Ịṅụrị Ọṅụ N’onye Okike Anyị Dị Ebube
“Ka Israel ṅụrịa n’Onye Meworo ya: ka ụmụ Zaịọn tegharịa egwú ọṅụ n’Eze ha.”—ABỤ ỌMA 149:2.
1. N’agbanyeghị ákwá nile nke “nnwere onwe n’ikpeazụ,” gịnị bụ ọnọdụ ihe a kpọrọ mmadụ n’ezie?
“IHE MGBU” na-eti ụwa taa ihe otiti. Nke ahụ bụ okwu Jisọs ji mee ihe n’amụma ya banyere “ọgwụgwụ oge a,” ọgbọ oké ihe ọdachi nke malitere n’Agha Ụwa Mbụ na 1914. (Matiu 24:3-8) Ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị adịghị ahụ ihe ọzọ ma ọ bụghị ọchịchịrị maka ọdịnihu. N’agbanyeghị ákwá nile a na-ebe maka “nnwere onwe n’ikpeazụ” n’Ọwụwa Anyanwụ Europe, otu onye bụbu onye isi ala n’ebe ahụ chịkọtara ọnọdụ ụwa mgbe ọ sịrị: “Ntiwapụ ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa na mmetụta nke ịrị elu okpomọkụ ụwa, oghere ndị e nwere n’ihe mkpuchi ụzarị anyanwụ, na ọrịa AIDS, iyi egwu nke iji nuklia mee ihe ike na ọdịiche na-asawanye mbara nke ukwuu n’etiti ebe ugwu ụwa bara ọgaranya na ebe ndịda ụwa dara ogbenye, ihe ize ndụ nke ụnwụ nrị, mbibi nke gburugburu ebe obibi ihe ndị dị ndụ na ihe ndị a na-egwuta n’ala n’ụwa, mmụba nke ọha mmadụ na-akpa àgwà dị ka a na-egosi n’ihe omume telivishọn ndị e ji eme mkpọsa ahịa na ihe iyi egwu na-arịwanye elu nke agha ógbè dị iche iche—ihe a dum, tinyere ọtụtụ puku ihe ndị ọzọ, bụ ihe iyi egwu nye ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha.” E nweghị ike mmadụ ọ bụla pụrụ iwepụ ihe iyi egwu a nke ọdachi ga-eweta ọnwụ.—Jeremaịa 10:23.
2. Ònye nwere ihe ngwọta na-adịgide adịgide nye nsogbu nile nke mmadụ, nzọụkwụ dịkwa aṅaa ka o werewoororịị?
2 Otú ọ dị, anyị pụrụ inwe ọṅụ na Onye Okike anyị Dị Ebube nwere ihe ngwọta ya na-adịgide adịgide. N’amụma Jisọs e jikọrọ “ọgwụgwụ oge a” na “ọnụnọ” ya a na-adịghị ahụ anya. (Matiu 24:3, 37-39, NW] Iji kee “eluigwe ọhụrụ,” Jehova nọkwasịrị Jisọs n’ocheeze ya dị ka Eze Mesaịa, ihe àmà amụma nke na-egosi na ihe omume nke a kwesịrị ịrịba ama weere ọnọdụ n’eluigwe n’afọ 1914.a (2 Pita 3:13) Dị ka onye so Eze Onyenwe anyị Jehova na-achị, e nyewo Jisọs ọrụ ugbu a ikpe mba nile ikpe na ikewapụ ndị dị obi umeala, ndị yiri atụrụ n’ụwa site ná ndị yiri ewu na-agba isi akwara. A na-aka “ewu” ndị ahụ na-adịghị asọpụrụ Chineke akara maka “ahụhụ mmehie ebighị ebi” na “atụrụ” ndị ahụ maka ndụ ebighị ebi n’ógbè ụwa nke Alaeze ahụ.—Matiu 25:31-34, 46.
3. Ihe dị aṅaa ka ezi ndị Kraịst nwere maka ite egwú ọṅụ?
3 Ihe fọrọ n’ụwa n’etiti Israel ime mmụọ, nke oké ìgwè mmadụ ahụ nke atụrụ ndị a na-erube isi na-esonyere ugbu a, nwere ihe nile ha ga-eji nwee ọṅụ n’ime Jehova, bụ́ Eze mgbe nile ebighị ebi, ka ọ na-eweta nzube ya ndị dị ebube ná ngwụsị site n’Alaeze Ọkpara ya. Ha pụrụ ikwu, sị: “Obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu n’ime Jehova, mkpụrụ obi m ga-etegharị egwú ọṅụ n’ime Chineke m; n’ihi na ọ chịrịwo uwe nzọpụta yikwasị m . . . Dị ka ala si eme ka ihe opupu ya pụta, na dị ka ubi a gbara ogige si eme ka ihe a ghaworo n’ime ya puo; otú a ka Onyenwe anyị Jehova ga-eme ka ezi omume na otuto pute n’ihu mba nile.” (Aịsaịa 61:10, 11) A na-enye ihe àmà ‘mpute’ nke a n’ọtụtụ nde ndị a na-achịkọbata ugbu a site ná mba nile ịbụ otuto Jehova dị ka abụ.
‘Ime Ka Ọ Bịa Ọsọ Ọsọ’
4, 5. (a) Olee otú e si buo amụma nchịkọbata nke ndị Chineke? (b) Ịrị elu dị aṅaa pụtara ìhè ka a hụrụ n’afọ ije ozi 1992?
4 Nchịkọbata ahụ na-ebiri ọkụ ka ọgwụgwụ usoro ihe Setan na-eru nso. Onye Okike anyị Dị Ebube na-ekwupụta sị: “Ndị gị kwa, ha nile ga-abụ ndị ezi omume . . . ; alaka nke ọkụkụ m, ọrụ aka m, ime ka m maa mma. Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.” (Aịsaịa 60:21, 22) E gosipụtara ime ka ọ bịa ọsọ ọsọ nke a n’ụzọ dị ịtụnanya n’Akụkọ Afọ Ije Ozi 1992 nke Ndịàmà Jehova n’Ụwa Nile, nke e bipụtara na peji nke 12 ruo 15 nke magazin nke a.
5 Ihe pụrụ iche n’akụkọ a bụ ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu bụ́ 4,472,787 ndị nkwusa Alaeze, ịrị elu nke 193,967—4.5 pasent karịa afọ gara aga. Ọnụ ọgụgụ kasị elu bụ 301,002 ndị e mere baptism na 1992 na-egosikwa na ọtụtụ ìgwè mmadụ na-anakwere eziokwu Bible. Lee ka anyị si enwe ọṅụ na ‘n’ụbọchị a nke ọchịchịrị na oké mgbachi, e nwere otu ndị dị ọtụtụ nweekwa ume,’ ndị, dị ka ìgwè igurube, na-agbasa àmà Alaeze ahụ “ruokwa ebe ụwa sọtụrụ”! (Joel 2:2, 25; Ọrụ 1:8) Site n’Alaska na-ajụ oyi—ebe ụgbọ elu Watch Tower Society gaworo ihe karịrị 50 ugboro n’ókèala snow na-ada na ha—gaa n’ọzara ndị na-ekpo oké ọkụ nke Mali na Burkina Faso na agwaetiti ndị nọsasịrị anọsasị nke Micronesia, ndị na-ejere Jehova ozi na-achapụta dị ka “ìhè nke ụwa nile, ịbụ ihe nzọpụta [ya] ruo nsọtụ ụwa.”—Aịsaịa 49:6.
6, 7. Nchigharị dị aṅaa nke a na-atụghị anya ya ka a hụrụ n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, oleekwa otú ndị na-ejere Jehova ozi siworo meghachi omume na ya?
6 Jehova adịwo ka ebe e wusiri ike na ụlọ elu dị ike n’ichebe na ịkwagide ndị ya. N’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, ọ dịwo Ndịàmà Jehova mkpa inwe ntachi obi n’ọtụtụ iri afọ nke mmegide na mkpagbu obi ọjọọ. (Abụ Ọma 37:39, 40; 61:3, 4) Ma n’isi nso a, dị ka ọ bụ site n’ọrụ ebube, e wepụwo ihe mgbochi dị iche iche n’ihe dị ka 21 ala, nke na ugbu a ndị Chineke pụrụ iji nnwere onwe kpọsaa na Onye Okike anyị Dị Ebube edowo Kraịst dị ka Eze n’isi ụwa.—Abụ Ọma 2:6-12.
7 Ndị Jehova hà na-eji nnwere onwe ha nwetara ọhụrụ na-eme ihe nke ọma? Rịba ama na chaatị ahụ ịrị elu ndị e nwere maka Bulgaria, Romania, na Soviet Union oge mbụ nke dị n’Ọwụwa Anyanwụ Europe na maka Angola, Benin, na Mozambique n’Africa. Na Zaire kwa, ebe a ka nwere oké ihe isi ike dị iche iche, mmụba ahụ dị egwu. Ka ọṅụ na-ejupụta obi ha, ụmụnna anyị a tọhapụrụ na-aza òkù ahụ bụ: “Keleenụ Jehova; n’ihi na ọ dị mma: . . . onye nanị ya na-arụ oké ọrụ dị iche iche: n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka ebere ya dị.” (Abụ Ọma 136:1, 4) A na-eji ije ozi n’ịnụ ọkụ n’obi n’ịchịkọta ndị ọzọ yiri atụrụ gaa n’akụkụ nke Alaeze ahụ na-egosipụta ekele nke a.
8. Olee otú ndị ọhụrụ na-eto Jehova siworo “na-efe efe dị ka igwe ojii” n’Ọwụwa Anyanwụ Europe? n’Africa?
8 N’oge okpomọkụ gara aga na Europe, mgbakọ ukwu nke ndị Jehova e nwere n’ala bụbu nke ndị Kọmunist enwewo ọnụ ọgụgụ ndị dị ịtụnanya nke ndị na-abịanụ. Ọbụna ihe na-atụ n’anya karị bụ ọnụ ọgụgụ ndị e mere baptism ná mba ndị ahụ. N’otu aka ahụ, na Togo, Africa, e wepụrụ mmachibido iwu ahụ na December 10, 1991. Nanị ka ọnwa abụọ gasịrị, e nwere mgbakọ ukwu dị iche iche. N’iji ya tụnyere nkezi ọnụ ọgụgụ kwa ọnwa nke 6,443 ndị nkwusa n’ubi, ọnụ ọgụgụ ndị bịara mgbakọ ndị a rịrị oké elu ruo 25,467, e mee 556 mmadụ baptism—8.6 pasent karịa ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa. Dị ka Aịsaịa 60:8 na-eso onyinyo ya, ndị ọhụrụ na-enye Jehova otuto “na-efe efe dị ka igwe ojii, ndị na-efekwa dị ka nduru si eferu window ha” n’ọgbakọ dị iche iche nke ndị Jehova.
9. Ndokwa ndị dị aṅaa ka e meworo ka ndị Kraịst nọ ná mba ndị a ka tọhapụrụ ọhụrụ wee ‘rie ihe ma rijuo afọ’?
9 A na-emejukwa agụụ maka nri ime mmụọ n’Ọwụwa Anyanwụ Europe na Africa. Ebe obibi akwụkwọ Watch Tower Society na Germany, Itali, nakwa na South Africa ezigawo ọtụtụ gwongworo jupụtara n’akwụkwọ, n’ọtụtụ asụsụ, gaa ná mba ndị nọ n’ụkọ nri ime mmụọ. N’oge mbụ, ọtụtụ Ndịàmà aghaghị ịdị na-ekerịta magazin n’ihi na ọ naghị ezu, ma ugbu a ha na-anata ụba nke nri ime mmụọ. Ha na-aṅụrị ọṅụ iso kere òkè ná mmezu nke amụma ahụ bụ: “Unu ga-eriju afọ, afọ ewee ju unu, unu ewee too aha Jehova, bụ́ Chineke unu, onye mesoworo unu n’ịrụ oké ọrụ.”—Joel 2:26.
