Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 12/1 p. 32
  • “Dị Ka Ọdụm Na-agbọ Ụja”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Dị Ka Ọdụm Na-agbọ Ụja”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 12/1 p. 32

“Dị Ka Ọdụm Na-agbọ Ụja”

Ị̀KWERE na Setan dị adị? Taa, ọtụtụ ekweghị. O yiri ka ha na-ele nkwenkwe dị otú ahụ anya dị ka “ihe na-ekwekọghị na sayensị.” Ọbụna laa azụ na 1911, akwụkwọ bụ́ Encyclopaedia Britannica kwuru, sị: “Sayensị akọwawo ihe ndị na-eme n’ógbè ndị na-adịghị n’ụwa nakwa ọdịdị dị n’ime nke mmadụ nke na e nweghị ihe ọ bụla na-enye echiche banyere ọrụ Setan.” Ndị ọkà mmụta okpukpe na-atụgharị uche na Setan bụ nanị ihe nnọchianya, akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị ọkà mmụ́tà okpukpe ọgbara ọhụrụ na-ewere Ekwensu dị ka ihe nnọchianya nke ike ihe ọjọọ, nke àgwà ndị kasị njọ nke ọdịdị mmadụ.”

Otú ọ dị, olee ihe ndị bụ eziokwu? Ọ bụrụ na i kwere na Bible, ị ghaghị ikwere na Setan dị adị n’ezie. Ọ bụghị nanị na Jisọs kwere na ọ dị adị kama ọ kpọrọ ya “onye isi nke ụwa nke a.” (Jọn 14:30) Pọl onyeozi kpọrọ Setan “chi nke oge a.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Jọn onyeozi ahụ meworo agadi kwukwara, sị: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19.

Ọ bụrụ na i kweghị n’ihe Jọn kwuru, chee echiche banyere akụkọ ihe ndị mere n’oge na-adịghị anya gara aga. Chee banyere ndị ogbu mmadụ na ojiji nke ndị gọọmentị na-eji mmekpa ahụ eme ihe. Cheta banyere agha na mgbukpọ ndị ọgbọ anyị hụworo. Gịnịkwa banyere mpụ ihe ike ndị na-apụta n’isi akwụkwọ akụkọ anyị—mgbukpọ n’ìgwè, ndina n’ike, igbu mmadụ, mmetọ mmekọahụ nke ụmụaka, ka anyị weregodị nani ihe atụ ndị a? Ọ̀ dị onye ọzọ ma e wezụga Setan nke pụrụ ịbụ chi nke ụwa a?

Onyeozi ndị Kraịst bụ́ Pita dọrọ aka ná ntị, sị: “Na-echenụ nche: onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe, bụ́ Ekwensu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.” (1 Pita 5:8) Ọ bụrụ na ọdụm na-akpagharị n’agbata obi unu, ị̀ ga-anọ na-atụle ma ọ̀ dị adị ma ọ bụ na ọ dịghị? Ka ị̀ ga-agba ọsọ ịchọta ebe ị ga- ezo?

Kwere na Setan dị adị. Ọ naghị eme ebere, obi kpọkwara ya nkụ, ọ dịkwa ike karịa anyị. Ya mere, gbaa ọsọ ịchọta nchebe n’aka Onye dị ike ọbụna karị. “Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọ n’elu.” (Ilu 18:10) Nọrọ n’ebe mgbaba nke Jehova Chineke, marakwa na n’oge na-adịghị anya a ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere onwe ya pụọ ná mmetụta nke ajọ onye ahụ, bụ́ Setan. Lee ntọhapụ na-enye ọṅụ nke ahụ ga-abụ!—Mkpughe 20:1-3.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya