Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 11/15 p. 23-27
  • Ime Nkwusa n’Obodo Nta Dị Iche Iche na Spain

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ime Nkwusa n’Obodo Nta Dị Iche Iche na Spain
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Nkwado Iwu Akpalie Ịgba Àmà n’Ime Obodo
  • “Chọpụtanụ Onye Kwesịrị”
  • Ndị Na-agụ Bible Na-azaghachi Ngwa Ngwa
  • E Merie Ịkpọasị Dị Iche Iche
  • Inyocha Bible Maka Eziokwu Ahụ
  • Owuwe Ihe Ubi Dị Mma
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 11/15 p. 23-27

Ime Nkwusa n’Obodo Nta Dị Iche Iche na Spain

JISỌS KRAỊST gara “n’obodo na obodo nta dị iche iche, na-ezi ihe, na-agakwa ije ya iru Jerusalem.” (Luk 13:22) Iji jezuo ozi ahụ, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya kwusara ọ bụghị nanị ‘n’obodo dị iche iche’ kamakwa n’ime “obodo nta dị iche iche.” Ọ bụ ezie na ọ gaara akawo mfe ịtụkwasị uche n’obodo ukwu dị iche iche, ha amafereghị ọtụtụ obodo nta ndị dị ná mpụga obodo.a

Ndịàmà Jehova na Spain chekwara ihe ịma aka yiri nke Jisọs zutere ihu. N’oge na-adịbeghị anya dị ka na 1970, e nwere ógbè buru ibu nke ókèala ime obodo a na-akpabeghị aka ndị ruworo maka owuwe ihe ubi. (Matiu 9:37, 38) Ọtụtụ narị obodo nta ndị dị n’ugwu ndị dị n’ebe ugwu mmiri na-ezo na ha, n’ala dị larịị n’ebe etiti bụ́ ebe kpọrọ nkụ, na n’ụsọ osimiri enwebeghị mgbe e ji ozi Alaeze ahụ rute ha.

Ndịàmà Jehova ahụ bụ́ ndị Spain kpebisiri ike itinye mgbalị nile iji wega ozi ọma ahụ n’ógbè ndị a. Ma n’ihi gịnị ka ndị bi n’ebe ndị a ji chere ruo ogologo oge a dum tupu ịnụ ozi Alaeze ahụ? Oleekwa ụzọ ha si zaghachi?

Nkwado Iwu Akpalie Ịgba Àmà n’Ime Obodo

A machibidowo ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Spain eri ngwụsị nke agha ime obodo na 1939. N’ime afọ ndị 1950 na 1960, Ndịàmà na-anụ ọkụ n’obi ji akọ mee nkwusa n’obodo ukwu dị iche iche, ebe ọ na-esi ike ịmata na ha nọ ya. Mgbe e mesịrị nweta nkwado iwu maka ọrụ ha na 1970, e nwere ihe dị ka 10,000 ndị nkwusa Alaeze na Spain. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ha nile bi n’obodo ukwu dị iche iche, ma ọ dịkwa mkpa ka obodo nta ndị e nwere na Spain nụ ozi Alaeze ahụ. Ònye ga-emeri ihe ịma aka ahụ?

N’afọ ndị 1970, e mere mkpọsa iji ozi ọma ahụ ruo n’akụkụ nile nke ala ahụ mmiri gbatụrụ gburugburu. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ọnwa malite 1973 ruo 1979, ọ́kwà ndị pụrụ iche na-egosipụta mkpa e nwere n’ógbè dị iche iche nke mba ahụ pụtara n’Ozi Alaeze Anyị, akwụkwọ ije ozi na-apụta kwa ọnwa maka ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ ezinụlọ ndị dị njikere nakweere òkù ahụ a na-akpọ ma nye onwe ha n’afọ ofufo ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu.

Ihe atụ e nwere bụ ihe nlereanya nke Rosendo na nwunye ya, Luci. E zipụrụ ha dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche (ndị nkwusa oge nile nke Alaeze) gaa n’obodo nta ndị na-akụ azụ n’akụkụ ugwu nke ebe ọdịda anyanwụ Spain, ha wee kpebie ibiri n’ebe ahụ mgbe ha mụtara nwa. “Aghaghị m ikweta na anyị tara nnọọ ahụhụ,” ka Rosendo na-ekwu. “O siri ike ịchọta ọrụ ego, anyị dabeere n’enyemaka Jehova, ọ dịghịkwa mgbe anyị nọrọ n’agụụ ma ọ bụ ghara inwe ụlọ ebe anyị ga-ebi. Ụgwọ ọrụ ya ruru nnọọ eru.” N’afọ ndị gafeworonụ, ha enwewo ike inye aka iguzobe ọgbakọ anọ n’ógbè a nke Spain.

“Chọpụtanụ Onye Kwesịrị”

Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘chọpụta’ ndị kwesịrị ekwesị n’obodo ma ọ bụ obodo nta nke ọ bụla. (Matiu 10:11) N’ime obodo Spain, nchọpụta ahụ chọrọ ịdị uchu na ibu ụzọ eme ihe, dị ka Ángel, bụ́ nwanna nwoke si Alcoy (Alicante), chọpụtara. Ọ ka gasịrị n’ebe obibi ụfọdụ n’obodo nta bụ́ Masías mgbe ọ nụrụ ụda ọkụkọ na-akwanụ. O chere n’onwe ya sị, “Ọ bụrụ na e nwere ọkụkọ, a ghaghị inwe ụlọ dị nso—ụlọ nke anya anyị na-erubeghị.” Mgbe ọ chọgharịsịrị ya, Ángel hụrụ warawara ụzọ dugara n’otu akụkụ ugwu ma mesịa gaa n’otu ụlọ dịpụrụ adịpụ.

N’ụlọ a dị n’ime ugbo ka José na Dolores, bụ́ ụmụnne nwoke na nwanyị nne ji, ndị gafeworo 60 afọ nke ndụ ha, bi. Ha ṅara ntị nke ọma ma kwere ozugbo ka e duziere ha ọmụmụ Bible. Otú ọ dị, ọ dịghị mfe ịmụrụ ndị a nwere obi umeala ihe, ebe ha na-apụghị ịgụ ma ọ bụ ide ihe, a ghaghịkwa isi n’asụsụ Spanish sụgharịa ihe nile gaa n’asụsụ ndị Valencia, bụ́ nanị asụsụ ha na-aghọta. Ọzọkwa, ha chere mmegide dị ukwuu ihu site n’aka ndị agbata obi ha. N’agbanyeghị ihe mgbochi ndị a, ma José ma Dolores nwere ọganihu n’eziokwu ahụ, ọ bụ ezie na ịbịa nzukọ pụtara ogologo njem gabiga ọtụtụ ugwu. E mesịa, ha ruru eru maka baptism, ha abụọ nọgidekwara na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi.

Rosendo na Luci, ndị a kpọtụrụ aha na mbụ, chetara ụzọ otu onye ahụ kpọnwụrụ n’otu ụlọ dịpụrụ adịpụ nso Moaña, akụkụ ebe ugwu nke ọdịda anyanwụ Spain, si nata eziokwu ahụ. Aha ya bụ María. Mgbe mbụ ọ gwara Ndịàmà okwu, ọ pụghị ịgụ ma ọ bụ ide ihe, ọ nọwokwa n’àkwà ọrịa ruo ọtụtụ afọ n’ihi na ọrịa ahụ mkpọnwụ ụmụaka nwetara ya mgbe ọ ka bụ nwata. Ụlọ ya dị ihe dị ka kilomita abụọ site n’okporo ámá kasị nso. Ka o sina dị, ọ dị ya ọkụ n’obi ịmụ Bible, mkpebisi ike ya ijere Jehova ozi pụtakwara ìhè ngwa ngwa. María mụtara ịgụ na ide ihe ma malite ịbịa nzukọ, n’ihi mgbalị nke ọgbakọ ahụ. Ụmụnna na-ebu ya ebu ihe dị ka 200 mita site n’ụlọ ya ruo n’ebe a wụrụ ụzọ awụ, ebe ha ga-eji nlezianya dọba ya n’ime ụgbọ ala. N’agbanyeghị mmegide mbụ site n’ezinụlọ ya, o nwere ọganihu ruo baptism. N’ihi obi ike ọganihu ime mmụọ ya nyere ya, ọ mụtawo ugbu a ịkwọ ụgbọ ala a haziri n’ụzọ pụrụ iche, ọ gụsịwokwa akwụkwọ n’otu ngalaba nke agụmakwụkwọ bụ isi. “Inwe ike inyere ndị dị ka María aka na-eme ka àjà ọ bụla a chụrụ ghara ịbụ na nkịtị,” ka Rosendo na-akọwa.

Ndị Na-agụ Bible Na-azaghachi Ngwa Ngwa

N’afọ ndị 1970, na nke mbụ ya e mere ka Bible ruo ọha mmadụ aka na Spain. Ọtụtụ ndị Spain zụtara nke ha, ụfọdụ malitekwara ịgụ Akwụkwọ Nsọ. Pilar, onye si Medina del Campo (Valladolid), amaliteworị ịgụ Bible mgbe Ndịàmà Jehova bịakwutere ya nke mbụ ya n’obodo ya na 1973. Ebe ọ bụ onye Katọlik, ọ na-eze eze ịnakwere akwụkwọ ọ bụla n’aka Ndịàmà, ma ọ chọrọ ịghọta Bible. N’ihi ya, o kwere inwe nkwurịta okwu kwa izu iji zaa ajụjụ ya ndị metụtara Bible.

Site n’iji akwụkwọ ndị Watch Tower Society bipụtara mee ihe nke ọma, nwanna nwanyị bụ́ ọsụ ụzọ nke letara Pilar nwere ike ịza ọtụtụ ajụjụ ndị o nwere. Ebe ihe ọ na-amụta masịrị ya, mgbe ọtụtụ izu gasịrị, Pilar kwenyere ịmụ Bible na-eji akwụkwọ ahụ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. Tupu ọmụmụ ihe ya nke akwụkwọ Ezi-Okwu ahụ a na-agwụ, ọ gụsịrị Bible dum, obi siekwa ya ike na ọ chọtawo eziokwu ahụ. Ọ ghọrọ Onyeàmà mbụ na Medina del Campo, nke nwere ugbu a ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze na otu ọgbakọ nke nwere 63 ndị nkwusa.

Ndịàmà bụ́ ndị Spain ka na-achọta ndị “bụ ogbenye n’ime mmụọ ha” na ndị na-agụchi Bible anya ná mgbalị iji ghọta uche Chineke. (Matiu 5:3) Pepi, onye bụbu onye Katọlik nke kụziburu katkizim na parish Zumaia (ebe ugwu Spain), na-eme nkwusa n’obodo nta dị nso mgbe o zutere ụkọchukwu parish ahụ.

“Pepi, ị na-egbu oge gị,” ka ụkọchukwu ahụ gwara ya. “N’obodo nta a bụ́ Itziar, e nwere nanị mmadụ abụọ—otu di na nwunye—ndị nwere mmasị n’ihe ime mmụọ. Ndị ọzọ na-aga chọọchị nanị dị ka ihe riworo ha ahụ.”

“Ọ dị mma,” ka Pepi zaghachiri, “ọ bụrụ na e nwere mmadụ abụọ nwere mmasị n’ihe ime mmụọ, ha ga-aghọ Ndịàmà Jehova.”

Pepi gara n’ihu n’ọrụ nkwusa ụlọ n’ụlọ ya, ya na Ndịàmà ọzọ ruo mgbe e jezuru obodo nta ahụ. N’eziekwa, n’otu ụlọ dịpụrụ adịpụ, ụmụnna chọtara di na nwunye ahụ ụkọchukwu ahụ kpọtụburu aha. Ha na-agụ Bible ma ha aghọtaghị ya. Ha ji ịnụ ọkụ n’obi nakwere ọmụmụ Bible, nwee ọganihu dị ngwa, e mekwara ha baptism n’April 1991.

Ụfọdụ ndị nwere obi eziokwu amụtawo eziokwu ahụ nanị site n’ịgụ n’onwe ha akwụkwọ ndị e ji amụ Bible nke Watch Tower Society bipụtara. Dị ka ihe atụ, Ndịàmà si Almadén (Ciudad Real) na-eme nkwusa n’obodo buturu ibu bụ́ Ciruelas (Badajoz) mgbe ha chọtara otu nwaada gesiri ntị ike n’ozi ha. N’ihi mmasị ya pụtara ìhè, ha kwuru ka e duziere ya ọmụmụ Bible ebe obibi. Ma ọ jụrụ, na-asị na otu ọmarịcha nwoke meworo okenye anọworị na-amụgosi ya Bible. Ọtụtụ ndị ọzọ n’ebe a kwukwara otu ihe ahụ. Ebe a kpaliri ọchịchọ ha ịmata ihe, ụmụnna ahụ jụrụ ajụjụ maka ọmarịcha nwoke a meworo okenye. Ha nwetara adres ya ma gaa leta ya.

Dị ka ihe ijuanya nye ha, ha chọpụtara na na Madrid nwoke a, onye aha ya bụ Felipe, enwetawo akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Mgbe ọ gụsịrị ya, ọ ghọtara na ọ bụ ibu ọrụ dịịrị ya iso ndị agbata obi ya kerịta ozi ọma ahụ. N’ihi ya, ọ nọwo na-eji akwụkwọ ahụ na-akụziri ha Bible. Ụmụnna ahụ mere ndokwa ịmụrụ ya ihe. Otu nwaada ọ mụkwaara Bible kwekwara ka a mụọrọ ya ihe. Ọ bụ ezie na ọ gbara 80 afọ, o nwechaghịkwa ezi ahụ ike, Felipe na-enwe ọganihu dị mma n’eziokwu.

E Merie Ịkpọasị Dị Iche Iche

Ókèala ndị dị n’ime obodo na-eweta ihe ịma aka ndị pụrụ iche. Ọdịnala okpukpe na nkwenkwe ụgha na-esikarị ike n’ebe ndị dị otú ahụ, ọtụtụ ndị bikwa n’ime obodo nwere àgwà gbamiri mkpọrọgwụ agbami nke ịdị na-enyo “okpukpe ọhụrụ” enyo. Ndị obodo nta ụfọdụ na-enwekarị mmetụta banyere ihe ndị agbata obi ha na ndị ikwu ga-eche ma ha gbanwee okpukpe ha. Ma ike nke Okwu Chineke pụrụ imeri nsogbu ndị a ma gbanwee ndụ mmadụ. Nke a bụ ihe mere n’obodo nta nke ndị na-akụ azụ bụ́ Cangas de Morrazo dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Spain.

Roberto, onye obodo nta a, malitere iso ụgbọ mmiri mgbe ọ dị afọ 14 n’ihi na ọ chọsiri ike inwere onwe ya. Ndụ ya dị ka onye na-eso ụgbọ mmiri azụmahịa mere ka o zute ndị ọzọ na-eto eto ji ụgbọ mmiri eme njem bụ́ ndị na-aṅụ oké mmanya ma na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe iji na-egbufu oge ịnọ nanị ha n’oké osimiri. Tupu ogologo oge agaa, Roberto ghọkwara onye oké mmanya na onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ.

Mgbe oge na-aga, Roberto lọtara ụlọ ma ọ dịghị njikere ịhapụ àgwà ọjọọ ya. Iji nweta ego maka ọgwụ riri ya ahụ, ọ ghọrọ onye ohi, a tụọkwa ya mkpọrọ ugboro isii. Mgbe ọ dị afọ 18, ọ ṅụrụ ngwakọta nke mmanya na ọgwụ na-akụjụ ahụ bụ́ nke fọrọ nke nta ka o gbuo ya. Ndị dọkịta zọpụtara ndụ ya, ma ọ pụghịkwa iji aka na ụkwụ ya eme ihe ọzọ. Ọ hapụrụ ụlọ ọgwụ ahụ dị ka onye ma aka ma ụkwụ jiri. Ọbụna ịbụ onye ji oche nkwagharị agagharị emeghị ka ọ kwụsị àgwà ọgwụ ọjọọ ahụ. Ike okpukpe gwụrụ ya, ọgwụ ọjọọ yikwara ka ọ gwụla ihe ọ pụrụ iji mee ka ndụ dị ụtọ—ruo mgbe afọ atọ gasịrị mgbe Ndịàmà Jehova letara ya.

Ịmụta banyere amụma Bible ndị mezuworo nyeere Roberto aka imeri obi abụọ ya. Otú e si nabata ya nke ọma n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mere ka obi sie ya ike na ezi okpukpe na-eme ka ndụ ndị mmadụ nwee nzube. N’ime ọnwa itoolu, Roberto emeriwo iri ahụ nke ọnwụ ọjọọ, e mekwara ya baptism. N’agbanyeghị ajọ nkwaru n’elu ahụ ya, ọ nọwo na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ ruo afọ asatọ. Ọ bụwokwa okenye ọgbakọ n’afọ abụọ gara aga. Francisco, otu n’ime ndị ya na ya na-akpakọbu, nwere mmasị dị ukwuu ná mgbanwe ndị Roberto mere ná ndụ ya nke na ya onwe ya kwa ghọrọ Onyeàmà, ọ bụkwa ugbu a ohu na-eje ozi. Mgbanwe dị ịrịba ama n’ahụ onye a yiri onye ihe riri ahụ nke a na-apụghị ịgwọta agwọta nyeere ndị mmadụ aka n’ógbè ahụ ịghọta nke ọma karị ụdị ọrụ anyị na-arụ. Ọbụna na otu nwanyị kpọtara nwa ya nwoke na-eto eto nke ọgwụ ọjọọ riri ahụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ile ma Ndịàmà hà pụrụ ịgwọta ya.

Inyocha Bible Maka Eziokwu Ahụ

N’ozuzu, ndị ime obodo nwere nnukwu ekele maka eziokwu ahụ nke na ọtụtụ mgbe nke a na-eme ka ihere mee ndị nwere amamihe ụwa. (1 Ndị Kọrint 1:26, 27) Adelina, nwanyị katatụworo ahụ nke na-eme ihere, bụ otu n’ime ndị ahụ nwere ekele. Ọ na-ejibu okpukpe Katọlik ya akpọrọ ihe nke ukwuu. Kwa ụtụtụ n’esepụghị aka, ọ na-egbunye ikpere n’ala ikpe ekpere, na-ekpe ọtụtụ Nna Anyị Bi n’Eluigwe na Ekele M Marịa. Ọ na-ekpegara “sentị” dị iche ekpere ya kwa ụbọchị nke izu—kpọmkwem iji jide n’aka na ọ ghaghị inwe nke a ga-aza.

Mgbe Adelina malitere ịmụ Bible, o tinyekwara otu ịnụ ọkụ n’obi okpukpe nke a n’okpukpe ọhụrụ ya. Ọbụna ime ihere ya ejighachighị ya azụ, ọ bụ ezie na mgbe mbụ ya na di ya gara Ụlọ Nzukọ Alaeze, o were ha minit iri iji nweta obi ike ịbanye. Otú ọ dị, ozugbo ha banyere, o gere ntị nke ọma. N’otu mgbe, ọ mụtara banyere Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst. Isiokwu a dọọrọ mmasị ya, mgbe ọ lọtakwara ụlọ, ọ chọrọ ịgụkwu ihe banyere ya n’ime Bible ya. Ma, ma ya ma di ya adịghị nke maara ebe a pụrụ ịchọta ihe ọmụma ahụ, ọ bụ ezie na ha chere na a kpọtụrụ ya uche n’otu ebe n’akwụkwọ Mkpughe. Ya mere Adelina malitere ịgụ Mkpughe n’abalị ahụ, nọgidekwa na-agụ ruo mgbe o rutere n’isi nke 20 n’isi ụtụtụ.

N’oge ọzọ, Adelina mụtara na o kwesịrị ekwesị ka di nọchite anya nwunye ya n’ekpere. Ọ bụ ezie na o kwere ikpe ekpere, di ya amaghị ihe ọ ga-ekwu n’ekpere. N’otu abalị ahụ, Adelina kpebiri ịchọta ntụziaka n’ime Bible. N’elekere anya abụọ nke ụtụtụ, ọ kpọtere di ya n’ụra iji gwa ya na ya achọtawo Matiu isi nke 6, nke tụlere isiokwu ekpere nke ọma. Mgbe ọ gụsịrị ntụziaka Jisọs, di ya mesịrị kpee ekpere maka ha abụọ. Ugbu a ma Adelina ma di ya bụ Ndịàmà Jehova.

Owuwe Ihe Ubi Dị Mma

Mgbe ndị a na-ejere Jehova ozi n’ịnụ ọkụ n’obi gbasịrị àmà n’ime obodo ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 25 afọ, akụkụ nile nke Spain anụwo ozi ọma ahụ. Dị ka ọ bụ eziokwu n’Asia Minor na narị afọ mbụ, ‘ebu okwu Jehova na-ejezu mba ahụ dum.’ (Ọrụ 13:49) N’ihi ya, ọtụtụ puku ndị ime obodo azaghachiwo nke ọma.

Na Spain na n’ebe ndị ọzọ, ikwusazu ozi ọma n’ime obodo na-achọ ndidi na ịchụ onwe onye n’àjà. Ma ebe ọ bụ uche Chineke na ‘a ga-azọpụta ụdị mmadụ nile,’ obi dị Ndịàmà Jehova ụtọ ịchọta ndị nwere obi ekele. (1 Timoti 2:4) Dịkwa ka ahụmahụ ndị a kọworo na-egosipụta, Jehova enyeghachiwo ụgwọ ọrụ n’ụba maka mgbalị nile e tinyere n’ime nkwusa n’obodo nta dị iche iche dị na Spain.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Josephus gụkọrọ na e nwere ngụkọta nke 204 “obodo ukwu na obodo nta dị iche iche” na Galilii, ọ kọwakwara ógbè ahụ dị ka nke nwere “ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke obodo nta.”

[[Map dị na peeji 23]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

FRANCE

PORTUGAL

SPAIN

AGWAETITI BALEARIC

AGWAETITI CANARY

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]

Vilac, Lérida

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]

Puebla de Sanabria, Zamora

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]

Casarabonela, Málaga

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]

Sinués, Huesca

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]

Lekeitio, Vizcaya

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya