Jehova Na-echebe Ndị Ya Na Hungary
HUNGARY, nke dị n’etiti Europe, anọkarịwo n’ọgba aghara nke akụkọ ihe mere eme. Ndị ya ahụjuwo anya nke ukwuu, n’agbanyeghị na a rarawo ha nye n’aka Meri Na-amaghị Nwoke ma manye ha ịghọ ndị Kraịst nanị n’aha n’afọ 1001 site n’aka Stephen, bụ eze ha nke mbụ.
Eri ọtụtụ narị afọ, e mere ka Hungary ghara isi ike site n’ọtụtụ mburịta agha obodo nke nyere ohere ka mba ndị ọzọ merie ya mgbe mgbe. E kpochapụrụ ndị nile bi n’ime obodo ụfọdụ n’oge mburịta agha ndị a, nke ndị si ná mba ọzọ mesịrị bichie na ha. Otú a, ndị bi ná mba ahụ ghọrọ ngwakọrịta nke ọtụtụ ndị si ná mba dị iche iche. N’ụzọ okpukpe, ihe ruru ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị bi ná mba ahụ nọgidere bụrụ ndị Katọlik, ọ bụ ezie na chọọchị Mgbanwe mesịrị gbasaa n’akụkụ ụfọdụ.
Mmalite Dị Ala
Ọ bụ na 1908 ka a kụrụ mkpụrụ nke eziokwu Bible na mbụ na Hungary. E mere nke a site n’aka otu nwanyị nke mụtaworo eziokwu site n’ọnụ Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. N’ihi nkwusa ya, ọtụtụ ghọrọ ndị nwere mmasị n’ozi ọma ahụ. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị ndị ikom abụọ na-alaghachi na Hungary site na United States gbasara ozi ọma ahụ n’oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ. Eziokwu gbasara n’ụzọ dị nwayọọ nakwa n’ụzọ e ji n’aka, e guzobekwara otu ụlọ ọrụ nke nwere ígwè na-ebi akwụkwọ na Kolozsvár.
A natara akụkọ ozi mbụ kwesịrị ndabere na 1922, mgbe 67 Ndị Mmụta Bible sitere na nnukwu obodo iri bịara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst. Ọrụ ịgba àmà ha nwere mmetụta ozugbo ahụ, na-akpata mmegide ka ndị ụkọchukwu na-akpali ndị gọọmenti na ndị na-ebi akwụkwọ akụkọ igbochi ọrụ nkwusa ahụ.
Mwakpo ahụ Esie Ike
Na 1928, onye ụkọchukwu ndị Katọlik bụ́ Zoltán Nyisztor wepụtara otu akwụkwọ nta a kpọrọ Millennialist Bible Students. N’ime ya o kwuru banyere Ndị Mmụta Bible, sị: “Ha dị njọ karịa ndị kọmunist ntụtụ isi ha na-acha ọbara ọbara bụ́ ndị na-eji ngwá agha alụ ọgụ, n’ihi na ndị a na-eduhie ndị na-amaghị nke a na-akọ site n’izo n’azụ Bible. Ụlọ ọrụ Royal State Police nke Hungary ji ịnụ ọkụ n’obi na-eleba anya n’ọrụ ha.”
N’oge ahụ otu nwanna na-anụ ọkụ n’obi aha ya bụ Josef Kiss letara ọgbakọ ndị e nwere n’ebe ahụ. Ndị agha uwe ojii ji nwayọọ na-eso ya. Na 1931 ọ nọ n’ụlọ otu nwanna mgbe ndị uwe ojii mere ihe juru ya anya wee nye ya iwu ka ọ pụọ ozugbo. Ka Nwanna Kiss malitere ịkwakọ ngwongwo ya, otu onye agha uwe ojii kụrụ ya ike égbè ya ma yie ya egwu, sị: “Mee ọsọ ọsọ, ma ọ bụ a magbuo gị!” Nwanna Kiss mụmụrụ ọnụ ọchị wee kwuo, sị: “Mgbe ahụ m ga-eru ụlọ ngwa ngwa,” na-ezo aka n’olileanya eluigwe ya dị ka onye Kraịst e tere mmanụ.
Ndị agha ahụ sogidere Nwanna Kiss ruo n’ụgbọ okporo ígwè. A tụrụ anya na ọ ga-abịarute n’ọgbakọ dị na Debrecen na June 20, 1931, a hụghị ya anya. Ụmụnna kwubiri na ndị iro ya egbuwo ya, na ọ “lara ụlọ” n’ezie gaa ná nkwụghachi ụgwọ eluigwe ya. Ọ bụ ezie na a kwụsịrị ọrụ ya, ọ dịghị mgbe ndị ọchịchị ahụ nwere ike imenyụ ìhè nke eziokwu ahụ.
Ọtụtụ mgbe e ji ịdị akọ mee ihe iji nwee ike ịgba àmà. Dị ka ihe atụ, n’etiti afọ ndị 1930, otu nwanna nwụrụ na Tiszakarád. A pụrụ iduzi ememe ili ozu mgbe ahụ nanị site n’ikike nke ndị isi ọchịchị. E nyere ụmụnna ohere nanị maka otu minit ekpere na otu minit abụ. Ndị òtù ndị agha uwe ojii, bụ́ ndị ji égbè na mma a na-akwụnye n’égbè bịara ememe ili ozu ahụ, bụ ndị e chere na ha ga-ahụ na e debere iwu a. Ọtụtụ ndị obodo bịara n’ihi na ha chọrọ ịma ụzọ a ga-esi duzie ememe ili ozu ahụ.
Otu nwanna nwoke guzoro n’akụkụ igbe ozu ahụ wee kpee ekpere ruo ọkara otu hour kama n’ụzọ nke mere na ndị mmadụ sịrị na ha anụtụbeghị ihe ọ bụla yiri ya. “Ọbụna ma a sị na ndị ụkọchukwu isii duziri ememe ili ozu ahụ,” ka ha sịrị, “ọ garaghị emetụworị n’ahụ otú ahụ.” Mgbe ahụ otu nwanna nwere olu dị mma malitere abụ ahụ, ma otu onye agha uwe ojii nyere ya iwu ka o mechie ọnụ. Ndị uwe ojii mesịrị kwupụta na, ọ bụ ezie na ahụ erughị ha ala, ha pụghị ịkwụsị ekpere ahụ.
Ka mwakpo ahụ nọgidere na-aga n’ihu, Lajos Szabó, bụ́ onye ụkọchukwu Chọọchị Reform, dere ihe a na-esonụ n’akwụkwọ nta ya nke 1935 bụ́ Antichrist by the River Tisza, sị: “Ọ bụ omume ịdị akọ iji ụkpụrụ kọmunism zụọ uche ndị mmadụ n’aha okpukpe . . . Marx bịara n’oyiyi Kraịst . . . Onye Mmegide Kraịst ahụ bịara ebe a n’uwe mwụda ọbara ọbara ya n’etiti Ndịàmà Jehova.”
Afọ Ndị A Nọ ná Mmachibido Iwu
Na 1939 a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu kpam kpam. A kpọrọ ya ihe omume nke “megidere okpukpe, megidekwa ọha mmadụ.” Okpukpe ndị Adventist, Baptist, Evangelical, na Presbyterian bipụtara akwụkwọ nta megide Ndịàmà ahụ. Ma Jehova agbahapụghị ndị ohu ya, Ndịàmà nọ ná mba ndị ọzọ lekọtakwara ha. Tụkwasị na nke ahụ, ndị Chineke nọ na Hungary nwere ọtụtụ ahụmahụ ndị na-ewusi okwukwe ike.
Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwanna bubatara otu akpa jupụtara na magazin anyị site na Czechoslovakia, onye ọfisa ndị ọrụ ahịa iwu jụrụ, sị: “Olee ihe dị n’akpa gị?” Nwanna ahụ ji eziokwu zaa, sị: “Ụlọ Nche.” Mgbe ahụ onye ọfisa ahụ megharịrị aka ya dị ka ọ̀ na-egosi na isi adịghị nwanna ahụ mma, ọ hapụkwara ya ka ọ gawara onwe ya. Otú a, nri ime mmụọ bịarutere na Hungary n’enweghị nsogbu.
Ma, mwakwasị ahụ akwụsịghị. E jidere ọtụtụ ụmụnna ma kpọchie ha n’ime oge dị iche iche. Mgbe ahụ e nyere otu òtù pụrụ iche na-eme nchọpụta ọrụ nke imesi Ndịàmà Jehova ike. Na 1942, a chịkọtara ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị tinye ha n’ụlọ ịnyịnya nakwa n’ụlọ akwụkwọ ndị Juu tọgbọ nkịtị. Mgbe ọnwa abụọ nke mmekpa ahụ gasịrị, e kpere ha ikpe ma maa ha ikpe. A mara ụfọdụ ikpe ịnọ n’ụlọ mkpọrọ n’afọ ndụ ha nile; a mara ndị ọzọ ikpe ịnọ afọ 2 ruo 15 n’ụlọ mkpọrọ. Ụmụnna atọ—Dénes Faluvégi, András Bartha, na János Konrád—bụ ndị a mara ikpe ọnwụ site ná nkwụgbu, ma e mesịrị gbanwee ọmụma ikpe ahụ ịbụ ịnọ n’ụlọ mkpọrọ n’afọ ndụ ha nile. Mgbe ahụ, a kpọgara 160 ụmụnna n’ogige ọnwụ dị na Bor. Mgbe ha gafesịrị ókèala, a gwara ha na ha agaghị alata ná ndụ. N’ime 6,000 ndị Juu a gbaara ụgbọ nwa mkpi, bụ́ ndị a kpọgara n’ogige a, nanị 83 nọgidere ndụ. Otú ọ dị, e wezụga mmadụ anọ, Ndịàmà ahụ nile laghachiri.
E gburu Ndịàmà Jehova ụfọdụ n’ihi okwukwe ha. N’ọgwụgwụ nke Agha Ụwa nke Abụọ, ndị Nazi gburu ọtụtụ ụmụnna. A gbagburu Bertalan Szabó, János Zsondor, na Antal Hónis, a kwugbukwara Lajos Deli.—Matiu 24:9.
Mgbanwe Dị Mma Bụ Nanị Nwa Oge
Mgbe agha ụwa nke abụọ gasịrị, ọnọdụ gbanwere ọzọ. Gọọmenti abụọ bịakọrọ ọnụ kwere nkwa ihe ndị ruru mmadụ. Ụmụnna ndị si n’ogige ndị ahụ na-alaghachi malitere ozugbo ikwusa ozi ọma na ịhazi ọgbakọ dị iche iche. Ha chere na Jehova enyewo ha nnwere onwe ka ha wee nwee ike ito oké aha ya, ọ bụghị ka ha wee gbalịa ịkpakọta ihe onwunwe. N’ọgwụgwụ nke 1945, e nwere 590 ndị nkwusa Alaeze na-arụsi ọrụ ike. Na 1947, a zụtara otu ihe owuwu a ga-eji mee ihe dị ka alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society, e mekwara mgbakọ mbụ nke zuru mba ọnụ, n’otu ụlọ nzukọ egwuregwu. Ndị bịaranụ dị 1,200, ọbụna ndị ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè nke mba Hungary wepụụrụ ndị na-aga mgbakọ 50 pasent n’ego ha kwụrụ.
Otú ọ dị, nnwere onwe ahụ adịteghị anya. N’oge na-adịghị anya, òtù Communist Party banyere n’ọchịchị, gọọmenti wee gbanwee. Mmụba nke ndị Jehova dọọrọ uche nke gọọmenti ọhụrụ ahụ, n’ihi na ha amụbawo site na 1,253 ndị nkwusa na 1947 ruo 2,307 na 1950. N’afọ ahụ ndị isi ọchịchị malitere itinye ihe mgbochi n’ọrụ nkwusa ahụ. A chọrọ ka e nweta ikike, ma gọọmenti jụrụ inye ha, Ndị Agha Uwe Ojii tikwara ndị ahụ tinyere akwụkwọ inweta ikike ihe. Isiokwu dị iche iche nke akwụkwọ akụkọ kwugidere Ndịàmà ahụ mgbe nile dị ka ‘ndị ozi nke ndị ọchịchị mba ọzọ.’ N’ụzọ na-adọrọ mmasị, tupu Kọmunism abata n’ọchịchị, e zigawo Ndịàmà ahụ n’ogige mkpọrọ dị ka ndị e boro ebubo na ha bụ ‘ndị nkwado nke Kọmunism ndị Juu.’
Mmekpọ Ọnụ ahụ Amalite
Na November 13, 1950, e jidere onye nlekọta alaka na onye nsụgharị okwu (abụọ n’ime ndị a maburu ikpe ọnwụ), ha na onye nlekọta nke sekit mbụ. A kpọgara ha n’ụlọ mkpọrọ nzuzo ahụ a ma ama dị na 60 Andrássy Street na Budapest, ịbụ ndị “a gwọrọ ịba.” Ikpe ha weere ọnọdụ na February 2 nke afọ na-esonụ. A mara onye nlekọta alaka ahụ ikpe ịga mkpọrọ afọ iri, onye nsụgharị ahụ ịga mkpọrọ afọ itoolu, onye nlekọta sekit ahụ ịgakwa mkpọrọ afọ asatọ. A kwakọọrọ ihe onwunwe mmadụ atọ ahụ. N’oge ikpe ahụ, a mara ndị nlekọta ọgbakọ anọ ọzọ ikpe ịga mkpọrọ malite n’agbata afọ ise ruo afọ isii n’ebubo ndị metụtara ịnwa ịkwatu gọọmenti.
E tinyere ụmụnna ahụ n’ụlọ mkpọrọ a na-echesi nche ike, bụ́ ebe ha na-apụghị ịnata akwụkwọ ozi, ngwugwu, ma ọ bụ ndị ọbịa ọ bụla. Ezinụlọ ha anụghị ihe ọ bụla banyere ha. Ndị nche ahụ apụghị ọbụna ịkpọ aha ha. Maka iji mata ha, nke ọ bụla yi ihe mmata e ji osisi mee nke e konyere ya n’olu nke nwere nọmba e dere na ya. E nwere ọbụna otu ihe odide dị n’ahụ ájá nke na-agụ, sị: “Ya abụla nanị nche ka ị na-eche ndị mkpọrọ; kpọọ ha asị.”
Ndịàmà ahụ jere ozi ná nzuzo, ma ọrụ nkwusa ahụ akwụsịghị. Ndịàmà ndị ọzọ weghaara ọnọdụ nke ndị ahụ a tụrụ mkpọrọ. Mgbe oge na-aga e jidekwara ndị ahụ nọchiri anya ha. Ka ọ na-erule afọ 1953, a mawo ihe karịrị 500 ụmụnna ikpe ma tụọ ha mkpọrọ, ma a pụghị iji mkpọrọ kee ozi ọma ahụ agbụ. Nanị ụmụnna ole na ole kwetara nkwa nrafu nke ndị nche ahụ wee mebie okwukwe ha.
Olileanya Ndị Dị Mma
N’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ 1956, ndị mmadụ malitere inupụ isi megide gọọmenti ahụ. Ndị Agha Soviet kwụsịrị nnupụisi ahụ, òtù Communist Party banyeghachiri n’ọchịchị.
A tọhapụwo Ndịàmà nile a tụrụ mkpọrọ, ma mgbe ahụ e zighachiri ụmụnna ole na ole a maara nke ọma n’ụlọ mkpọrọ ịga n’ihu n’ikpe a mara ha, ọ bụ ezie na a maghị ndị ọhụrụ ikpe. N’ikpeazụ, na 1964, ọnọdụ malitere ịdị mma. Ndị isi ọchịchị adịghị emekwa ihe ọ bụla iji gbochie ememe ili ozu na oriri agbamakwụkwọ. E mere mgbakọ sekit dị iche iche n’ọhịa. Ọ bụ ezie na a kwụsịrị ụfọdụ n’ime ndị a, ọ dịghị Ndịàmà ọ bụla ọzọ a tụrụ mkpọrọ.
Na 1979, e nyere ụmụnna ndị nọ n’ọkwa nlekọta ohere ịga mgbakọ e nwere na Vienna. N’afọ ahụkwa, ndị isi ọchịchị kwere nkwa inye Ndịàmà Jehova nnabata iwu, ma afọ iri ọzọ gabigara tupu nke a emee n’ezie. Na 1986 e mere mgbakọ distrikti nke mbụ, n’ogige Youth Park nke Kamara Forest, nke ndị isi ọchịchị maara banyere ya. A mapawara ọbụna otu ihe odide, nke na-asị na nke a bụ Mgbakọ Distrikti “Udo nke Chineke” nke Ndịàmà Jehova. N’afọ na-esonụ, e mere Mgbakọ “Tụkwasị Jehova Obi,” na 1988 ụmụnna nwetara ọṅụ ná Mgbakọ “Ikpe Chineke.”
Inwe Onwe n’Ikpeazụ!
June 27, 1989, bụ ụbọchị dị ịtụnanya, n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka ụmụnna natara akwụkwọ nke na-enye Nzukọ Okpukpe nke Ndịàmà Jehova nnabata iwu na Hungary. Na July, ụlọ ezumezu obodo bụ́ Budapest Sports Hall batara 9,477 bịara ná Mgbakọ Distrikti “Nsọpụrụ Chineke.” E jikwa otu ụlọ nzukọ ahụ mee ihe maka Mgbakọ Distrikti “Asụsụ Dị Ọcha” na 1990, e nwekwara mgbakọ n’obodo ukwu atọ ndị ọzọ na Hungary.
Ugbu a e wepụworo mmachibido iwu ahụ kpam kpam, o kwere omume ịhazi mgbakọ mba nile nke mbụ. N’agbanyeghị ihu igwe na-adịghị mma, e mere ya na Népstadion dị na Budapest, bụ́ ebe 40,601 zukọrọ inweta ikpo ọkụ nke ịhụnanya ụmụnna. Ndị so n’Òtù Na-achị Isi bịara ma wusie okwukwe ụmụnna ahụ ike site n’okwu ha, e wepụtakwara akwụkwọ na akwụkwọ nta ọhụrụ dị iche iche ndị nwere ihe osise tụrụ àgwà mara mma ná mgbakọ a.
Gịnị Na-eme Taa
Mbipụta Ụlọ Nche na Teta! n’asụsụ Hungary na-apụta ugbu a n’otu oge ahụ ndị nke Bekee na-eji apụta, nakwa n’ụdị ụkpụrụ mbipụta ahụ mara mma. Na 1992 a malitere ibipụta Yearbook n’asụsụ Hungary. Ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa nke ozi ọma rịrị elu nke ukwuu malite na 6,352 na 1971 ruo 13,136 na January 1993.
Taa, Ndịàmà Jehova na Hungary nwere nnwere onwe okpukpe ma na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’enweghị mgbochi. E nwere 205 ọgbakọ, 27,844 bịakwara Ememe Ncheta n’April 17, 1992. Ruo mgbe e nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze zuru ezu, ọgbakọ ndị ahụ nọgidere na-ezukọ n’ụlọ akwụkwọ, ogige ọdịnala, ogige ndị agha mmadụ na-ebighị, nakwa ọbụna ọfis ndị ghere oghe nke òtù Communist Party. Ka ọ na-erule 1992, ọgbakọ iri ararawo Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ha nye, a na-ewukwa ụlọ nzukọ ndị ọzọ.
N’oge nile ahụ e nwere mgbanwe na oge nnupụisi ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ụmụnna ahụ anọgidewo na-ekwesị ntụkwasị obi n’akụkụ Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, ha anọgidewokwa na-ekwusa ozi ọma. Ọgba aghara nile nke oge a ebibibeghị ha, n’ihi na Jehova echebewo ndị ya na Hungary.—Ilu 18:10.
[Map dị na peeji 9]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Vienna
AUSTRIA
Budapest
Debrecen
HUNGARY
ROMANIA
[Foto dị na peeji nke 10]
Ndị Jehova zukọrọ na Budapest