Ilekọta Mmụba E Nwekwuru
10. N’ihi ọnụ ọgụgụ dị elu nke ndị bịara Ememe Ncheta, òkù dị aṅaa ka a na-akpọ ndị nile nwere mmasị?
10 Ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta maka ọnwụ Jisọs gburugburu ụwa dị ịtụnanya n’ezie, 11,431,171, ịrị elu 781,013, ma ọ bụ 7.3 pasent karịa afọ gara aga. Nnọọnụ, unu nile ndị bịara ọhụrụ! Lee ka ọ ga-esi magbuo onwe ya ma ọ bụrụ na ndị ọhụrụ nile dị otú ahụ nwere mmasị enweta uru nke isoro otu n’ime Ndịàmà Jehova nwee ọmụmụ Bible ebe obibi! (Lee Aịsaịa 48:17.) Akụkọ Ije Ozi Afọ a na-egosi na a na-eduzi 4,278,127 n’ọmụmụ ihe ndị a kwa ọnwa, ịrị elu dị mma nke 8.4 pasent. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ọzọ ka pụrụ iwepụta onwe ha n’ozi a. Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ ịdị na-akpọtụrụ ndị nwere mmasị mgbe nile iji duzie ọmụmụ Bible n’efu n’ebe obibi ha, si otú a na-enyere ndị a aka ịkwụsi ike n’ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16, 36) Gịnị mere ị gaghị ekwu ka e duziere gị ọmụmụ ihe dị otú ahụ? Chetakwa, ị ga-enweta nnabata na-ekpo ọkụ mgbe ọ bụla n’Ụlọ Nzukọ Alaeze!—Abụ Ọma 122:1; Ndị Rom 15:7.
11, 12. (a) Nsogbu ndị dị aṅaa ka a na-enwe n’ala ụfọdụ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka “nhata” na-ewere ọnọdụ n’etiti ala ndị bara ọgaranya karị na ndị dara ogbenye karị?
11 Ọgbakọ ndị nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị mara mma bụ ndị a gọziri agọzi n’ụzọ bara ụba. Ọnọdụ ahụ dị iche n’ala ebe Ndịàmà na-eguzosi ike n’ihe tachiworo obi ruo ọtụtụ afọ n’okpuru mmachibido iwu, na-ezukọ ná nzuzo n’ìgwè ndị dị nta. N’ọtụtụ ebe dị otú a, ha enwerewo onwe ha ugbu a ma ha nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze ole na ole. N’otu mba dị n’Africa, dị ka ihe atụ, ebe e nwere 93 ọgbakọ, e nwere nanị Ụlọ Nzukọ Alaeze atọ. Ya mere a na-enwekarị nzukọ ná mbara ala ndị buru ibu a na-enweghị ihe e wuru na ha. Ọgbakọ 150 mmadụ mejupụtara pụrụ inwe ihe ruru 450 mmadụ na-abịachi nzukọ ndị a anya.
12 N’Ọwụwa Anyanwụ Europe ọ na-esikarị ike ịzụta ala ma ọ bụ iwu ụlọ, ma a na-enwe ọganihu ụfọdụ. E mere atụmatụ maka ịrara otu alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ nye na November 28, 1992 na Poland. A na-eji onyinye mmesapụ aka maka ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ gburugburu ụwa na-enye aka iwu ụlọ nzukọ na ihe ndị ọzọ. Otu a, “nhata” na-ewere ọnọdụ n’ihi na mmesapụ aka nke ụmụnna si ‘n’ihe ha nwebigara ókè’ na-enye onyinye na-enye aka imeju mkpa ime mmụọ nke ọgbakọ ndị nọ ná mkpa n’ala ebe ndị e nwere ihe isi ike.—2 Ndị Kọrint 8:13, 14.
Otu Ijeri Hour!
