Akụkọ Bible Ndị Na-adọrọ Mmasị Ụmụntakịrị
Otu nwoke bụ onye òtù nke otu chọọchị Protestant dị na Puerto Rico degaara Watch Tower Society akwụkwo, sị: “Abụ m onye na-akụziri ụmụntakịrị ihe n’otu ụlọ akwụkwọ ebe a na-akụzi Bible. N’ime afọ gara aga ihe nke a na-esonụ mere m.
“Anyị gụzuru akwụkwọ nile m na-eji akụziri ụmụntakịrị ahụ akụkọ ihe mere eme nke Bible, m wee jụọ onwe m, sị: ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a?’ Ka m nọ na-elegharị anya n’ebe ndebe akwụkwọ dị n’ụlọ m, ebe m nwere ihe dị ka otu narị akwụkwọ, ahụrụ m otu nke na-acha edo edo nke aha ya ‘bụ Akwukwọ m nke Akukọ Bible. Ekpebiri m iji akwụkwọ nke a mee ihe.
“Akụchapụrụ m ntụ dị n’ahụ ya wee malite iji ya na-eme ihe na Sunday ọ bụla ná nkụzi m. Akwụkwọ ahụ masịrị ụmụntakịrị ahụ nke ukwuu, ozugbo anyị ka gụsịrị otu isiokwu, ha chọkwara ịmalite ọzọ. Ihe si na ya pụta: Mgbe afọ ahụ na-agwụsị, anyị agụzuwokwa akwụkwọ ahụ dum. Obi tọrọ ụmụntakịrị ahụ ụtọ nke ukwuu, enwekwara m ekele nke ukwuu. Ọ bụ n’ezie akwụkwọ mara mma, doo anya, dịkwa nkenke.”
Anyị na-eche na gị onwe gị ga-enwekwa mmasị n’akwụkwọ nke a e sere ihe osise ndị mara mma, nke e bikwara ná mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo. Akụkọ Bible dị 116 ndị dị n’ime ya na-enye onye na-agụ ya nghọta ụfọdụ nke ihe dị na Bible. A haziri akụko ndị ahụ n’usoro n’usoro otú ha si mee. Ị ga-ahụ na nke a bụ ihe na-enye aka n’ezie n’ịmata mgbe ihe dị iche iche mere ma e jiri ha tụnyere ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta akwụkwọ nke a bara uru, nke nwere 256 peji, biko dejupụta ma zite mpempe akwụkwo dị n’ebe a.
Ọ ga-amasị m inweta akwụkwọ ahụ e kwesịrị mkpò ya ike, bụ́ Akwụkwọ m nke Akụkọ Bible. (Dega akwụkwọ n’adres dị n’okpuru ebe a iji matakwuo ihe banyere ya.)