Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ntọhapụ Ime Mmụọ na Colombia
SITE n’oge mmeri ndị Spain, okpukpe Katọlik agbawo mkpọrọgwụ okpukpe siri ike n’Ebe Ndịda America. Na Colombia, ọ dịwo anya ọ ghọrọ okpukpe Obodo nke dị n’iwu. Kemgbe 105 afọ gara aga, Vatican enwewo akwụkwọ nkwekọrịta sitere n’aka gọọmentị Colombia nke chebere chọọchị ahụ ma nye ya ihe ùgwù ndị pụrụ iche n’ihe metụtara agụmakwụkwọ na alụmdi na nwunye.
Na December 1990, ndị Colombia họpụtara otu òtù imepụta iwu ọhụrụ, bụ́ nke e mesịrị ka ọ na-erule etiti afọ 1991. Iwu ọhụrụ ahụ na-agbanwe ọnọdụ okpukpe na Colombia. Ugbu a okpukpe nile nwere ikike hà nhata n’iwu, a pụghịkwa ịmanye ụmụaka ịnara nkụzi okpukpe n’ụlọ akwụkwọ obodo. Oge eruwo maka ịtụleghachi akwụkwọ nkwekọrịta ahụ dị n’etiti ha na Vatican, na-eburu n’uche mgbanwe ndị a dị n’iwu.
Nnwere onwe okpukpe nke a dị ukwu karị ga-ebelata mmetụta nke Chọọchị Katọlik, na-eme ka ọ dịrị ndị obi ha ziri ezi mfe karị inweta ihe ọmụma Bible na inwe nnwere onwe ime mmụọ.
Site n’ịtụ anya ntọhapụ ime mmụọ nke a, 51,000 Ndịàmà Jehova nọ ná mba a anọwo na-eme nkwadebe iji lekọta ndị gbatara ọsọ enyemaka ime mmụọ. Ogige alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ ha e mere ka ọ saa mbara, nke gụnyere ìgwè offset na-ebi akwụkwọ ngwa ngwa n’àgwà mara mma, fọrọ nke nta ka a rụchaa ya. E zigawo ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge gaa n’obodo ndị dị nta karị ịchọ atụrụ Jehova furu efu, ha arụwokwa ọrụ nkụzi Bible mara mma nke ukwuu. Na 63 obodo, nke nwere ihe dị ka 10,000 ndị bi na nke ọ bụla, e guzobewo 47 ọgbakọ na ìgwè ọhụrụ dị iche iche.
Ka mmụọ Jehova nọgidere na-akpali ndị obi ha ziri ezi, ọtụtụ ndị ntorobịa na-azaghachikwa. Akwụkwọ ahụ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work aghọwo nke bara oké uru nye ma ndị dị otú ahụ na-eto eto ma ndị mụrụ ha. Mgbe ọ na-aga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, otu Onyeàmà zutere otu nwoke nke gụworo akụkụ dị iche iche nke akwụkwọ a, nke otu onye agbata obi ya gbazinyere ya. O nwere mmasị nke ukwuu site n’amamihe dị irè nke o gosipụtara n’ịtụle nsogbu ezinụlọ. Isi nke 4, “N’ihi Gịnị Ka Papa na Mama M Ji Kewaa?” masịrị ya karịsịa, ebe ọ bụ na ọ fọrọ nke nta ka ya na nwunye ya kewaa. Ọ sịrị na akwụkwọ ahụ zọpụtara ya pụọ n’oké ọdachi. Ugbu a ya na ezinụlọ ya na-eso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, na-abịakwa nzukọ nile nke ọgbakọ. Ha nwere obi ekele dị ukwuu maka amamihe ahụ dị irè nke Jehova na-ewepụta site na Bible na nzukọ ya.
Ahụmahụ nke a na-eme ihe atụ nke ntọhapụ ime mmụọ na-ewere ọnọdụ na Colombia ka Ndịàmà Jehova na-enyere ndị agụụ ihe ime mmụọ na-agụ aka ịmụta banyere nzube nile dị ebube nke Jehova na ụwa ọhụrụ ya, nke dị nso ugbu a.—2 Pita 3:13.