Ikwusa Ozi Ọma ‘n’Obodo Polynesia’ nke New Zealand
“OBODO Polynesia Kasị Buo Ibu n’Ụwa.” Nke ahụ bụ ihe ụfọdụ ndị kpọworo isi obodo New Zealand bụ́ Auckland. N’ihi gịnị? Ọ bụghị nanị n’ihi na ọ bụ obodo nke ndị Polynesia nke New Zealand n’onwe ha, bụ́ ndị Maori, kama ọtụtụ iri puku ndị Polynesia ndị ọzọ bikwa n’ebe ahụ. N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, ha abịawo n’ebe ahụ site na Western Samoa, agwaetiti Cook Island, Tonga, Niue, na agwaetiti ndị ọzọ dị na Pacific. Ee, e nwere ndị Maori nke Cook Island bi na New Zealand karịa ka e nwere n’ìgwè agwaetiti Cook Island ahụ n’onwe ya! N’otu aka ahụkwa, ndị Niue bi n’Auckland hiri nne nke ukwuu karịa ndị bi na Niue.
Ọ bụ ezie na ihe bụ isi mere ndị a bụ́ ndị agwaetiti Pacific dị iche iche ji bịa biri n’Auckland bụ n’ihi ọnọdụ akụ na ụba, ha nwekwara mkpa ndị ọzọ a ga-egbo. Otu mkpa bụ isi nke ndị a hụrụ Bible n’anya bụ mkpa ime mmụọ ha. (Matiu 5:3) N’ịghọta nke a, Ndịàmà Jehova nọ na New Zealand etinyewo mgbalị dị ukwuu iji kwusaa ‘ozi ọma alaeze ahụ’ n’etiti ndị bi n’agwaetiti ndị a. (Matiu 24:14) Gịnị ka e meworo n’ihe banyere nke a, oleekwa ụzọ ndị agwaetiti ndị ahụ siworo zaghachi?
Ndị Samoa Na-enwe Ọganihu
Okwu otu onye ozi ala ọzọ nọ na Samoa kwuru na-akọrọ anyị otu ihe banyere otú ndị bi n’agwaetiti ahụ si ele ihe ime mmụọ anya. Ọ kọwara, sị, “Mgbe i zutere mmadụ na New Zealand, ọ bụ omenala ịjụ ihe banyere ọrụ ọ na-arụ. Na Samoa, ajụjụ mbụ a na-ajụ na-abụkarị ihe banyere okpukpe onye ahụ na-ekpe.” Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na ọgbakọ Ndịàmà Jehova abụọ na-asụ asụsụ Samoa n’Auckland na-amụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu karịa ọgbakọ ndị ọzọ dị na New Zealand.
E guzobere ọgbakọ mbụ na-asụ asụsụ Samoa n’Auckland na 1977. N’ihi ito uto nke Chineke mere ka e nwee, e guzobere nke abụọ mgbe afọ asaa gasịrị. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 3:6.) N’ime ọgbakọ abụọ ndị a, e nwere ngụkọta nke 154 ndị nkwusa Alaeze, ndị 12 n’ime ha na-arụsi ọrụ ike n’ije ozi oge nile. Na Sunday ọ bụla, ihe karịrị 275 mmadụ na-abịa nzukọ ndị ahụ dabeere na Bible a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Ụmụnna nwoke na ndị nwanyị bụ ndị Samoa ji okwukwe ha kpọrọ ihe nke ukwuu, dị ka e gosipụtara ya n’ịnụ ọkụ n’obi na mkpebisi ike ha na-egosi n’ọrụ nkwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ ha na-arụ. (Matiu 28:19, 20) A pụrụ ịhụta nke a site n’ahụmahụ na-esonụ nke otu nwanna nwanyị onye Samoa:
Mgbe ọ nọ n’ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ, nwanna nwanyị ahụ zutere otu nwanyị onye katọrọ okpukpe nile dị ka ndị ihu abụọ, wee mechie ụzọ ya. N’ịbụ onye nke a nwụrụ ibubo n’ahụ, na onye nwere nkụda aka, nwanna nwanyị ahụ chere echiche ihe ọ ga-eme. O chere, sị, ‘Apụghị m ịhapụ ya ka ọ nọgide na-eche na Ndịàmà Jehova bụ ndị ihu abụọ.’ Ya mere, o kpebiri idetu ozi dị mkpirikpi n’akwụkwọ ma hapụrụ ya nwanyị ahụ. “A kọwara m ná mkpirikpi ihe ndabere Akwụkwọ nsọ maka ọrụ m na-arụ, jụọkwa ma ọ̀ ga-enye m ohere ịkọwara ya olileanya nke Bible na-enye. Etinyekwara m nọmba telifon m.”
Mgbe ahụ, nwanna nwanyị ahụ gara n’ihu n’ozi ya, na-aga n’ụlọ ndị ọzọ. Mgbe o ruru n’ụlọ nke anọ dị n’okporo ụzọ ahụ, e ziri ya ozi sitere na telifon ka ọ gaghachi jee hụ nwanyị ahu nke ji iwe mechie ụzọ ya. Nwanna nwanyị ahụ kọrọ, sị, “Nwanyị ahụ rịọrọ m mgbaghara maka mmeghachi omume mbụ ya, wee gosikwa ekele maka akwụkwọ ozi ahụ m hapụụrụ ya. Ezi mkparịta ụka sochiri, a malitekwara ọmụmụ Bible ebe obibi.”
Ọ bụkwa ihe na-enye obi ụtọ ịhụ mmụọ ije ozi ala ọzọ nke iji onwe onye achụ àjà nke ụfọdụ n’ime Ndịàmà bụ ndị Samoa na-egosipụta. Otu nwanna nwoke na ezinụlọ ya si Auckland kwalaa Wellington na 1981 ije nyere otu ìgwè nta nke na-arụ ọrụ n’etiti ndị Samoa bi n’ebe ahụ aka. Site n’ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị nkwusa Alaeze 11 n’oge ahụ, e nwewo ọgbakọ nke nwere 47 mmadụ na ya. Nwanna nwoke ahụ sịrị, “Nkwụghachi ụgwọ anyị nwetara dị ukwuu karịa ihe ndị anyị jiri chụọ àjà.” N’oge na-adịbeghị anya gara aga, ya na ezinụlọ ya azawo ‘òkù Masedonia’ ahụ wee kwalaghachi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Samoa. (Ọrụ 16:9, 10) Ndị ọzọkwa alaghachiwo n’ebe ndị ha bibu mbụ wee malite ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche, ije ozi ala ọzọ, ma ọ bụ ije ozi Betel.
Nzaghachi nke Ndị Niue
Ọrụ nkwusa ahụ na-agakwa n’ihu n’etiti ndị Niue bi n’Auckland. Onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kọrọ, sị: “N’ije ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ọ bụ ihe a na-ahụkarị, bụ́ ịkpọbata gị. Bible nke ezinụlọ ọ bụla na-adịkarị nso ebe aka ga-eru ya, a na-elekwa ya anya dị ka ihe kwesịrị ekwesị ịtụle ya.”
Ugbu a, e nwere ọgbakọ na-asụ asụsụ Niue nke na-arụsi nnọọ ọrụ ike n’Auckland. N’oge nleta onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’afọ gara aga, 76 ndị nkwusa Alaeze nọ na ya nwere ike ịnabata 127 mmadụ maka okwu ihu ọha dabeere na Bible nke e kwuru na Sunday. E nwekwara mmụọ dị nnọọ mma n’etiti ụmụnna nwoke na ndị nwanyị.
Onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị kwuru, sị, “A na-ele nleta ahụ anya dị ka izu pụrụ iche maka agbamume nye mmadụ nile. Ọgbakọ nile na-ezukọta maka nri ọ bụla. A na-ejikwa oge ndị a mee ihe maka iwepụta ụdị nri na-amasịkarị ndị Niue dị ka takihi (nri e ji pọpọ [papaya], taro [ụdị ihe ọkụkụ na-eme n’akụkụ okpomọkụ ụwa], na akị bekee a sụrụ asụ nke e ji ahịhịa banana fụchie wee mee), pitako (ógbè achịcha e ji taro, banana, akpụ kpọrọ akpọ a kwọriri akwọri mee), na punu povi (anụ kom kom), bụ́ nke a na-eji egwuregwu mgbe ụfọdụ na-akpọ porterhouse steak nke ndị agwaetiti ahụ.”
Akwụkwọ Ndị E Bipụtara n’Asụsụ Ndị Polynesia
Iji wee gboo mkpa ime mmụọ nke ndị Polynesia bi n’Auckland nakwa n’ebe ndị ọzọ, Watch Tower Society emewo ndokwa ibipụta akwụkwọ dị iche iche e ji amụ Bible n’asụsụ dị iche iche nke ndị Polynesia. Dị ka ihe atụ, a na-ebipụta Ụlọ Nche nke asụsụ Rarotongan, ma ọ bụ Cook Island Maori, ugbo abụọ n’ọnwa. A na-anarakwa Ụlọ Nche asụsụ Niue ahụ a na-ebipụta otu ugbo n’ọnwa nke ọma. Ka ọ dị ugbu a, ọnụ ọgụgụ Ụlọ Nche a na-ebipụta n’asụsụ Rarotongan na Niuean bụ ihe dị ka 1,000 maka mbipụta nke ọ bụla, a na-ekesakwa ugbu a ihe dị ka 900 ndị e bipụtara n’asụsụ Samoan na New Zealand. Alaka ụlọ ọrụ Society dị n’Australia na-ebipụta Ụlọ Nche nke asụsụ Samoa, a na-ekesakwa ihe dị ka 1,200 n’ubi dị na New Zealand.
Tụkwasị n’Ụlọ Nche, e nwere akwụkwọ ukwu na akwụkwọ nta ole na ole dị n’asụsụ dị iche iche nke ndị Polynesia. Akwụkwọ ahụ bụ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi nke e bipụtara n’asụsụ Niue na 1989, bụ akwụkwọ mbụ dị n’asụsụ ahụ nke na-enye nghọta nke ozizi Bible ndị bụ isi. Akwụkwọ ahụ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala n’asụsụ Cook Island Maori (Rarotongan) dị nnọọ irè. Ọ fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ akwụkwọ ahụ ka e ji na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi dum a na-eduzi n’ebe ahụ. Otu onye okenye kwuru, sị, “Ịdị njikere nke ndị a na-eduziri ọmụmụ ihe ịmalite ịbịa nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ bụ ihe na-agba àmà na ọ bụ ihe enyemaka dị irè n’izi ihe.”
Tụkwasị ná nkesa ha na-ekesa akwụkwọ ndị a site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ndị Jehova na-etinye ọtụtụ akwụkwọ n’ihe a pụrụ ịkpọ ịgba àmà n’ọma ahịa. N’ihi oké ịrị elu nke ọnụ ọgụgụ ndị Polynesia bi n’Auckland n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, e nwewo ọtụtụ nnukwute ahịa ebe e wuru ụlọ ahịa ndị na-adịghị adịgide adịgide, ebe ihe ndị bụ isi a na-ere na ha bụ nri na ihe nkà dị iche iche nke ndị Agwaetiti dị iche iche nke Pacific. Ihe ruru 25,000 mmadụ pụrụ ịbịa otu n’ime ahịa ndị dị otú ahụ n’ụtụtụ Saturday. N’iji ohere nke a mee ihe n’ụzọ amamihe, Ndịàmà ahụ na-eje n’ahịa ndị a wee gwa ndị nwe ụlọ ahịa na ndị bịara ịzụrụ ihe okwu banyere Alaeze Chineke.
Site n’ije ozi ha, Ndịàmà Jehova enwewo ike ịkụ mkpụrụ Alaeze n’ụba, tinyekwa ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’aka ndị Polynesia. Alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society na-enye akụkọ na n’ime afọ ije ozi 1990, e si n’ebe obibi akwụkwọ ha bupụ 23,928 akwụkwọ dị iche iche n’asụsụ dị iche iche nke ndị Polynesia.
Ịṅụrị Ọṅụ n’Otu Table Ime Mmụọ
N’ịbụ ndị maara mkpa ime mmụọ ha, Ndịàmà bụ ndị Polynesia na-eji ịbịazu nzukọ ndị Kraịst a na-enwe kwa izu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche kpọrọ ihe, tinyekwara ịbịa mgbakọ nta na mgbakọ ukwu dị iche iche. (Ndị Hibru 10:23-25) Ná Mgbakọ Distrikti “Ikpe nke Chineke” e mere n’Auckland na December 1988, e nwere nnọkọ dị iche iche maka ndị na-asụ asụsụ Samoan, Niuean, na Cook Island Maori. Otu ihe pụtara ìhè n’usoro ihe omume asụsụ Samoan ahụ bụ ihe nkiri Bible na-akpali akpali nke a mụrụ nnọọ nke ọma. Ndịàmà bi n’Auckland, bụ́ ndị Niue na ndị Cook Island gosipụtara àgwà ile ndị ọbịa anya nke ọma nke ndị Kraịst ha site n’iji amara nabata ndị ọbịa si ná mba ha dị iche iche wee bịa. Mgbakọ ahụ bụ oge maka inwe oké oriri na ịṅụrị ọṅụ na table ime mmụọ nke Jehova. Ná Mgbakọ ‘Asụsụ Dị Ọcha’ nke 1990 e nwere n’Auckland, ọnụ ọgụgụ kasị elu nke bụ 503 mmadụ bịara nnọkọ ndị e nwere n’asụsụ Samoan.
Ịzaghachi nke ọma n’ozi Alaeze ahụ bụ ihe àmà doro anya na ndị si n’agwaetiti dị iche iche nke ndị Polynesia ndị dị n’Ebe Ndịda Pacific anọwo ‘na-echere iwu Jehova.’ (Tụlee Aịsaịa 42:4, 12.) Ha jikwa ọṅụ na-ekere òkè n’ikwusa ozi ọma ahụ ‘n’obodo Polynesia’ nke New Zealand.