Ubi Achawo Maka Owuwe Ihe Ubi na Brazil
“WELIENỤ anya unu elu, kirie ubi, na ha chara acha ugbu a ka e were ihe dị n’ime ha. Onye na-ewere ihe ubi na-anara ụgwọ ọrụ ya, na-achịkọtakwa mkpụrụ nye ná ndụ ebighị ebi.” (Jọn 4:35, 36) Okwu amụma ndị ahụ nke Jisọs Kraịst bụ eziokwu taa n’ebe dị iche iche dị anya nke mba ahụ gbasapụrụ agbasapụ dị na South America, bụ́ Brazil.
Ruo ọtụtụ afọ, Ndịàmà Jehova nọ na Brazil anọwo na-enwe ezi mmụba. N’April 1991, ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 308,973 ndị na-ewe ihe ubi Alaeze duziri ihe karịrị 401,574 ọmụmụ Bible ebe obibi dị iche iche. Na March 30, 1991, ngụkọta nke 897,739 mmadụ zukọtara maka ime ememe ncheta ọnwụ Jisọs, bụ́ onye malitere ọrụ owuwe ihe ubi ahụ.
N’agbanyeghị ihe ọma dị otú a a rụpụtara, otu akụkụ nke ubi ahụ ka nọ na-echere ka e were ihe dị na ya. Ihe karịrị nde mmadụ ise bi n’akụkụ dị iche iche nke Brazil ebe Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ nkwusa dị nta ma ọ̀ bụkwanụ ebe ha na-adịghị arụ ọrụ ma ọlị. Gịnị ka a na-eme iji gbasaa owuwe ihe ubi ahụ iru n’ebe ndị a?
Ndị Ọsụ Ụzọ Na-ekere Òkè n’Owuwe Ihe Ubi ahụ
N’ogologo oge dị ọnwa isii nke na-adịbeghị anya gara aga, alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Brazil zipụrụ ndị nkwusa Alaeze oge nile—100 ndị bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche ruo nwa oge na 97 ndị ọsụ ụzọ oge nile—gaa na 97 obodo dị iche iche nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke mba ahụ ebe ndị mmadụ bijupụtara. Ndị nkwusa Alaeze si n’ọgbakọ dị iche iche wepụtakwara onwe ha ịrụ ọrụ n’akụkụ ndị a ruo ogologo oge ndị dị mkpirikpi karị. N’agbanyeghị ihe mgbochi ndị a ọ dịrị mkpa ka e merie, ihe ndị a rụpụtara abụwo ihe ndị na-enye obi ụtọ.
Dị ka ihe atụ, na São João da Ponte nke dị na steti Minas Gerais, ndị ọsụ ụzọ jere n’ụlọ onye na-akụzi ihe banyere okpukpe n’ụlọ akwụkwọ e nwere n’ebe ahụ. Mgbe ọ nụsịrị ozi ha, o kwuru ka e wetara ya 50 akwụkwọ Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya maka ndị nọ na klasị katkizm ya. Otu onye nkụzi ọzọ gwara ndị ọsụ ụzọ ahụ na-ala ala, sị: “Unu ekwesịghị ịla, ebe ọ bụ na unu na-arụ ọrụ ọma dị otú a n’ebe a. Ọ bụ nanị unu pụrụ inye nkọwa doro anya nke Bible.”
Ọ bụghị mmadụ nile ka ọrụ ọma nke a nyere obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, tụlee otu akwụkwọ ozi e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ ndị ebe ahụ (Diário de Montes Claros) n’okpuru isiokwu ihu akwụkwọ bụ “E Boro Onye Ụkọchukwu Ebubo Ịkpali Ime Ihe Ike na Imenyere Otu Ndị.” Akwụkwọ ozi ahụ sịrị: “Na chọọchị, [onye ụkọchukwu ahụ] nwere omenala nke ịkatọ ndị na-agbaso òtù okpukpe ndị ọzọ, ọ bụ ezie na ndị ndú okpukpe nke ebe ahụ adịghị enye nduzi ndị Katọlik na nke ndị Kraịst zuru ezu n’Oziọma ndị ahụ nye ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Na Mas, ọ katọwo ndị na-ejere Ndịàmà Jehova ozi ndị nọ n’obodo, ọ bụ ezie na ha adịghị emeso ndị Katọlik omume n’ụzọ dị njọ.” N’egosighị ịkpọasị dị otú ahụ, onye dere ihe odide ahụ (bụ́ onye ọkà mmụta okpukpe) bịara ige okwu ihu ọha nke ndị ọsụ ụzọ ahụ kwuru, kpọrọkwa ndị ọzọ nwere mmasị bịa. Nzukọ ahụ masịrị ha nile.
Ụmụnna nwoke anọ ndị si Fortaleza ji ụgbọ elu jee Agwaetiti Fernando de Noronha, nke dị 400 kilomita site n’akụkụ elu ala nke obodo ahụ. Mmadụ dị 1,500 ndị bi n’ebe ahụ enwetabeghị ezi ịgba àmà ọ bụla n’ihe karịrị afọ 15. N’ime ụbọchị iri ụmụnna ahụ tinyere 50 akwụkwọ ukwu na 245 magazin na akwụkwọ nta dị iche iche, ha malitekwara ọmụmụ Bible ebe obibi 15 dị iche iche. Mmadụ iri na abụọ bịara Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst, bụ́ nke dabara n’oge ọbịbịa ha. Ndị ọsụ ụzọ ahụ nwere olileanya na site n’enyemaka Jehova, ọrụ ahụ ga-eguzosi ike n’ebe ahụ. Ụfọdụ ụmụnna atụlewo ịkwafe jee biri n’agwaetiti ahụ.
Mmetụta Ndị Ndú Okpukpe Emetụta Owuwe Ihe Ubi
Otu ìgwè ndị nkwusa Alaeze si n’Ọgbakọ Arpoador nke dị na Rio de Janeiro wepụtara onwe ha ịnọ izu abụọ n’ikwusa ozi ọma n’obodo dị iche iche dị na steti Minas Gerais, nke dị ihe dị ka 200 kilomita site n’ebe ha bi. Ọ bụụrụ ha ihe obi ụtọ ịhụ na ndị bi n’ebe ahụ na-ele ndị ọbịa anya nke ọma, nweekwa obi ọma. Ndị nwoke nwere omenala nke iweli okpu ha elu mgbe ọ bụla a kpọtụrụ Chineke ma ọ bụ aha ya bụ Jehova. Otú ọ dị, n’ihi oké nsọpụrụ ha nwere maka Chineke, ndị ndú okpukpe na-enwe mmetụta n’ahụ ha ngwa ngwa.
N’otu obodo, onye ụkọchukwu nọ n’ebe ahụ gwara ndị obodo ahụ ka ha ghara ige Ndịàmà Jehova ntị ma ọ bụ ije nzukọ ndị ha na-eme atụmatụ inwe. O mekwara ndokwa ido Mas pụrụ iche n’otu oge ahụ a ga-enwe nzukọ, jirikwa ígwè na-ekwu okwu kpọsaa Mas ahụ n’olu dara ụda n’èzí chọọchị ya. Otú ọ dị, n’agbanyeghị mgbalị ya nile, 29 ndị bi n’ebe ahụ bịara nzukọ ahụ e nwere, tinyere ndị ọbịa ahụ.
Otu obodo dị nso ebe ahụ dị nnọọ iche! N’ebe ahụ, onye ụkọchukwu gwara ndị bi n’ebe ahụ ka ha gee ntị mgbe Ndịàmà ahụ bịara. Ihe nke a rụpụtara bụ na 168 mmadụ bịara nzukọ mbụ e nwere. Mgbe e mesịrị, ọ gwara ha ka ha rịba ama otú Ndịàmà Jehova na-esi eme Ememe Ncheta n’ihi na, dị ka o kwuru, “ha na-eme ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.” N’ime izu abụọ nke ọrụ nkwusa Alaeze a rụrụ n’ebe ahụ, e tinyere 1,014 akwụkwọ ukwu na 1,052 magazin na akwụkwọ nta dị iche iche.
Mgbalị Ndị A Nọgidere Na-eme Wetara Ngọzi
Mgbe otu ọnwa gasịrị, 34 ndị nkwusa Alaeze bịaghachiri ilekọta ọmụmụ Bible ndị a malitere n’oge mbụ ahụ a bịara n’ebe ahụ. Onye okenye ndị Kraịst nke duziri ihe omume ahụ dere, sị: “Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịhụ ka ndị ahụ nwere mmasị ji obi ekele na anya mmiri nke ọṅụ n’anya ha na-anabata anyị.” Otu nwanna nwanyị chetara na otu nwanyị bịakwutere ya na Ndịàmà ndị ọzọ mgbe ha nọ n’otu obere ụlọ nri, “na-arịọ anyị arịrịọ, anya mmiri dịkwa ya n’anya, ka anyị bịa duziere ya ọmụmụ ihe.” Otu nwanyị ọzọ mụrụ ihe ugbo atọ n’ime izu ahụ Ndịàmà ahụ nọ n’ebe ahụ. N’oge nke ọ bụla, ọ kwadebewo ihe a ga-amụ, na-echerekwa echere maka ọmụmụ ihe ahụ. Nwanyị ahụ kwuru na ya amalitewo ikpeku ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ekpere. “N’ime obi m, nke a bụ ihe m nọworo na-eche eri mgbe,” ka o kwukwara.
Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, e kenyere ndị ọsụ ụzọ abụọ ọrụ ilekọta mmasị ndị e nwere n’ógbè ahụ. Dị ka ọ dị n’ime narị afọ mbụ O.A., ‘ndị e doziworo ịnata ndụ ebighị ebi ghọrọ ndị kwere ekwe.’ (Ọrụ 13:48) Dịkwa ka nwanyị onye Sameria ahụ, onye Jisọs gbaara àmà n’olulu mmiri Jekọb, ha malitere ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ha na-amụta. (Jọn 4:5-30) Taa, ndị ọsụ ụzọ 2 ahụ nwere mmadụ 6 ha na ha na-ejekọ ozi, nkezi nke 20 mmadụ na-abịakwa nzukọ ndị ha na-enwe kwa izu.
N’ịbụ ndị nwere ịnụ ọkụ n’obi n’ihi ihe ịga nke ọma nke ọrụ nke a pụrụ iche, 29 ndị nkwusa si n’Ọgbakọ Arpoador jere ikwusa ozi ọma n’obodo Mutum, nke dị ihe dị ka 500 kilomita site n’ebe ahụ. “A nabatara anyị n’ụzọ pụrụ iche,” ka onye okenye nke duziri òtù nke a kwuru. “Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ji mmasị gee ntị nke ọma nke na a malitere 170 ọmụmụ Bible, anyị na-echekwa na ọtụtụ n’ime ha ga-anọgide na-aga n’ihu.” N’ime izu abụọ ndị nkwusa ahụ nyere nkezi nke 90 hour, tinyekwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1,100 akwụkwọ dị iche iche e ji amụ ihe n’aka ndị mmadụ. Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 181 mmadụ bịara okwu ihu ọha ụmụnna ndị ahụ kwuru.
Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, ọgbakọ ahụ naara otu ọmarịcha ụlọ ná ngó n’etiti obodo Mutum iji ya mee ihe dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze na ebe obibi ndị ọsụ ụzọ. Akụkọ ozi mbụ ụmụnna nwanyị abụọ ndị ọsụ ụzọ ahụ e kenyere ọrụ n’ebe ahụ ziteere Society na-agụ n’otu akụkụ, sị: “Ebe a maliteworo ọtụtụ ọmụmụ ihe ugbu a, ọ dị anyị mkpa inwetakwu ndị ọsụ ụzọ. Ọbụna site n’enyemaka ụmụnna ndị si Rio de Janeiro na-abịa otu ugbo n’ọnwa, ọrụ e nwere hiri nne. Itoolu n’ime mmadụ iri ọ bụla ndị nwe ụlọ anyị gwara okwu na-agwa anyị ka anyị bịaghachi ọzọ. Enyemaka dịkwa anyị mkpa maka iduzi nzukọ dị iche iche.” Onye ọsụ ụzọ ọzọ esonyeworo ha ugbu a.
A Gbanwere Ndụ Ndị Mmadụ
Ọ bụwo ihe na-agba ume ịhụ ka eziokwu ahụ na-agbanye mkpọrọgwụ, na-amịpụtakwa ezi mkpụrụ. Otu onye nwere mmasị dere, sị: “Inweta ihe ọmụma nke a nke Bible bụ ihe kachasị mma metụwooro m. Ndụ m agbanwewo n’ụzọ ka mma, ọ dịghịkwa m mkpa ịdị na-aṅụ ọgwụ nkụjụ ahụ ọzọ. . . . Ka Jehova kwụghachi unu ụgwọ ọrụ maka ihe nile unu mewooro m.”
Otu onye ọzọ kwuru, sị: “Ọ bụụrụ m ihe ịtụnanya n’ezie ịhụ ka Jehova siworo meghee anya m. Ọ bụ ezie na nne m ochie nwụnahụrụ m n’izu a, ugbu a, enwere m olileanya ịhụ ya ọzọ. Enwere m olileanya ịbụ onye e mere baptism, ma achọrọ m ibu ụzọ mee ezi nkwadebe. Ka Jehova gọzie unu maka ịbịa n’ebe a igosi anyị ụzọ ahụ dị warara nke na-eduje ná ndụ ebighị ebi.” Otu onye ọzọ sịkwara: “Achọrọ m ka unu mara na akwụsịrị m ise sịga otu ọnwa gara aga. Enwere m obi ụtọ dị ukwuu maka magazin ahụ unu ziteere m. O nwere ọtụtụ ihe dị mma n’ime ya ndị nyeere m aka ime nke ahụ.” N’eziokwu, owuwe ihe ubi ahụ na-enye ezi ihe mere a ga-eji ṅụrịa ọṅụ.
Otú ọ dị, ọ dịwo mkpa ime mgbalị dị ukwuu iji nweta ngọzi ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwanyị na nwa ya nwanyị malitere ịmụ ihe, onye ụkọchukwu bi n’ebe ahụ dọrọ ha aka ná ntị na ọ bụrụ na ha ejee nzukọ dị iche iche nke Ndịàmà ahụ, na ya ga-achụpụ ha na chọọchị. N’ilefuru iyi egwu ahụ anya, ha jere nzukọ ndị ahụ. Mgbe ahụ, ndị bụbu ndị enyi ha gbakụtara ha azụ, ụfọdụ n’ime ha bokwara ha ebubo na ha aghọwo ndị ara n’ihi na “Jehova ahụ” apụtaghị n’ime Bible ndị Katọlik. Ebe nwanyị ahụ na-enweghị ike ịchọta aha Jehova n’ime Bible ndị Katọlik nke ya, ọ kpọrọ ndị agbata obi ya òkù ka ha bịa n’ụlọ ya n’ụbọchị ya na ndị ọsụ ụzọ ahụ na-amụ ihe. Otu nwanyị ji nsụgharị Paulinas nke Bible ndị Katọlik ya wee bịa. Mgbe ọ gụpụtara aha Chineke ná nkọwa ala ala peji dị n’Ọpụpụ 6:3, ọ nakweere ka a bịa na-eduziri ya ọmụmụ Bible n’ụlọ nke ya.
Kere Òkè Zuru Ezu n’Owuwe Ihe Ubi ahụ
Mmetụta dị aṅaa ka ịrụ ọrụ n’ókèala a na-adịghị arụkebe ọrụ nwere n’ahụ ndị ọrụ ahụ n’onwe ha? Otu onye nkwusa Alaeze kwuru, sị: “Ọrụ nke a mere ihe iwusiwanye okwukwe anyị na mmekọrịta anyị na Jehova ike, o nyekwaara anyị aka ịhazigharị ihe ndị dị anyị mkpa.” Otu onye nkwusa ọzọ kwuru, sị: “Ogologo oge ahụ dị ụbọchị 14 mụbawanyere ịhụnanya m nwere n’ebe ụmụnna m nọ, bụ́ ndị na-eje ozi dị ka otu ezinụlọ ndị nwere otu ihe mgbaru ọsọ: ịchọpụta ndị ọzọ nwere obi umeala. O mere ka m hụkwuo ndị ahụ na-anakwere ozi ahụ n’anya, ndị na-ebukarị anya mmiri n’anya ha, na-egosi ezi akpịrị ịkpọ nkụ maka eziokwu ahụ. Karịsịa ihe nile, enwere m mmetụta nke ịhụnanya Jehova n’inye anyị ihe ùgwù nke ijere ya ozi.”
Otu onye okenye nke keere òkè n’ikwusa ozi ọma n’ókèala a na-adịghị arụkebe ọrụ zoro aka n’ọdịiche dị n’etiti ịdị ndụ n’ebe ahụ na n’obodo ukwu dị iche iche. Ọ sịrị: “Ana m eche nnọọ echiche ụzọ ndụ ọtụtụ ụmụnna anyị pụrụ isi bụrụ nke e meziwanyere site na ha ịkwafe n’obodo ndị dị n’ime ime. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na e nweghị ime ihe ike n’ebe a. Ndụ a na-ebi n’obodo ndị dị nta ma ọ bụ ndị na-ebuchaghị ibu dị n’ọnọdụ nke na ọ na-enye anyị ohere ọ bụghị nanị imefu ihe dị ala karị, kama ọ na-enyekwa anyị ohere iso ụmụnna anyị kpakọrịta karị, tinyekwa oge ka ukwuu n’ọrụ ime mmụọ. Ọtụtụ ụmụnna ndị laworo ezumike nká, ndị na-eto eto ndị na-enweghị ibu ọrụ ezinụlọ dị ukwuu, ma ọ bụ ụmụnna ndị ọrụ ha nyere ha ohere ime nkwagharị, hà nwere ike ịnara ihe ùgwù nke a pụrụ iche wee wetara onwe ha, Jehova, na ndị agbata obi ha, ọṅụ?”
Akụkọ nke a banyere ókèala ndị a na-adịghị arụkebe ọrụ na ha na Brazil gosipụtara na ubi ahụ achawo maka owuwe ihe ubi. N’ime nanị afọ abụọ, ọrụ a rụrụ n’ubi nke a arụpụtawo 191 ọgbakọ ndị ọhụrụ na òtù ndị dịpụrụ iche. A ka nwere ihe dị ukwuu a ga-arụ, ma n’ezie, Jehova ga-anọgide na-awụpụ ngọzi ya ka ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze karị na-ekere òkè n’owuwe ihe ubi nke a na-amịpụta mkpụrụ. Ị̀ pụrụ ikere òkè dị ukwuu karị na ya?
[Map/Foto dị na peeji nke 25]
Ndịàmà nwere obi ụtọ si Rio de Janeiro na-ekere òkè n’owuwe ihe ubi ahụ
[Map]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
BRAZIL
[Foto dị na peeji nke 26]
Ịgba àmà n’ime ime obodo na Minas Gerais