Ịghọta Ihe Dị n’Akukọ
N’ihi Gịnị Ka E Ji Ekwusa Ozi Ọma?
Ndị ọnụ na-eru n’okwu akpọtụwo emeghị nkwusa aha dị ka ihe so na-akpata ndalata e nwere ná ndị òtù chọọchị n’etiti okpukpe ndị bụ isi. Nchegbu e nwere na 1988 banyere nsogbu nke a kpalịri United Chụrch of Christ ịnabata okwu metụtara “ime nkwusa na ịba ụba ndị òtù chọọchị dị ka ihe kasị mkpa a ga-elebara anya n’ogologo afọ anọ.
Akwụkwọ akụkọ bụ St. Petersburg Times na-akọ na òtù okpukpe ndị ọzọ bụ isi na United States, gụnyẹre Presbyterian Church na Episcopal Church, emewokwa ihe yiri nke ahụ. Otú ọ di, otu nnyocha e mere n’oge na-adịghị anya gara aga n’ihe karịrị 200 ọgbakọ dị iche iche nke United Church of Christ gosiri na ọtụtụ n’ime 1.6 nde ndị òtù ya na-egosi mmasị dị nta n’ije kọọrọ ndị ọzọ banyere okwukwe ha. Otu onye òtù ya jụrụ, sị: “N’ihi gịnị ka o jị dị mkpa ka anyị jee gwa ndị ọzọ okwu ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe dị mma?” Onye ọzọ sịrị: “Ọ bụrụ na ị na-adị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’okwukwe gị, ọ dịghi mkpa ka ị na-ekwu okwu banyere ya.”
Ma, n’akwụkwọ ya bụ American Mainline Religion, onye so dee ya, bụ́ Wade Clark Roof kwetara na “otú ndị mmadụ si ekwu okwu banyere ndụ okpukpe na nke ime mmụọ ha nwere nkekọ dị oké mkpa n’etiti ya na ndịgide nke okwukwe ahụ n’onwe ya.”
Ọ bụrụ na ‘ime ihe ọma’ na inwe “okwukwe” zuru ezu ime Chineke obi ụtọ, n’ihi gịnị ka Pọl onyeozi jì dee, sị: “Ahụhụ dịịrị m, a sị na ezisaghị m ozi ọma”? Ọ kọwaara ndị kwere ekwe ibe ya nọ na Rom, sị: “Ọ bụrụ na ị ga-ewere ọnụ gị kwuputa Jisọs na ọ bụ Onyenwe anyị, ọ bụrụkwa na i ga-ewere obi gị kwere na Chineke mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, a ga-azọpụta gị: n’ihi na a na-eji obi kwere ruo ezi omume; a na-ejikwa ọnụ kwupụta ruo nzọpụta.”—1 Ndị Kọrint 9:16; Ndị Rom 10:9, 10.
Iji Mmekọahụ Mere Ngwá Ọrụ
Professor Mamoru Fukutomi kwụru na ihe kạrịrị ọkạra n’ime 1,100 ihe osise na-atọ ọchị ndị e bipụtara n’akwụkwọ ndị Japan dị iche iche, gụnyere ndị nke ụmụntakịrị, gosiri ihe omume ndị metụtạra mmekọahụ. Ọ nọrọ n’isi otu òtù dị na Tokyo nke nyochara ihe karịrị 390 magazin na akwụkwọ ndị ọzọ a zụtara n’ime otu ọnwa.
Professor Fukutomi kwuru na ‘ihe ka ọtụtụ ná ngosipụta ndị ahụ nke omume mmekọahụ na-agbaso ụkpụrụ nke ndị ikom ịnwa ịrara ndị inyom ndị na-enweghị mmasị n’ime ihe ahụ [gaa n’inwe mmekọahụ] na ndị inyom imesị kwenyere ha ma na-ekeresi òkè ike.’ Akwụkwọ akụkọ bụ The Daily Yomiuri kọrọ na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 80 pasenti nke 6,861 foto ndị dị na magazin ndị na-amasị ọha mmadụ na Japan, bụ́ ndị e nyochara, “gosiri ndị inyom ndị nọ n’ọnọdụ ndị na-akpali agụụ mmekọahụ.” Ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị inyom dị na foto ndị ahụ “yi uwe ime, uwe e ji egwu mmiri ma ọ bụkwanụ gbara ọtọ,” ọ bụkwa nanị 40 pasenti yi uwe, 75 pasenti nke ndị ikom dị na foto ndị ahụ e nyochara yi uwe.
Olee ụzọ iji mmekọahụ mere ngwá ọrụ n’ụzọ dị otú a ga-esi emetụta ndị na-eto eto? Akwụkwọ Bible bụ llu nyere nkọwa pụtara ìhè banyere otu nwa okorobịa nke “na-enweghị ezi nzube” ka a na-arara ya gaa n’ụlọ nke nwanyị na-akwa iko. (Ilu 7:7, Reference Bible, nkọwa ala ala peji) Gịnịkwanụ banyere nwanyị ahụ na-akwa iko? “Ugbu a n’èzí’ ka ọ nọ, ugbu a ọ bụ n’ámá nile, ọ bụkwa na nso nkuku nile ọ bụla ka ọ [na-echere, NW]. Nwanyị ahụ wee jide ya aka.” (Ilu 7: 8-13) N’oge dị ugbu a, ọbụna akwụkwọ e biri ebi ‘na-echere ijide’ ndị na-eto eto. Otú ọ dị, Bible na-enye ndụmọdụ, sị: “Ekwela ka obi gị wezuga onwe ya baa n’ụzọ nile nke nwanyị ahụ, akpafula n’okporo ụzọ ya nile.”—Ilu 7:25.
Ònye Bụ Onye Kraịst nke “Ka Mma”?
“N’agbanyeghị mkpebi onye Kraịst mere, ma ọ̀ ga-abụ onye soja ma ọ̀ ga-abụ onye jụrụ ije agha n’ihi akọ na uche ya, ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi ya ịzọrọ na ya bụ onye Kraịst n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu karịa onye nke ọzọ, ma ọ bụ ọbụna iwelite ihe ịrụ ụka banyere ọbụbụ onye nke ọzọ bụ onye Kraịst n’ihi na ọ kwadoro ọnọdụ dị iche na nke ya.”
Nzukọ Kansụl nke Evangelical Lutheran Church nke Germany wepụtara okwu ahụ na July 1989. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ndị isi kwuru na ọ bụ iji megide echiche ahụ nke ụfọdụ ndị nwere nke bụ na ịjụ ije agha n’ihi akọ na uche bụ “ihe àmà dị mma” nke ịbụ onye Kraịst karịa ije agha. Ọ bụ ezie na o kwenyere na ndị Kraịst pụrụ ịkwụsị agha site “n’ịghara ime ihe ike n’onwe onye,” Kansụl Chọọchị ahụ rụrụ ụka na a pụkwara ime nke a site n’iji ike nke agha lụsoo ime ihe ike ọgụ iji wee hụ na e guzobere udo.
N’akwụkwọ ya bụ History of Christianity, Edward Gibbon dere na ndị Ḳraịst nke nạrị afọ mbụ “jụrụ ikere òkè ọ bụla pụtara ìhè n’ọchịchị obodo ma ọ bụ n’ọrụ agha nke nchebe mba,” na “ọ bụkwa ihe na-ekweghị omume na ndị Kraịst ahụ, n’ajụghị ọrụ nke dị nsọ karị, pụrụ ịnara ọrụ nke ịbụ ndị agha, nke ịbụ ndị ikpe, ma ọ bụ nke ịbụ ndị isi.”
Ya mere, ajụjụ dịnụ abụghị onye nke bụ onye Kraịst nke “ka mma,” kama ọ bụ ma onye ọ bụla nke na-agbaso ụzọ ndụ nke megidere Iso Ụzọ Kraịst oge gboo ọ̀ bụkwa onye Kraịst ma ọlị. Pọl dere, sị: “Ọ bụ ezie na anyị na-ejegharị n’anụ ahụ, ma anyị adịghị ebu agha dị ka anụ ahụ si ebu: (n’ihi na ihe agha nke ibu agha anyị abụghị nke anụ ahụ).”—2 Ndị Kọrint 10:3, 4.