Jehova Na-agbanwe Oge Na Mgbe A Kara Aka na Romania
IFUFE nke mgbanwe fere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe na 1989. Ka ọ na-erula ọnwa ole na ole, gọọmentị dị iche iche nke guzoburu dị ka ebe e wusịrị ike a na-apụghị ịgafe agafe dakpọrọ ná nsochi ná nsochi. Tinyere mgbanwe nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị e nwekwara mgbanwe nke mmekọrịta ọha mmadụ, akụ na ụba, na nke kasị amasị Ndịàmà Jehova, mgbanwe okpukpe. Site n’otu mba gaa n’ọzọ, e nyere Ndịàmà Jehova ikike nke ọchịchị kwadoro, e weghachikwaara ha nnwere onwe nke ịrụ ọrụ okpukpe ha.
Ma o yiri ka ihe ọ̀ ga-adị iche na Romania. Gọọmentị nwere mmetụta siri ike n’ebe ndị mmadụ nọ nke na o yiri ka ifufe mgbanwe ahụ agaghị eme ihe ọ bụla. Ka Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ nụrụ banyere ihe na-ewere ọnọdụ ná mba Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe ndị ọzọ, ha jụrụ onwe ha, ‘Ànyị ga-enwekwa ike inweta nnwere onwe nke ofufe tupu Amagedọn?’ Obi ha na-achọsị ike oge ahụ mgbe ha pụrụ izukọ ná nzukọ ndị Kraịst dị iche iche ha na ụmụnna ime mmụọ ha ndị nwoke na ndị nwanyị, kwusaa ozi ọma ahụ n’ihu ọha, ma mụọ akwụkwọ ha dabeere na Bible n’ihu ndị mmadụ, n’ezoghị ha ezo mgbe ọ bụla. Ihe ndị ahụ nile yiri nnọọ nrọ.
Mgbe ahụ nrọ ahụ mezuru! O mere na December 1989. N’ụzọ juru onye ọ bụla anya, a kwaturu ọchịchị nke Ceauşescu na mberede. Na mberede, ndị Kraịst ndị ahụ nwetara ntọhapụ. N’April 9, 1990, e nyere Ndịàmà Jehova ike n’ụzọ iwu kwadoro dị ka nzukọ okpukpe na Romania. Jehova agbanwewo oge na mgbe a kara aka maka 17,000 Ndịàmà siri ike n’ebe ahụ.—Tụlee Daniel 2:21.
Akụkọ Ihe Mere Eme Dị Ogologo
Na 1911, Carol Szabo na Josif Kiss laghachiri na Romania site na United States, bụ́ ebe ha mụtaworo eziokwu nke Bible ma rara ndụ ha nye Jehova ime uche ya. Ha chọrọ isoro ndị ala ha kerịta ozi ọma ahụ. Ozugbo ha zọsara ụkwụ na Romania, ha malitere ime nkwusa. Mgbe Agha Ụwa nke Mbụ tiwapụrụ, e jidere ha maka ihe ha na-eme. N’agbanyeghị nke ahụ, mkpụrụ nke Alaeze ahụ ha kụworo amalitewo ịmịpụta mkpụrụ. Ka a na-erule 1920, mgbe a hazigharịrị ọrụ ahụ, e nwere ihe dị ka 1,800 ndị nkwusa Alaeze na Romania.
N’oge ahụ a na-enwe mmetụta nke mmụọ mgbanwe nwuru dị ka ọkụ na Balkan n’ụzọ na-adịwanye ukwuu na Romania, ọgba aghara jupụtakwara ebe nile. N’agbanyeghị oge ndị ahụ siri ike, ụmụnna ime mmụọ anyị ji ọrụ ahụ na-aga n’ihu. Na 1924 Watch Tower Society meghere ụlọ ọrụ na 26 Regina Maria Street na Cluj-Napoca iji lekọta ọrụ ahụ na Romania, Hungary, Bulgaria, Yugoslavia, na Albania.
Otú ọ dị, ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị sikwuru ike, ewezugakwa nsogbu sitere n’aka ndị isi, e nwere nsogbu n’ime nzukọ ahụ. Akwụkwọ 1930 Year Book kọrọ, sị: “N’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi nke onye Society zijere ebe ahụ, ndị enyi agbasawo, a kwawokwa obi ike ha aka nke ukwuu. Society anọwo na-ele anya maka ohere ụfọdụ iji tụteghachi ọrụ ahụ n’ala ahụ, ma ndị isi ógbè ahụ machibidoro ihe ọ bụla iwu, anyị aghaghị icherekwa ruo mgbe Onyenwe anyị meghere ụzọ ka mma.” Mgbe ahụ, na 1930, a họpụtara Martin Magyarosi, otu Onyeàmà bụ́ onye Romania e mere baptism na 1922, dị ka ohu ọhụrụ nke alaka ahụ, e mesịkwara buga ụlọ ọrụ ahụ na 33 Crişana Street, Bucharest. Mgbe ogologo oge nke ịgba mgba gasịrị, n’ikpeazụ e denyere aha Society n’akwụkwọ dị ka ụlọ ọrụ iwu kwadoro na Romania na 1933.
Ihe Isi Ike Gara N’ihu
Ọnwụnwa siri ike nọgidere na-abịakwasị Ndịàmà na Romania. Akwụkwọ 1936 Year Book kọrọ, sị: “Ihe ịrụ ụka adịghị ya na e nweghị akụkụ ụwa ọ bụla nke ụmụnna na-arụ ọrụ n’ihe isi ike dị ukwuu karịa na Rumania.” N’agbanyeghị ihe isi ike nile ahụ, akụkọ ije ozi nke 1937 hotara 75 ọgbakọ nwere 856 ndị nkwusa na Romania. N’Ememe Ncheta, e nwere 2,608 ndị bịaranụ.
Ka Agha Ụwa nke Abụọ nọ na-aga n’ihu, Romania anọgideghị na-abụghị ndị o metụtara. Na September 1940, General Ion Antonescu weghaara ọchịchị na gọọmentị ahụ ma malite ọchịchị nke yiri nke Hitler. Omume nke mmekpọ ọnụ bụ nke a na-ahụkarị ebe nile. E jidere, tie ihe, ma mekpọọ ọtụtụ narị ụmụnna anyị ọnụ. E jidere Nwanna Magyarosi na September 1942, ma ọ ka nwekwara ike ị na-eduzi ọrụ ahụ maka Transylvania site n’ụlọ mkpọrọ.
Mkpagbu gara n’ihu mgbe ndị agha Hitler wakporo mba ahụ na 1944. Akụkọ sitere Bucharest kọwara ọnọdụ ndị dị n’okpuru ọchịchị Nazi: “A kpagburu Ndịàmà Jehova ná mba a n’ụzọ dị egwu. N’ịbụ ndị e tinyekọrọ ha na ndị ọchịchị Kọmụnist n’ụlọ mkpọrọ, ndị ndị ụkọchukwu na-akwado Hitler boro ebubo ịbụ ndị dị njọ karịa ndị Kọmụnist, a mara ọtụtụ n’ime anyị ikpe ịga mkpọrọ 25 afọ, mkpọrọ mkpụrụ ọka, ma ọ bụ ikpe ọnwụ.”
N’ikpeazụ agha ahụ gwụsịrị, na June 1, 1945 kwa, ụlọ ọrụ nke Society na Bucharest maliteghachiri ọrụ. N’agbanyeghị ihe isi ike dị n’inweta akwụkwọ, ndị ọrụ wepụtara onwe ha bipụtara ihe karịrị 860,000 akwụkwọ nta na ihe karịrị 85,000 Ụlọ Nche n’asụsụ Romania na Hungary. Jehova gọziri ịrụsị ọrụ ike ha n’ụba. Ka ọ na-erula 1946, e mere ihe dị ka 1,630 ndị ọhụrụ baptism. Ihe bụ isi n’afọ ahụ bụ mgbakọ ala ahụ nile nke e mere na Bucharest na September 28 na 29. Ndị Ụkọchukwu gbalịrị ike ha nile ịbata ma kwụsị mgbakọ ahụ, ma ha enweghị ihe ịga nke ọma, ihe dị ka 15,000 ndị mmadụ bịakwara okwu ihu ọha ahụ. Ọ bụ nke mbụ ya ụmụnna nọ Romania nwere ike inwe ụdị mgbakọ ahụ.
Society zipụrụ Nwanna Alfred Rütimann site n’alaka Swiss gaa Romania. N’August 1947 o nwere ike ịgwa ihe ruru 4,500 ụmụnna okwu na 16 akụkụ dị iche iche, na-ewuli ha elu maka ihe dị n’ihu. N’oge na-adịghị anya nrụgide ga-abịakwasịkwa Ndịàmà ahụ, nke ugbu a site n’aka ọchịchị ndị Kọmụnist. Na February 1948 ndị ọchịchị machibidoro ọrụ obibi akwụkwọ na nkwusa anyị. Mgbe ahụ, n’August 1949, a wakporo ụlọ ọrụ ahụ dị na 38 Alion Street. Dị ka ihe si na nke a pụta e jidere ọtụtụ ụmụnna, tinyere Nwanna Magyarosi. N’oge a, n’ịbụ ndị e boro ebubo na ha na-akwado ọchịchị eze ukwu, e zijere ha n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ n’ogige a na-arụ ọrụ ike. Ruo 40 afọ ọzọ dị n’ihu, a machibidoro ọrụ ahụ iwu, Ndịàmà Jehova ahụ tara ahụhụ nke ukwuu. Nsogbu ndị iro kpaliri n’ime nzukọ tinyekwuru ihe n’ahụhụ ahụ. N’ikpeazụ, a kwaturu ọchịchị Ceauşescu na 1989, ha nweere onwe ha! Olee ihe ha ga-eji nnwere onwe ha mee ugbu a?
Ime Nkwusa Ihu Ọha Ọzọ
Ndịàmà ahụ egbughị oge ọ bụla. Ha malitere ozugbo ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ma nke a adịghịrị ndị jiworo obi ike na-arụ ọrụ ahụ na nzuzo ruo ọtụtụ afọ mfe site n’ịgba ama mberede. Ahụ erughị ha ala ugbu a ha pụrụ ime nkwusa n’ihu ọha. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha emetụbeghị nke a mbụ, mgbe ikpeazụkwa onye ọ bụla n’ime ha mere nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụ ná ngwụsị afọ ndị 1940. Ụdị ihe dị aṅaa na-esi n’ọrụ ha na-arụ apụta? Ka anyị lee.
Ebe kwesịrị ekwesị ịmalite bụ n’isi obodo ahụ, Bucharest, bụ́ nke nwere 2.5 nde ndị mmadụ bi n’ime ya. Afọ abụọ gara aga, e nwere nanị ọgbakọ anọ n’ime obodo ahụ. Ugbu a, e nwere ọgbakọ iri, ihe karịrị 2,100 bịakwara Ememe Ncheta nke 1992. Ebe a na-eduzi ọtụtụ ọmụmụ Bible ebe obibi na-aga n’ihu n’ihu, a pụrụ iguzobe ọgbakọ ndị ọhụrụ n’oge na-adịghị anya.
Craiova bụ obodo nwere ihe dị ka 300,000 ndị bi n’ime ya, bụ́ nke dị n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke ebe ndịda mba ahụ. Ruo 1990, e nwere nanị ihe dị ka 80 Ndịàmà n’obodo ahụ nile. Mgbe ahụ mmụọ nke ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ wuru ewu, ọrụ ahụ gakwara n’ihu. Na 1992 nanị, e mere 74 ndị mmadụ baptism, a na-eduzikwara ihe karịrị 150 ọmụmụ Bible. N’inwe ihe karịrị 200 ndị nkwusa, ha na-elesi anya ike maka ebe kwesịrị ekwesị maka Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Na Tirgu-Mures, otu nwanna nwanyị bụ Onyeàmà na ụmụnna nwoke abụọ gakwuuru onye ụkọchukwu nke Orthodox ka akachapụ aha ya n’akwụkwọ chọọchị ahụ. Mgbe ọ mụtasịrị nzube ha ji bịa, ụkọchukwu ahụ sịrị ha batawa, ha nwekwara nkwurịta okwu dị mma. Mgbe ahụ ụkọchukwu ahụ kwuru, sị: “M na-atajiri unu anya ma ọ bụghị n’ụzọ ọjọọ. Anyị kwesịrị ịdị na-arụ ọrụ ahụ unu na-arụ. Ọ dị njọ nke ukwuu na Chọọchị Orthodox bụ dike ukwu nke na-ehi ụra”! Ọ naara akwụkwọ nta ahụ bụ́ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu? na otu Ụlọ Nche. Nwanna nwanyị ahụ nwere obi ụtọ na ya abụkwaghị akụkụ nke “dike ukwu [ahụ] nke na-ehi ụra.”—Mkpughe 18:4.
Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na ihe ka ọtụtụ ná ndị na-amụ eziokwu ahụ taa bụ ndị na-eto eto. N’ihi gịnị? Ọ pụtara ìhè na ha tụrụ anya ihe dị ukwuu site ná mgbanwe ọchịchị, ma ha nwere obi ilu n’ihi ịbụ ndị olileanya ha na-emezughị. Ha nwere obi ụtọ ịmụta na nanị Alaeze Jehova pụrụ iweta ngwọta na-adịgide adigide nye nsogbu anyị nile.—Abụ Ọma 146:3-5.
Ihe Ukwuu Na-eme n’Ebe Ndị Dị Nta
Ocoliş bụ ime obodo dị nta n’ebe ugwu Romania. Na 1920 otu nwoke nke aha ya bụ Pintea Moise lọghachiri site n’ihu agha ndị Russia, bụ́ ebe a kpụrụwooro ya dị ka onye a dọtara n’agha. Ọ bụbu onye Katọlik n’otu mgbe, ma tupu nlọghachi ya ọ ghọwo onye Baptist. Izu atọ ka nke a gasịrị, Ndị Mmụta Bible, dị ka a maara Ndịàmà Jehova na mgbe ahụ, kpọtụụrụ ya. Mgbe nleta ahụ gasịrị, o kwupụtara, sị: “Ugbu a achọtawo m eziokwu ahụ banyere Chineke!” Ka a na-erule 1924 e nwere ìgwè nke 35 mmadụ mejupụara na Ocoliş.
Taa, n’ime ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ dị 473, e nwere 170 ndị nkwusa Alaeze n’ebe ahụ. Onye nkwusa ọ bụla nwere ihe dị ka ụlọ abụọ e kenyere ya dị ka ókèala ya, ha na-arụkwa ime obodo ndị gbara ha gburugburu. N’agbanyeghị nke a, ha ka nwekwara olileanya. Ha ka wupụrụ otu Ụlọ Nzukọ Alaeze mara mma nke ga-aba 400 mmadụ. Ọ bụ Ndịàmà bi n’ógbè ahụ rụrụ ọrụ nile.
Valea Largă bụ ebe Nwanna Szabo na Kiss kwagara na 1914. Na 1991, n’ime 3,700 ndị bi n’ime ya, e nwere ọgbakọ asatọ na 582 ndị nkwusa Alaeze. N’Ememe Ncheta nke 1992, e nwere 1,082 ndị bịaranụ—ihe fọrọ nke nta ka o bụrụ 1 n’ime 3 mmadụ na ndagwurugwu a.
Ndị Ọsụ Ụzọ Pụrụ Iche Emeghee Ụzọ
Ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na-ekere okè dị ukwuu n’iwegara ndị bi n’ógbè ndị a dịbara n’ime karị ozi ọma ahụ. Ozugbo ahụ e nyere nnwere onwe nke ime nkwusa, Ionel Alban malitere ịrụ ọrụ n’obodo abụọ, na-etinye ụbọchị abụọ n’izu ọ bụla na Orşova na ụbọchị ise na Turnu-Severin.
E nweghị Ndịàmà ọ bụla na Orşova mgbe Ionel bịarutere. N’izu mbụ, ọ malitere iduziri nwa okorobịa dị afọ 14 ọmụmụ Bible. Nwatakịrị ahụ mere ọtụtụ mgbanwe n’ọnwa abụọ nke na otu enyi ya na onye agbata obi malitekwara ịmụ ihe. Onye agbata obi ahụ, bụ́ Roland, nke bụ́ onye Katọlik, nwere ọganihu dị ịtụnanya. Mgbe nanị otu ọnwa na ọkara gasịrị, o sonyeere Ionel n’ọrụ ime nkwusa, n’ọnwa ise kwa e mere ya baptism. Ọ banyere n’ozi oge nile ozugbo ahụ. Nne ya malitekwara ịmụ ihe, e mekwara ya baptism ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-enye Ìhè” nke 1992. Ugbu a, e nwere ndị nkwusa iri na Orşova, ha na-eduzikwa 30 ọmụmụ Bible ebe obibi.
Onye mbụ natara eziokwu na Turnu-Severin bụ onye na-anabata ndị mmadụ n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ ebe Ionel nọrọ. Mgbe ọnwa abụọ gasịrị nwoke ahụ ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptism, n’ọnwa atọ kwa e mere ya baptism. Ugbu a ọ bụ otu onye n’ime 32 ndị nkwusa n’ebe ahụ bụ́ ndị na-eduzi ngụkọta nke 84 ọmụmụ Bible ebe obibi.
Onye ọsụ ụzọ pụrụ iche ọzọ bụ́ Gabriela Geica, jere ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile ọbụna mgbe a machibidoro ọrụ anyị iwu. Ọchịchọ ya bụ ịrụ ọrụ ebe e nwere mkpa dị ukwuu karị. E kenyere ya ókèala sara mbara nke ukwuu. Mgbe ụfọdụ ọ na-eme njem site na 60 ruo 100 mile, iji kpọtụrụ ndị nwere mmasị. Otu obodo ebe ọ rụrụ ọrụ bụ Motru, ebe e nwere nanị Ndịàmà anọ. “N’ihi ọrụ nke mụbara amụba na Motru, ndị ụkọchukwu na ndị òtù okpukpe ndị ọzọ malitere iguzogide anyị,” ka ọ kọrọ. “Ha kpaliri onye isi obodo ahụ na ndị uwe ojii ka ha rụgide ezinụlọ ndị nyere m ụlọ. Ha chụpụrụ m, ya mere ọnwa ọ bụla, m ghaghị ịchọ ebe ọzọ m ga-anọ.”
Gabriela malitere iduziri onye na-ekweghi na Chineke ọmụmụ ihe na Orşova, bụ́ onye sịrị na ya enweghị mmasị n’okpukpe ma ọ bụ na Bible. Ma mgbe ọ mụsịrị ihe nanị ọnwa anọ, nwanyị ahụ malitere ikwuchitere Bible. Ọ bụ ezie na di ya gbochiri ya ịbata n’ebe obibi ya n’abali ma yie ya egwu ịgba ya alụkwaghị m ma ọ bụ gbuo ya, ọ nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi ya. Ọbụna tupu e mee ya baptism, o duziri ọmụmụ Bible iri.
Olileanya Ndị Magburu Onwe Ha Dị n’Ihu
Na August 1992, Romania ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 24,752 ndị nkwusa n’ime 286 ọgbakọ. Ndị bịara Ememe Ncheta dị ihe karịrị 66,000. N’obere alaka ụlọ ọrụ dị na Bucharest, ndị ọrụ 17 na-eme ike ha nile iji lekọta mkpa ime mmụọ nke ụmụnna ha. Ha na-elepụ anya imalite ọrụ owuwu ihe n’alaka buru ibu karị n’oge na-adịghị anya.
Ọ dịghị ihe ga-egbochi Ndịàmà Jehova nọ na Romania ịbụ ndị mgbanwe ndị dị ngwa e nweworo n’ime afọ ole na ole gara aga tụrụ n’anya. Ha nwere ekele n’ebe Jehova nọ na ha bụ akụkụ nke ọgbakọ mba dị iche iche mejupụtara nke na-aza aha ya ma na-eduzi ndị mmadụ gaa n’ezi ihe ọmụma nke ya na nzube ya a na-adịghị agbanwe agbanwe. Mgbe ọtụtụ afọ nke ihe isi ike na mkpagbu gasịrị, lee aha ekele ha nwere nye Jehova na n’ezie ọ gbanwewo oge na mgbe a kara aka na Romania!
[Map dị na peeji 23]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
HUNGARY
ROMANIA
Bucharest
Cluj-Napoca
Craiova
Tirgu-Mures
Orşova
Turnu-Severin
Motru
Turda
BULGARIA
[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]
1. Ihe dị ka 700 Ndịàmà zukọrọ n’ọhịa na 1947
2. Mpempe akwụkwọ maka mkpọsa okwu ihe ọha na 1946
3. Mgbakọ e nwere nso nso a na Romania
4. Ịgba àmà na Cluj-Napoca taa
5. Ụlọ Nzukọ Alaeze dị nso Turda
6. Ezinụlọ Betel na Bucharest