“Mmiri nke Ndụ” Na-agbapụta na Cape Verde
“ỊDỊ adị na ife ofufe nke Ndịàmà Jehova na Cape Verde kemgbe afọ 1958 bụ eziokwu kwesịrị ịrịba ama,” ka minista ikpe ziri ezi nke Republic of Cape Verde kọwara. Ọ na-agwa Ndịàmà abụọ a kpọrọ n’ọfis ya okwu. “Ọ na-ewute anyị na o were ogologo oge dị otu a ime ka Ndịàmà Jehova bụrụ ndị iwu nabatara,” ka o kwukwara.
Nzukọ ahụ, e mere na November 30, 1990, bụ nke Ndịàmà Jehova nọ na Cape Verde ga-echeta ruo ogologo oge. Ọ bụ ihe ngosi nke ndị ọchịchị ịnabata ha dị ka òtù okpukpe iwu kwadoro ná mba ahụ. Otú ọ dị, nye Ndịàmà abụọ ahụ nọ ebe ahụ, ọ bụ ahụmahụ onwe onye na-akpali mmụọ, n’ihi na ọ bụ na 1958 ka otu onye n’ime ha—Luis Andrade—hụrụ ụfọdụ akwụkwọ e ji amụ Bible nke Watch Tower Society bipụtara. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ ndị a site ná mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ matara na ya achọtawo eziokwu ahụ. O jiri ịnụ okụ n’obi soro Francisco Tavares, enyi ya eri ogologo oge, kerịta ihe ọ mụtaworo. N’afọ ole na ole sochirinụ, ha abụọ gara n’ihu na-aṅụ mmiri nke eziokwu ahụ site n’ịgụ magazin Ụlọ Nche na Teta!, nke ha natara site n’ụtụ. Afọ iri mgbe nke a gasịrị, na 1968, e mere ha baptism n’oge njem nleta mbụ nke onye nlekọta na-ejegharị ejegharị mere na Cape Verde.
Nwanna Andrade na Tavares ghọtara ibu ọrụ ha ikere oké n’ịkpọsa ọkpụkpọ oku ahụ: “Bịa . . . nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 22:17) Ha dị njikere ịnara ihe ịma aka nke ókè ala ha dịsasịrị adịsasị ma siekwa ike. Cape Verde nwere agwaetiti iri bụ isi tinyere ụfọdụ agwaetiti nta ndị ọzọ dị n’oké Osimiri Atlantic, ihe dị ka 560 kilomita n’ebe ọdịda anyanwụ nke Dakar, Senegal. Aha ahụ bụ́ Cape Verde, nke pụtara “Ụsọ Mmiri Na-acha Akwụkwọ Ndụ Akwụkwọ Ndụ,” bụ nke e jibu na-eme ihe banyere ala fọrọ ntakịrị ka mmiri gbaa ya okirikiri n’ụsọ osimiri nke Africa. Otú ọ dị, agwaetiti ndị a adịghị acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ ma ọlị, ebe mmiri ozuzo dị nta, 350,000 ndị bi na ya na-eweta nanị ihe e na-ezuru ha iji bie ndụ site n’ala ahụ kpọrọ nkụ.
N’afọ 30 gaworo aga, ndị ozi ala ọzọ na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche arụsiwo ọrụ ike dị ka ndị ozi oge nile na-ewetara ndị bi n’agwaetiti ndị ahụ mmiri nke ndụ. Gịnị ka ụdị ọrụ ahụ rụpụtaworo? Na nso nso a, otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị si Portugal jere leta ọgbakọ ndị dị na Cape Verde. Anyị ga-enye ya ohere ịkọrọ anyị ihe ọ chọpụtara.
São Vicente Anụ ‘Asụsụ Dị Ọcha’
Mkwụsị anyị mbụ na Cape Verde bụ n’obodo ukwu nke Porto Grande n’Agwaetiti São Vicente. N’ịkwọ ụgbọ ala site n’ọdụ ụgbọ elu ahụ baa n’ime obodo, anyị hụrụ akụkụ ugwu jupụtara n’oké nkume nke aja uzuzu ikuku na-ebugharị kpuchiri. Mbara nke ọzara n’ebe Ugwu Africa eruworị agwaetiti nile nke Cape Verde! Site na December ruo February, ụgụrụ—ikuku ọkụ kpọrọ nkụ sitere na Sahara—na-efefe oké osimiri ahụ ma jiri aja na uzuzu kpuchie agwaetiti ndị ahụ. Mgbe ụfọdụ igwe oji nke uzuzu ahụ na-adị ukwuu nke na ụgbọ elu agaghị efeli. Ahịhịa ndụ ntakịrị ọ bụla fọdụrụnụ na-akpọ nkụ mgbe ụgụrụ bịara.
Otú ọ dị, n’ụzọ ime mmụọ, isi iyi nke mmiri dị adị. Ndịàmà Jehova eguzobewo ọgbakọ abụọ na Porto Grande, 167 ndị nkwusa Alaeze jikwa ọrụ n’aka na-ewegara 47,000 ndị bi n’Agwaetiti São Vicente mmiri na-enye ndụ nke eziokwu. Ná ngwụcha izu, ihe dị ka 400 ndị mmadụ na-abịa nzukọ dabere na Bible n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
N’oge nleta ahụ nọrọ otu izu, e mere ndokwa ikpeazụ maka Mgbakọ Distrikti ‘Asụsụ Dị Ọcha’ nke a ga-eme n’ebe ihe nkiri kasị mma n’obobo ahụ. (Zefanaịa 3:9) Ndị bịara mgbakọ ahụ site n’agwaetiti nke Santo Antão na São Nicolau, tinyere ndị nke obodo ahụ wetara ọnụ ọgụgụ ndị bịaranụ n’ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 756. E mere 24 ndị mmadụ baptism. Usoro ihe omume ahụ gụnyere ihe nkiri Bible nke Ndịàmà ahụ mere. Otu nwoke bụ́ onye na-eduzi ihe omume mmụgharị nke ihe nkiri bịara lee ihe nkiri ahụ ma kwuo, sị: “Anyị ji otu afọ mee ọzụzụ ma ọbụna mgbe ahụ anyị nwere ọtụtụ nsogbu. Ndị mere ihe nkiri unu ji ọzụzụ ọnwa abụọ mee nnọọ nke ọma karị.” N’ịbịa ná njedebe gara nke ọma nke mgbakọ ahụ, ọ bụ oge anyị ga-eji gaa n’obodo ukwu nke Praia, isi obodo nke Cape Verde Republic, n’agwaetiti nke São Tiago.
Ndị A Sachaworo
N’afọ ndị na-adịbeghị anya ọtụtụ ndị bi n’agwaetiti ndị ọzọ enubawo n’isi obodo ahụ iji chọọ ọrụ. N’ihi nke a, e wuwo ọtụtụ puku ụlọ nta nke ndị oge gboo ná mpụga mpụga nke obodo ukwu ahụ, bụ́ nke gara n’ihu ime ka ụkọ mmiri na nke ihe ndị e ji edobe ihe ọcha siwanye ike. Iji nyekwuoro ego ha na-enweta aka, ụfọdụ ezinụlọ na-akpa ewu, ezi, na ọkụkọ. A na-ahụkarị ihe ndị a ka ha na-akpagharị n’okporo ama. Nke a esonyewo n’ihe na-agbasa ọrịa.
Otú ọ dị, n’agbanyeghị ụdị ọnọdụ isi ike ndị ahụ, e nwere ugbu a ọgbakọ abụọ na-eto nke ọma na Praia, na-enwe ngụkọta nke ihe dị ka 130 ndị nkwusa Alaeze. Ndịàmà ndị a nwere obi ụtọ n’ezie ‘abaworo onwe ha uru’ site n’itinye ihe ndị ha mụtaworo site na Bible n’omume. Ịgbalisi ike ịbụ ndị dị nsọ, dịkwa ọcha, ụmụnna anyị na ụmụ ha enwetawo ezi ahụ ike, ma n’ime mmụọ ma n’anụ ahụ. Ọ bụ ezie na ndụ siiri ha ike, ha bara ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ.—Aịsaịa 48:17; 1 Pita 1:15, 16.
Mgbe anyị bịarutere, ụmụnna ahụ ji ọrụ n’aka na-akwado maka mgbakọ distrikti ha. Ndịàmà na ndị nwere mmasị sitere n’akụkụ nile nke São Tiago nakwa n’agwaetiti nile nke Sal na Fogo gara mgbakọ ahụ, Jehova jikwa ọnụ ọgụgụ ndị bịaranụ kasị ukwuu nke 472 gọzie ha. Onye ọ bụla nwere obi ụtọ, tinyere ọtụtụ ụmụaka ndị ihu ha na-egbukepụ egbukepụ! Ka anyị nọdụrụ ala n’etiti ìgwè mmadụ ahụ na-ege ntị, o doro anya na anyị ekwesịghị ileda “ụbọchị ihe nta” anya. (Zekaraịa 4:10) Ihe ndị a nile etowo site ná mkpụrụ mmadụ abụọ bụ́ ndị mụtara eziokwu ahụ nanị 30 afọ gara aga!
Tupu ịhapụ agwaetiti ahụ, anyị gara ileta òtù nta abụọ, Vila Assomada and Tarrafal, bụ́ ndị na-anọghị n’ime obodo ukwu ahụ. Agwaetiti ahụ jupụtara n’ugwu, ala ihe na-adịghị, na nke kpọrọ nkụ. Ma n’ebe ole na ole dịsasịrị adịsasị, anyị hụrụ ahịhịa ndụ na osisi ndị na-eto nke ọma—ọtụtụ acre nke osisi akị bekee, unere, pọpọ, na mango, na ihe ndị ọzọ. Nke a na-eme ka anyị cheta amụma Aịsaịa na otu ụbọchị ọbụna ọzara ga-agbawa okooko ọhịa. (Aịsaịa 35:1) Dị ka ebe e nwere ahịhịa ndụ n’ọzara, ọbụna ugbu a òtù Ndịàmà dị nta abụọ ahụ na-enye ọtụtụ puku ndị ahụ nri na ihe ọṅụṅụ ime mmụọ bara ụba bụ́ ndị na-ebi, dị ka a pụrụ ikwu ya, n’ala kpọrọ nkụ n’ụzọ ime mmụọ.
Ịnụ Ọkụ n’Obi Dị Ọkụ n’Agwaetiti Fogo
Agwaetiti na-esọnụ bụ Fogo, nke pụtara “ọkụ.” Mmalite ya nke sitere n’ugwu na-agbawa agbawa kọwara aha ahụ. Cano Peak ka bụ ugwu na-agbawa agbawa. Ọ na-arigo site n’osimiri dị ka okoso kpudoro ihu n’ala ma kapịpụ ọnụ ruo ịdị ogo ọ̀tụ̀tụ̀ ya dị 2,800 mita. Agwaetiti ahụ ka nwesịrị mmiri ozuzo dị ukwu, bụ́ nke mbụ ọ dịworo ukwuu otú ahụ kemgbe ọtụtụ afọ. Nke a nwere mmetụta nke obi ụtọ n’etiti ndị mmadụ, ha jikwa ọrụ dị ukwuu nke ịkụ mkpụrụ àgwà na akpụ́, bụ́ nri bụ isi a na-eri na Cape Verde.
Otú ọ dị, ndị ahụ nwere obi ekele ejibigaghị ọrụ n’aka ókè nke na ha enweghị ike ikwụsị ma nara mmiri nke eziokwu site na Bible. Anyị gbalịrị soro òtù atọ dị iche iche zukọọ, ọbụna na ọ bụ ezie na ọ bụ ịgba mgba irute ha n’ihi na ụgbọ ala dị ole na ole ma dịrị n’ọnọdụ dị njọ. Obi tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu mgbe ngụkọta 162 mmadụ bịara nzukọ ndị ahụ, n’ihi na e nwere nanị 42 ndị nkwusa Alaeze n’agwaetiti ahụ. Nke a bụ ngosipụta nke ịnụ ọkụ n’obi nke òtù a dị nta nke ụmụnna nwoke na nwanyị, bụ́ ndị na-eji 15 hour ná nkezi kwa ọnwa na-eweta mmiri ihe atụ nke eziokwu na ndụ nye 32,000 ndị bi n’Agwaetiti Fogo.
Mkpụrụ n’Ala Katọlik
Ọ ka fọdụrụ anyị ije leta ụmụnna anyị nọ n’agwaetiti Santo Antão na São Nicolau. Dị ka aha ndị a na-egosi, Chọọchị Roman Katọlik enwewo mmetụta n’agwaetiti ndị ahụ ruo ọtụtụ narị afọ. Ọ bụ ezie na Okpukpe Katọlik ka bụkwa okpukpe bụ isi na Cape Verde, ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu na-echegharị ihu ha gaa na Bible maka mmiri nke eziokwu ya na-emezi ahụ.
Ndị nkwusa Alaeze ahụ dị 49 nọ n’ime ọgbakọ nta abụọ ahụ nọ n’ebe cherịtara ibe ha ihu ná ngwụcha ngwụcha nke Santo Antão na-arụsị ọrụ ike imezu mkpa ime mmụọ nke 44,000 ndị mmadụ bi na ya. Mgbe 512 ndị mmadụ bịara n’okwu ihu ọha sitere na Bible n’ọgbakọ Porto Novo, o doro 32 ndị nkwusa Alaeze ahụ anya na ọtụtụ ndị yiri atụrụ na Santo Antão bụ ndị agụụ mmiri nke eziokwu na-agụ.
Ọrụ ahụ n’Agwaetiti São Nicolau malitere ọtụtụ afọ gara aga mgbe otu nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ na Portugal site n’ide akwụkwọ ozi duziiri otu ezinụlọ ọmụmụ Bible n’agwaetiti ahụ. Mgbe ahụ, na 1978, onye ọsụ ụzọ ọzọ na Portugal kpebiri ịlaghachi n’agwaetiti a mụrụ ya, bụ́ São Nicolau, iji soro 15,000 ndị bi na ya kerịta eziokwu Bible. Mgbe o duziri nzukọ ọmụmụ Bible mbụ n’agwaetiti ahụ, ihe bịara ya bụ nanị otu onye—ya onwe ya! Ma Jehova Chineke zara ekpere o kpesiri ike ná nzukọ ahụ. N’oge njem nleta anyị, 48 ndị nkwusa ahụ nọ n’ọgbakọ atọ ahụ ṅụrịrị ọṅụ ịhụ ngụkọta nke 335 ndị mmadụ bịara nzukọ ahụ.
Mgbakọ sekit mbụ n’agwaetiti ahụ bụ nke e mere n’oge nleta anyị, e nyekwara anyị ụlọ ihe nkiri nke ndị obodo ahụ n’efu. Ndị ọchịchị obodo wetara ígwè e ji ekwu okwu na ụgbọ ala ga-ebuga anyị na-anaghị ego ọ bụla. Ndị nkwusa 19 nke ọgbakọ obodo ahụ lekọtara ihe banyere ebe obibi maka 100 ndị bịara mgbakọ ahụ ma kwadebe nri maka 208 ndị bịaranụ. N’agbanyeghị ọtụtụ ihe isi ike ụmụnna anyị na-ezute kwa ụbọchị, ha nyere onyinye maka Ụtụ Ego Society Maka Iwu Ụlọ Nzụkọ Alaeze.
Ezi àgwà nke Ndịàmà Jehova abụrụwo ihe a ma ama n’ebe a, ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ na-achọ ha mgbe ha chọrọ ndị ọrụ. Dị ka ihe atụ, onye nwe nanị ebe a na-agba mmanụ ọkụ ụgbọ ala n’agwaetiti ahụ gwara Onyeàmà ka ọ rụọrọ ya ọrụ, ebe ọ chọrọ onye na-eme ihe n’eziokwu. Nwanna nwoke ahụ enwewo ọrụ ọ na-arụ ma kwuo na ya ga-ele ma ọ ga-achọtara ya onye ọzọ. “Nanị ma ọ̀ bụ Onyeàmà e mere baptism!” ka onye ahụ nwee ihe kwuru. Ọnwa abụọ ka nke a gasịrị, ọ gwara nwanna anyị, sị: “Ndịàmà Jehova bụ nanị ndị kwesịrị ijide ego!”
Nkwusị Ikpeazụ—Agwaetiti Sal
Nkwụsị anyị ikpeazụ na njem nke a bụ n’agwaetiti nke Sal. Aha ya pụtara “nnu,” nke ahụ na-egosikwa ụlọ ọrụ bụ isi nọ n’agwaetiti ahụ. N’ebe a ọgbakọ nta dị na ya nwere 22 ndị nkwusa, bụ́ ndị na-arụsi ọrụ ike iwetara 6,500 ndị bi n’ebe ahụ ozi Alaeze. Ọ bụ nnọọ ihe obi ụtọ isoro ndị bi n’agwaetiti nke a kerịta ozi ọma ahụ, n’ihi na a kpọbatara anyị n’ime ebe obibi ọ bụla ma nwee ike ịgwa ọtụtụ ndị nọ n’ezinụlọ dị iche iche okwu.
Njem nleta e mere gaa Agwaetiti Sal wetara njem anyị nile ná njedebe. Lee ihe ngọzị ọ bụ isoro ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi na Cape Verde rụkọọ ọrụ! E nwere ugbu a 531 ndị nkwusa Alaeze n’agwaetiti ndị a nile, ọnụ ọgụgụ ahụ ga-etowanyekwa ka 2,567 mmadụ bịara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst na 1991 na-aga n’ihu na-anata ihe ime mmụọ. Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime Ndịàmà Jehova n’ebe a nwere ihe dị nta n’ụzọ ihe onwunwe, ha bụ ọgaranya ma na-erijukwa afọ n’ụzọ ime mmụọ. Leekwa obi ekele ha nwere na Jehova na-eme ka mmiri nke ndụ na-asọpụta n’ụba n’agwaetiti ndị a nile maka otuto na ebube ya!
[Map dị na peeji 24]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
CAPE VERDE
SANTO ANTÃO
SÃO VICENTE
SÃO NICOLAU
SANTA LUZIA
SAL
BOA VISTA
MAIO
SÃO TIAGO
FOGO
BRAVA
Praia
Osimiri Atlantic