“Ndị Nkwusa Alaeze” Na-agbagharị N’ọtụtụ Mmiri Nke Guyana
GUYANA.a Okwu a nke ndị India America pụtara “ala mmiri mmiri.” Lee ka o si kọwaa nke ọma ala nke a ọ bụ nanị na ya ka a na-asụ Bekee na kọntinent South America. Ala ahụ jupụtara n’ọtụtụ osimiri na mmiri iyi ndị na-asọba na ha, ndị na-agba site n’Ebe Ugwu Nile nke Guiana gabiga oké ọhịa mmiri ozuzo nke Oké Osimiri Atlantic. Ọwa mmiri ndị a bụ ihe ọtụtụ obodo nta na ugbo ndị dịsasịrị n’akụkụ ha ji adị ndụ.
Ndịàmà Jehova nọ na Guyana matara na mgbe Jisọs buru amụma na “a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile,” nke ahụ ga-agụnye ikwusa ozi ọma ahụ nye ndị bi n’ikpere mmiri ndị a. (Matiu 24:14) N’ihi ya, ruo ọtụtụ afọ, ọtụtụ ìgwè Ndịàmà, ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ọsụ ụzọ, ejiwo ụgbọ mmiri, ndị ukwu na ndị nta, mee ihe, ịgbagharị ná mmiri nile nke Guyana iji wetara ndị ahụ ozi ọma.
Iji nye aka n’ọrụ ahụ, ruo taa, Watch Tower Society ahụwo maka ụgbọ mmiri ise e ji osisi wuo, bụ́ ndị a na-akpọ Onye Nkwusa Alaeze nke Mbụ ruo Onye Nkwusa Alaeze nke Ise. Ha bụ ụgbọ mmiri ndị a na-akpọ balahoo, bụ́ ndị dị 24 amaụkwụ n’ogologo, ghere oghe n’elu, ike ya pịrị ọnụ,-bụ́ ndị otu ezinụlọ Ndịàmà na-ewu ma na-elekọta. N’ịbụ ndị Ndịàmà obodo ahụ ji ịhụnanya na-akpọ Ndị Nkwusa, a kwụsịwo iji abụọ ndị mbụ eme ihe mgbe ha jeworo ozi ruo ọtụtụ iri afọ. Otú ọ dị, nke Atọ, Anọ, na nke Ise ka na-arụsi ọrụ ike n’osimiri Pomeroon, Mahaica, na Demerara.
Na Demerara
Na Britain na akụkụ ụfọdụ nke Europe, okwu ahụ bụ “demerara” pụrụ ịkpọtụ n’uche m mkpụrụ mkpụrụ shụga na-acha nchara nchara nke yitetụrụ ọla-edo edo, nke na-esitekarị n’ugbo ndị jupụtara n’akụkụ osimiri a dị ụrọ ụrọ nke jupụtara n’aja sansan. N’ụsọ mmiri nke ebe ọdịda anyanwụ, ụzọ sitere n’ụsọ osimiri ahụ ebe a na-akọ shugakenụ na-akwụsị. A gafee ebe ahụ, Ndịàmà ahụ na-adabere n’ụgbọ Onye Nkwusa Alaeze ndị ahụ iji wetara ndị bi n’ikpere mmiri—ndị Hindu, Alakụba, na ndị Kraịst egbugbere ọnụ, ozi ahụ na-atọ ụtọ nke Alaeze Jehova.
Mkpọsa ime nkwusa na Demerara pụrụ ịbụ njem otu ụbọchị ma ọ bụ gaa n’ihu ruo ọtụtụ izu, na-aga site n’ebe e nwere ala ruo n’ebe ọzọ e nwere ala, site n’ụtụtụ ruo abalị. Ná njem ndị a ga-anọbọ chi, ọ bụghị nanị na ndị ọsụ ụzọ ahụ na-esi nri n’ime ụgbọ, kamakwa ha na-ehi ụra n’ime ya. Mgbe o ruru anyasị, a na-ekedo Onye Nkwusa n’osisi mangrove ma ọ bụ mado ya n’ebe ndọba ụgbọ mmiri ma ọ bụrụ na e nwere ya. A na-ewunye osisi abụọ dị amaụkwụ asatọ n’elu n’ihu na n’azụ ụgbọ ahụ. A na-ekenyesi eriri ike n’osisi ndị a kwụ ọtọ, wee wụkwasị ya nnukwute tapolin iji mere elu ụlọ. Warawara osisi ndị sara asa na-anọchi anya àkwà, blanketi na ákwà mkpuchi ihe ndina na-eje ozi dị ka matrasị. N’agbanyeghị ọnọdụ a, ụra na-abịa ngwa ngwa mgbe a rụsiworo ọrụ ogologo ụbọchị dum.
“Ùnu na-asa ahụ n’ime mmiri ụrọ ahụ?” ka a jụrụ ndị ọsụ ụzọ ahụ.
“Ee e ma mmiri ọzọ dị!” bụ azịza ha. “Mgbe ọ bụla anyị gafere ọwa mmiri dị ọcha, anyị na-ekuju mmiri n’arịa ndị anyị bu maka isi nri, ịṅụ aṅụ, na ịsa ahụ.”
E ji ọtụtụ ọmarịcha ahụmahụ nyeghachi ntachi obi ha ụgwọ ọrụ. N’otu oge, otu nwoke bịara n’ebe e nwere ala, guzo ma gbasapụ ụkwụ ya abụọ, gbanye aka n’úkwù, ma jiri oké mmasị na-ekiri anyị. “Onye Nkwusa Alaeze nke Ise”! Ọ gụpụtara aha e dere n’ihu ụgbọ ahụ n’olu dara ụda. “Unu aghaghị ịbụ Ndịàmà Jehova. Nanị unu bụ ndị na-eji okwu ahụ bụ ‘alaeze’ eme ihe n’ụzọ dị otú a. Unu nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze, ugbu a kwa Onye Nkwusa Alaeze.”
Site Gilead ruo Pomeroon
Ọrụ n’akụkụ Osimiri Pomeroon nwere ọdịdị dịtụ iche, dị ka Frederick McAlman na-echeta. Otu afọ mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead na 1970, ọ bịara na Charity, ime obodo nta dị 34 kilomita n’elu ala site n’ikpere mmiri n’akụkụ ọwụwa anyanwụ ụsọ osimiri nke Pomeroon, ebe e nwere ìgwè ndị nkwusa Alaeze dị mmadụ ise.
“Ruo ogologo afọ ise, anyị nwere ‘ihe ụtọ’ nke ịkwọ ụgbọ Onye Nkwusa nke Abụọ n’osimiri Pomeroon tupu anyị enweta ụgbọ epeepe e ji injin nwere ike ịnyịnya isii na-anya,” ka Nwanna McAlman na-echeta. “Ka anyị na-akwọ ụgbọ, anyị ga-eme nkwusa gbadaa ụsọ osimiri ahụ ruo mgbe anyị ruru Hackney, nke dị 11 Kilomita site n’ebe ọ na-asọbanye n’oké osimiri. N’ebe ahụ, anyị ga-ehi ụra abalị nke ọma n’ụlọ Nwanna Nwanyị DeCambra, nwanyị na-eji ime nke na-elekọta ógbè ahụ n’oge ahụ. N’isi ụtụtụ echi ya, anyị ga-aga n’ihu ná mgbada ebe osimiri ahụ na-asọbanye n’oké osimiri tupu anyị agafere n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụsọ osimiri ahụ. Mgbe anyị ga-arụrụ ọrụ laa azụ 34 kilomita gaa Charity.”
Ụgbọ epeepe ahụ nwere injin nwere ike ịnyịnya isii jeere ha ozi nke ọma ruo afọ iri. E mesịa, na 1986, e ji ụdị nke nwere injin nwere ike ịnyịnya 15 dochie ya. Mgbe o jeworo ozi n’ikwesị ntụkwasị obi na Pomeroon ruo ihe karịrị 21 afọ, Nwanna McAlman pụrụ iji afọ ojuju nke ihe a rụpụtara lee anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze a ka wuru ọhụrụ nke dị na Charity, nke ọgbakọ nwere 43 ndị nkwusa, bụ́ ndị sitere ma n’ebe ugwu ma n’ebe ndịda osimiri ahụ, ji eme ihe ugbu a. Nkezi ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ karịrị 60, n’Ememe Ncheta kwa nke 1992 nke ọnwụ Jisọs Kraịst, ha nwere oké ìgwè mmadụ dị 190!
Ịchọ “Nwoke Ụlọ Nche” Ahụ
Monday bụ ụbọchị ahịa na Charity. Ya mere ọ bụ oge dị mma ikwusa ozi ọma ahụ, Ndịàmà jikwa magazin Ụlọ Nche na Teta! nọrọ n’ebe ahụ. Otu ụbọchị ná mmalite afọ ndị 1970, Monica Fitzallen onye si Warimuri nke dị na Moruka bịara ahịa wee nakwere magazin abụọ site n’aka Nwanna McAlman. Ma mgbe ọ laruru ụlọ, o debere magazin ahụ n’ala ala igbe ákwà ya.
“Ha nọrọ ebe ahụ afọ abụọ ma agụghị m ha,” ka Monica na-echetaghachi. “M bịara daa ọrịa, gharakwa inwe ike ibilite site n’àkwà ruo oge ụfọdụ. Ka m na-enweta onwe m, m malitere ịchọ ihe ọ bụla a na-agụ agụ n’ụlọ m iji nwee ihe m ga na-eme. N’ikpeazụ, echetara m magazin abụọ ahụ dị n’igbe àkwà wee malite inyocha ha.” Ọ ghọtara ụda eziokwu ahụ ozugbo.
Mgbe ahụ dịrị Monica, ọ gwara di ya bụ Eugene, ka ọ chọta ọrụ n’akụkụ Pomeroon ka o wee nwee ike ịchọta nwoke ọma ahụ nyere ya magazin ndị ahụ. Eugene kwenyere, ma nanị ọrụ o nwekwara ike inweta bụ n’otu ugbo dị n’ogbe Pomeroon bụ ruo otu izu, site Monday ruo ehihie Saturday.
Mgbe ọ na-eru Saturday ahụ, Monica achọtabeghịkwa nwoke nyere ya magazin ndị ahụ. N’ihe dị ka n’ehihie, ọ jụrụ di ya ma ikuku mmiri a ga-ekwe ha ịkwọrọ ụgbọ gaa Charity iji chọta “nwoke Ụlọ Nche” ahụ. Kpọmkwem ka ọ na-ekwusị okwu, ha nụrụ ụda ụkwụ n’ọnụ ụzọ ha wee hụ ihu ọchị nke otu nwanna nwanyị onye bịara inye ha magazin ndị kasị ọhụrụ. “Ị̀ bụ otu n’ime ndị Ụlọ Nche?” ka Monica jụrụ. Ọtụtụ ajụjụ sochiri nke na nwanna nwanyị ahụ aghaghị ịlaghachi n’ụgbọ mmiri ịkpọ maka enyemaka. Ònye ka o mesịrị bụrụ? Ọ bụghị onye ọ bụla ọzọ ma ọ bụghị Nwanna McAlman!
E mere ndokwa iduzi ọmụmụ Bible site n’akwụkwọ ozi. Ná mkpirikpi oge ka e mesịrị, Monica zigara akwụkwọ ọpụpụ ya site na Chọọchị Anglikan. Ná nzaghachi ọ natara mpempe ozi site n’aka ụkọchukwu: “Aṅala Ndịàmà Jehova ntị. Ọ dịghị ihe dị ha n’ime metụta ihe ọmụma Bible. M ga-abịa ka mụ na gị kwurịta okwu ahụ.” Ruo taa, ụkọchukwu ahụ abịabeghị. Ka ọ dị ugbu a, e mere Monica baptism na 1975. Mgbe otu afọ gakwara, e mekwara di ya, onye ụmụnna ji ịhụnanya na-akpọ Deede Eugene ugbu a, baptism mgbe o jiworo nlezianya nyochaa Akwụkwọ Nsọ. (Ọrụ 17:10, 11) Ọ bụ ezie na ọ na-ewe hour 12 iji ụgbọ si n’ebe ha bi kparute n’ọgbakọ kasị dịrị ha nso na Charity, ha nọgidere na-abụ ndị nkwusa Alaeze na-arụsi ọrụ ike ruo taa.
Njem Ozi Ala Ọzọ Banye n’Ebe Ndị Dị n’Ime Ime
N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, Watch Tower Society anọwo na-akwado njem ozi ala ọzọ mgbe mgbe banye n’ebe ndị dị n’ime ime. Site n’ụgbọ ndị nwere injin, ndị ọrụ afọ ofufo wepụtara onwe ha edetụwo ire ihe ụtọ nke iwegara ndị bi n’ógbè ndị India America ndị dịpụrụ adịpụ na ógbè ndị dịpụrụ iche nke ndị na-akwọ osisi na ndị nke ndị ọrụ ugbo n’ala ụfọdụ dị n’ụsọ ọwa mmiri ndị ahụ ozi ọma. Dị ka ndị ọsụ ụzọ n’ikwekọ n’ihe okwu ahụ pụtara n’ezie, ha nwere ihe ùgwù nke iweta n’ebe ndị a dịpụrụ adịpụ ‘aha Jehova’ nke na-azọpụta ndụ na nke mbụ ya. (Ndị Rom 10:13-15) Ụmụnna ahụ aghaghị ịnagide ọtụtụ ihe isi ike, mgbe ụfọdụ na-akwọrọ ụgbọ gabiga ọwa mmiri dị iche iche ụbọchị atọ zuru ezu iji ruo ebe ụfọdụ ndị a. Ma nkwụghachi ụgwọ ndị ha na-enye kwesịrị ya.
Otu nwa okorobịa, bụ́ onye Pentecostal nke bi nso ógbè ndị na-akwọ osisi bụ́ Kwebanna n’Osimiri Waini, bụ onye e jekwuru ná njem ozi ala ọzọ mbụ n’ógbè ahụ na July 1991. Ná nleta nke sochiri ya n’October, a malitere ọmụmụ Bible. Na nke mbụ ya, ọ hụrụ n’ime Bible nke ya na aha Chineke bụ Jehova, na Jisọs abụghị Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, nakwa na ozizi Atọ n’Ime Otu adịghị n’Akwụkwọ Nsọ. (Abụ Ọma 83:18; 1 Ndị Kọrint 11:3) O nwere ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu nke na, mgbe ụmụnna ahụ lara, ọ kpọkọtara ndị Pentecostal ibe ya wee malite igosi ha site na Bible nke ha eziokwu banyere Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. Mgbe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ jụrụ eziokwu ahụ, o kpebiri na oge eruwo ka ya hapụ ma si na “Babilọn Ukwu” ahụ pụta. (Mkpughe 18:2, 4) Mgbe ụmụnna ahụ lọghachiri ịhụ ya na February 1992, ọ gwara ha ihe meworo ma kwuokwa, sị: “M chọrọ isonyere unu. Achọrọ m ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. M chọrọ ịkụziri ndị mmadụ eziokwu!”
Ahụmahụ ndị dị otú ahụ na-enye aka inye ụmụnna ahụ agbamume ịga n’ihu n’ọrụ a na-ama aka. Ndị na-aga njem ozi ala ọzọ ndị ahụ aghaghị iji ntụsara ahụ nke ebe obibi chụọ àjà, kpughepụ onwe ha nye ọrịa dị iche iche dị ka ịba, nagidekwa ihe ize ndụ nke ndụ n’ime ọhịa. Ma ndị na-esoghị gaa na-ejikwa ihe dị iche iche achụ àjà. Ezinụlọ ụfọdụ ka ndị ha hụrụ n’anya na-ahapụ, mgbe ụfọdụ ruo ọtụtụ izu n’otu mgbe. Ọgbakọ dị iche iche aghaghị ịnọ n’enweghị ndị okenye ha na ụmụ okorobịa ha dị ka, n’ọnọdụ ụfọdụ, nanị otu nwanna ka a na-ahapụ ilekọta mkpa nile nke ọgbakọ. Ma lee aha ọṅụ na agbamume a na-enwe mgbe ọgbakọ nụrụ ahụmahụ ha na-akpali akpali mgbe ha lọtara! Ihe ndị e mefuru adịghịkwa abata n’uche.
Ndị nkwusa Alaeze na-eji ozi ọma ahụ akwọ ụgbọ ná mmiri nile nke Guyana na-enwe ahụmahụ pụrụ iche n’ezie. Ha na-eso ndị ọrụ ibe ha gburugburu ụwa na-eji obi ike ma na-eji obi ha “na-achụ àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe nile, nke ahụ bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha ya.”—Ndị Hibru 13:15.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A na-akpọbu ya Guiana nke Britain, a gbanwere aha ahụ gaa na Guyana mgbe o nwetara nnwere onwe site n’aka Britain na 1966.
[Map ndị dị na peeji 24]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
HONDURAS
NICARAGUA
COSTA RICA
PANAMA
VENEZUELA
COLOMBIA
GUYANA
SURINAME
FRENCH GUIANA
BRAZIL
BOLIVIA
ATLANTIC OCEAN
[Foto ndị dị na peeji nke 26, 27]
N’aka ekpe: Ịgba àmà n’ụbọchị ahịa
N’elu: Inwe nkwurịta okwu nke ozi ọma ahụ n’Osimiri Demerara
N’elu aka nri: Ìgwè ndị ozi ala ọzọ ka kwọọrọ ụgbọ na-alaghachi n’ogige ha