13. Hour ole ka e tinyere n’ime nkwusa na nkụzi na 1992, ọ̀ bụkwa mgbalị òle ndị ka a na-egosipụta n’ọnụ ọgụgụ a?
13 Gịnị ka ị ga-eji otu ijeri hour mee? Ndị nile ga-enweta ndụ ebighị ebi ga-enwe ike iji hour ruru otú ahụ, ọbụna karịa, mee ihe, n’ije ozi dị irè, nke na-eju afọ nye Jehova. Ma chee echiche ịchịkọta ọtụtụ hour ahụ n’ime otu afọ! Nke ahụ bụ ihe ndị Jehova mezuru n’afọ 1992. Site n’ịgbakọta akụkọ ozi ndị nkwusa Alaeze n’otu n’otu nyere, anyị na-enweta ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu bụ 1,024,910,434 hour e ji mee ihe n’ụzọ kasị mma a pụrụ iji hour mee ihe—na-eto Onye Okike anyị Dị Ebube, ‘na-ezi ihe n’ihu ọha na site n’ụlọ ruo n’ụlọ.’ (Ọrụ 20:20) Ná nkezi, 4,289,737 Ndịàmà nyere akụkọ ozi kwa ọnwa. Ha sitere n’akụkụ nile nke ndụ. A kpaara ụfọdụ ókè n’oge ha pụrụ itinye n’ọrụ Alaeze. Ndị a gụnyere ndị isi ezinụlọ, bụ́ ndị na-aghaghị igbo mkpa ezinụlọ ha; ndị meworo okenye karị; na ọtụtụ ndị ọzọ nwere nsogbu ahụ ike; gụnyekwara ụmụaka ka nọ n’ụlọ akwụkwọ. Ma akụkọ onye nke ọ bụla nyere bụ ngosipụta dị oké ọnụ ahịa nke ịhụnanya maka Jehova.—Tụlee Luk 21:2-4.
14. Olee otú ndị na-eto eto si ‘na-echeta Onye Keworo ha’?
14 Ọgbọ ndị bụ nwata karị na-etolite n’ije ozi Jehova, ọ bụkwa ihe obi ụtọ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị a na-etinye okwu Solomọn nke dị n’Eklisiastis 12:1 n’ọrụ: “Chetakwa Onye Keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa.” Ha na-etinye onwe ha n’ọrụ ụlọ akwụkwọ ha, na-anatakwa ọzụzụ n’ihe ime mmụọ dị iche iche site n’aka ndị nne na nna nyefere onwe ha na ya. Ọ bụwo ihe ọṅụ ịhụ ọtụtụ ndị na-eto eto nọ n’agbata afọ ndụ iri na atọ na iri na itoolu ka ha na-eguzo ọtọ ná mgbakọ ndị e nwere n’oge na-adịbeghị anya gara aga, na-ewepụta onwe ha maka baptism. Ọ bụkwa ihe ọṅụ ịmata na ọtụtụ, site n’ịmụ akaọrụ ma ọ bụ nkà ụfọdụ, na-eme nkwadebe dị irè maka ọru ọsụ ụzọ mgbe ha gụsịrị akwụkwọ. Otú a, ha ga-enwe ike karị ịkwado onwe ha, dị ka Pọl onyeozi mere site n’oge ruo n’oge site n’ịkpa ákwà ụlọikwuu.—Ọrụ 18:1-4.
15, 16. Olee otú ndị ọsụ ụzọ na ndị ọzọ na-eje ozi oge nile siworo kere òkè n’ọganihu nke ọrụ Alaeze ahụ, ngọzi dịkwa aṅaa ka ụfọdụ n’ime ha nwetaworo?
15 Lee nnukwute òkè ndị ọsụ ụzọ na ndị ọzọ na-eje ozi oge nile na-ekere n’ọganihu nke ọrụ Alaeze ahụ! Ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu bụ 931,521 n’afọ a gara aga. Ka ndị a na-eme nkwusa kwa ụbọchị site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma na-eduzi ọmụmụ Bible n’ebe obibi ndị mmadụ, ha na-aghọ ndị dị nnọọ irè n’iji Akwụkwọ Nsọ kọwapụta uche ha. Ọzọkwa, ọtụtụ eruwo eru ịga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ na-ewe izu abụọ, bụ́ nke na-enyere ha aka ịzụlite ikike ka ukwuu na ọṅụ n’ịrụ ọrụ Chineke.
16 Nke ọ bụla ná ndị ọsụ ụzọ ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ ikwenye n’okwu ndị dị n’Aịsaịa 50:4: “Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, enyewo m ire nke ndị mmụta, ka m wee mara iwere okwu kwagide onye dara mbà.” E nwere ọtụtụ ndị mmadụ taa ike ụwa rụrụ arụ gbara ha gburugburu gwụworo ma bụrụ ndị na-achọ inweta ntụrụndụ site n’okwu ndị ọsụ ụzọ anyị na-ekwesị ntụkwasị obi kwuru.—Tụlee Ilu 15:23; Ezekiel 9:4.
Oké Ọrụ Owuwu Ihe
17. Tinyere owuwu ihe ime mmụọ, owuwu ihe nkịtị dị aṅaa ka a hụworo n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga?
17 Ịba ụba ime mmụọ gburugburu ụwa nke Ndịàmà Jehova na-achọkwa ka e nwee ụba ihe onwunwe. Mgbasawanye ebe obibi akwụkwọ, ọfịs, na ebe obibi Betel na iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ dị iche iche dịrị mkpa. Ya mere a chọrọ ka Ndịàmà Jehova ghọọ ndị na-ewu ihe n’ụzọ nkịtị. Owuwu ihe dị otú ahụ weere ọnọdụ n’ụbọchị Eze Solomọn. Solomọn wuru ụlọ nsọ ahụ maka ofufe Jehova dị ka “ihe atụ . . . dị n’aka ya site na mmụọ nsọ” si dị, ebe Jehova nyeworo Nna ya, bụ́ Eze Devid nke a. (1 Ihe Emere 28:11, 12) Otú a, ọ bụghị nanị na Solomọn ji okwu amamihe ndị dị oké ọnụ ahịa wulie ndị na-ege ya ntị elu kamakwa o duziri ọrụ owuwu ihe nkịtị nke makarịrị ihe ọ bụla ụwa wuworo na mma.—1 Ndị Eze 6:1; 9:15, 17-19.
18, 19. (a) Ọrụ owuwu ihe dịgasị aṅaa bụ́ ndị na-aga ngwa ngwa ka nzukọ Jehova na-arụ? (b) Olee otú mmụọ Jehova siworo pụta ìhè n’owuwu ihe nkịtị nakwa na nke ime mmụọ?
18 Taa, Ndịàmà Jehova ejighị ihe atụ site n’ike mmụọ nsọ Chineke na-ewu ihe, ma ha nwere mmụọ Chineke. Dị ka ọ dị n’ụbọchị Israel, nke a na-akwali ha iwu ihe n’ụzọ na-eju ndị ụwa anya. (Zekaraịa 4:6) Oge e nwere dị mkpụmkpụ. A chọrọ Ụlọ Nzukọ Alaeze na ihe owuwu ndị ọzọ n’egbughị oge. Ná mba ụfọdụ, ihe na-ewu bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị e wuru ngwa ngwa. N’afọ 10 gara aga, dị ka ihe atụ, Canada na-akọ na e wuru ụlọ nzukọ dị 306, nke ọ bụla n’ihe na-erughị ụbọchị abụọ. N’ihi mgbasa nke a dị ngwa nke ọrụ Jehova gburugburu ụwa, a na-ewu ugbu a ma ọ bụ mee atụmatụ iwu ngụkọta nke 43 alaka ụlọ ọrụ ndị ọhụrụ ma ọ bụ na-agbakwụnyere ha ihe. Karịsịa, a na-achọ iwusi ụlọ obibi dị 30 okpukpu, nke ga-enye ebe obibi maka ihe karịrị otu puku ndị ọrụ afọ ofufo Betel, na Brooklyn. Na New York State kwa, na Patterson, owuwu nke ebe ọzụzụ Bible, ihe owuwu kasị ibu Watch Tower Society wuworo mgbe ọ bụla, na-aga n’ihu ngwa ngwa nke ukwuu karịa ka e mere atụmatụ ya.
19 Ihe owuwu ndị a na-aga n’ihu n’ụzọ dị irè na n’ọdịdị ọrụ nke na-atụ ụlọ ọrụ ụwa ndị na-ewu ihe owuwu bụ́ ndị maara ọrụ, n’anya. N’ihi gịnị? N’ihi nnukwute òkè Ndịàmà Jehova raara onwe ha nye na-ekere. Mmụọ ya na-akwali ha ọ bụghị nanị inye nkwado ihe onwunwe nkịtị kamakwa iji obi ha dum nye oge na ume ha. Ebe a na-ewu ihe owuwu na-ejupụta ná ndị ọrụ a zụrụ nke ọma, ndị na-etinye uche ha n’ọrụ. Ọ dịghị mgbe a na-achịsa ngwá ọrụ n’iwe, adịghịkwa egbu oge n’ọrụ. Mmụọ Jehova na-enye nkwali, dị nnọọ ka ọ kwaliri ndị wuru ụlọikwuu ahụ n’oge Mosis na ndị ahụ wuru ụlọ nsọ ahụ n’ụbọchị Solomọn. Ọnọdụ ime mmụọ bụ àgwà pụtara ìhè a chọrọ n’aka ndị ọrụ ndị a.—Tụlee Ọpụpụ 35:30-35; 36:1-3; 39:42, 43; 1 Kings 6:11-14.
20. (a) Ruo ókè hà aṅaa ka a ka ga-ekwusa ozi ọma ahụ? (b) Olileanya dị aṅaa a gọziri agọzi na-echere ndị Jehova?
20 Solomọn gara n’ihu n’usoro iwu ihe ya mgbe o wusịrị ụlọ nsọ ahụ. (2 Ihe Emere 8:1-6) Ruo ókè ịgba àmà nke oge a ka ga-agbasaru—na-emekwa ka e nwee mkpa n’otu ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ maka ụlọ nzukọ na ihe owuwu ndị ọzọ—anyị amaghị. Ma, anyị maara na mgbe e kwusaworo ozi ọma nke a nke Alaeze ruo ókè Jehova nyere n’iwu, mgbe ahụ ọgwụgwụ ahụ, “mkpagbu ukwu” ahụ, ga-abịa. (Matiu 24:14, 21) N’ime ụwa nke ụmụ mmadụ dị anyaukwu na-adịghịkwa emerụ, ndokwa Jehova maka “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ga-ewetazịrị ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi ndị a na-apụghị ikwu n’ọnụ. Ya mere ka anyị ‘tee egwú ọṅụ, ṅụrịakwa ọṅụ n’ihe Chineke na-eke,’ na-enye Onye Okike anyị Dị Ebube otuto nile!—Aịsaịa 65:17-19, 21, 25.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee “Ka Alaeze Gị Bịa,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, peji nke 105-116, 186-189.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Ihe ndị dị aṅaa ka anyị nwere iji ṅụrịa ọṅụ n’Onye Okike anyị Dị Ebube?
◻ Ịrị elu dịgasị aṅaa ka e nyere akụkọ ya n’afọ ije ozi 1992?
◻ Ná mba ebe ndị a machibidoburu ịgba àmà n’iwu, ngọzi ndị dị aṅaa bara ụba ka e nyeworo akụkọ ha?
◻ Olee otú ndị ntorobịa na ndị ọsụ ụzọ siworo kere òkè n’ịrị elu nke nzukọ Jehova?
◻ Olee otú ndị Jehova siworo jide ọrụ n’aka n’ọrụ iwu ihe nkịtị na nke ime mmụọ?
[Igbe dị na peeji nke 17]
N’afọ gara aga e tinyere ihe karịrị otu ijeri hour n’ọrụ nkwusa na nkụzi ahụ
[Chaatị dị na peeji nke 12-15]
AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 1992 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE
(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)
[Foto dị na peeji nke 10]
Ọtụtụ narị puku ndị e mere baptism n’afọ gara aga na-egosipụta ngọzi Jehova n’ọrụ nkwusa na nkụzi ahụ
[Foto dị na peeji nke 16]
Ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị na-eto eto ‘na-echeta Onye Keworo ha’