Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị Nile n’Afọ 1994
JANUARY
1. Gaanụ . . . mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke m nyere unu n’iwu.—Mat. 28:19, 20. w-IB 9/1/92 1, 2
2. Dragọn ahụ wee wesa nwanyị ahụ iwe, wee pụọ ibu agha megide mkpụrụ ya fọdụrụ, bụ́ ndị na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndị na-enwekwa àmà nke Jisọs.—Mkpu. 12:17. w-IB 9/15/92 19-21a
3. Ya onwe ya bụ onye a mapuworo site ná njehie nile nke anyị, onye a zọpịaworo site n’ajọ omume nile nke anyị.—Aịsa. 53:5. w-IB 10/1/92 18, 19
4. Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.—Efe. 6:4. w-IB 10/15/92 11
5. O dokwara iwu n’Israel, nke o nyere nna anyị ha n’iwu, ime ka ụmụ ha mara ha.—Abụ Ọma 78:5. w-IB 11/1/92 9
6. Ngọzi Jehova . . . na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.—Ilu 10:22. w-IB 12/1/92 4, 5
7. Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla nwaworo unu ma ọ bụghị nke mmadụ na-anagide: ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, Onye na-agaghị ekwe ka a nwaa unu karị nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.—1 Kọr. 10:13. w-IB 12/15/92 10
8. Ma ugbu a, Chineke anyị, anyị onwe anyị na-ekele gị, na-etokwa aha gị mara mma.—1 Ihe Eme. 29:13. w-IB 11/15/92 20-22
9. A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.—Mat. 24:14. w-IB 1/1/93 19, 20
10. Chọọnụ Jehova mgbe a na-achọta ya, kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso: onye na-emebi iwu, ya hapụ ụzọ ya, onye na-eme ajọ ihe, ya hapụ echiche ya nile: ya laghachikwutekwa Jehova, ọ ga-enwekwa obi ebere n’ahụ ya; ya laghachikwutekwa Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụba.—Aịsa. 55:6, 7. w-IB 9/15/92 1-3
11. Ọ dịghị onye ọ bụla nke bụ onye na-akwa iko ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha, ma ọ bụ onye anyaukwu, nke isi ya bụ onye na-ekpere arụsị, nwere ihe nketa n’alaeze nke Kraịst na Chineke.—Efe. 5:5. w-IB 1/15/93 15-17b
12. Mụ onwe m apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe m: dị ka m na-anụ m na-ekpe: ikpe m zikwara ezi; n’ihi na etughị m ihe mụ onwe m na-achọ, kama ihe onye zitere m na-achọ.—Jọn 5:30. w-IB 2/1/93 12, 13
13. Jehova, zi m ụzọ ụkpụrụ gị nile: m ga-echebekwa ya ruo mgbe ikpeazụ.—Abụ Ọma 119:33. w-IB 2/15/93 9, 10a
14. Nwa m, nụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.—Ilu 1:8. w-IB 10/15/92 4
15. Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche: ma n’ahụ gị ka Jehova ga-awa dị ka anyanwụ, ebube ya ka a ga-ahụkwa n’ahụ gị.—Aịsa. 60:2. w-IB 3/1/93 1, 2a
16. Mgbe ọ bụla ha ga-arara unu nye, unu echegbula onwe unu otú unu ga-ekwu ma ọ bụ okwu unu ga-ekwu: n’ihi na a ga-enye unu n’oge hour ahụ okwu unu ga-ekwu.—Mat. 10:19. w-IB 9/15/92 10a
17. Àjà nile nke Chineke bụ mmụọ e tiwara etiwa: obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, Chineke, ị dịghị eleda ya anya.—Abụ Ọma 51:17. w-IB 3/15/93 15, 16a
18. Nweenụ anya udo, na-echenụ nche: onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe, bụ́ Ekwensu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi: ma na-eguzogidenụ ya, n’ihi na unu dị ike n’okwukwe unu.—1 Pita 5:8, 9. w-IB 11/15/92 18, 19b
19. Lee ohu m, onye m na-ejide aka; onye nke m m họpụtara, onye ihe ya tọrọ mkpụrụ obi m ụtọ: atụkwasịwo m ya mmụọ m; ikpe ka ọ ga-ewepụtara mba nile.—Aịsa. 42:1. w-IB 1/15/93 7, 8
20. Unu ga-ezi ụmụ unu ha, n’ikwu okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.—Deut. 11:19. w-IB 11/1/92 1
21. Webatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri nile n’ụlọ akụ nke m, ka ihe oriri wee dị n’ụlọ m, biko, nwaanụ m na nke a, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, ma m gaghị emeghere unu window nile nke eluigwe, wụsara unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.—Mal. 3:10. w-IB 12/1/92 6, 7
22. Ọ dịghịkwa ihe m na-eme n’onwe m, kama dị ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a.—Jọn 8:28. w-IB 12/15/92 3, 4a
23. Ọ . . . na-eme ka onye na-enweghị ike si n’ájá bilie, ọ na-esi n’ebe ikpofu ahịhịa bulie ogbenye elu; ime ka ya na ndị a maara aha ha nọkọọ . . . Ọ bụ onye na-eme ka nwanyị àgà nke ụlọ biri n’ezinụlọ nke aka ya, bụrụ nne na-aṅụrị ọṅụ nke mụworo ụmụ ndị ikom.—Abụ Ọma 113:6-9. w-IB 11/15/92 10, 11
24. Pita wee cheta okwu Jisọs kwururịị, sị, Mgbe oké ọkụkọ akakwaghị, ị ga-agọnarị m ugbo atọ. O wee pụọ, kwaa ákwá nke ukwuu.—Mat. 26:75. w-IB 9/15/92 9-11
25. Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya. . . . Ị ga-ahụkwa onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.—Mat. 22:37, 39. w-IB 2/1/93 3, 4a
26. Onye na-eche na ọ na-eguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda.—1 Kọr. 10:12. w-IB 2/15/93 8-10
27. Ya mere mụ onwe m, bụ́ onye mkpọrọ n’ime Onyenwe anyị, na-arịọ unu ka unu jegharịa dị ka o kwesịrị ọkpụkpọ nke a kpọrọ unu.—Efe. 4:1. w-IB 3/1/93 5, 6
28. Ọ na-eme ka anyanwụ ya na-awakwasị ajọ mmadụ na ezi mmadụ, ọ na-emekwa ka mmiri zokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.—Mat. 5:45. w-IB 11/15/92 7, 8a
29. M ga-emekwa ka otu onye ọzụzụ atụrụ biliere ha, ọ ga-azụkwa ha, ọbụna ohu m, bụ́ Devid.—Ezik. 34:23. w-IB 1/1/93 4, 5a
30. Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, enyewo m ire nke ndị mmụta, ka m wee mara iwere okwu kwagide onye dara mbà: ọ na-akpọte ntị m kwa ụtụtụ, ọ na-akpọte ntị m ịnụ ihe dị ka ndị mmụta.—Aịsa. 50:4. w-IB 11/1/92 20, 21a
31. Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ ndị na-atụ egwu ya. N’ihi na ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.—Abụ Ọma 103:13, 14. w-IB 9/15/92 15, 16