Onye Achịbishọp Apụghị Ịnagide Ya!
N’AFỌ gara aga, e guzobere otu nzukọ (nzukọ dị nsọ nke ndị kadinal) ịtụle okwu ụfọdụ nke na-enye Chọọchị Katọlik nsogbu nke ukwuu. Otu n’ime okwu ndị a, dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Il Sabato, bụ “mwakwasị nke òtù dị iche iche.” Otú ọ dị, akwụkwọ akụkọ ahụ sịrị: “O kwesịghị ịbụ ihe siri ike nye ndị kadinal ahụ inwe nkwekọrịta n’isiokwu nke a. Ha nile kwekọrịtara na e nwere mkpa maka ihe ọmụmụ dị omimi banyere ọdịdị nke òtù okpukpe ọhụrụ dị iche iche nakwa mkpa ọ dị igbochi, ruo n’ókè o kwere mee, mmụba ha.”
Otú ọ dị, o doro anya na “mwakwasị nke òtù dị iche iche” abụghị nanị nsogbu dị n’Itali. Akwụkwọ akụkọ Il Sabato kọrọ, sị: “Ka anyị na-eleta Vatican n’oge na-adịbeghị anya gara aga, Archbishop Kirill nke Smolensk [otu n’ime nnukwu obodo kasị mee ochie na Russia] . . . rịọrọ popu maka enyemaka okpukpe iji nagide oké mmụba nke Ndịàmà Jehova na òtù ndị yiri ha na Soviet Union.”
Na narị afọ mbụ, ndị ndú nke okpukpe a haziri ahazi mere mkpesa yiri nke ahụ mgbe ndị nọ n’Iso Ụzọ Kraịst mere ka ọ gbasaa ngwa ngwa. N’otu oge ndị Juu iwe juru obi kpesaara ndị ọchịchị nke obodo, sị: “Ndị a, bụ́ ndị kpuru elu ụwa dum mmadụ bi ihu, ha eruwokwa n’ebe a”! (Ọrụ 17:6) Laa azụ n’oge ahụ, ndị ndú okpukpe gbalịsiri ike ịkwụsị mgbasa nke Iso Ụzọ Kraịst, ma ha dara ada. Taakwa, mgbalị ọ bụla e mere ịkwụsị mgbasa nke ezi ozizi ndị Kraịst bụ nke na-aghaghị ịda ada. Chineke onwe ya kwere nkwa, sị: “Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide gị ga-aga nke ọma: ọzọ, ire ọ bụla nke ga-ebili imegide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe. Nke a bụ ihe nketa nke ndị ohu Jehova, ezi omume ha na-esite na m.”—Aịsaịa 54:17.