Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 12/15 p. 21
  • Ịghọta Ihe Dị n’Akụkọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịghọta Ihe Dị n’Akụkọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị E Gbochiri Ịlụ Di na Nwunye
  • Gịnị Kpatara Njupụta nke Ime Ihe Ike?
  • Ebee ka “Obodo Devid” Dị?
  • “Aha Ọhụrụ”
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 12/15 p. 21

Ịghọta Ihe Dị n’Akụkọ

Ndị E Gbochiri Ịlụ Di na Nwunye

N’ịbụ nke otu onye bishọp okpukpe Lutheran kọwara di ka “nsogbu zoro ezo ruo ọtụtụ ọgbọ,” mmekọahụ na-ezighị ezi nke ndị ụkọchukwu na-eme abụwo nke ‘pụtara ìhè’ n’ikpeazụ. Otú ọ dị, akwụkwọ akụkọ Los Angeles Times na-akọ na ihe nke ahụ kpatara bụ “mkpughe ihu ọha ndị na-eme ihere na ịgba akwụkwọ n’ụlọikpe ndị dị oké ọnụ nke nubaworo ọtụtụ chọọchị n’ịnọ n’ụkọ ego.” Akwụkwọ akụkọ Times ahụ na-ekwu na e nwere n’ụlọikpe dị iche iche ihe ruru 2,000 okwu ikpe mmekọahụ na-ezighị ezi ndị metụtara ndị ụkọchukwu.

Ọ bụkwa ihe dị ịrịba ama na a kọrọ na ụfọdụ n’ime ndị kasị ada iwu ahụ bụ ndị ụkọchukwu Roman Katọlik. A. W. Richard Sipe, bụ́ onye ọkà n’ịgwọ ọrịa uche na onye bụbu onye mọnk nke òtù Senti Benedict, eduziwo ịgba ajụjụ ọnụ nke ya na 1,000 ndị ụkọchukwu na 500 ndị ikom na ndị inyom ndị ọzọ nwere, ọtụtụ n’ime ndị ikpeazụ ahụ kwuru na ha esorowo ndị ụkọchukwu nwee mmekọahụ. Magazin bụ Time na-akọ na ọ na-eme atụmatụ na ihe dị ka ọkara nke 53,000 ndị ụkọchukwu Roman Katọlik nọ na United States na-emebi iyi ha ṅụrụ nke ịnọ n’alụghị nwunye. Dị ka Sipe si kwuo, 28 pasenti nke ndị ụkọchukwu nile nọgidere na-eso ndị inyom na-enwe mmekọahụ, ebe, tụkwasị na nke ahụ, malite 10 ruo 13 pasenti na-etinye aka n’iso ndị ikom toworo eto na-enwe mmekọahụ, 6 pasenti na-achọkwa ụmụaka maka inwe mmekọahụ, karịsịa ụmụntakịrị nwoke. Ihe karịrị 100 ụgwọ a kwụrụ maka omume na-ezighị ezi nke ndị ụkọchukwu n’ime afọ isii gara aga efuwo ndị isi Katọlik 100 nde ruo 300 nde dollar.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-eche na ọtụtụ n’ime nsogbu ndị a ga-abụ nke a kwụsịrị ma ọ buru na a hapụ ndị ụkọchukwu ka ha na-alụ nwunye. Ọ pụrụ ịbụ ihe ijuanya nye ụfọdụ ịmata na ọ dịghị ebe ọ bụla Bible gbochiri ndị Kraịst bụ ndị ozi Chineke ịlụ di na nwunye. Otú ọ dị, Chọọchị Katọlik amachibidowo ndị ụkọchukwu ịlụ nwunye kemgbe narị afọ nke 12. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị na mgbe ọ na-ezo aka n’oké ndapụ n’ezi ofufe nke ga-abịa mgbe ndị ozi ahụ nwụsịrị, Pọl dere na “ụfọdụ ga-ewezụga onwe ha n’ebe okwukwe anyị dị, na-aṅa ntị ndị mmụọ na-eduhie eduhie na ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ, site n’ihu abụọ nke ndị na-ekwu okwu ụgha, . . . na-egbochi mmadụ ịlụ di na nwunye.”—1 Timoti 4:1-3.

Gịnị Kpatara Njupụta nke Ime Ihe Ike?

O juru Canada anya, nwụọkwa ya ibubo n’ahụ ịmata na Marc Lepine onye dị 25 afọ egbuwo ọchụ n’ụba n’ogige nke University of Montreal. N’enweghị mmetụta ọ bụla, o gburu ndị inyom 14 na-agụ akwụkwọ ịghọ ndị injinia, na-emerụ ụmụ akwụkwọ 13 ndị ọzọ ahụ, tinyere ndị ikom 4, tupu o jiri égbè ahụ gbagbuo onwe ya. Ọ bụ ogbugbu ìgwè mmadụ kasị njọ e nweworo n’akụkọ ihe mere eme nke mba ahu. Onye praịm minista mba ahụ kọwara ogbugbu ahụ ezi echiche na-adịghị na ya dị ka “ọdachi dakwasịrị ụmụ mmadụ nke ọ̀tụ̀tụ̀ ya buru ibu.”

Dị ka akwụkwọ akụkọ The Toronto Star si kwuo, na United States, “e nwewo ihe karịrị 100 ugbo e mere ogbugbu ìgwè mmadụ kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ, ihe ka ọtụtụ n’ime ha mere n’ime iri afọ abụọ gara aga.” Ma, dị ka nna nke otu onye n’ime ndị ahụ Lepine gburu jụrụ n’iru újú: “N’ihi gịnị ka e ji nwee njupụta nke ime ihe ike n’ụwa? N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji eme ibe ha ihe dị otú a?”

Nkọwa Bible nyere maka mmụba nke ime ihe ike n’oge anyị a doro anya. Jọn onyeozi dere, sị: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) N’iji ya tụnyere ikuku nke anyị na-ekuru, otu mmụọ na-adịghị mma nke na-esite n’ebe Setan nọ, bụ “ajọ onye ahụ,” na-achịkwa echiche, ọchịchọ, na omume nke ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ. Site ná mmụọ ya nke nnupụisi, ọchịchọ onwe onye nanị, na mpako, ọ “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Otú ọ dị, ezi ndị na-efe Chineke ofufe na-enweta nkasi obi n’ihe ọmụma ahụ nke bụ na “ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.

Ebee ka “Obodo Devid” Dị?

Ọ bụrụ na ị gaa Jerusalem, i wee rịọ mmadụ ka o gosi gị ebe ị ga-enweta Ugwu Zaịọn, o yikarịrị ka a ga-eduzi gị gaa n’otu ebe dị elu, ma ọ bụ ugwu nta, nke banyere n’ebe ndịda nke Obodo Ochie ahụ. N’ịbụ nke Ndagwurugwu Tyropoeon dị n’ókèala ya dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, na Ndagwurugwu Hinọm n’ebe ọdịda anyanwụ, e ji ọdịdị nke Chọọchị nke Dormition rịba ugwu nta nke a ama, nke elu ụlọ ya dị gburugburu, dịkwa ka okoso e kpubere ihu n’ala.

Otú ọ dị, map na ihe osise dị iche iche nke Watch Tower Society bipụtara na-egosi na Ugwu Zaịọn dị n’otu obere ugwu dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ebe a maara taa dị ka Ugwu Zaịọn. Ihe kewara ugwu nta nke a pụọ na nke yiri ya dị n’ebe ọdịda anyanwụ bụ Ndagwurugwu Tyropoeon, Ndagwurugwu Kidron dịkwa n’ókèala ya nke ebe ọwụwa anyanwụ.

Olee nke n’ime abụọ ndị a bụ ebe e nwere Ugwu Zaịọn na mbụ? Magazin ahụ bụ Biblical Archaeology Review (May/June 1990) kwetara na “ebe ahụ dị elu, ma ọ bụ ugwu nta nke dị n’ọwụwa anyanwụ, bụ ebe Ugwu Zaịọn dị na mbụ, . . . bụ nke Eze Devid dọtara n’agha site n’aka ndị Jebus.” Mgbe ọ dakpọsịrị, obodo ndị Jebus nke a siri ike ghọrọ nke a maara dị ka “Obodo Devid,” nke a na-akpọkwa “Zaịọn.” (2 Samuel 5:7) Akwụkwọ ahụ bụ Biblical Archaeology Review kwuru na “ndị ọkà n’igwupụta ihe mgbe ochie ekpebiwo, n’enweghị obi abụọ, na obere ebe nke dị elu,” nke a na-akpọkarị ugwu nta nke ebe ọwụwa anyanwụ, bụ Ugwu Zaịọn ahụ nke Bible ebe Devid guzobere isi obodo nke ọchịchị na okpukpe mba Israel.—2 Samuel 6:11, 12, 17.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya