Ime Ihe Iji Laghachi
‘O WEE tụọrọ ha ilu.’ Bible si otú a meghee ilu atọ a na-agaghị echefu echefu nke Jisọs tụrụ banyere obi ebere—otu atụrụ furu efu, otu shilling furu efu, na nwa mmefu.—Luk 15:3-32.
Isiokwu abụọ dị n’Ụlọ Nche nke April 15, 1991, tụlere ilu ndị ahụ ma nyere ọtụtụ ndị na-agụ akwụkwọ anyị aka ịhụ ụzọ a pụrụ isi gosi obi ebere taa. Otu ihe e lekwasịrị anya bụ ka ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ na-ebute ụzọ n’ịkpọtụrụ ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ ma bụrụ ndị pụrụ imeghachi omume ma e jiri obi ọma leta ha. Gịnị ka isiokwu ndị a na ụkpụrụ ọhụrụ ndị ahụ rụpụtaworo?
N’oge na-adịghị anya mgbe e bipụtasịrị magazin ahụ, otu nwoke bi n’obodo Washington, U.S.A., dere, sị: “Ngosipụta obi ebere ịhụnanya bara ụba nke Jehova bịara n’igbe akwụkwọ ozi m taa. Anọ m n’ebe a buru anya mmiri n’anya, nweekwa ọṅụ n’ime obi m banyere ndokwa na nhazigharị nke Onye Kasị Elu na-ewepụta. Ọ bụ n’ezie Chineke nke na-ekpe ikpe ziri ezi pụrụ inyere ndị ahụ yiri atụrụ fuworo efu aka. . . . Ee, a chụpụrụ m n’ọgbakọ ma anọ m n’ụzọ nke ịbụ onye a kpọbataghachiri.” N’October, a kpọbataghachiri ya.
Ma gịnị banyere nleta ndị okenye abụọ nke ọgbakọ mere? Otu onye Kraịst bụ nwunye dere, sị: “Apụghị m ikwupụta ihe bụ mmetụta m. A chụpụwo di m n’ọgbakọ ruo ihe dị ka afọ 13. Ndị okenye letara ya, dị ka a tụrụ aro ya n’isiokwu ahụ. N’abalị ụnyahụ, na nke mbụ n’ime ọtụtụ afọ, ọ gara otu n’ime nzukọ ndị ahụ. Ugbu a ọ na-agbalị ịgbanwe ndụ ya ma laghachi.”
Ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-aga n’otu ọgbakọ ruo ọgbakọ ọzọ, ha na-ahụ ihe na-esi na ya apụta. Otu onye nlekọta sekit dere n’oge na-adịbeghị anya, sị:
“Mgbe e bipụtara Ụlọ Nche nke April 15, 1991, ọtụtụ chere banyere ihe mmeghachi omume ha ga-abụ ma ndị okenye kpọtụrụ ndị mmadụ. Azịza ya apụtawo nnọọ ìhè.
“Na sekit anyị, ọgbakọ anọ ikpeazụ ndị m letaworo ahụwo ka mmadụ itoolu laghachiri n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu onye ka a kpọbataghachiworo, asatọ ndị ọzọ na-enwe ezi ọganihu. Ndị okenye na ọgbakọ dị iche iche na-enwe obi ụtọ ịhụ mkpụrụ nke ọrụ ha na-amịpụta na amamihe nke itinye ntụziaka ọchịchị Chineke n’ọrụ.
“Anyị na-enwe ọṅụ maka ezi ndokwa obi ebere nke a. Dị ka otu nwanna nwanyị a kpọbataghachiri si kwuo, ‘enweghị m obi ike iji aka m laghachi, ebe ọ bụ na m chere na abụ m onye a mara ikpe n’anya Jehova. Ma mgbe ndị okenye ahụ bịara, ọ bụ agbamume ahụ dị m mkpa iji laghachi bịara.’ Ịnụ ọkụ n’obi ya agbawo ọgbakọ ahụ ume nke ukwuu.”
Ọbụna ma ọ bụrụ na ọtụtụ ndị e letara emeghachighị omume, a na-arụzu ihe dị mma site n’ibu ụzọ gosi obi ebere nke a. Otú a, na-amalite na September ndị okenye nke ọgbakọ ọ bụla ga-atụleghachi aha ndị ahụ nọ n’ókèala ha a chụpụrụ n’ọgbakọ ma mee ndokwa ileta ndị nile ha chere na ha pụrụ imeghachi omume n’obi ebere e gosipụtara.