Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 9/15 p. 24-27
  • Ha Na-achọta Ezi Obi Ụtọ na “Paradaịs”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Na-achọta Ezi Obi Ụtọ na “Paradaịs”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • E Meriwo Ụjọ nke Ọnwụ
  • Ezi Iso Ụzọ Kraịst Dọọrọ Mmasị Ha
  • E Nweta Udo na Obi Ụtọ
  • Ịchụ Àjà Dị Iche Iche na Nkwụghachi Ụgwọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 9/15 p. 24-27

Ha Na-achọta Ezi Obi Ụtọ na “Paradaịs”

PARADAỊS! Okwu ahụ na-abatakarị n’uche mgbe ndị mmadụ na-eche banyere Hawaii—ọ bụkwa ezi ihe kpatara nke ahụ. N’ụzọ bara ụba n’ebe a, e nwere ihu eluigwe dị jụụ, urukpuru na-acha anụnụ anụnụ, úkwù nkwu ndị na-amagharị amagharị, ikuku dị jụụ n’ahụ, na ụsọ osimiri ndị jupụtara n’ájá—bụ́ ihe ndị ọtụtụ pụrụ ile anya dị ka ọnọdụ paradaịs.

Ihe ndị a adọtawo ndị mmadụ site n’akụkụ dị iche iche. Ha esiwo Esia, akụkụ Pacific, kọntinent America, na ọbụna ebe ndị dị ka agwaetiti nile nke Caribbean na Europe, wee bịa. Ọtụtụ akwatawo n’ebe a n’ihi ihu igwe na-adị jụụ n’oge nile n’afọ. Ndị ọzọ abịawo ịchọ ọnọdụ akụ na ụba ka mma—nakwa obi ụtọ, n’ezie. Ihe si na ya pụta bụ njikọ nke ndị si ná mba na agbụrụ dị iche iche, na-enwe ọdịiche mara mma nke ọdịnala na echiche okpukpe dị iche iche.

Otú ọ dị, ọnọdụ ahụ nwere akụkụ ọzọ. Dị ka ọtụtụ ebe mara mma n’elu ala, Hawaii jupụtara n’imempụ, ọgwụ ọjọọ, isi ike, mmetọ, na ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ na-adakwasị ezinụlọ mmadụ n’agbanyeghị ebe mmadụ bi. Site ná nleghara anya na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke mmadụ, agwaetiti nile nke Hawaii ji nwayọọ nwayọọ bụrụ nke a na-emebi ịma mma nke okike ha. Ndị mmadụ chọrọ paradaịs, ma ọ bụghị mmadụ nile bi n’ebe a na-eche echiche mgbe nile ime ma ọ bụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, idebe agwaetiti ndị a n’ọnọdụ paradaịs. Ọ bụghị nanị ebe nkiri mara mma na ihu igwe dị mma n’ahụ na-eme ka e nwee paradaịs.

Otú ọ dị, e nwere ìgwè ndị mmadụ na-amụba amụba bi n’ebe a bụ́ ndị na-ama ụtọ nke ezi obi ụtọ n’ọnọdụ paradaịs nke a. Ha bụ ndị na-anakwere eziokwu Bible ma jiri obi ha na-ekwere nkwa Chineke nke dị ebube: “M gaje ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: a gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi.” Ndị a ji obi ụtọ na-elepụ anya n’ọdịnihu, na-eburu okwu nke Pita onyeozi n’uche: “Dị ka nkwa ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (Aịsaịa 65:17; 2 Pita 3:13) Ndị a bụ ole ndị? Olee ụzọ ha si mụta banyere olileanya ahụ dị ebube nke dị n’ime Bible? Mgbanwe ndị dị aṅaa ka e wetaworo ná ndụ ha?

E Meriwo Ụjọ nke Ọnwụ

Isabel na di ya, bụ́ George, bụ ndị Filipino. A zụlitere ya ịgbaso okpukpe Roman Katọlik nke ndị mụrụ ya, ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe ọ bụla o lebara anya n’ime Bible. A kụziworo Isabel na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ. Olee ụzọ o si nabata ozizi ụgha nke a? Leenụ, echiche nke ịbụ onye nwụrụ anwụ na-atụ ya ụjọ n’ihi na o nwere echiche nke ịbụ onye e liri ná ndụ n’akpati ozu, mkpụrụ obi ya bụrụ nke na-enweghị ike ịgbapụ dị ka o si chee. Otú ọ dị, na 1973, Isabel malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Mgbe ọ mụtara na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ, na Chineke ga-emegharị ihe ọnwụ mebiri site ná mbilite n’ọnwụ, o nwere ọṅụ dị ukwuu ma nwerekwa onwe ya nke ukwuu. (Ezikiel 18:4, 20; Jọn 5:28, 29) Eziokwu nke Bible kpaliri mmasị ya nke na o nwere ọganihu dị ngwa.

Gịnị banyere George? Ya onwe ya sonyekwara n’oge nkwurịta okwu Bible ma ọ bụ nanị n’echiche nke ịnwapụta na Ndịàmà ahụ na-ekwu ihe na-ezighị ezi. Otú ọ dị, ọ pụghị ịhụ ihe ọ bụla dị njọ n’ihe a na-akụziri ya na nwunye ya. N’ezie, n’oge na-adịghị anya mgbe ha malitere ịmụ ihe, isiokwu nke ọbara bilitere. Ruokwa mgbe ahụ, George anọwo na-enwe mmasị n’iri nri e ji ọbara kwadebe. Ma mgbe ọ hụrụ na Bible na-emegide iri ọbara n’ụzọ doro anya, ọ kwụsịrị nke ahụ. (Jenesis 9:3, 4; Levitikọs 17:10-12; Ọrụ 15:28, 29) Ọ nọgidere na-ekere òkè n’ọmụmụ Bible ahụ, o nwekwara obi ụtọ na o mesịwo chọta eziokwu ahụ. Taa, George, Isabel, na ụmụ ha anọ na-enweta obi ụtọ site n’ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ nile nke Chineke.

Ezi Iso Ụzọ Kraịst Dọọrọ Mmasị Ha

Otu nwoke bụ́ onye Japan aha ya bụ George na nwunye ya bụ́ onye Portugal, bụ́ Lillian, nọ n’afọ ndụ ha nke 60. A mụrụ ha abụọ ma zụlite ha na Hawaii. Ebe ọ bụ na ndị mụrụ George enyeghị ya ntụziaka okpukpe ọ bụla, ọ dịghị mgbe o ji okpukpe kpọrọ ihe. Ma, ọ nọgidewo na-ekwere na Chineke. N’aka nke ọzọ, ndị mụrụ Lillian zụlitere ya n’okpukpe ha, dị ka onye Roman Katọlik.

Ọ bụ ezie na George abụghị onye na-agụ Bible nke ukwuu, ọ nọwo na-agụ magazin Ụlọ Nche na Teta! ruo ihe dị ka 30 afọ. O siwo otú a mụta ọtụtụ ihe banyere Bible. Otú ọ dị, n’ihi ịbụ onye na-ese oké siga na onye na-aṅụ oké mmanya, ọ dịghị ngwa n’ime mgbanwe ná ndụ ya. Ka ọtụtụ afọ na-agabiga, George nọgidere na-agụ magazin ndị ahụ, na-abịakwa mgbe ụfọdụ ná nzukọ ndị Kraịst a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ihi gịnị? N’ihi na, dị ka o si kwuo ya, “okpukpe ndị ọzọ bụ ndị ihu abụọ” n’ịnabata ọtụtụ ihe ọjọọ ndị e megidere na Bible. Ọ pụrụ ịhụ na Ndịàmà Jehova dị iche.

Gịnị dọọrọ mmasị nwunye George nke raara onwe ya nye ya, bụ́ Lillian, n’eziokwu nke Okwu Chineke ọ bụ ezie na okpukpe nke ndị mụrụ ya nwere mmetụta dị omimi n’ahụ ya? Lee, nwanne ya nwanyị n’anụ ahụ kpọrọ ya òkù ịbịa nzukọ ndị a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. “Ọnọdụ ezinụlọ obi ụtọ na ọchị ihu enyi ndị ahụ tọrọ m ụtọ,” ka Lillian chetara. Ezi ịhụnanya ọ hụrụ nke e gosipụtara n’etiti ndị Jehova mere ka o kweta na nke a bụ eziokwu. (Jọn 13:34, 35) Ọ nakweere ọmụmụ Bible, mesịakwa rara ndụ ya nye Jehova Chineke, bụrụkwa onye e mere baptism n’ọnwa ole na ole mgbe e mesịrị di ya.

George adịghịkwa ese siga ma ọ bụ na-aṅụbiga mmanya ókè, Lillian atụfuwokwa ihe oyiyi ya nile nke okpukpe. Site n’obi jupụtara n’ịhụnanya, ha na-eso ndị ọzọ na-ekerịta ihe ha mụtaworo, tinyere 25 ụmụ ụmụ ha na ụmụ 4 ndị ụmụ ụmụ ha mụtara. Nanị lee ha anya n’ihu, ị ga-ahụkwa otú George na Lillian si bụrụ ndị na-enwe obi ụtọ!

E Nweta Udo na Obi Ụtọ

Patrick, bụ́ onye Ireland katatuworo ahụ, na nwunye ya onye Juu, bụ́ Nina, ha abụọ kwagara na Hawaii site n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ United States. Na mbụ, ha ebiwo ihe a na-akpọ ndụ ime otú ọ masịrị gị nke ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ịnwale okpukpe, na omume rụrụ arụ. Ha nọrọ ọtụtụ afọ dị ka ndị so n’otu ịrọ òtù, na-agbalị inweta ọnọdụ uche dị elu site n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ntụgharị uche, na site n’aka onye nkụzi okpukpe nke aka ha. Ka oge na-aga, ike gwụrụ Patrick n’ihi ekworo, ịma aka, na esemokwu na-adị mgbe mgbe n’etiti ndị so n’ịrọ òtù ahụ bụ́ ndị na-azọrọ na ha enwetawo ‘ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ọnọdụ uche.’ Ọ hapụrụ òtù ahụ ma laghachi na Hawaii, bụ́ ebe o biworo na mbụ, na-enwe olileanya ịchọta udo nke uche. Mgbe nke ahụ gasịrị, Patrick mere ka Nina, bụ́ enyi ya nwanyị n’oge ahụ, kweta ịbịa leta ya. E mesịa, ha lụrụ di na nwunye wee biri na Hawaii.

O nweghị ka Patrick na Nina si mara na ọchịchọ ha na-achọ udo na obi ụtọ ga-emesịa duga n’iso Ndịàmà Jehova na-enwe ọmụmụ Bible. Dị ka onye na-ekweghị na Chineke n’ụzọ siri ike ná ndụ ya nile, Nina malitere ịchọta azịza Bible ndị na-eju afọ nye ajụjụ ndị na-agbagwoju anya banyere ihe mere ajọ ihe ji dịrị na ihe mere ihe ọjọọ ji adakwasị ndị ọma. Ọchịchọ Patrick chọrọ eziokwu ruo afọ iri n’otu aka ahụ mesịrị rụpụta ihe na-enye obi ụtọ. N’oge na-adịghị anya, ihe ya na Nina na-amụta site na Bible malitere ịgbanwe ụzọ ha si eme omume. Mgbe ọ gbasịrị mbọ siri ike ruo ogologo oge, Patrick meriri iri ahụ ụtaba nke gbaworo mkpọrọgwụ n’ahụ ya. Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ ugbu a, ya na nwunye ya ebiwo ndụ dị ọcha, nke omume ọma n’ikwekọ n’ụkpụrụ nile nke Chineke. Site n’obi dị ọcha nakwa akọ na uche dị ọcha, ha na-enweta udo nke ha nọworo na-achọ.

Ịchụ Àjà Dị Iche Iche na Nkwụghachi Ụgwọ

“Jisienụ ike isi n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na ọtụtụ mmadụ, ka m sịrị unu, ga-achọ ịba n’ime ya, ma ha agaghị enwe ike.” (Luk 13:24) Okwu ndị ahụ nke Jisọs Kraịst kwuru na-egosi n’ụzọ doro anya na ọ dịghị mfe ijere Chineke ozi ma na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Akwụkwọ nsọ. Ọ bụghị nanị na onye ọ bụla na-achọ ime otú ahụ ga-etinye mgbalị dị mkpa kamakwa ọ ga-eji ihe ndị dị mkpa chụọ àjà. N’ezie, nke a abụwo ihe mere n’ọnọdụ ndị ahụ e hotara n’akụkọ nke a. Ma lee ụzọ dị ebube e siworo kwụghachi ha ụgwọ!

Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Patrick na Nina, bụ́ ndị a ka kwusịrị banyere ha. Ha mere oké mgbanwe site n’ụzọ ndụ ebe ha na-akpata ego buru ibu gaa na nke ije ozi oge nile nke ndị Kraịst bụ́ nke ha na-akwado site n’ịrụ ọrụ ego nwa oge. Ma, ha kwenyesiri ike na uru ime mmụọ dị na ya ji ihe dị ukwuu karịa ihe onwunwe ọ bụla ha jiworo chụọ àjà. Ha na-enwekwa obi ụtọ n’ezie.

N’ihi afọ ndụ ha, ime mgbanwe adịbeghịrị George na Lillian mfe. Ikere òkè ná nzukọ na ije ozi nile nke ndị Kraịst chọrọ oge, ntụkwasị uche, na mgbalị anụ ahụ. Otú ọ dị, n’oké obi ụtọ ha, ahụ ike ha akawo mma, a pụkwara ịkọwa ndụ ha na-adị ugbu a dị ka nke ịgbasi ike, nke juru eju, na nke obi ụtọ.

Banyere George na Isabel, ihe ịma aka kasị ukwuu ha nwere bụ n’ịzụlite ụmụ ha na inyere ha aka ịbata n’okporo ụzọ nke ndụ. Oge na mgbalị dị ukwuu dị mkpa iji kwadebe ụmụ anọ maka nzukọ ndị Kraịst ma ọ bụ ịkpọrọ ha n’ozi ndị Kraịst. N’otu oge, nrụgide na-abịa mgbe mgbe mere ka George na Isabel laa azụ n’ibu ọrụ ha nile dị ka ndị mụrụ ụmụ. Ma otu okwu ihu ọha dabeere na Bible a kpọrọ “Ịtụteghachi Mmụọ nke iji Onwe Onye Achụ Àjà” kpaliri ha ịmụba mgbalị ha inye ụmụ ha anọ ntụkwasị uche na ọzụzụ nile dị mkpa iji ‘zụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Jehova.’ N’ezie, mgbalị ndị dị otú ahụ abụwo ndị a kwụghachiri ụgwọ nke ukwuu.—Ndị Efesọs 6:4.

Ọ bụghị ebe nkiri ndị ahụ mara mma, ihu eluigwe dị mma n’ahụ, ma ọ bụ ntụsara ahụ nke usoro ịdị ndụ na-eweta ezi obi ụtọ nye ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ. Kama nke ahụ, ọ bụ ihe ọmụma nke na ha na-eji ndụ ha na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke ma na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ nile nke Okwu ya, bụ́ Bible. (Eklisiastis 12:13) Ọzọkwa, ezi obi ụtọ na-ejupụta n’obi ha ka ha na-atụgharị uche banyere oge ahụ na-enye ọṅụ mgbe a ga-eweghachi paradaịs elu ala n’elu ụwa nile.—Luk 23:43.

[Foto dị na peeji nke 25]

George, Isabel, na ụmụ ha na-enweta obi ụtọ n’ịgụ Bible

[Foto dị na peeji nke 26]

George na Lillian na-enweta obi ụtọ n’ije ozi ndị Kraịst

[Foto dị na peeji nke 27]

Patrick na Nina na-enwe ezi udo n’ozi Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya