Irute “Mmadụ Nile” na Belgium
PỌL onyeozi chetaara ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ banyere uche Chineke “ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” Iji mezuo nke a ha ga-ekpe ekpere ka e nye ha ohere ‘ibi obi udo na nke dị nwayọọ,’ ka ha wee nwee ike ịkpọsa ozi ọma Alaeze ahụ nye ndị nile nwere ntị ịnụ ihe.—1 Timoti 2:1-4.
Taa, iji ozi ọma ahụ rute “mmadụ nile” nwere ihe pụrụ iche ọ pụtara nye Ndịàmà Jehova na Belgium. Eri ngwụsị nke Agha Ụwa nke Abụọ, mba nta nke a, nke ga-adị mfe ịdọkwasị n’elu ọdọ mmiri Lake Tanganyika ma ọ bụ n’ọkara Lake Michigan, enwewo mgbanwe ndị siri ike n’ọdịdị ọdịnala na nke omenala ya. Tinyere ógbè atọ ya—nke Ndị Flander (Netherland), France, na Germany—e nwere ugbu a na Belgium ọtụtụ ìgwè ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na ndị nwere omenala dị iche iche. E nwere ndị Arab, Turkey, India, China, Philippine, Africa, na ìgwè ndị America, iji kpọtụ nanị ole na ole aha. E mere atụmatụ na 1 n’ime mmadụ 10 ọ bụla na Belgium si obodo ọzọ.
Otú a, Ndịàmà nọ na Belgium, dị ka ndị Kraịst ibe ha gburugburu ụwa, na-eche ihe ịma aka nke iji ozi ọma ahụ rute “mmadụ nile” ihu. Gịnị ka ọ dị ka ya ime nkwusa n’etiti ndị si mba dị iche iche? Olee otú mmadụ si ejekwuru onye nwere nzụlite dịwaga nnọọ iche n’omenala na okpukpe? Gịnịkwa bụ nzaghachi ha nye ozi Bible?
Ibu Ụzọ Mee Ihe Na-arụpụta Ihe
Ịgwa “mmadụ nile” okwu banyere ozi ọma Alaeze bụ ahụmahụ obi ụtọ na nke na-akpali akpali. N’okporo ámá ndị na-ekwo ekwo, n’ọma ahịa, n’ụgbọ njem ọha, site n’ụlọ ruo n’ụlọ, a ga-achọta ndị sitere na kọntinent nile. Site n’ibute ụzọ mee ihe, ọ pụrụ ịdị mfe onye nkwusa Alaeze ịkpalite mkparịta ụka, ọtụtụ mgbe kwa nke a na-arụpụta ihe ndị na-enyeghachi ụgwọ ọrụ.
N’otu ebe bọs na-akwụsị, otu Onyeàmà ji nanị ịmụmụ ezigbote ọnụ ọchị malite mkparịta ụka n’etiti ya na nwaada si Africa. Ngwa ngwa nwaada ahụ gosipụtara ọṅụ ya ịnụ banyere Alaeze Chineke, ọ chọkwara ịmụtakwu ihe banyere Bible. Ọ nakweere magazin Ụlọ Nche na Teta!, nye Onyeàmà ahụ adres ya. Mgbe o kwuru na ya ga-eleta ya n’isi nso, nwaada ahụ jụrụ. “Mba! Mba! ka anyị yie agba kpọmkwem ka m wee nọrọ ya mgbe ị ga-abịa.”
Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, mgbe Onyeàmà ahụ ga-aga, ọ chọpụtara na ya atụfuwo adres nwaada ahụ. Ma ka o chetara aha okporo ámá ahụ, ọ gara kpọtụrụ ụlọ nke ọ bụla ile ma ọ ga-achọta onye nwere aha ndị Africa. O ruru ná ngwụsị okporo ámá ahụ n’achọtaghị ihe ọ na-achọ. Lee oké ihe ndakpọ olileanya ọ bụ! Ka ọ na-akwadebe ịla, na mberede, dị ka o si n’eluigwe dapụta, kpọmkwem nwaada ahụ ọ na-achọ guzo ya n’ihu, ọ bụkwa kpọmkwem oge ha kwekọrịtaworo maka nnọkọ ahụ! A malitere iduziri ya ọmụmụ Bible.
Gịnị banyere omenala, nkwenkwe, na ọdịnala dị iche iche? Dị ka ihe atụ, gịnị banyere nkwenkwe ndị Hindu? Otu onye ọsụ ụzọ chetara ihe ọ gụworo n’akwụkwọ Reasoning From the Scriptures. Ọ sịrị: “Kama ịnwa ikwu okwu banyere mgbagwoju anya dị iche iche nke nkà ihe ọmụma ndị Hindu, ọ kọwapụtara eziokwu ndị na-eju afọ a na-achọta na Bible Nsọ . . . Eziokwu ndị doro anya n’Okwu ya ga-eru n’obi ndị agụụ ezi omume na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ya.”
Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe ọsụ ụzọ ahụ mere mgbe o zutere Kashi, nwanyị si India nke nakweere ọmụmụ Bible. Kashi nọgidere na-enwe ọganihu, ngwa ngwa kwa ọ na-agwa ndị enyi ya nile okwu banyere ihe ọ na-amụta. Otu ụbọchị onye ọsụ ụzọ ahụ zutere nwunye onye nnọchianya mba, bụ́ onye jụrụ ya sị: “Ọ̀ bụ gị na-akụziri Kashi Bible?” Lee ka o si ju onye ọsụ ụzọ ahụ anya mgbe nwaada ahụ sịrị: “Lee ezi onye nkụzi ọ bụ! O nwere ike ime ka m kweta n’ọtụtụ isi ihe. Leenụ, ya bụ onye Hindu ịkụziri mụ bụ onye Katọlik Bible!”
Mgbe i zutere ndị Philippine, ị ga-amata ozugbo na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha hụrụ Bible n’anya. Ha jupụtara n’ihu ọchị, na-elekwa ndị ọbịa nke ọma, ọ dịkwa mfe iso ha malite mkparịta ụka. Otu nwaada bụ onye Philippine nakweere magazin abụọ ngwa ngwa, ma n’ihi ịbụ onye Katọlik, ọ tụfuru ha. N’izu ole na ole n’ihu ọ nakweere abụọ ọzọ, bụ́ ndị ọ hapụrụ n’akpa nta ya. Otu abalị, ọ gụrụ ya agụụ ịgụ ihe. Mgbe ọ chọgharịsịrị ihe na-adọrọ mmasị ọ ga-agụ, ọ chọtara magazin ndị ahụ. N’enweghị mmasị, ọ malitere ịgụ ha, mmasị ya rịkwara elu. N’oge na-adịghị anya ka ọ malitere, otu Onyeàmà bịara n’ụlọ ya, nwaada ahụ jụkwara ọtụtụ ajụjụ. Nke a bụ nke mbụ ya o ji nkwenkwe Katọlik ndị o nwere tụnyere ihe Bible na-ekwu. Nkọwa ezi uche dị na ya, nke Akwụkwọ Nsọ, mere ka o kweta na o mesịwo chọta eziokwu ahụ.
“Zipụ Nri Gị”
Ọtụtụ n’ime ndị ofesi bi ná mba ahụ nọ na Belgium maka azụmahịa ma ọ bụ iji rụọ ọrụ n’otu n’ime 150 ụlọ ọrụ nnọchianya mba dị iche iche ndị iwu nabatara ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ Òtù Na-ejikọ Mba Nile nke Europe. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha na-anọ afọ ole na ole. Ikwusara ha na iduziri ha ọmụmụ Bible pụrụ iyi ihe na-adịghị amịpụta mkpụrụ na mbụ. Ma Bible na-echetara anyị, sị: “Zipụ nri gị n’elu mmiri: n’ihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-ahụ ya.” (Eklisiastis 11:1) Ọtụtụ mgbe ihe ndị ọ na-arụpụta na-enyeghachi ụgwọ ọrụ na-eju anya.
Nke a bụ otú ọ dị n’ihe banyere otu nwanyị onye America onye na-anata Onyeàmà magazin mgbe nile. Mgbe oge na-aga, Onyeàmà ahụ gosipụtara uru nke ịmụchi Bible anya, o wee kwuokwa ka ya duziere ya ọmụmụ ihe. Nwanyị ahụ kwenyere ma nwee ọganihu ngwa ngwa. Ngwa ngwa ọ hụrụ ọdịiche dị n’ezi okpukpe na nke ụgha. Ya mere o wepụchasịrị n’ụlọ ya ihe oyiyi okpukpe nile. Mgbe ahụ oge ruru ka ọ lọghachi United States. Nke ahụ ọ̀ pụtara ọgwụgwụ nke ọganihu ime mmụọ ya? Cheedị echiche ọṅụ na ijuanya Onyeàmà ahụ nwere mgbe ọ natara òkù fon site n’aka otu Onyeàmà na United States, bụ́ onye na-agwa ya na nwaada ahụ agawo n’ihu n’ọmụmụ ihe ya, ọ rarawokwa ndụ ya nye Jehova Chineke, e mewokwa ya baptism! N’ezie, ọ nọworị na-eje ozi dị ka onye ozi ọsụ ụzọ inyeaka.
Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ebe Kashi, nwanyị India ahụ, na n’ebe nwaada ahụ si Philippine e bu ụzọ hota, nọ. Mgbe Kashi lọghachiri India, ya na di ya maliteghachiri ọmụmụ Bible ha. N’ikpeazụ ha abụọ raara onwe ha nye Jehova ma kere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ. Ebe ha bi n’ógbè ebe a na-enweghị Ndịàmà ọzọ, ha wepụtara ụlọ ha maka Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Kashi jere ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka ruo otú ahụ ike ya nyere ya ohere, ọ nọwokwa na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi isii, na-agụnye ihe karịrị 31 mmadụ. N’otu aka ahụ, mgbe oge na-aga, nwanyị onye Philippine ahụ kwalara United States, nwee ọganihu ruo nraranye na baptism, wee ghọọ ọsụ ụzọ oge nile. Ihe obi ụtọ ndị dị otú ahụ a rụpụtara so n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ nke ndị nkwusa Alaeze na Belgium na-enweta ka ha nọgidere na-ekwusa na ndị nọ n’ókèala ha ozi ọma.
Ihe Ịma Aka nke Ọtụtụ Asụsụ
Iji rụzuo ọrụ nke ikwusara “mmadụ nile” ozi ọma, ọ dịwo alaka ụlọ ọrụ mkpa inwe akwụkwọ e ji amụ Bible n’ihe karịrị otu narị asụsụ. E nwere ugbu a ọgbakọ ndị dị na Belgium n’asụsụ iri. N’ime 341 ọgbakọ ndị e nwere, 61 dị n’asụsụ ndị ofesi, n’ime 26,000 ndị nkwusa Alaeze kwa, 5,000 si ofesi. Otu ọgbakọ nwere ndị ikom na ndị inyom si 25 mba dị iche iche. Cheedị ụdị ọcha na ọdịiche ndị a na-enwe ná nzukọ ha nile! Ma ịhụnanya na ịdị n’otu e nwere n’etiti ụmụnna ahụ bụ ihe akaebe siri ike maka ezi iso ụzọ Kraịst.—Jọn 13:34, 35.
Ebe e nwere ọtụtụ ndị bi na Belgium nwere mkpa ịnụ ozi ọma ahụ n’asụsụ mba ọzọ, ndị nkwusa ụfọdụ anakwerewo ihe ịma aka nke ịmụta asụsụ ụfọdụ ndị siri ike, dị ka Turkish, Arabic, na Chinese. E nyeghachiwo mgbalị ha nile ụgwọ ọrụ n’ụba.
Ndị na-arụ ọrụ n’etiti ndị Arab na-ahụ na ọtụtụ mgbe ha pụrụ ịkpalite inwe mmasị na Bible site n’ịkọwapụta uru ya ndị dị irè. Otu onye nkwusa Alaeze so onye prọfesọ bụ́ onye Arab nwee nkwurịta okwu na-adọrọ mmasị, e mesịa ruo afọ atọ mgbe nke ahụ gasịrị o nweghị ike ịchọta prọfesọ ahụ ọzọ. N’abụghị onye na-enwe nkụda mmụọ ngwa ngwa, onye nkwusa ahụ kpebiri ịhapụrụ prọfesọ ahụ mpempe akwụkwọ ozi e dejupụtara ajụjụ dị iche iche nke Bible. Nke a kpaliri ya nke ukwuu nke na ọ dị njikere iji ezi uche nyochaa Bible. Ihe ọ chọpụtara tụrụ ya na nwunye ya n’anya nke ukwuu nke na ha abụọ, bụ́ ndị Alakụba, setịpụrụ mgbede ụfọdụ kpọmkwem iji gụkọọ Bible ọnụ.
Ndị na-anwa inyere ìgwè buru ibu nke ndị China n’obodo ukwu dị iche iche aka nwere ihe mgbochi ọzọ ha ga-emeri gụnyere ihe ngechi nke asụsụ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị China ekwenyeghị na Chineke dị ka Onye Okike ma ọ bụ na Bible dị ka Okwu Chineke. Ma, ha nwere ọchịchọ ịmata ihe, chọọkwa ịmata isi ihe ọ na-ekwu. Ha bụkwa ndị na-agụ akwụkwọ nke ukwuu. Ọ bụghị ihe na-eju anya ha ịgụcha akwụkwọ ọ bụla e ji amụ Bible a hapụụrụ ha, ma ọ bụ ọbụna akụkụ dị ukwuu nke Bible, nanị n’ụbọchị ole na ole. Ọ bụrụ na obi ha ziri ezi, ike Okwu Chineke na-akpali ha.
Otu nwaada bụ́ onye China nwere oké ihe isi ike ịnakwere echiche nke Onye Okike. Ma n’oge ọmụmụ ihe nke abụọ, anya mmiri juru ya n’anya mgbe ọ sịrị: “Ugbu a ekwenyewo m na Jehova Chineke, n’ihi na ọ bụrụ na 40 ndị ikom dị iche iche dere Bible n’agbata oge dị 1,600 afọ ma o kwekọro n’akụkụ nile n’otu isiokwu, mgbe ahụ ọ ghaghị ịbụ na Jehova Chineke duziri odide ya. Ezi uche dị nnọọ na nke ahụ!”
Nwaada ọzọ bụ́ onye China ka otu Onyeàmà jekwuuru n’ime ntakịrị ụgbọ okporo ígwè e ji eletrik anya. “Ị̀ bụ onye Kraịst?” ka ọ jụrụ Onyeàmà ahụ. O kwuru mgbe ahụ na ya nwere oké mwute ịhụ ihe dị ukwuu na-emegiderịta onwe ha n’etiti ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst. Onyeàmà ahụ kwenyere n’ihe o kwuru ma kọwaa na Bible adịghị emegide onwe ya. Kpọmkwem na mgbe ahụ ka nwaada ahụ ga-arịtu n’ụgbọ ahụ. O nyere Onyeàmà ahụ adres ebe o bi, mgbe o letakwara ya, nwaada ahụ tiri mkpu sị: “A sị na m maara, m gaara abanyewo n’ụgbọ ahụ n’otu afọ tupu mgbe ahụ!” Mgbe a jụrụ ya ihe o bu n’uche, nwaada ahụ kọwara, sị: “Nke ahụ bụ mbụ m ji ụgbọ ahụ gaa mahadum. Ị̀ pụrụ ịghọta ya? Emefusịrị m otu afọ!” O nwere obi ụtọ nke ukwuu ịmụ Bible ọbụna nanị n’ime ọnwa ole na ole tupu ọ lọghachi China.
Ahụmahụ ndị dị otú a akụziworo Ndịàmà ahụ nọ na Belgium ihe. “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ewepụkwala aka gị n’anyasị,” ka Bible na-ekwu, “n’ihi na ị dịghị ama nke ga-agazi agazi, ma ọ bụ nke a ma ọ bụ nke ọzọ, ma ọ bụ na ha abụọ ga-adị mma otú aka ahụ.” (Eklisiastis 11:6) Nkwụghachi ụgwọ a na-enweta kwesịrị mgbalị ndị a na-etinye iji merie ihe mgbochi nile nke asụsụ, omenala, na ọdịnala. Nzaghachi na-ekpo ọkụ na-anwapụta karịsịa ihe nile na n’ezie Chineke “abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.