Diocletian Busoro Iso Ụzọ Kraịst Agha
N’EMEME nke chi ndị Rom bụ́ Terminus na February 23, 303 O.A., nke e mere na Nicomedia dị n’Asia Minor, bụ́ isi obodo ọhụrụ nke alaeze ukwu ahụ, ndị ikom marịtara ibe ha aka nke igosipụta otú ha si hụ mba ha n’anya. Ma ọ pụtara ìhè na obere ìgwè ndị Kraịst ahụ anọghị n’ebe ahụ.
Site n’ebe ha na-anọ elepụ anya n’obìeze ha, Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ́ Diocletian na onye nọ ya n’okpuru bụ́ Galerius Caesar hụrụ ebe nzukọ nke ndị Kraịst obodo ahụ. N’oge a gwara ha gaa n’ihu, ndị agha na ndị isi ọchịchị ji aka ike wabanye n’ụlọ ndị Kraịst, tikpọsịa ya, ma kpọọ Bible ọ bụla ha pụrụ ịchọta ọkụ. N’ikpeazụ, ha tidara ihe owuwu ahụ n’ala.
Otú a ka oge mkpagbu si malite bụ́ nke mebiri ọchịchị Diocletian. Ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme na-akpọ ya “oké mkpagbu ikpeazụ,” “mkpagbu kasị dị njọ,” ọbụna “ihe bụ nanị mkpochapụ nke aha ndị Kraịst.” Ileba anya n’ihe kpatara ihe omume ndị a na-akpali akpali na-ekpughe ọtụtụ ihe.
Ikpere Arụsị Megide Iso Ụzọ Kraịst
Diocletian, onye a mụrụ na Dalmatia, bụ́ ógbè ghọrọ Yugoslavia, ghọrọ onye a ma ama site n’ọkwá nke onye agha Rom. N’ịbụ onye a kpọsara dị ka onye ọchịchị alaeze ukwu n’afọ 284 O.A., ọ ghọrọ onye a ma ama maka ịgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị mgbe o guzobere usoro ọchịchị nke mmadụ anọ, ịchị alaeze ukwu ahụ. Diocletian họpụtara Maximian, bụ́ onye agha ibe ya, iso ya rụkọọ ọrụ dị ka onye ọchịchị alaeze ukwu nke abụọ, Augustus (onye e buliri elu) nke abụọ, na-enwe ibu ọrụ pụrụ iche n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ nke alaeze ukwu ahụ. Ma Diocletian ma Maximian nwere Caesar nke nọ n’okpuru ha, bụ́ onye e nyere ikike ịnọchi anya eze. Constantius Chlorus rụrụ ọrụ dị ka Caesar nke Maximian, ebe Galerius sitere Thrace nwere ikike n’okpuru Diocletian.
Dị ka Diocletian, Galerius Caesar bụ onye ofufe na-anụ ọkụ n’obi nke chi ndị ọgọ mmụọ. N’ịbụ onye nwere oké ọchịchọ ịnọchi anya onye ọchịchị alaeze ukwu nke ya, Galerius mere ka à ga-asị na ọ na-atụ egwu maka aghụghọ a na-aghọ n’òtù agha. O nweghị mmasị ọ bụla ná mmetụta na-arị elu nke ndị sịrị na ha bụ ndị Kristian na-enwe. Site n’ụzọ onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ si ele ihe anya, ọjụjụ ha jụrụ ikere òkè n’ofufe ikpere arụsị bụ ịma ikike o nwere aka. Ya mere Galerius gbara Diocletian ume ka o mee ihe iji kpochapụ Iso Ụzọ Kraịst. N’ikpeazụ, n’oge oyi nke afọ 302/303 O.A., onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ nabatara echiche nke Caesar ahụ imegide ndị Kraịst wee kweta ikpochapụ ndị a n’òtù agha nakwa n’obìeze. Ma Diocletian nyere iwu megide ịwụfu ọbara, na-atụ egwu na ndị e gburu n’ihi okwukwe ndị Kraịst ga-akpali ndị ọzọ ikpebisi ike inupụ isi.
Ma, n’ịbụ onye ụzọ o si elebara nsogbu ahụ anya na-ejughị afọ, Diocletian kpọtụụrụ ndị ọchịagha na ndị ọfịsa, gụnyere Hierocles, bụ́ onye gọvanọ nke Bithynia. Onye nkwado ozizi Grik nke a na-anụ ọkụ n’obi kwadoro ime ihe ike megide ndị Kraịst nile. Nkwado nke Diocletian kwadoro chi ọdịnala nile nke Rom dugara n’ibuso Iso Ụzọ Kraịst iro. Dị ka akwụkwọ bụ́ Diocletian and the Roman Recovery, nke Stephen Williams dere, si kwuo, ihe si na ya pụta bụ “agha a lụgidere ruo ná ngwụsị n’etiti chi ndị Rom na chi nke ndị Kristian.”
Iwu Ndị Ahụ
Iji mezuo mkpọsa ya nke mkpagbu, Diocletian nyere iwu anọ ná nsochi nsochi. N’ụbọchị na-esote mwakpo ahụ e mere na Nicomedia, o nyere iwu ka e bibie ebe nzukọ na ihe onwunwe nile nke ndị Kraịst, nyekwa iwu ka a chịpụta akwụkwọ nsọ nile ma kpọọ ha ọkụ. A gaje ịchụtu ndị Kraịst ji ọkwá Ọchịchị n’ọkwá.
Mgbe ọkụ ọgbụgba abụọ tiwapụrụ kpọmkwem n’obìeze nke onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ, ụta gaara ndị Kristian na-arụ ọrụ n’ebe ahụ. Nke a kpaliri iwu nke abụọ, nke kwuru ka e jide ma tụọ ndị bishọp, ndị nna chọọchị, na ndị ụkọchukwu nile mkpọrọ. Site n’inye ikike ka e mekpaa ha ahụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, iwu nke atọ nwara ime ka ndị ikom ndị a si n’ezi ofufe dapụ, na-achọ ka ha chụọ àjà nye chi ndị Rom. Iwu nke anọ gara n’ihu ma mee ka mmadụ ikwu na ọ nọ n’Iso Ụzọ Kraịst bụrụ ịda iwu na-eweta ọnwụ.
Omume obi ịta mmiri si na nke ahụ pụta wepụtara otu òtù a kpọrọ traditores (nke pụtara, “ndị chịliri aka elu”), ndị hapụrụ Chineke na Kraịst, ndị nwara ichebe ndụ ha site n’ịchịpụta Akwụkwọ nsọ ndị ha nwere. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ Will Durant si kwuo, “ọtụtụ puku ndị Kristian jụrụ okwukwe ha . . . Ma ihe ka n’ọtụtụ ndị a kpagburu guzosiri ike; ịhụ ma ọ bụ ịnụ akụkọ banyere ikwesị ntụkwasị obi n’okpuru mmekpa ahụ mesiri okwukwe nke ndị obi ha na-esighị ike ike, kpọtakwara ọgbakọ ndị ahụ a na-enye nsogbu ndị òtù ọhụrụ.” E gburu ọtụtụ ndị Kristian n’ihi okwukwe ha na Frijia, Kapadọsịa, Mesọpọtemia, Finisia, Ijipt, na ihe ka ọtụtụ n’akụkụ ndị ọzọ nke Alaeze Ukwu Rom.
Ọkọ akụkọ ihe mere eme nke chọọchị bụ́ Eusebius nke Caesarea kwuru na ọtụtụ puku ndị Kristian nwụrụ n’oge mkpagbu ahụ. N’aka nke ọzọ, Edward Gibbon, onye dere akwụkwọ bụ́ The Decline and Fall of the Roman Empire, kwuru ọnụ ọgụgụ na-erughị puku abụọ. “Gibbon na-eji obi abụọ anakwere ọtụtụ n’ime akụkọ ndị a, ebe ọ bụ na ha na-esite n’aka ndị Kristian kpebisiri ike inye ndị e gburu n’ihi okwukwe ha otuto na imezi ọnọdụ ime mmụọ nke ndị kwere ekwe,” ka otu onye edemede kọwara. “Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya,” ka ọ gara n’ihu ikwu, “na e nwere ikwubiga okwu ókè n’akụkụ ndị na-ede ihe, bụ́ ndị na-eji ụzọ dị mfe tụgharịa ọnwụ nke ndị ole na ole ịghọ ‘oké ìgwè’, ndị na-adịghị egosi ọdịiche dị n’etiti ndị na-emeghị ihe ọ bụla e gburu n’ihi okwukwe ha na ndị e gburu n’ihi na ha kpacha anya meta ihe e ji gbuo ha; na ndị na-akọ otú anụ ọhịa ndị dị n’ọgbọ egwuregwu si jiri iwe dọrisịa ndị omempụ ndị ọzọ nile ma bụrụ ndị a kwụsịrị site ‘n’ike karịrị nke mmadụ’ ka ha ghara imetụ ndị Kristian ahụ aka. Ma, ọbụna à sị na e tinyere akụkọ ahụ nnú na ose, ihe merenụ dị oké njọ.” N’ezie mkpagbu jọgburu onwe ya weere ọnọdụ, nke e mere site n’iji ihe na-adọtị mmadụ, site n’ịgba ọkụ, site n’ikpekara anụ ahụ, na site n’iji ihe mkpagide e ji emekpa mmadụ ahụ mee ihe.
Ndị ụfọdụ nwere echiche ahụ bụ na ọ bụ Galerius, kama ịbụ Diocletian, kpaliri mkpagbu ahụ. “Ọ bụghị site n’enweghị ịdị mkpa omume ọ bụla,” ka Professor William Bright kwuru n’akwụkwọ bụ́ The Age of the Fathers, “ka oké mgbalị nke ike ọchịchị ụwa ọgọ mmụọ mere ikpochapụ ndụ nke Alaeze na-esiteghị n’ụwa nke a ga-eji zaa aha Diocletian, kama ịza aha nke onye malitere ya n’ezie bụ́ Galerius.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọbụna n’ime usoro ọchịchị mmadụ anọ ahụ, Diocletian nwere ike kasị elu, dị ka onye edemede bụ́ Stephen Williams kwuru: “Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na Diocletian nwere ike n’ụkpụrụ ọ bụla bụ isi e mere n’Alaeze Ukwu ahụ ruo n’afọ 304, nweekwa ibu ọrụ bụ isi maka mkpagbu ahụ ruo n’oge ahụ.” Diocletian dara ọrịa ma mesịa rịtuo n’ọkwá ọchịchị n’afọ 305 O.A. Ruo ihe dị ka afọ isii mgbe nke ahụ gasịrị, mkpagbu ahụ nọgidere na-aga n’ihu gosipụtara ịkpọasị dị ilu nke Galerius n’ihe nile metụtara ndị Kraịst.
Iso Ụzọ Kraịst Narị Afọ nke Anọ
Ihe ụjọ ndị a mere ná mmalite narị afọ nke anọ na-emesi ihe ndị ozi bụ́ Pọl na Pita buru n’amụma ike, tinyekwara ndị ọzọ so dee akwụkwọ nsọ. E wegharaworị ikike nke “onye ahụ na-emebi iwu,” bụ́ òtù ndị ụkọchukwu na-achị achị nke ndị kpọrọ onwe ha ndị Kristian, dị ka iwu Diocletian, karịsịa nke abụọ, na-egosi. (2 Ndị Tesalonaịka 2:3, 4; Ọrụ 20:29, 30; 2 Pita 2:12) Ka ọ na-erule na narị afọ nke anọ, omume dị iche iche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ ejupụtaworị n’ebe nile. Ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị kpọrọ onwe ha ndị Kristian so n’òtù agha ndị Rom. Ọ̀ bụ na e nweghị ndị Kraịst laa azụ n’oge ahụ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ‘n’okwu na-enye ezi ndụ’ nke a natara site n’aka ndị ozi?—2 Timoti 1:13.
Eusebius kpọrọ aha ụfọdụ n’ime ndị mkpagbu ahụ dakwasịrị, ọbụna na-akọwa nke ọma mmekpa ọnụ ha, nhụjuanya ha, na n’ikpeazụ ogbugbu ha. Ma ndị a e gburu n’ihi okwukwe ha hà nwụrụ site n’iguzosi ike n’eziokwu nke e kpughere n’oge ahụ, anyị apụghị ịma ugbu a. Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na ụfọdụ ejiriwo obi ha nakwere ịdọ aka ná ntị nke Jisọs izere ịrọ òtù, omume rụrụ arụ, na ime ihe ọ bụla na-ekwekọghị n’okwukwe ha. (Mkpughe 2:15, 16, 20-23; 3:1-3) Ihe àmà na-egosi na ụfọdụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi lanarịrịnụ apụtaghị ìhè n’akụkọ ihe mere eme. (Matiu 13:24-30) N’ezie, atụmatụ ndị ahụ e mere ịkwụsị ofufe ihu ọha nke ndị Kraịst nwere ihe ịga nke ọma nke na otu ihe ncheta ndị Spain n’oge ahụ na-eto Diocletian maka ‘ikpochapụworị nkwenkwe efu ahụ banyere Kraịst.’ Otú o sina dị, mgbalị ndị e mere ịchịrị na ibibi Akwụkwọ nsọ, bụ́ akụkụ bụ isi nke agha Diocletian busoro Iso Ụzọ Kraịst, enweghị ihe ịga nke ọma n’ikpochapụ Okwu Chineke kpam kpam.—1 Pita 1:25.
N’enweghị ihe ịga nke ọma n’ikpochapụ Iso Ụzọ Kraịst kpam kpam, Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye na-achị ụwa, nọgidere n’omume aghụghọ ya site n’aka Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ́ Constantine, onye chịrị malite n’afọ 306 ruo 337 O.A. (Jọn 12:31; 16:11; Ndị Efesọs 6:11) Onye ọgọ mmụọ bụ́ Constantine ebusoghị ndị Kraịst agha. Kama nke ahụ, ọ chọpụtara na ọ ga-aka mma ijikọ nkwenkwe ndị ọgọ mmụọ na nke ndị Kristian ịghọ okpukpe ọhụrụ nke Obodo.
Lee ịdọ aka ná ntị nke ahụ bụụrụ anyị nile! Mgbe anyị na-ezute mkpagbu dị oké njọ, ịhụnanya anyị nwere maka Jehova ga-enyere anyị aka izere ime ihe na-ekwekọghị n’okwukwe anyị iji nweta izu ike ọ bụla ruo nwa oge. (1 Pita 5:9) N’otu aka ahụ, anyị agaghị ekwe ka oge udo mee ka ike gwụ anyị ịrụ ọrụ ndị Kraịst. (Ndị Hibru 2:1; 3:12, 13) Ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ nile nke Bible ga-eme ka anyị nọgidesie ike n’ebe Jehova nọ, bụ́ Chineke nke pụrụ ịnapụta ndị ya.—Abụ Ọma 18:25, 48.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 28]
Musei Capitolini, Roma