“Dị Ka Ọdụm Na-agbọ Ụja”
Ị̀KWERE na Setan dị adị? Taa, ọtụtụ ekweghị. O yiri ka ha na-ele nkwenkwe dị otú ahụ anya dị ka “ihe na-ekwekọghị na sayensị.” Ọbụna laa azụ na 1911, akwụkwọ bụ́ Encyclopaedia Britannica kwuru, sị: “Sayensị akọwawo ihe ndị na-eme n’ógbè ndị na-adịghị n’ụwa nakwa ọdịdị dị n’ime nke mmadụ nke na e nweghị ihe ọ bụla na-enye echiche banyere ọrụ Setan.” Ndị ọkà mmụta okpukpe na-atụgharị uche na Setan bụ nanị ihe nnọchianya, akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị ọkà mmụ́tà okpukpe ọgbara ọhụrụ na-ewere Ekwensu dị ka ihe nnọchianya nke ike ihe ọjọọ, nke àgwà ndị kasị njọ nke ọdịdị mmadụ.”
Otú ọ dị, olee ihe ndị bụ eziokwu? Ọ bụrụ na i kwere na Bible, ị ghaghị ikwere na Setan dị adị n’ezie. Ọ bụghị nanị na Jisọs kwere na ọ dị adị kama ọ kpọrọ ya “onye isi nke ụwa nke a.” (Jọn 14:30) Pọl onyeozi kpọrọ Setan “chi nke oge a.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Jọn onyeozi ahụ meworo agadi kwukwara, sị: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19.
Ọ bụrụ na i kweghị n’ihe Jọn kwuru, chee echiche banyere akụkọ ihe ndị mere n’oge na-adịghị anya gara aga. Chee banyere ndị ogbu mmadụ na ojiji nke ndị gọọmentị na-eji mmekpa ahụ eme ihe. Cheta banyere agha na mgbukpọ ndị ọgbọ anyị hụworo. Gịnịkwa banyere mpụ ihe ike ndị na-apụta n’isi akwụkwọ akụkọ anyị—mgbukpọ n’ìgwè, ndina n’ike, igbu mmadụ, mmetọ mmekọahụ nke ụmụaka, ka anyị weregodị nani ihe atụ ndị a? Ọ̀ dị onye ọzọ ma e wezụga Setan nke pụrụ ịbụ chi nke ụwa a?
Onyeozi ndị Kraịst bụ́ Pita dọrọ aka ná ntị, sị: “Na-echenụ nche: onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe, bụ́ Ekwensu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.” (1 Pita 5:8) Ọ bụrụ na ọdụm na-akpagharị n’agbata obi unu, ị̀ ga-anọ na-atụle ma ọ̀ dị adị ma ọ bụ na ọ dịghị? Ka ị̀ ga-agba ọsọ ịchọta ebe ị ga- ezo?
Kwere na Setan dị adị. Ọ naghị eme ebere, obi kpọkwara ya nkụ, ọ dịkwa ike karịa anyị. Ya mere, gbaa ọsọ ịchọta nchebe n’aka Onye dị ike ọbụna karị. “Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọ n’elu.” (Ilu 18:10) Nọrọ n’ebe mgbaba nke Jehova Chineke, marakwa na n’oge na-adịghị anya a ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere onwe ya pụọ ná mmetụta nke ajọ onye ahụ, bụ́ Setan. Lee ntọhapụ na-enye ọṅụ nke ahụ ga-abụ!—Mkpughe 20:1-3.