere baptism na Nome.
“Ọ bụrụ na ị pụọ ije ozi, m̀ pụrụ iso gị?” ka ọ jụrụ. Ebe o bi n’ebe dịpụrụ adịpụ nke dị 800 kilomita site n’ọgbakọ kasị nso, ọ chọrọ isoro ụmụnna ya kere òkè n’ozi ahụ mgbe ọ ka nwere ohere ya.
Ụzarị ìhè anyanwụ malitere ịchabata site n’urukpuru ndị ahụ, anyị makwaara na n’isi nso a ga-enye anyị ohere ịhapụ. Ka Elmer na-arịbanye n’ụgbọ elu ahụ, ihu ya na-egosi obi ụtọ, nke na-egbuke egbuke mere ka obi kpoo anyị ọkụ. Nke a bụ ụbọchị pụrụ iche nye Elmer. O so anyị na-efega n’obodo nta anyị na-eje ikwusara ndị Inuit ibe ya ozi ọma, na-esonyere anyị ná mgbalị anyị na-eme iweli ihe mgbuchi pụọ n’obi ndị n’ebe ikpeazụ e wusiri ike nke ụwa.—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.
[[Map dị na peeji 23]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
1. Gambell
2. Savoonga
3. Nome
4. Kotzebue
5. Barrow
6. Tuktoyaktuk
7. Fairbanks
8. Anchorage
9. Unalaska
10. Ọdụ ụgbọ mmiri Netherlands
[Foto dị na peeji nke 24]
Iji ruo n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ, ọ na-adịkarị mkpa ịgafe otu n’ime ọtụtụ usoro ugwu nke Alaska
[Foto dị na peeji nke 25]
Betty Haws, Sophie Mezak, na Carrie Teeples nwere ngụkọta nke ihe karịrị 30 afọ n’ije ozi oge nile