Akụkọ Na-enye Ọṅụ Site na Soviet Union
Iru Ọ̀tụ̀tụ̀ Kasị Elu nke Na-enye Ọṅụ n’Otu Narị Afọ nke Ịgba Àmà
“IJI denye Iwu E Ji Guzobe Ebe Nlekọta Ọrụ nke òtù okpukpe dị iche iche nke ‘Ndịàmà Jehova n’ime U.S.S.R.’ n’akwụkwọ.”
Nke a bụ nsụgharị nke okwu ndị mbụ nke akwụkwọ ahụ e dere n’asụsụ Russian nke e sepụtara na peji nke a. N’eziokwu, okwu ndị a nọchiri anya azịza nye ọtụtụ ekpere. Otu onye nọ n’ọkwá dị elu n’ụlọ ọrụ Ministri na-ahụ maka Ikpe Ziri Ezi nke R.S.F.S.R. (Russian Soviet Federated Socialist Republic) bịanyere aka n’akwụkwọ ahụ na Moscow, kaakwa ya akara. Ọ pụtara na Ndịàmà Jehova bụ òtù okpukpe iwu kwadoro n’ime mba U.S.S.R. Otú a, e ruwo oge dị oké mkpa n’akụkọ ihe mere eme ha nke dịworo otu narị afọ n’ime mba nke a buru ibu.
Mmalite Dị Nnọọ Nta
Otu narị afọ nke akụkọ ihe mere eme? Ee. N’oge a, onye nkwusa mbụ a ma ama nke ozi ọma ahụ n’ala ahụ bụ Charles Taze Russell, onye kọrọ banyere ojije o jere n’ebe ahụ na 1891. Ná mbipụta September 1891 nke Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence, ọ kọrọ na ya jere obodo Kishinev, Russia, n’oge ọ na-eme njem na Europe. N’ebe ahụ, o zutere otu nwoke aha ya bụ Joseph Rabinowitch, onye kwere na Kraịst, na-agbalịkwa ikwusara ezinụlọ ndị Juu bi n’ebe ahụ ozi ọma. Russell kọrọ ogologo akụkọ banyere ọnụnọ ya na Rabinowitch na mkparịta ụka ha ndị dị omimi, na-akpalikwa mmasị, banyere Alaeze ahụ.
A Nụrụ Ozi Ọma ahụ Ọzọ
Mgbe ọbịbịa Russell gasịrị, a nụrụ nanị ihe dị nta banyere ịgba àmà n’ime ihe ahụ a maara ugbu a dị ka U.S.S.R., ma nke ahụ apụtaghị na ọ dịghị ihe a rụzuru. Na 1927, ọgbakọ atọ dị na Soviet Union ziteere Society akụkọ banyere nzukọ Ememe Ncheta ha. Ma o yiri ka ọ̀ bụ na e nweghị ọganihu ngwa ngwa ruo oge agha ụwa nke abụọ. Agha ahụ rụpụtara oké nkwagharị nke ụmụ mmadụ na Europe. Otu ihe ọ rụpụtara nke a na-ebughị n’uche na ọ ga-arụpụta bụ nnubata nke ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze n’ime Soviet Union.
Dị ka ihe atụ, mbipụta February 1, 1946 nke Ụlọ Nche (Bekee) kọrọ, sị: “Ihe karịrị otu puku ndị nkwusa, ndị na-ekwusabu ozi ọma n’asụsụ Ukranian n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Poland akwafewo ugbu a banye n’ime ime Russia. . . . Ọzọkwa, ọtụtụ narị ụmụnna ndị bibu na Bessarabia, nke bụbu akụkụ Rumania, bizi na Russia ugbu a, ha jikwa ọrụ ha nke ime ndị na-eso ụzọ site ná mba nile na-aga n’ihu.”
N’ịga n’ihu, n’oge agha ụwa nke abụọ, ọtụtụ ụmụ amaala Soviet tara ahụhụ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche nke ndị Nazi. Nye ụfọdụ n’ime ha, ahụmahụ ihe isi ike nke a dujere ná ngọzi ndị ha na-atụghị anya ha. Otu akụkọ na-akọ banyere 300 ụmụ agbọghọ ndị Russia a tụrụ mkpọrọ na Ravensbrück. N’ebe ahụ, ha zutere Ndịàmà Jehova, nara eziokwu ahụ, nweekwa ọganihu ruo n’ókè ime baptism. Ihe ndị dị otú ahụ mekwara n’ogige ndị ọzọ. Mgbe a tọhapụrụ Ndịàmà ndị a e mere baptism ọhụrụ mgbe agha ahụ gasịrị, ha buuru ozi ọma nke Alaeze ahụ laghachi na Soviet Union. N’ụzọ dị otú a, agha ụwa nke abụọ rụpụtara mmụba dị ngwa n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze n’ókèala Soviet. Na 1946, e mere atụmatụ na 1,600 ndị nkwusa na-arụsi ọrụ ike n’ebe ahụ.
Ikwusa Ozi Ọma n’Ụlọ Mkpọrọ
Ụlọ mkpọrọ dị iche iche nọgidere na-arụ ọrụ dị ukwuu n’ịgbasa ozi ọma ahụ na Soviet Union. Mgbe agha ahụ gasịrị, ndị ọchịchị mehiere ihe site n’ile Ndịàmà ahụ anya dị ka ihe iyi egwu, a tụkwara ọtụtụ n’ime ha mkpọrọ. Ma nke a akwụsịghị ọrụ nkwusa ha. Ọ̀ pụrụ isi aṅaa mee nke ahụ, ebe ọ bụ na ha kwenyere n’ezie na ozi banyere Alaeze Chineke bụ ozi kasị mma nye ihe a kpọrọ mmadụ? Ya mere, nye ọtụtụ n’ime ha, ụlọ mkpọrọ ghọrọ ókèala ha, ọtụtụ ndị mkpọrọ ndị nụkwara olu ha naara ozi ahụ nke ọma. Otu akụkọ e nwetara na 1957 na-asị: “N’ime ndị nile a maara na ha nọ n’eziokwu taa na Russia, e kwubiwo na iri pasenti anọ anatawo eziokwu ahụ n’ime ụlọ mkpọrọ nakwa n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche.”
À kụdara mmụọ Ndịàmà ahụ site n’iyi egwu nke a a na-enwe mgbe nile nke ije mkpọrọ? Ọ dịghị ma ọlị! Otu akụkọ e nwetara na 1964 na-asị: “E nwere ndịàmà Jehova n’ime ogige ndị ahụ, ndị nọ ebe ahụ nke ugbo abụọ ma ọ bụ nke ugbo atọ, ebe ha na-akwụsịghị ikwusa ozi ahụ mgbe a tọhapụrụ ha.” Ọ gara n’ihu ikwu na ndị ọzọ bụbu ndị omekome ndị a tụbara n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ n’ogige ịta ahụhụ hà wee zute Ndịàmà ahụ mgbe ha nọ n’ebe ahụ. Ha nakweere eziokwu ahụ ma nwee ọganihu ruo n’ókè nke ime baptism tupu a tọhapụ ha.
Mbelata nke Nrụgide
N’etiti afọ ndị 1960, ndị ọchịchị malitere ịgbaso ụkpụrụ ime ihe nke na-adịghị emesichakwa Ndịàmà ahụ ike. Ma eleghị anya, ha chọpụtara na ndị Jehova adịghị ụzọ ọ bụla ha si bụrụ ihe iyi egwu nye iwu na ụkpụrụ ọha na eze. Ya mere, ọ bụ ezie na ọrụ nke ndị Kraịst ndị a dị umeala n’obi abụbeghị nke iwu kwadoro, a dịghị emesichakwa ha ike n’ihe banyere njide, ịbịa wagharịa n’ụlọ ha, ha nwekwara ekele maka mbelata nke a nke nsogbu a na-enye ha. Ọchịchọ ha bụ isi bụ ịnọgide na-ebi ndụ ndị Kraịst ha, na-arụkwa ọrụ ha n’ụzọ dị nwayọọ, dịkwa n’udo, ruo ókè ọ bụ ihe dabeere n’aka ha.—Ndị Rom 12:17-19; 1 Timoti 2:1, 2.
Na 1966, e mere ka ndị ahụ a chụpụburu jee na Siberia ruo ogologo oge nwere onwe ha, nyekwa ha ohere ije ebe ọ bụla ha chọrọ ije n’ime mba ahụ. Ọtụtụ n’ime ha lọghachiri n’ụlọ ha mgbe ọtụtụ afọ gafesịrị, ma ụfọdụ ndị họọrọ ịnọgide n’ubi ahụ nke na-amịpụta mkpụrụ. Ọ bụghịkwa mmadụ nile ndị lọghachirinụ họọrọ ịnọgide n’ụlọ ha. Otu nwanna nwanyị, onye a chụpụrụ ya na ezinụlọ ya jee Siberia mgbe ọ bụ nwa agbọghọ nta, so ndị mụrụ ya lọghachite n’ebe ọdịda anyanwụ Russia. Ma ọ nọrọ ebe ahụ nanị nwa oge. O nwere ịhụnanya maka ndị Siberia ahụ dị umeala n’obi, ndị na-elekwa ndị ọbịa anya nke ọma nke na ọ hapụrụ ezinụlọ ya wee laghachi n’ebe ọwụwa anyanwụ ịnọgide na-ekwusara ndị ahụ na-aṅa ntị nke ọma ozi ọma.
Otu ihe atụ yiri nke ọtụtụ ndị n’oge a metụtara otu nwanna nwoke onye si n’otu obodo ukwu kwafee n’ọzọ. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, o zutere Ndịàmà abụọ ndị ọzọ. Ha atọ kpere ekpere maka enyemaka, mgbe nwa oge nta gasịrị, ha zutere otu nwa agbọghọ onye a zụlitere n’okpukpe Greek Orthodox. Nwa agbọghọ ahụ nakweere eziokwu ahụ ngwa ngwa, wee duru ụmụnna ahụ jekwuru mmadụ abụọ ndị ọzọ nwere mmasị—nne ya na nwanne ya nwanyị nke ọ tọrọ. Akụkọ ahụ na-emechi, sị: “Taa, e nwere iri mmadụ anọ ha na ụmụnna ndị a na-ezukọ, ndị iri mmadụ atọ n’ime ha natara eziokwu ahụ n’ime ọnwa isii gara aga.”
Otú o sina dị, Ndịàmà Jehova nwere ihe mgbochi n’ọrụ ha n’ihi enweghị nkwado nke iwu. A na-eji akọ na-enwe nzukọ dị iche iche. A na-eji nlezianya na-arụ ọrụ nkwusa. A ka pụkwara ịtụ mmadụ mkpọrọ, ịgba àmà ụlọ n’ụlọ n’ihu ọha bụkwa ihe a na-apụghị ime eme. Otú ọ dị, n’agbanyeghị nke a, ndị Kraịst ndị a kwesịrị ntụkwasị obi bụ ndị Soviet nọgidere na-ejere Chineke ha ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, na-abụkwa ezi ụmụ amaala nke mba ha. (Luk 20:25) N’ikwupụta ihe bụ àgwà ha, otu n’ime ha dere, sị: “Ọ bụ oké ihe ùgwù ịnagide ule nile na ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova Chineke, ito Chineke ruo mgbe ebighị ebi n’oge nile nke ndụ mmadụ iji wee nweta ndụ ebighị ebi nke Jehova na-enye site n’aka Jisọs Kraịst.” Lee nnọọ ezi ihe nlereanya nke inwe ntachi obi na ikwesị ntụkwasị obi Ndịàmà ndị a bụ ndị Soviet bụworo!
E Mesịa Nweta Nkwado Iwu!
Na 1988, ihe malitere ịgbanwe n’ala dị iche iche ndị ha na Soviet Union nwere mmekọrịta. A malitere inwe ọnọdụ nke nnwere onwe dị ukwuu karị, mba dị iche iche ndị machibidoworo ọrụ Ndịàmà Jehova iwu malitere ịnabata ụkpụrụ iwu ndị ọhụrụ. Poland, Hungary, Romania, na mba ndị ọzọ nyere ndị Kraịst ndị a nwere obi eziokwu nkwado iwu, na-enye ha ohere ime ihe n’ihu ọha n’atụghị egwu nke mmegide. Lee nnọọ afọ obi ụtọ afọ atọ ndị ka gafeworonụ bụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe! Lee nnọọ ka ụmụnna ahụ siworo jiri nnwere onwe ha nwetara ọhụrụ mee ihe nke ọma ịgbasa ozi udo nke Alaeze ahụ! Leekwa ka Ndịàmà Jehova n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa siworo soro ha nwekọọ ọṅụ!
Ndịàmà bụ ndị Soviet amaliteworị irite uru site ná nnwere onwe ha nke na-agbasawanye. Ọtụtụ puku—ụfọdụ n’ime ha site n’ebe dị anya dị ka ụsọ oké osimiri Pacific nke Esia—bịara mgbakọ ndị ahụ bụ oké ihe akụkọ na Poland na 1989 nakwa mgbe e nwere ọzọ na 1990, mgbe 17,454 Ndịàmà si na Soviet Union bịara na Warsaw. Lee nnọọ oké ihe ncheta ndị ha bu wee laghachi! Ihe ka ọtụtụ n’ime ha esobeghị ihe karịrị ndị Kraịst ibe ha ole na ole wee fekọọ ofufe mbụ. Ugbu a, ha nọ n’etiti oké ìgwè nke ọtụtụ iri puku mmadụ!
Ha laghachiri na Soviet Union nke na-enyewanye mmesara ahụ. Ndịàmà nọ gburugburu ụwa legidere ihe na-emenụ anya, na-echekwa, sị: Olee mgbe Ndịàmà Jehova nọ na Soveit Union ga-enweta nkwado iwu? Ee, o mere na 1991—kpọmkwem otu narị afọ mgbe Charles Taze Russell jesịrị ebe ahụ! Na March 27, 1991, e denyere “Ebe Nlekọta Ọrụ nke Òtù Okpukpe Dị Iche Iche nke Ndịàmà Jehova n’ime U.S.S.R.” n’otu akwụkwọ nke onye Minista Ikpe Ziri Ezi nke R.S.F.S.R. nọ na Moscow bịanye aka na ya. Ụdị nnwere onwe dị aṅaa ka e nyere Ndịàmà ahụ?
Akwụkwọ nkwado iwu nke òtù a e debara aha ha ọhụrụ gụnyere nkwupụta okwu na-esonụ: “Nzube nke Òtù Okpukpe ahụ bụ ịga n’ihu n’ọrụ okpukpe ahụ nke ime ka a mara aha Jehova Chineke na ndokwa ịhụnanya o meere ihe a kpọrọ mmadụ site n’Alaeze eluigwe ya nke dị n’aka Jisọs Kraịst.”
Olee ụzọ a ga-esi mee nke a? Ụzọ ndị e depụtara gụnyere ime nkwusa ihu ọha na ije n’ụlọ ụmụ mmadụ; ịkụziri ndị chọrọ ige ntị eziokwu Bible; iduziri ha ọmụmụ Bible ndị ha na-agaghị akwụ ụgwọ maka ha site n’enyemaka nke akwụkwọ ndị e ji amụ Bible; na ime ndokwa maka nsụgharị, mbubata, obibi, na nkesa nke Bible.
Akwụkwọ ahụ depụtakwara nhazi nke Ndịàmà ahụ n’okpuru Òtù Na-achị Isi, gụnyere ọgbakọ dị iche iche ndị nwere òtù ndị okenye, Kọmitii Nlekọta [alaka] nke nwere mmadụ asaa maka mba ahụ, na ndị nlekọta sekit na distrikt.
O doro anya na Ndịàmà Jehova pụrụ ime ihe ugbu a ná nnwere onwe nakwa n’ihu ọha n’ime Soviet Union dị ka ha na-eme n’ọtụtụ ala ndị ọzọ. Cheedị nnọọ echiche banyere ọṅụ nke mmadụ ise n’ime mmadụ asaa so na Kọmitii Nlekọta ahụ nakwa mmadụ ise ndị bụworo okenye ọgbakọ ruo ogologo oge, ndị nwere ihe ùgwù nke ịbịanye aka n’akwụkwọ nke a bụ ihe akụkọ, ịhụkwa ka Onye Isi Ngalaba Na-edeba Aha Òtù Ọha Mmadụ na nke Okpukpe kara ya akara iji kwadoo ya! N’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, Milton Henschel na Theodore Jaracz ndị so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova nọkwa n’ebe ahụ iji anya ha hụrụ oké ihe omume nke a. N’ime òtù ndị R.S.F.S.R. ahụ kwadoro, Ndịàmà Jehova bụ ndị mbụ natara akwụkwọ ha nke na-egosi na e debawo aha ha. Lee nnọọ nkwụghachi ụgwọ nke a bụụrụ ụmụnna ndị Russia ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe ha jiworo ndidi nwee ntachi obi ruo ọtụtụ afọ!
Ndịàmà Jehova nọ n’ebe nile nwere obi ekele nye ndị ọchịchị mba Soviet bụ ndị nyere nkwado iwu nke a. Karịsịa, ha ji obi ha nile na-ekele Jehova maka nnwere onwe ọhụrụ nke ụmụnna ha ndị Soviet. Ha so ụmụnna ha ndị nọ na U.S.S.R. nakwa ná mba ndị ọzọ nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe na-aṅụrị ọṅụ, bụ́ ndị nwere ike ijere Jehova Chineke ozi ugbu a n’ihu ọha karị. Ka Jehova gọzie ha n’ụba ka ha ji nnwere onwe nke a na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu n’ito aha nsọ ya.
[Foto dị na peeji nke 9]
Kremlin nke dị na Moscow
[Foto dị na peeji nke 10]
Ndị si Russia bịa otu mgbakọ e mere na 1990n’ebe na-abụghị Soviet Union