Ọ̀ Dịtụwo Mgbe I Chere Echiche?
◼ Gịnị bụ echiche Chineke banyere ịgba alụkwaghịm?
◼ Bible ọ̀ na-akwado ịkwa iko ma ọ bụ idina ụdị onwe?
◼ N’ihi gịnị ka Chineke jiworo kwere ka ịta ahụhụ dịgide?
◼ Ò zubere n’ezie ka ụwa dịrị otú a ọ dị?
◼ Gịnị ka ọdịnihu ga-eweta?
Ọ ga-amasị otu n’ime Ndịàmà Jehova ịbịa leta gị ma nyere gị aka ịchọta azịza ndị sitere na Bible nye ajụjụ ndị dị otú ahụ. Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị mmadụ Bible n’otu n’otu ma ọ bụ n’ìgwè n’anaghị ego ọ bụla.
Ya mere, ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ka onye ruru eru bịa leta gị n’ụlọ gị ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ ga-adịrị gị mma, anyị ga-eji obi ụtọ mee ndokwa maka ya. A ga-enyere gị aka ịchọta azịza, ọ bụghị nanị nye ajụjụ ndị i nwere na Bible, kamakwa azịza nye nsogbu ndị a na-enwe taa, ndị a pụrụ idozi site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Iji mee ka ndokwa nke a rute gị, ihe ị ga-eme bụ nanị idejupụta ihe a chọrọ ma zije ya n’adres nke dị ná mpempe akwụkwọ dị n’okpuru ebe a.
Achọrọ m ịmatakwu ihe banyere Bible. Biko meenụ ndokwa ka mmadụ bịa kpọtụrụ m.