Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 11/1 p. 29-31
  • ‘Nọgidenụ Na-abu Ndị e Mere Ka Ha Guzozie’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Nọgidenụ Na-abu Ndị e Mere Ka Ha Guzozie’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ime Ka E Guzozie Metụtara
  • Mkpa nke Ịbụ Ndị E Mere Ka Ha Guzozie Taa
  • Ụkpụrụ Nile nke Chineke
  • Mgbalị Dị Mkpa
  • Ị̀ Ga-anọgide Na-ekwe Ka A Na-agbazi Gị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Ndị Okenye—Meenụ Ka Ndị Ọzọ Guzozie ná Mmụọ nke Ịdị Nwayọọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ka Anyị Jisie Okwukwe Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa Ike!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 11/1 p. 29-31

‘Nọgidenụ Na-abu Ndị e Mere Ka Ha Guzozie’

“Ì JI n’aka na anyị ga-achọta ebe ọ dị?” Onye njem ahụ jụrụ onye isi ụgbọ mmiri ahụ ajụjụ a. Ka obere ụgbọ mmiri ahụ na-adagharị n’ihi oké ifufe ahụ a ma ama nke a na-akpọ Cape Rollers nke ebe Ndịda Atlantic, o yiri ya ka ọ bụ na ọ ga-afọdụ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ ọrụ ebube ga-eme ka ha ruo nwa obere ebe ahụ dị na map nke bụ ebe ha na-eje.

Ya mere, onye isi ụgbọ mmiri ahụ kpọọrọ ya banye n’ebe a na-anya ụgbọ ahụ wee kọwaara ya otú ngwá ọrụ dị iche iche e ji anya ụgbọ mmiri na-esi arụ ọrụ—ígwè gyro compass dị iche iche, radar, satellite ndị e ji anata ozi, na ọbụna sextant nkịtị. Ọ bụ ezie na nkọwa nke otú ihe ndị ahụ si arụ ọrụ karịtụrụ ike nghọta nwanyị ahụ, o mesịrị ghọta ụkpụrụ bụ isi n’ịnya ụgbọ mmiri: idozigharị ebe e chere ihu. Site n’enyemaka nke ngwá ọrụ ndị ahụ e ji anya ụgbọ mmiri, onye isi ụgbọ ahụ pụrụ ime ka ike nile nke nrugharị oké osimiri na ifufe ghara imetụta ebe ha chere ihu site n’ịdị na-ahazigharị ihe site n’oge ruo n’oge. Ọ bụrụ na e meghị nhazigharị ndị dị otú ahụ, ha ga-eji ọtụtụ maịlụ gahie ụzọ n’ebe ha na-eje.

Ndị Kraịst yiri ụgbọ mmiri ndị nọ n’oké osimiri nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ‘ịbụ ndị e mesịrị hụ n’udo, ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta n’ihu [Jehova].’ (2 Pita 3:14) Ma dị ka ọ dị n’ihe banyere ụgbọ, e nwere ike dị iche iche—ndị sitere n’ime na ndị sitere n’èzí—ndị o yiri ka hà na-achọ ịkwapụ anyị site n’ebe anyị chere ihu. Ya mere, lee nnọọ ka okwu ahụ Pọl gwara ndị Kọrint si kwesị ekwesị: “Nke a ka anyị na-ekpekwara Chineke, bụ́ ka e mee ka unu zuo okè [guzozie, NW] . . . ka a na-eme unu ka unu zuo okè [guzozie, NW].”—2 Ndị Kọrint 13:9, 11.

Ihe Ime Ka E Guzozie Metụtara

Okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ime ka e guzozie” na-ezo aka n’ime ka ihe “guzoo n’ahịrị kwụ ọtọ.” (Lee nkọwa ala ala peji nke Reference Bible.) N’ihe odide Bible ụfọdụ, e jiri ya mee ihe ịkọwa mweghachi nke ihe n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, na Matiu 4:21, e jiri okwu yiri nke ahụ mee ihe iji kọwaa ‘imezi’ ụ̀gbụ́ e ji egwu azụ. (Kingdom Interlinear) Ya mere, gịnị ka ọ pụtara ndị Kraịst ịbụ ndị e mere ka ha guzozie?

Tụlee ihe banyere ndị Kraịst ahụ nọ na Kọrint ndị Pọl dejeere akwụkwọ. N’akwụkwọ o dejeere ha tupu mgbe ahụ, Pọl ehotawo ọnọdụ ụfọdụ ndị na-ekwesịghị ekwesị ndị dị n’ọgbakọ ahụ: ịrọ òtù, ikwe ka adịghị ọcha nke mmekọahụ dịgide, ịgbarịta ibe ha akwụkwọ, asọpụrụghị Nri Anyasị nke Onyenwe anyị, na ọbụna inwe nzukọ ndị na-adịghị aga n’usoro. (1 Ndị Kọrint 1:10-13; 5:1; 6:1; 11:20, 21; 14:26-33) Otú a, ọ dị mkpa ka ndị Kọrint ndị ahụ “mezie” ọnọdụ dị n’ebe ahụ, ya bụ, mee ka o “guzoo n’ahịrị kwụ ọtọ” nke kwekọrọ n’ụkpụrụ nsọpụrụ Chineke.

Akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara ha gosiri na ha mere nnọọ nke ahụ. (2 Ndị Kọrint 7:11) Otú ọ dị, Pọl matara na nrụgide sitere n’ụwa, site n’aka Setan, sitekwa ná mkpali anụ ahụ nke ha onwe ha, ga-anọgide na-akwapụ ha site n’ebe ha chere ihu site n’oge ruo n’oge. N’ihi ya, ọ gwara ha okwu ndụmọdụ kwesịrị ekwesị ka ha ‘nọgide na-abụ ndị e mere ka ha guzozie.’

Mkpa nke Ịbụ Ndị E Mere Ka Ha Guzozie Taa

Ndịàmà Jehova nke oge a aghaghịkwa ịnọgide na-abụ ndị e mere ka ha guzozie. Setan bụ Ekwensu ‘na-ebuso anyị agha,’ na-arụsi ọrụ ike imebi nguzosi ike anyị n’ezi ihe. (Mkpughe 12:17; Ndị Efesọs 6:12) Anyị na-ebikwa n’ime usoro ihe zuru ụwa ọnụ nke na-eme ihe “dị ka onye isi nke ike nke mbara eluigwe si chọọ.” Ndị ọrụ ibe anyị na ụmụ akwụkwọ ibe anyị pụrụ ịbụ ndị ‘na-eduzi onwe ha n’ụzọ kwekọrọ n’agụụ nke anụ ahụ ha, na-eme ihe anụ ahụ ha chọrọ.’ (Ndị Efesọs 2:2, 3) Anyị nọgidekwara na-ebuso ọchịchọ mmehie anyị bu pụta ụwa agha. (Ndị Rom 7:18-25) Ọ bụrụ na a nọgideghị na-eme ka anyị guzozie, ọ pụrụ ịdị mfe inupụ anyị site n’ebe anyị chere ihu.

Otu ahụmahụ nke Pita onyeozi mere ihe atụ nke a n’ụzọ dị mma. Mgbe o mesịrị ka a mata Jisọs n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka “Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ,” a jara Pita mma site n’okwu ndị a: “Ngọzi [obi ụtọ, NW] na-adịrị gị, Saịmọn Ba-Jona: n’ihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị, kama ọ bụ Nna m nke bi n’eluigwe.” (Matiu 16:16, 17) O doro anya na echiche Pita na-agbaso ụzọ kwesịrị ekwesị. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, n’ime ogologo oge amaokwu isii ndị na-esonụ were, ọ dịrị mkpa ka Jisọs basiere ya mba ike! Mgbe ọ nụrụ na Kraịst gaje “ịhụ ọtụtụ ahụhụ . . . na a ghaghị igbu ya,” Pita gbara Jisọs ume, sị: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị; ihe nke a agajeghị ime gị ma ọlị.” [NW] Jisọs zaghachiri ngwa ngwa, sị: “Gaa n’azụ m, Setan: ị bụ ihe na-eme ka m maa n’ọnyà: n’ihi na ị dịghị atụkwasị uche gị n’ihe Chineke, kama ọ bụ n’ihe mmadụ.”—Matiu 16:21-23.

Pita na-eche echiche dị ka mmadụ si ele ihe anya. Ọ dịrị mkpa ka e mee ka echiche na àgwà ya nile guzozie. Ọ̀ bụ na nke ahụ abụghịkwa eziokwu n’ihe banyere anyị nile site n’oge ruo n’oge? Ọ̀ bụ na a dịghị akpali anyị ịhụ ihe dị iche iche site n’ụzọ anyị onwe anyị si ele ihe anya kama ịbụ site n’ụzọ Chineke si ele ihe anya? Ya mere, site n’oge ruo n’oge, ọ dị mkpa ka e mee ka anyị guzozie. Dị ka ụgbọ mmiri nke nọ n’oké osimiri, mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ịbụ na nhazigharị ndị ahụ dị nta, nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a gaghị ahụta ha. Ma ha pụrụ ịkpata ọdịiche dị n’etiti anyị iru ebe anyị na-eje na anyị ịbụ ndị ụgbọ ha kpuru n’ụzọ ime mmụọ. N’eziokwu, nhazigharị dị nta ugbu a pụrụ igbochi mkpa ọ ga-adị ime nhazigharị ndị buru ibu—ma eleghị anya ndị na-eweta ihe mgbu mgbe oge gasịrị.

Ụkpụrụ Nile nke Chineke

Ọ bụrụ na ngwá ọrụ ndị e ji anya ụgbọ mmiri abụghị ndị e mere ka ha nwee ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị ziri ezi, a pụghị iji ha dozigharịa ebe e chere ihu n’ụzọ kwesịrị ekwesị. N’otu aka ahụ, ka ndụ anyị wee nọgide chee ihu n’otu ebe, ọ dị anyị mkpa inweta nduzi ziri ezi nke Okwu Chineke, bụ́ Bible. “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie.” (2 Timoti 3:16) Okwu ahụ nke sitere n’ike mmụọ nsọ na-esetịpụ ụkpụrụ omume na nke echiche ndị Chineke chọrọ. Ịgụ ya mgbe nile dị mkpa iji wee na-agbaso “ụzọ nile nke ezi omume.”—Abụ Ọma 23:3.

A na-enwetakwu nduzi site n’aka òtù “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nke ndị Kraịst e tere mmanụ. Mmụọ Jehova enyeworo ndị a aka ịghọta uche ya n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu. (Matiu 24:45-47; Ilu 4:18) Otú a, mgbe ntụzi sitere ná nzukọ Jehova wee bịa, anyị pụrụ iji amamihe wee nakwere ya, na-amara nke ọma na Jehova ga-eduru anyị gaa nanị n’ụzọ nke ga-ewetara anyị abamuru ebighị ebi.—Aịsaịa 48:17.

Ma mgbe ụfọdụ, ọ dị anyị mkpa inweta enyemaka onwe onye iji wee nọgide n’ụzọ ahụ. Pọl gbara ume ná Ndị Galetia 6:1, sị: “Ụmụnna m, a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị mmụọ nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ.” Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi so ná ndị nwere iru eru ime mmụọ dị otú ahụ. Ọtụtụ mgbe, ha ga-arụtụrụ anyị aka kpọmkwem n’ebe ụfọdụ ọ dị mkpa ka anyị meziwanye ihe.

Mgbalị Dị Mkpa

Ọ naghị adịcha mfe mgbe nile ime mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ anyị. Ọzọkwa, tụlee ihe banyere Pita. N’ịbụ onye a mụrụ dị ka onye Juu, Pita tolitere na-enwe echiche na-ezighị ezi nke mmadụ dum na-enwe banyere ndị si n’agbụrụ ndị ọzọ. Dị ka ọ gwara onye Jentaịl ahụ bụ Kọniliọs: “Unu onwe unu maara otú ọ bụ ihe na-ezighị ezi n’iwu ka nwoke nke bụ onye Juu were onwe ya rapara n’ahụ onye mba ọzọ ma ọ bu ijekwuru ya.” Otú ọ dị, mgbe ọ ghọtasịrị na uche Chineke bụ ka o soro nwoke nke a na ezinụlọ ya kerịta eziokwu ndị Kraịst, Pita kwubiri, sị: “N’ezie ana m aghọta na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:28, 34, 35.

Pita emewo mgbanwe dị egwu n’echiche na àgwà ya n’ebe agbụrụ ndị ọzọ dị! Ma ihe àmà gosiri na ọ dị mkpa ka ọ nọgide na-abụ onye e mere ka o guzozie n’ihe banyere nke a n’ihi na mgbe afọ ole na ole gasịrị, nrụgide nke ndị ọgbọ ya mere ka Pita malite ikwujọ ndị kwere ekwe bụ ndị Jentaịl. Ọ dịrị mkpa ka Pọl onyeozi tụọ ya mmehie ya n’anya, na-eji okwu ndị siri ike mee ihe iji nyere ya aka ime ka echiche ya guzozie karị!—Ndị Galetia 2:11-14.

N’otu aka ahụkwa taa, ọ pụrụ ịbụ na onye Kraịst etolitewo n’ebe e nwere ịkpa okè nke agbụrụ. Mgbe ọ batasịrị n’eziokwu, ọ pụrụ iji uche ya kwere na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, ma nọgide na-ejigidesi mmetụta dị iche iche nke ịkpa okè agbụrụ ike. Ọ bụ ezie na ọ dịghị emeso ndị si n’agbụrụ ọzọ ihe ike, ọ pụrụ ikpebi n’echeghị echiche na ha nwere àgwà ụfọdụ na-adịghị mma n’ihi agbụrụ ha si na ya. Ọ pụrụ ịdị na-ekwu okwu egwuregwu banyere agbụrụ, bụ́ ndị ga na-akpasu ha iwe ma ọ bụ na-ekwu okwu mgbe mgbe, bụ́ ndị na-adọrọ uche gaa n’ihe banyere agbụrụ ma ọ bụ ndịrịta iche nke agbụrụ. Ọbụna na ọ pụrụ ịjụ ịnara ndụmọdụ ime mmụọ sitere n’aka onye Kraịst ibe ya, onye ọ pụrụ ịbụ na o kwughị okwu n’ụzọ ụfọdụ n’ihi ịbụ onye na-agụghị oké akwụkwọ ma ọ bụ onye na-emepeghị anya nke ukwuu. O doro nnọọ anya na ọ ga-achọ ezi mgbalị n’aka onye dị otú ahụ ime ka echiche ya guzozie n’ụzọ kwekọrọ na nke Jehova!a

Ma okwu a na-ekwu ò metụtara ịkpọasị nke agbụrụ, ịhụ ihe onwunwe n’anya, ihe omume ọha na eze ndị a na-eme n’ụlọ akwụkwọ na n’ụlọ ọrụ, ma ọ bụ mkpa ọ dị ịbịa nzukọ ndị Kraịst, anyị aghaghị ịdị na-anakwere ntụzi a na-enye site n’Okwu Chineke nakwa nzukọ ya. Anyị ekwesịghị iche na ndụmọdụ akwụkwọ nsọ ndị dị irè emetụtaghị anyị, wee lefuru ya anya. Cheta na ndị Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi sịrị: “E meghị ka ụzọ Jehova guzozie nke ọma.” Ọ́ bụghị anyị onwe anyị bụ ndị na-aghaghị ime ka anyị guzozie iji kwekọọ n’ụzọ nile nke Jehova?—Ezikiel 18:25, NW.

Anyị na-aṅụrị ọṅụ na Jehova na-enwe ezi mmasị n’ụzọ anyị na-esi eje ije n’ihu ya, na-enye ndị ya mgbazi mgbe mgbe. Ọ bụ dị ka Aịsaịa buru amụma, sị: “Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.” Ka anyị onwe anyị na-anara nduzi ịhụnanya dị otú ahụ site n’aka Jehova, ‘na-adịkwa njikere irube isi.’ (Aịsaịa 30:21; Jemes 3:17) Ee, ka anyị nọgide na-abụ ndị e mere ka ha guzozie ka ụzọ anyị wee duje anyị n’ihe mgbaru ọsọ nke inweta ihu ọma Chineke ruo mgbe ebighị ebi!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Lee isiokwu ndị ahu metụtara ikpọasị ndị dị ná mbipụta April 8, 1988, nke magazin a na-ebipụtakọ ya na nke a, bụ Teta! Leekwa mbipụta May 15, 1988, nke Ụlọ Nche, peji 10-20.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya