Ime Nkwusa n’Ala Nwere Ọtụtụ Ọdịiche
ANỤ ọhịa kangaroo, koala, wombat, na platypus, Nkume Ayers nakwa Oké Mkputamkpu Ala si n’osimiri pụta—ndị a bụ aha ndị na-abata n’uche mgbe ndị mmadụ na-eche banyere Australia. Ma n’ịbụ ihe na-eju anya, eleghị anya ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị Australia agatụbeghị ịhụ Nkume Ayers ma ọ bụ Oké Mkputamkpu Ala ahụ si n’osimiri pụta ma ọ bụ hụ anụ ọhịa koala, wombat, ma ọ bụ platypus ndị na-adịghị n’ogige ụmụ anụmanụ. Ihe kpatara ya bụ na 85 pasent nke ọnụ ọgụgụ ndị bi ná mba ahụ nke dị 17.3 nde bụ ndị bi n’obodo ukwu, na-ebi ná nnukwu obodo ise bụ isi ndị dị n’ụsọ oké osimiri.
Ịhapụ ebe mpụta ụsọ osimiri ahụ ma gawa n’ebe ime ime nke dị 200 kilomita ma ọ bụ karịa, mmadụ na-abịarute ná mmalite nke ebe ugbo a ma ama nke kọntinent ahụ. Mbara ala ya na-agbanwe site n’oké ọhịa nke ahịhịa ndụ na ala na-emepụta nri gaa n’ala oké okpomọkụ nke na-enwekebeghị ọhịa, ebe nanị ihe ọkụkụ na ahịhịa na-abaghị uru na-eto. Otú ọ dị e nwere ndụ n’ebe ndị ahụ dịpụrụ adịpụ. Nnukwu ogige atụrụ na ehi na-ejupụta ọtụtụ narị square kilomita. Bamikwuo n’ebe ime ime, e nwere ọzara ndị dị oké ọkụ, ebe ndị mmadụ na-anwụ mgbe ụfọdụ mgbe a na-akpachapụghị anya nke ọma.
Ozi Ọma ahụ Na-eto nke Ọma
Ọ bụ n’ọnọdụ dị otú ahụ ka a na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ala nke a nke dị n’okpuru. Ọtụtụ puku kwa afọ na-anakwere nkwa Jehova banyere ụwa ọhụrụ nke ezi omume. N’afọ ije ozi gara aga, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ihe karịrị 57,000, na-afọ nke nta ka o jiri okpukpu abụọ karịa nke afọ iri gara aga. Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa ahụ, dịkwa ka ihe ka n’ọtụtụ ná ndị bi ná mba ahụ, jupụtara n’obodo ndị dị n’ụsọ osimiri, ozi ọma ahụ na-eto nke ọma n’ime ime obodo.
Iji ghọta ihe ọ dị ka ya ikwusa ozi ọma ná nnukwu mbara ala nke a nwere ọtụtụ ọdịiche, ka anyị sonyere otu n’ime ndị nlekọta distriktị ise anyị nwere na nwunye ya ka ha na-eleta ụfọdụ n’ime ọgbakọ ndị dị n’ókèala ndị dị n’ebe ime. Njem ha metụtara steti nke Western Australia, ọkara nke steti nke Queensland, na Northern Territory, bụ́ mbara ala nke ihe karịrị 4.7 nde square kilomita. Nke fọrọ nke nta ka ọ hara ka ọkara nke Europe, ma a gụpụ ebe bụbu Soviet Union.
Njem anyị na-amalite na Perth, isi obodo nke Western Australia. N’obodo nke a bụ obodo ọgbara ọhụrụ n’ụzọ nile nke nwere 1.2 nde ndị mmadụ, e nwere ugbu a 49 ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Tụkwasị n’ọgbakọ Bekee, e nwere ọgbakọ ndị dị n’asụsụ Grik, Italian, Portuguese, na Spanish, tinyere obere ìgwè ndị dị n’asụsụ ndị ọzọ. E nwekwara ọgbakọ nke ihe mejupụtara ya kpam kpam bụ ụmụnna ndị nwoke na nwanyị Aborigine, bụ́ ndị nkwusa ozi ọma ha na-abụkarị n’etiti ndị a nwe kọntinent ahụ. Ọtụtụ n’ime ndị a dị umeala na-aṅa ntị ugbu a n’ozi Alaeze ahụ. Ma olee otú ọnọdụ dị ma a pụọ ná nnukwu obodo ndị ahụ?
Site na Perth anyị tinyere isi 1,800 kilomita n’ebe ugwu nke Port Hedland, bụ́ ebe a gaje inwe mgbakọ sekit. Ihe ka ọtụtụ ná 289 ndị bịaranụ emewo njem dị n’agbata 200 na 700 kilomita iji nọrọ ebe a. Ha sitere n’ókèala ndị dịpụrụ adịpụ ebe ọgbakọ kasị dịrị ha nso pụrụ ịdị 250 kilomita site n’ụzọ ndị na-adịghị larịị ndị jupụtara na nkume ndị pịrị ọnụ, ndị na-adụpukarị taya ụgbọ ala. Ọgbakọ atọ e nwere n’ókèala nke a ewuwo Ụlọ Nzukọ Alaeze n’oge na-adịbeghị anya, na-eji usoro iwu ụlọ ngwa ngwa.
Ụlọ Nzukọ Ndị E Wuru Ngwa Ngwa n’Ókèala Ndị Dịpụrụ Adịpụ
Lee ọdịiche dị n’etiti iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ókèala ndị a na iwu otu ná nnukwu obodo na obodo ukwu dị iche iche! A ghaghị iji gwongworo bubata ihe ka ọtụtụ n’ime ihe ndị e ji ewu ụlọ site na Perth, nke dị 1,600 kilomita n’ebe ndịda. Ọtụtụ narị ụmụnna nwoke na nwanyị na-eme njem ogologo nke a ma ọ bụ karịa ná ngwụsị izu nke e mere atụmatụ ya ịbịa ma wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze n’okpuru okpomọkụ dị 105 ruo 115 degree Fahrenheit. Nnubata dị otú ahụ n’ime ógbè dịpụrụ adịpụ bụ ịgba àmà pụrụ iche n’onwe ya. Mgbe e wuru otu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Tom Price, bụ́ otu obere obodo a na-egwupụta ígwè, ihu akwụkwọ nke otu akwụkwọ akụkọ obodo ahụ kwupụtara, sị: “A na-asị ndị ọrụ aka na ndị inyeaka afọ ofufo bịara iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova ‘ngwa ngwa’ n’ime ụbọchị atọ na Tom Price unu abịala.”
O yiri ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile nọ n’obodo chọrọ inye nkwado. Kama ịnara ọnụ ego $11,000 ọ na-anakarị maka iji bute ngwongwo dị 50 tọn, otu onye mmesapụ aka nwere gwongworo gwara ụmụnna ahụ nanị ka ha tụọ ụtụ maka petrol. Ndị ọrụ ngó obodo ahụ na-arụ ọrụ ite ágbà nyere 100 lita nke ágbà. Ndị ọrụ ngó nwere ígwè katapila wepụtara ígwè ọrụ, ụlọ ọrụ ahụ na-egwupụta ihe wepụtara otu ígwè ọrụ na-adọli ihe n’anaghị ego ọ bụla. Ịchọta ebe 300 ndị ọbịa ahụ ga-ehi ghọrọ nsogbu, ma nkwado site n’aka ndị obodo ahụ pụtara nnọọ ìhè. Ụfọdụ kpọrọ na fon wee nye àkwà ndina. Otu nwoke kpọrọ na fon ikwu na ya agaghị anọ ya ná ngwụsị izu ahụ kama na ya agaghị akpọchi azụ ụlọ ya akpọchi. Ọ sịrị: “Werenụ ụlọ m ji mere ihe n’oge nile unu nọ n’ọrụ ahụ.”
Otu ihe na-atọ ọchị mere mgbe e nyere ụmụnna ụfọdụ adres ebe ha ga-eje bute otu ụgbọ ala obu ngwongwo nke sekit dị n’ógbè ahụ nwe. O juru ha anya ịhụ otu akara dị na geti nke na-asị, “A Chọghị Ndị Ozi Ọma.” Ma ụgbọ ala obu ngwongwo ahụ dị n’ebe ahụ. Ya mere ha gwara nwunye onye nwe ụlọ ahụ na ha chọrọ iburu ụgbọ ala obu ngwongwo ahụ, bụ́ nke jupụtara n’ihe mkpofu. Mgbe ha nọ na-ehichasị ya, ha chọpụtara na mberede na ọ bụghị ụgbọ ala obu ngwongwo nke sekit! Mgbe onye nwe ụgbọ ala obu ngwongwo ahụ lọtara, nwunye ya gwara ya na Ndịàmà Jehova eburuwo ụgbọ ala obu ngwongwo ya. N’oge na-adịghị anya ụmụnna ahụ bughachitere ụgbọ ala obu ngwongwo ahụ nke ihe na-adịkwaghị n’ime ya ugbu a, na-akọwa nghọtahie ahụ. Nkwurịta okwu mara mma sochiri, ndị a bụ ndị mmegide na mbụ nwere ọtụtụ ajụjụ ịjụ banyere anyị na ọrụ anyị. Ugbu a ha chọrọ ịbịa hụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ahụ.
Ikwusa ozi ọma n’ókèala nke a chọrọ inwe ntachi obi. Nke mbụ, e nwere nsogbu nke ịdị anya. Otu nwanna nwanyị onye ọsụ ụzọ na di ya na-ejikarị ụgbọ ala agazu ihe karịrị 350 kilomita ma ojije ma ọlịla n’ụzọ na-adịghị larịị, nke jupụtara n’uzuzu, site na Port Hedland ruo Marble Bar, ije mee nletaghachi na iduzi ọmụmụ Bible. Marble Bar so n’ebe ndị kasị adị ọkụ n’Australia, okpomọkụ na-erukarị ihe karịrị 120 degree Fahrenheit site n’October ruo March.
Itinye Isi ná “Nsọtụ Ebe Ugwu”
Darwin, nke dị 2,500 kilomita n’ime ime ebe ugwu, bụ obodo ọzọ a ga-enwe mgbakọ sekit. Onye nlekọta distriktị ahụ na nwunye ya na-eji ogologo hour nke ime njem eme ihe iji nọgide na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye. Ha na-ebu ụzọ agụ ma na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị. Mgbe ahụ ha na-egere ọgụgụ Bible dị na tepu. Ebe ha na-eke ịkwọ ụgbọ ala eke, ha na-ekekwa ịgụpụta isiokwu ndị sitere n’Ụlọ Nche na Teta! eke.
Otu akara ụzọ na-adọ ha aka ná ntị ịmụrụ anya maka “ụgbọ ala obu ngwongwo ndị dị oké ogologo.” Ndị ahụ bụ isi ụgbọ ndị na-adọkpụ ụgbọ ala obu ngwongwo atọ ma ọ bụ anọ ma na-eru ọ̀tụ̀tụ̀ 55 mita n’ịdị ogologo ya nile. Ya mere e kwesịrị inwe ụzọ sara mbara mgbe a na-agbafe ya. A na-eji ha eme ihe ibuga ehi na ngwongwo ndị ọzọ n’obodo ndị dịpụrụ adịpụ.
Ihu igwe na-adịkarị ọkụ, akụkụ ime obodo ahụ kọrọ akọ. A pụrụ ịghọtahie ala akọrọ ahụ ma eleghị anya dị ka ebe a na-eli ozu n’ihi na ala ahụ jupụtara n’ụlọ mkpu ndị e wusara ewusa. Ụlọ mkpu ndị a nwere ụcha dị iche iche, na-adabere n’ájá nke mkpu ndị ahụ ji mee ihe, ha pụkwara ịdị ihe dị ka malite n’otu mita ruo mita abụọ na ọkara n’ịdị elu. Mgbe ahụ, ka ndị njem anyị na-agafe Osimiri Victoria, ọtụtụ ihe odide e dere n’ụlọ na-adọrọ uche ha. “Ihe Ize Ndụ: A Dịghị Egwu Mmiri n’Ebe A. Agụiyi Ndị Na-eri Mmadụ Dị n’Osimiri Ndị A!” ka otu kwuru. N’ụzọ amamihe, ha kpebiri ịchọta ụzọ ndị ọzọ ha ga-esi saa ahụ ma mee ka ahụ jụọ ha oyi!
N’ikpeazụ, ha rutere ná nsọtụ ebe ugwu nke Australia, nke onye ọ bụla maara dị ka “Nsọtụ Ebe Ugwu.” Darwin, bụ́ isi obodo nke Northern Territory, bụ ebe e nwere ọgbakọ abụọ buru ibu nke Ndịàmà Jehova. A pụrụ ịhụ ịdị ọtụtụ nke ndị si ebe dịgasị iche iche bi na Darwin mgbe a na-aga mgbakọ sekit. Onye a bụ Charles nke dị 30 afọ, onye siteburu na East Timor agha tisara nke dị n’Indonesia. Ndị China mụrụ ya zụlitere ya ikere òkè n’ofufe nke ndị nna ochie. O tinyewokwa aka miri emi n’egwuregwu karat. Isi na ya pụta adịghị mfe n’ihi njikọ siri ike o nwere ná mgbaasị. Otú ọ dị, n’iburu n’uche nkwa Jisọs na “eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu,” o nweere onwe ya pụọ n’ụzọ ndụ nke a. (Jọn 8:32) “Taa,” ka ọ sịrị, “enwere m akọ na uche dị ọcha n’ihu Jehova, m na-ejekwa ozi ugbu a dị ka ohu na-eje ozi. Ihe mgbaru ọsọ m bụ ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi.”
Ọzọ, onye a Beverly nke sitere Papua New Guinea. “Na mbụ obi esichaghị m ike ịgbara ndị ọcha àmà,” ka Beverly na-ekwupụta, “n’ihi na Bekee bụ asụsụ m nke abụọ, okwu ụfọdụkwa, ya na mkpọpụta okwu ndị Australia, mere ka o siere m ike ịghọta. Ma site n’icheta na Bible na-agwa anyị ka anyị tụkwasị obi na Jehova na idetụ ya ire ma hụ na ọ dị mma, amalitere m ozi ọsụ ụzọ oge nile na January 1991. Onye mbụ m duziiri ọmụmụ Bible bụ onye ọsụ ụzọ ugbu a. Ụmụ ya ndị inyom anakwerewokwa eziokwu, otu n’ime ha na-arụkwa ọsụ ụzọ, ya na di ya.”
Tupu anyị ahapụ Darwin, ka anyị mee njem dị ngwa gaa 250 kilomita n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ogige ntụrụndụ Kakadu National Park, nke a maara nke ọma maka ijupụta n’ụmụ nnunu. N’ebe a anyị zutere Debbie, bụ́ onye nkwusa ozi ọma nanị ya nọ n’ókèala ahụ nile. Anyị jụrụ ya ụzọ o si enwe ike anọgidesi ike n’ime mmụọ n’ebe dịpụrụ adịpụ otú a. Ọ zaghachiri, sị: “Nke mbụ, site n’ekpere. . . . Ana m enwetakwa nkasi obi site n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Aịsaịa 41:10, nke na-asị: ‘Atụla egwu, gị ka m nọnyeere: elela anya gburugburu n’ụjọ, n’ihi na mụ onwe m bụ Chineke gị: m ga-agba gị ume; ee, m ga-enyere gị aka; ee, m ga-eji aka nri nke ezi omume m kwagide gị.’”
Na Jilkmingan, nke dị 450 kilomita n’ebe ndịda nke Darwin, anyị zutere otu obere ìgwè ndị Aborigine. Ruo ọtụtụ afọ e weere obodo ndị Aborigine nke a dị ka obodo nke Ndịàmà Jehova n’ihi na ọtụtụ na-abịachi anya ná mgbakọ ukwu nakwa mgbakọ dị iche iche, ọ bụ ezie na ọ dịghị otu onye n’ime ha e meworo baptism. A maara obodo ahụ maka ịdị ọcha ya. Dị ka ihe obi ụtọ, ụfọdụ ewerewo nguzo siri ike ugbu a maka eziokwu, bụrụkwa ndị e mere baptism. Ha so n’ime ndị Aborigine mbụ bi n’ime obodo mere otú ahụ. Ọ na-ewe ezi obi ike na ndabere n’ebe mmụọ nsọ Jehova dị n’ebe ndị a dị umeala n’obi nọ iji wee nwere onwe ha pụọ n’omenala nakwa omume mgbaasị dịworo ọtụtụ narị afọ nke ndị agbụrụ ha.
Ịga n’Alice Springs na Isi n’Ebe ahụ Dịpụrụ Adịpụ Pụta
Ugbu a oge eruwo ịhapụ “Nsọtụ Ebe Ugwu” ahụ na itinye isi 1,600 kilomita n’ebe ndịda nke Alice Springs, n’ebe “Ogige Uhie” nke kọntinent ahụ dị, n’ebe dịdebere Nkume Ayers ahụ a ma ama. N’ebe a n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ nwere ntụoyi, a rụrụ oche na-enye ntụsara ahụ maka mgbakọ, nke 130 ma ọ bụ karịa na-abịa site n’ọgbakọ abụọ e nwere n’ókèala nke a. Ọzọ, anyị hụrụ ihu obi ụtọ nke ndị Polynesia, Europe, na Aborigine ka ha na-ezukọta ná mkpakọrịta nke ndị Kraịst.
N’ikpeazụ anyị hapụrụ Alice Springs wee malite akụkụ ikpeazụ nke njem ahụ anyị na onye nlekọta distriktị na-ejegharị ejegharị na nwunye ya na-eme. Njem nke a were anyị ihe dị ka 2,000 kilomita iji gagharịa kọntinent ahụ, na-eje n’ebe ugwu na n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị na-asị ebe ime ime obodo ahụ ka e mesịa, n’ihi na anyị mesịrị rute n’ebe oké ọhịa ahịhịa ndụ nke Queensland. N’ebe a, n’ụsọ osimiri nke ebe ugwu Queensland—ala nke Oké Mkputamkpu Ala si n’osimiri pụta—e nwere ọtụtụ ọgbakọ ndị nwere ọnụ ọgụgụ Ndịàmà dị elu ma e jiri ya tụnyere ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ebe ahụ.
Otú ọ dị, njem anyị agwụsịbeghị ruo mgbe anyị jekwuru otu mgbakọ sekit. Tupu anyị abanye ụgbọ elu na-aga Cairns—obodo okpomọkụ Queensland nke e ji Mkputamkpu Ala si n’osimiri pụta wee mara—anyị hapụrụ ókèala bụ isi nke Australia wee jiri ụgbọ elu gawa n’ebe ugwu nke nsọtụ Cape York Peninsula, ma a gafee Torres Strait, ije Thursday Island. E nwere otu obere ọgbakọ nke nwere nanị 23 ndị nkwusa n’ebe a. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ 63 ndị bịaranụ ná mgbakọ ikpeazụ anyị gara ná njem nke a!
Anyị nwere olileanya na nnyocha nke a nke ọrụ nkwusa Alaeze a na-arụ n’ala nke a nke nwere ọtụtụ ọdịiche atọwo gị ụtọ. Eleghị anya otu ụbọchị ị ga-enwe ike ileta anyị n’ala nke a na-akpali akpali nke dị n’okpuru ma jiri anya gị hụ ụmụnna nwoke na nwanyị ndị jiworo ikwesị ntụkwasị obi na-ejezu ozi ha n’ọrụ ha nke pụrụ iche.
[Map/Foto dị na peeji nke 23]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Port Hedland
Canberra
Tom Price
Marble Bar
Newman
Darwin
Katherine
Alice Springs
Nkume Ayers
Thursday Island
Cairns
Adelaide
Melbourne
Hobart
Sydney
Brisbane
Perth
[Foto dị na peeji nke 24]
Perth, isi obodo nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Australia
[Foto dị na peeji nke 25]
Ịgba àmà okporo ụzọ na-arụpụta ihe ndị dị mma