Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 5/15 p. 20-23
  • Ezi Iso Ụzọ Kraịst Na-emeziwanye Ndụ na Sweden

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Iso Ụzọ Kraịst Na-emeziwanye Ndụ na Sweden
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Ihe Ọmụma Bible Na-enye Aka!
  • Mmetụta Na-agbasa Agbasa
  • Ịgba Àmà n’Ụlọ Akwụkwọ
  • Ịlụ Ọgụ maka Nnwere Onwe nke Okpukpe
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 5/15 p. 20-23

Ezi Iso Ụzọ Kraịst Na-emeziwanye Ndụ na Sweden

SWEDEN na-enye ndị bi n’ime ya ọnọdụ ịdị ndụ nke so ná ndị kasị dịrị elu n’ụwa nile. Tụkwasị n’ihe oriri na ụlọ obibi zuru ezu, moto, ụgbọ mmiri ndị e ji eme ntụrụ ndụ, telivishọn, na ígwè kọmpụta ndị mmadụ nwere n’onwe ha, ndị bi na Sweden na-enweta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nlekọta ahụ ike n’akwụghị ụgwọ ọ bụla, ego a na-akwụ ndị meworo agadi na ndị nwere ọrụsị, ego a na-enye maka ụmụntakịrị ndị a mụrụ, na nlekọta ndị ọzọ gọọmenti na-akwado.

Otú a, ị pụrụ ikwubi na ọ dịghị onye pụrụ imeziwanye ụdị ndụ a na-adị n’ala dị otú ahụ. Ma, n’agbanyeghị uru ihe onwunwe ya nile, Sweden nwekwara òkè ya nke ihe isi ike: ịgba alụkwaghịm, ịṅụbiga mmanya ókè, iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, imempụ, na ndị mmadụ igbu onwe ha. Okpukpe, bụ́ nke a pụrụ ịtụworị anya na ọ ga-enwe mmetụta sịrị ike n’àgwà ụmụ mmadụ, fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nwụrụ anwụ kpam kpam na Sweden. Ihe karịrị 90 pasenti nke ụmụ amaala mba ahụ bụ ndị òtù Lutheran State Church, ma ọ bụ nanị 2.1 pasenti na-agachi nnọkọ ofufe anya. Otu onye ụkọchukwu kwuru, sị: “Chọọchị alawo ezumike nká. . . . O nwekwaghị ike ahụ dị mkpa, ọ gbakụtawokwa mkpa ndị mmadụ azụ.”

Otú ọ dị, ọdịda nke chọọchị dara n’imeziwanye ndụ na Sweden adịghị ụzọ ọ bụla o si bụrụ na ezi iso ụzọ Kraịst adawo. Ihe dị ka 22,000 Ndịàmà Jehova, ndị nọ na 331 ọgbakọ dị iche iche na-enwe ihe ịga nke ọma n’inyere ụmụ mmadụ aka itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ iji meziwanye ndụ ha. Ọrụ nke a abụwokwa ihe a rịbara ama.

Otu onye nkuzi ihe banyere okpukpe dere n’akwụkwọ akụkọ ndị Pentecostal ahụ zuru mba ahụ ọnụ, bụ́ Dagen (Ụbọchị Ndị A), sị, “Anyị aghaghị ịja Ndịàmà Jehova mma maka ịnụ ọkụ n’obi ha n’izisa ozi ha!” Ihe odide ahụ kwukwara, sị: “Ndịàmà Jehova mejupụtara òtù ahụ nke na-enweta ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị ọhụrụ kwa afọ, nweekwa ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị na-eto eto . . . Anyị kwesịrị ịmụta ihe site n’aka Ndịàmà Jehova!”

N’eziokwu, ndị ahụ dị njikere n’ezie ịmụta ihe site n’aka Ndịàmà Jehova ga-achọpụta otu ihe. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ ụzọ eziokwu nile nke Bible pụrụ isi meziwanye ọnọdụ ndụ ha n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu.

Ihe Ọmụma Bible Na-enye Aka!

Chee echiche banyere otu akwụkwọ ozi alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị n’ebe ahụ natara site n’aka otu nwa agbọghọ nke mụrụ nwa n’alụghị di. O dere, sị: “Achọrọ m ikwupụta obi ekele m maka ezi ndụ nke m nọworo na-ebi eri mgbe m malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ ihe. Enwewo m ụlọ nke anwụrụ ọkụ sịga na-adịghị. Amatawo m mkpa ọ dị ka mụ na nwa m nwanyị na-anọkọ. Ọnọdụ m adịwanyewo mma n’ihe banyere ego, ọ bụ ezie na aka m na-erite otu ụgwọ ọnwa ahụ. Nsogbu ihi ụra m na-enwe ebelatawo. Enwekwara m ezi ndị enyi ndị m ga-enwe obi ụtọ n’ihi ha. Ee, agaghị m ekwe iji ụdị ndụ m na-adị ugbu a gbanwere nke ahụ m na-adị na mbụ.”

Ihe atụ ọzọ metụtara okwu banyere ịgba alụkwaghịm—bụ́ nke jupụtara ebe nile na Sweden. Otú ọ dị, Bible nyeere otu di na nwunye aha ha bụ Arne na Ketie aka. Ha alụwo di na nwunye ruo 13 afọ, ha nwekwara ụmụ abụọ mgbe enweghị nkwekọrịta mere ka ha gbaa alụkwaghịm. Ha kpọrịtara ibe ha asị.

Arne, bụ́ onye kwapụrụ wee jee biri nanị ya, zutere Ndịàmà Jehova, wee malite ịmụ Bible. Ihe ọ na-amụta kpaliri ya nke ukwuu nke na ọ gbaara ọsọ otu ụbọchị jee n’ụlọ Ketie wee nwaa ịmanye ya na ụmụntakịrị ndị ahụ ka ha malitekwuo ọmụmụ ihe! Mgbe nwanyị ahụ jụrụ, o nuru ya aka o wee daa n’ahụ ụlọ ahụ, o wee sị: “Mụọ ihe, ma ọ bụghị otú ahụ m ga-egbu gị!” Ketie kpọrọ Ndịàmà Jehova wee mee mkpesa, na-asị: “Ụdị Chineke obi ọjọọ dị aṅaa ka Jehova bụ?”

E ji ndidi gwa Ketie na Jehova bụ Chineke nke na-ahụ n’anya, nke na-adịghị amanye onye ọ bụla amanye. A kpaliri mmasị ya, o wee chọọ ịmụtakwu ihe. Ka Arne na-amụtakwu ihe banyere ụkpụrụ nile nke Chineke, obi dajụrụ ya o wee maliteghachi ikwunyere Ketie okwu. Ha na-ahụrịta onwe ha mgbe mgbe ná nzukọ ndị a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Gịnị sị na nke a pụta? Mgbe ha abụọ ghọsịrị Ndịàmà meworo baptism, ha lụghachiri di na nwunye! Ha alụwo di na nwunye ruo afọ asatọ ugbu a, Arne na-ejekwa ozi dị ka okenye ọgbakọ. Ha na-asị, “Alụmdi na nwunye anyị adịbeghị mgbe ọ bụla ọ dị mma karịa otú ọ dị ugbu a. Anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-ekele Jehova banyere ha.”

Eziokwu Bible na-enyekwara ndị na-eto eto aka imeziwanye ndụ ha. Otu nwa okorobịa aha ya bụ David kọrọ, sị: “Ndị mụrụ m agbawo alụkwaghịm, o yikwara ka ihe nile adịghị agazi agazi ná ndụ m. Ọ dịghị ihe ọ bụla m nwere mmasị na ya. Ana m ahapụ ụlọ akwụkwọ ọtụtụ mgbe, n’ime afọ atọ gara aga, emebeghịkwa m ihe omume ọ bụla e nyere anyị n’ụlọ akwụkwọ, bụ́ nke anyị ga-eme n’ụlọ. Mgbe ụfọdụ, ana m ahụ ndụ ọbụna dị ka ihe a na-ekwesịghị ịdị adị. Ana m eyi uwe jeans dọkasịrị adọkasị na akpụkpọ ụkwụ ochie. Ahapụrụ m agịrị isi m ka o too ogologo wee wụsara n’azụ m. Anwalere m ụdị ndụ dị iche iche, dị ka nke ndị na-eti egwú punk rock na nke hard rock. Esere m sịga, ṅụọ mmanya, tinyekwa aka n’imempụ.

“Na 1986, otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara ileta m. ‘Nke a bụ otu n’ime ndị okpukpe ahụ na-amaghị nke bụ nke,’ ka m chere. ‘Ka m jụọ ya ajụjụ ụfọdụ ndị ọ na-agaghị enwe ike ịza.’ N’ịbụrụ m ihe ijuanya, ọ zara ha. Esooro m ya jee otu n’ime ọmụmụ Bible ndị ọ na-enwe, wee chọpụta na o nwere azịza ezi uche dị n’ime ya nye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ajụjụ nile—na e nweghị oghere ọ bụla dị n’eziokwu ahụ. Ejere m otu mgbakọ, ọ bụkwaara m ihe ịtụnanya ịhụ ndị ahụ dị ọcha n’anya, ndị nwekwara omume enyi. Amalitere m ije nzukọ nile nke Ndịàmà Jehova, ọ tụkwara m n’anya mgbe ọtụtụ ndị na-abịakwute m, na-ekwe m n’aka. Lee nnọọ ụdị ịdị n’otu dị n’etiti ndị a!”

Mgbe otu afọ na ọkara gasịrị, David mere baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. O siiri ndị ikwu ya, ndị bụbu ndị enyi ya, ndị nkuzi ya, na ndị ọzọ, ike ikwere na nwa okorobịa nke a jikwara onwe ya nke ọma bụ David ahụ ha maara na mbụ.

Mmetụta Na-agbasa Agbasa

Mgbe ụfọdụ, ọrụ nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ na Sweden na-abụ ihe na-akụda mmụọ. Ndị Sweden na-eji ịnụ ọkụ n’obi echebe ihe dịịrị ha. Mgbe ha nụrụ ụda mgbịrịgba ọnụ ụzọ, ha pụrụ isi n’oghere e si elepụ anya wee lepụta anya, ọtụtụ ndị anaghị emeghekwara Ndịàmà Jehova ọnụ ụzọ ha. Ma ha adịghị ada mbà n’obi. Ndịàmà ahụ maara na ndị mmụọ ozi pụrụ ịchọta ndị nwere ọchịchọ ezi omume. (Mkpughe 14:6; tụlee Matiu 13:41.) Ozugbo eziokwu ahụ banyere ná ndụ nke ndị dị otú ahụ, ọ na-agbasakarị—dị ka ebili mmiri nta na-agbasa n’elu mmiri mgbe a tụnyere nkume na mmiri—nye ndị ikwu na ndị enyi.

Otu nwanyị bi na Stockholm chetara otu mgbe o nọ na table dị n’ime kichin ya na-akwa ákwá n’ihi ọnọdụ ọjọọ nke ndụ ya. Ọ sịrị, “Amaghị m ihe m ga-eme eme. Na mberede, amalitere m ikpe ekpere: ‘Chineke, achọrọ m ka mụ na gị kwurịta okwu banyere ndụ.’ Anụrụ m ụda mgbịrịgba ọnụ ụzọ. Esi m n’oghere nlepụ anya lepụ anya, ahụru m otu nwoke jikere nke ọma, ya mere emeghere m ụzọ. O kwuru na ya chọrọ ka anyị tụlerịta echiche ụfọdụ na-agba ume site n’Okwu Chineke. Ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ajụrụ m ya ma ò jewo na nke ndị ọzọ bi n’ụlọ ahụ. ‘Ee e,’ ka ọ sịrị, ‘Anọ m na-alaghachi n’ụlọ m site n’ebe m jere duzie ọmụmụ Bible mgbe m kpebiri ka m kpọtụrụ mmadụ ụfọdụ. Ọ dabara nnọọ na ọ bụ ebe a ka m malitere.’ Nke a tụrụ m n’anya nke ukwuu n’ihi na okpukpu ụlọ nke m bi na ya dị nnọọ elu. Ihe ndị o gosiri m masịrị m.”

N’oge na-adịghị anya, nwanyị a malitere ịmụ Bible. O ji ịnụ ọkụ n’obi malite iso ndị ikwu ya na ndị enyi ya kerịta ihe ndị ọ na-amụta. O kesara 28 Bible na 96 akwụkwọ ukwu dị iche iche. Gịnị si na nke a pụta? Di ya, ụmụnne ya ndị nwanyị abụọ, ụmụ nwanne ya nke nwoke na nke nwanyị, di nwanne ya nwanyị, nne na nna ya, nwa nke di ya mụtara site na nwanyị ọ lụburu na mbụ, otu onye ọrụ ibe ya, na otu onye ya na dị ya na-arụkọ ọrụ na nwunye ya, malitere ịmụ Bible n’oge na-adịghị anya wee na-akwadebe maka baptism. Ka ọ dị ugbu a, mmadụ iri na atọ enwewo ohere imeziwanye ndụ ha site n’ojije otu n’ime Ndịàmà Jehova jere n’ụlọ otu onye. Nwanyị a sịrị: “Ime ihe kwekọrọ n’uche Jehova ewetawo ihe dị mma nke ukwuu ná ndụ anyị nke na anyị kwesịrị igbunye ikpere n’ala wee na-ekele ya kwa ụbọchị!”

Ịgba Àmà n’Ụlọ Akwụkwọ

E nwere nsogbu ndị siri ike banyere inye ọzụzụ n’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ dị na Sweden. Ma Ndịàmà na-eto eto egosiwo onwe ha ịbụ ndị na-enwe ezi mmetụta site n’iso ndị nkuzi na ụmụ akwụkwọ ibe ha kerịta eziokwu Bible dị iche iche. Dị ka ihe atụ, Jorgen, bụ́ onye na-eto eto kwuru hoo haa gwa ndị nkuzi na ụmụ klasị ya na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. E nyere ya nsọpụrụ maka nkwupụta okwu na ezi àgwà ya. Mgbe nile, Jorgen na-eji olu dị nwayọọ na-aza ọbụna ajụjụ ndị na-akpasu iwe, na-ezokwa aka na Bible. Nke a nwere mmetụta dị omimi n’ebe ụmụ klasị ya nọ. Jorgen kọrọ, sị:

“Otu afọ mgbe m jesịrị ụlọ akwụkwọ, ezutere m Peter, bụbu nwa klasị m. Mgbe mụ na ya nwesịrị mkparịta ụka ụfọdụ, amalitere m iduziri ya ọmụmụ Bible. Ebe nne ya na-emegide ya, anyị na-anọ n’ụsọ oké osimiri i na-amụ ihe. Peter mere baptism na March 1988. Nne ya chọpụtara na nwa ya nwoke agbanwewo gaa n’ọnọdụ ka mma, ya mere, ya onwe ya malitekwara ịmụ ihe. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, o mekwara baptism.

“Otu nwa klasị m ọzọ, bụ́ Torbjorn, malitere ịmụ Bible. Nne ya mekwara otú ahụ. Ha onwe ha emewokwa baptism ugbu a.” Ná ngụkọta, anọ n’ime ndị ha na Jorgen nọrọ na klasị malitere ịmụ Bible, onye nke ise egosiwokwa mmasị. Jorgen kwubiri, sị, “Enwere m olileanya na ahụmahụ nke a ga-agba ndị na-eto eto nọ n’ụlọ akwụkwọ ume ka ha ghara ịla azụ. Àgwà ndị Kraịst na nguzosi ike ha n’akụkụ eziokwu ahụ pụrụ ịkụnye ihe ndị pụrụ ịmịpụta ezi mkpụrụ mgbe oge ụfọdụ gasịrị.”

Ịlụ Ọgụ maka Nnwere Onwe nke Okpukpe

Ndịàmà Jehova emewokwa ihe dị mkpa n’iguzobe ntọala nke nnwere onwe okpukpe na Sweden. Nke a ewetaworo mmadụ nile abamuru.

Dị ka ihe atụ, dị ka ọ dị ná mba ndị ọzọ nile, Ndịàmà Jehova bi na Sweden ekpebiwo n’otu n’otu ịnọgide ná nnọpụiche ndị Kraịst. (Jọn 17:16) N’ihi nke a, a tụrụ ọtụtụ n’ime ha mkpọrọ ogologo oge. Ma, na 1966, e mere ihe pụtara ìhè maka nnwere onwe nke okpukpe mgbe ndị isi ọchịchị kpebiri na, na-adabere ná nnyocha a ga-eme n’okwu metụtara onye ọ bụla n’otu n’otu, a gaghị akpọkwa Ndịàmà Jehova maka ije ozi agha. (Aịsaịa 2:2-4) Otú a ndị Sweden si mee ka okpukpe ọ bụla nwere onwe ya anọwo dị ka ihe nlereanya nye ọchịchị ndị ọzọ.

Okwu ọzọ bụ nke metụtara ihe ruuru ndị ọrịa. Ndịàmà Jehova ji iwu Biblé ahụ bụ ka ha ‘hapụ ọbara’ kpọrọ ihe nke ukwuu, n’ihi ya, ha na-ajụkwa ịnara mmịnye ọbara. (Ọrụ 15:28, 29) Ọ bụ ezie na ọ bụghị ndị dọkịta na ndị ọrụ ahụ ike nile na-asọpụrụ echiche nke a nke dabeere n’Akwụkwọ nsọ, akwụkwọ akụkọ a kasị mara amara n’ihe banyere ọgwụ na ahụ ike na Sweden kpọsara isiokwu nke a n’oge na-adịghị anya gara aga: “E Kwesịrị Ịsọpụrụ Ọjụjụ Onye Ọrịa Jụrụ Ịnara Mmịnye Ọbara Ma Ọ Bụrụ na Ọ Maara Ihe Ga-esi Na Ya Pụta.”

Okwu ndị a bụ isiokwu nke akụkọ banyere otu nzukọ nke Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ maka Ahụ Ike na Ọdịmma na Òtù Na-eleba Anya n’Akparamagwa Ndị Ọrụ Ahụ Ike nke Òtù Sweden Na-ahụ Maka Ahụ Ike mere. Mgbe ha tụlesịrị ọnọdụ Ndịàmà Jehova, ndị a ọnụ na-eru n’okwu kpebiri ịgba ndị dọkịta nile ume ka ha kwenyere mkpebi nke onye ọ bụla ruworo ogo ime mkpebi dị ka iwu si ele ihe anya—site na 15 afọ gbagoo —mere ịjụ ịnara mmịnye ọbara. Ha matara na e nwere ihe mgbochi ka ukwuu ugbu a n’ihe banyere mmịnye ọbara n’ihi ihe ize ndụ nke ibufere ndị ọzọ ọrịa. Otú ọ dị, ihe ka mkpa bụ na mkpebi ha nke a nke gosiri amamihe kwadoro ihe bụ ịsị nke ruuru onye ọrịa ọ bụla ịjụ ịnara ụdị ọgwụgwọ ụfọdụ.

N’eziokwu, ihe ka ọtụtụ ná ndị Sweden na-ebi ndụ dị mma n’ụzọ ihe onwunwe. Ma ọ dị mkpa iwuli ọtụtụ ndị elu n’ụzọ omume na n’ụzọ ime mmụọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ezi ndị Kraịst bi n’ala ahụ na-enye aka n’imeziwanye ndụ nke ndị ahụ nile dị njikere ịmụ Okwu Chineke, tinyekwa ya n’ọrụ. Ndị na-azaghachi n’ụzọ dị mma otú ahụ na-enwekwa ezi olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke nke na-abịanụ.—Jọn 17:3; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4.

[Map dị na peeji nke 22]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

NORWAY

SWEDEN

FINLAND

U.S.S.R

DENMARK

WEST GERMANY

EAST GERMANY

POLAND

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya