Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 2/15 p. 3-4
  • Esemokwu Banyere Ọnwụ Jisọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Esemokwu Banyere Ọnwụ Jisọs
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mgbapụta ahụ Ozizi Krisendọm nke Fuworo Efu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Olee Ụzọ E Si Akọwa Atọ n’Ime Otu?
    Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?
  • Gịnị Mere Jizọs Ji Nwụọ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ihe Isi Ike Dịịrị Nkà Mmụta Okpukpe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 2/15 p. 3-4

Esemokwu Banyere Ọnwụ Jisọs

N’ỤBỌCHI Ememe Ngabiga nke afọ 33 O.A., e gburu mmadụ atọ n’otu mgbe. A chịịrị ndị ikom atọ a maworo ikpe ọnwụ gaa n’otu ebe dị n’azụ mgbidi Jerusalem ma gbuo ha n’otu n’ime ụzọ ndị kasị eweta ihe mgbu, bụrụkwa ihe mweda n’ala: ịkpọgide ha n’elu osisi ndị kwụ ọtọ. Ogbugbu ndị dị otú ahụ bụ ihe a na-emekarị n’oge ndị Rom, ya mere, a pụrụ ịtụ anya na ka ọ dị ugbu a, a ga-echezọworị ogbugbu ndị ahụ e gburu n’oge Ememe Ngabiga. Otú ọ dị, otu n’ime ndị ahụ e gburu bụ Jisọs Kraịst. Ọnwụ ya kpaliri oké mgbanwe na esemokwu n’ihe banyere okpukpe.

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ agafewo eri mgbe ihe ahụ mere, ya mere ị pụrụ ile ya anya dị ka akụkọ ihe mere eme mgbe ochie. Otú ọ dị, ị̀ maara na e dozibeghị ma ọlị esemokwu ahụ biliterenụ?

Dị ka ị pụrụ ịma, ọtụtụ nde ndị mmadụ na-ekwu na Jisọs nwụrụ n’ihi ha. Ha kwenyesiri ike na ọnwụ Jisọs bụ isi ihe na-eduje ná mgbapụta na mgbaghara nke mmehie, na inwe okwukwe n’ọnwụ ya bụ ụzọ nzọpụta. Ma, ọ bụ ihe dị ịtụnanya na otu ihe odide dị n’akwụkwọ Anglican Theological Review kọrọ na nkwenkwe nke a e jidesiri ike nọ “ná nsogbu.” “Nsogbu” ahụ na-abịakwa site n’aka ndị ndú okpukpe.

Akwụkwọ Anglican Theological Review ahụ na-akọwa, sị: “Ozizi nke mkpuchi mmehie n’echiche ndị Kraịst nọ ná nsogbu n’ihi na a na-arụ ụka banyere ndabere o nwere na Bible, e jiriwo echiche ndị bụ na ọ na-adịru nanị nwa oge bogbuo ya . . . , ụzọ e sikwa egosipụta ya n’ọnọdụ ime mmụọ nke ọha mmadụ ewerewo ọdịdị nke mkpali mmadụ nwere n’onwe ya na nke mmadụ ịgụ onwe ya n’onye na-emeghị ihe ọjọọ.” N’eziokwu, ma ndị ọkà mmụta okpukpe nke Protestant ma ndị nke Katọlik enwebeghị ike iru nkwekọrịta ọ bụla n’ihe banyere ihe ọnwụ Jisọs Kraịst pụtara, ma ọ bụrụ na ọ dị ihe ọ pụtara.

Ị pụrụ iche na nke a bụ nserịta okwu n’etiti ndị ọkà mmụta okpukpe ole na ole, na o metụtaghị ndụ gị. Ma cheba echiche na nke a: Ọ bụrụ na e nwere njikọ ọ bụla n’ezie n’etiti ọnwụ Jisọs na ọnọdụ gị n’ihu Chineke na olileanya i nwere maka ịdị ndụ ebighị ebi (n’eluigwe ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ), mgbe ahụ, esemokwu nke a kwesịrị ka i lebara ya anya.

N’ihi gịnị ka ndị ọkà mmụta okpukpe ka ji nọrọ na-arụ ụka banyere okwu ahụ? Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Chọọchị Roman Katọlik. O nwere ozizi a kọwara nke ọma, bụ́ nke a chọrọ ka e kwere n’ajụghị ase banyere anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi nakwa banyere Atọ n’Ime Otu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ihe dị mgbagwoju anya na chọọchị ahụ emebeghị mkpebi ọ bụla n’ihe banyere mgbapụta site n’ọnwụ Kraịst. Akwụkwọ New Catholic Encyclopedia na-anakwere, sị: “E guzobewo ọtụtụ usoro dịgasị iche iche iji kọwaa ụzọ a na-esi napụta mmadụ site n’ọnọdụ ọjọọ nke mmehie, wee weghachikwa ya n’amara . . . Ma ọ dịghị otu nke ọ bụla n’ime usoro ndị a gaworo nke ọma n’ụzọ zuru ezu. . . . Nkà mmụta okpukpe n’ihe banyere mgbapụta ahụ bụ nke a na-emezubeghị n’otu akụkụ, ọ nọgidekwara na-abụ ihe isi ike na nkà mmụta okpukpe.”

N’ihi ya, o kwesịghị ịbụrụ gị ihe ijuanya na n’ime ọtụtụ nde ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu na ‘Jisọs nwụrụ n’ihi anyị’ ọ bụ nanị ole na ole nwetụrụ nghọta ọ bụla banyere ihe nke ahụ pụtara n’ezie. Dị ka akwụkwọ bụ Anglican Theological Review si kwuo: “Mgbe a rụgidere ya, . . . onye Kristian kwere ekwe na-abụkarị onye na-enweghị ike ikwu ebe ozizi ahụ dabeere na Bible, ma ọ bụ ịkọwa ụzọ o si arụ ọrụ.” N’ịbụ ndị e bokwasịrị ibu nke ozizi ha na-apụghị ịghọta, nke ha na-apụghịkwa ịkọwa, ọ na-esiri ndị na-efe ofufe na chọọchị dị iche iche ike ịhụ ụzọ ọnwụ Kraịst si bụrụ ihe dị mkpa ná ndụ ha.

Ọdịda Krisendọm daworo n’ịchịkọta ozizi doro anya banyere mgbapụta ahụ emewokwa ka mgbalị ya nile kụọ afọ n’ala iji ozi banyere Kraịst rute ndị Juu, ndị Hindu, ndị okpukpe Buddha, na ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ọtụtụ n’ime ndị dị otú ahụ nwere mmasị, na-akwanyekwara ọtụtụ n’ime ozizi ndị Jisọs ziri ùgwù, mgbagwoju anya nke gbara ọnwụ Kraịst gburugburu na ihe ọ pụtara nọ dị ka ihe mgbochi nye inwe okwukwe.

Ịdị mkpa nke ọnwụ Kraịst ọ̀ bụ ihe omimi efu—nke mmadụ na-apụghị ịghọta? Ka ò nwere nkọwa ezi uche dị na ya, nke dabeere na Bible? Ajụjụ ndị a kwesịrị ka i lebara ha anya, n’ihi na Bible na-ekwu okwu nke a dị ịtụnanya banyere Kraịst: ‘A gaghị ebibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ọ ga-enweta ndụ ebighị ebi.’—Jọn 3:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya