Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 5/1 p. 10-13
  • Ịnagide Adịghị Ike M

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịnagide Adịghị Ike M
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Mụrụ Ụmụ ‘Ịkwazi Ọnụ osisi’
  • Ezi Ihe Nlereanya nke Nna M
  • Echiche Ziri Ezi nke Nne M
  • Ịnagide Ịda Mbà n’Obi
  • Ịnagide Nsogbu nke Nwa M Nwoke
  • Mkpa Ọ Dị Iche Echiche Ziri Ezi
  • Obi Ekele Maka Nkwado Jehova nke Na-adịghị Ada Ada
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Gịnị Ka M Nwere Ike Iji Kwụọ Jehova Ụgwọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Inweta Ọṅụ n’Agbanyeghị na M Nwere Nkwarụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 5/1 p. 10-13

Ịnagide Adịghị Ike M

Dị ka Thomas Addison si kọọ

MGBE m bụ obere nwa, nnụnụ na-adịghị emerụ ahụ nọ n’okporo ụzọ ga-eme ka m tụgharịa wee jiri ọsọ gbafuo. Mgbe ndị ikwu ma ọ bụ ndị enyi bịara n’ụlọ, ha ga-ahụ otu nwa na-adịghị ekwu okwu nke na-ezo n’azụ ákwà úkwù nne ya. Ihe m na-emekarị mgbe ndị ọbịa bịara bụ iji ọsọ gbaba n’ime ụlọ ebe anyị na-ehi ụra. Ogbi na-ada m mgbe ọ bụla m nọ n’ihu onye ọ bụla na-achị isi, karịsịa ndị nkuzi ụlọ akwụkwọ.

Gịnị nyeere m aka ime mgbanwe? Olee otú onye na-eto eto dị otú a nke oké ihere na-eme si bụrụ onye nwere ike ịgwa ìgwè mmadụ ruru ọtụtụ puku okwu na mgbakọ ukwu dị iche iche n’oge ndị na-etebeghị anya gara aga?

Ndị Mụrụ Ụmụ ‘Ịkwazi Ọnụ osisi’

Ndị mụrụ m—karịsịa Nna m, onye na-ebughị ibu, bụ́ onye Scotland nke nwere ume—hụrụ m dị ka nwa siri ike ịghọta. N’ịbụ onye nne ya na nna ya nwụnahụrụ mgbe ọ gbara 13 afọ, ọ bụ ezi nkume diamond n’ime ikpo ahịhịa. Ọ mụtara ilekọta onwe ya site ná mgbe ọ bụ nwata. Nne m, n’aka nke ọzọ, bụ ada nke onye ọrụ ubi, bụrụkwa onye dị nnọọ umeala. Ọzụzụ m site na nwata bụ nke obi ọma na nke siri ike, ma ọ bụghị nke onye a zụgburu azụgbu.

Na 1945, mgbe m di afọ isii, apụtara m nke mbụ n’ihu ọha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ihe m ji kwuo okwu m nke mbụ bụ ìhè sitere n’oriọna ji mmanụ kerosene na-enwu n’ime otu ọgbakọ nta dị n’Australia nke nanị ezinụlọ atọ mejupụtara. Nna m nyeere m aka ime nkwadebe n’oge, na-akọwa uru ọ bara ịbụ onye okwu na-aga were were n’ọnụ. O mesikwara ya ike ka m ghara ịtụ egwu ihe ndị ọzọ na-ekwu ma ọ bụ na-eche. Dị ka o si kwuo ya: “Anyị bụ́ ụmụ mmadụ bụ nanị mkpokọba ájá dị iche iche. Mkpokọba ájá ụfọdụ ji nke nta buo ibu karịa ibe ha, o nweghị ihe ọzọ dị na ya.” Ikpere m kụkọtara, ọsụsọ malitere ịgba m n’ọbọ aka, mgbe m kwumikwara okwu ahụ, akpịrị tachịrị m, enweghịkwa m ike ikwucha ya.

Ọ ghaghị ịbụ mgbe m dị ihe dị ka afọ iri ka Nna m kpọpụrụ mụ na nwanne m nwoke nke obere bụ Robert ná nnukwu okporo ụzọ nke obodo ahụ, kpọmkwem n’ihu sịnịma nke e nwere n’ógbè ahụ. Ebe ahụ ka anyị welitere magazin Ụlọ Nche na Teta! elu n’ebe ụmụ akwụkwọ ibe anyị ga-ahụ ha nke ọma. Magazin ndị ahụ nyịrị oké arọ, mgbe ụfọdụkwa ha ga-ada n’ala n’azụ m! N’amaghị ihe m ga-eme, m ga-agbalị ichigharị onwe m gaa n’ọnọdụ a na-apụghị ịhụchazi m anya nke ọma.

Otú ọ dị, ka m na-ahụ nkwuwa okwu nke Nna m nke bụ ihe nlereanya, enwere m agbamume dị ukwuu. Ọ na-ekwu mgbe nile na ịdaghachi azụ bụ inye Setan ohere na ịtụ ụmụ mmadụ egwu. Ule ọzọ bịara n’ụlọ akwụkwọ. Agha Ụwa nke Abụọ etebeghị anya o biri, ịhụ mba n’anya n’Australia ka sikwara ike. Mụ na Ellerie nwanne m nwanyị ga-anọdụ ala n’oge ụmụ akwụkwọ gbakọtara mgbe a na-agụ egwu e ji eto mba. Ọ bụụrụ m ezi ule ịnọpụ iche, ma nnọgide nke ndị mụrụ m nọgidere na-akwado m na agbamume nke ha nọgidere na-enye m nyeere m aka ịghara ịda.

Ezi Ihe Nlereanya nke Nna M

N’ịtụle nzụlite nke Nna m na àgwà ya, o nwere nnọọ ndidi n’ebe m nọ. Ọ malitere ịrụ ọrụ n’ebe a na-egwupụta coal n’England mgbe ọ bụ obere nwa dị afọ iri na atọ. Mgbe ọ gbara iri afọ abụọ na ụma, ọ kwagara Australia iji chọta ọrụ ka mma. Ma ọnọdụ ndakpọ akụ na ụba nke afọ ndị 1930 malitere, ọ nakweere ọrụ n’okpuru ọnọdụ ndị dị njọ iji kpata ihe ezinụlọ ya ga-eri.

Ọnọdụ ihe nile na karịsịa ndọrọ ndọrọ ọchịchị meghere anya Nna m, ya mere mgbe ọ gụrụ akwụkwọ dị iche iche nke Watch Tower Society na mkpughe ha kpughere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na azụmahịa, na ihu abụọ nke okpukpe n’atụghị egwu, o metụrụ ya n’ahụ. O teghị anya mgbe nke a gasịrị o wee rara onwe ya nye Jehova, oge na-adịghị anya mgbe Nne m mesịrị otú ahụ. N’agbanyeghị ịta ahụhụ nke ọrịa akpa ikuku nke mere ya n’ihi ájá ịdagide ya n’ebe a na-egwupụta ihe n’ime ala nakwa enweghị kpọmkwem ọrụ a na-arụ ruo ugbu a, Nna m kpọọrọ ezinụlọ anyị jee ozi n’ebe ndị e nwere mkpa nke ime mmụọ. Ndabere ọ dabeere n’ebe Jehova nọ nwere mmetụta dị omimi n’ebe m nọ.

Dị ka ihe atụ, echetere m mgbe anyị kwafere n’otu obodo nta ebe a na-egwu coal bụ́ ebe ụmụnna nwanyị abụọ meworo okenye bụ nanị Ndịàmà e nwere, ndị di ha abụọ bụcha ndị na-ekweghị ekwe. Inweta ụlọ obibi bụ ihe siri ike, ma n’ikpeazụ anyị nwere ike inweta otu ụlọ ochie nke dị ọtụtụ maịlụ site obodo ahụ. Nanị ịhe anyị nwere maka iji mee njem bụ ụkwụ ma ọ bụ ịnyịnya ígwè. Mgbe ahụ, n’otu ịsị ụtụtụ, mgbe anyị atọ bụ ụmụaka pụrụ gaa na nke ndị enyi anyị, ụlọ ahụ rechapụrụ n’ọkụ. Ndị mụrụ anyị gbapụrụ ná ndụ ma ọ dịghị ihe ọzọ a tụtụtara. Anyị enweghị akwụkwọ inshọransị, ọ dịghịkwa ego dịnụ.

N’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ ya na 1982, Nna m chetara nke a. O kwuru, sị: “Nwa m, ị̀ na-echeta otú ọnọdụ si yie nke na-enweghị olileanya na mbụ, ma Jehova nọnyeere anyị? Leenụ, mgbe ọkụ ọgbụgba ahụ gasịrị, ụmụnna nọ na Perth zitere ngwongwo e ji ebi n’ụlọ, uwe, na ego. N’ihi mmesapụ aka ha, ọnọdụ anyị bịaziri dị mma karịa otú ọ dị tupu ọkụ ọgbụgba ahụ!” Ná mbụ m chere na Nna m na-ekwu banyere ihe a na-ejighị n’aka mgbe ọ na-ekwukarị okwu banyere enyemaka Jehova ná ndụ anyị. Otú ọ dị, ahụmahụ ndị m nwere mgbe mgbe banyere ihe ọ kpọrọ enyemaka nke Chineke ghọrọ ihe buru ibu nke ukwuu nke na ọ dịghị ụzọ ọ bụla ọzọ a pụrụ isi kọwaa ya.

Echiche Ziri Ezi nke Nne M

Otu n’ime oké nsogbu ndị m na-enwe mgbe nile bụ iche echiche n’akụkụ jọrọ njọ nke ndụ. Ọtụtụ mgbe Nne m jụrụ, sị: “N’ihi gịnị ka i ji na-ahụ akụkụ jọrọ njọ nke ndụ mgbe nile?” Ihe nlereanya ya nke ile anya n’akụkụ dị mma bụụrụ m ezi ihe mkpali maka ịnọgide na-etinye mgbalị iji na-eche echiche n’ụzọ dị mma karị.

N’oge na-adịbeghị anya, Nne m kwuru okwu banyere otu ihe mere n’otu obodo nta nke ndị ọrụ ugbo n’oge na-adịghị anya mgbe anyị kwagara ebe ahụ. Otu ihe onye dọkịta e nwere n’ógbè ahụ kwuru tọrọ ya ọchị. O chewo na ndị mụrụ anyị bara ụba mgbe ọ na-ahụ ákwà ha dị ọcha na ejiji ha nke mara mma. Nke bụ eziokwu bụ na ihe mejupụtara ụlọ anyị bụ otu ụlọ ebe a na-akwakọba ihe oriri nke buru ibu, nke e ji akpa ndị a kpara akpa e ji etinye ihe kebisịa. Ike ọkụ eletrik, gas, ma ọ bụ mmiri pọmpụ adịghị. N’otu ụbọchị otu oké ehi nwara isi n’ọnụ ụzọ nke ihu ụlọ mabata. Ị pụrụ iji uche mara ebe m nọ: n’okpuru àkwà!

Nne m kutere mmiri anyị site n’otu olulu mmiri dị 200 yard [200 mịta] site n’ụlọ, na-amakwunye ihe e ji eku mmiri na-aba galọn mmiri anọ n’isi abụọ nke otu osisi ọ tụkwasịrị n’ubu ya. Ọ na-achọkarị ịhụ akụkụ na-atọ ọchị nke ihe ndị na-enye nsogbu, sitekwa na nkwalite dị nta nke Nna m, ọ na-ele ọnọdụ ọ hụla siri ike anya dị ka ihe ịma aka nke a ga-emeri kama ịbụ ihe mgbochi. Ọ na-eme ka ọ pụta ìhè na ọ bụrịị eziokwu na anyị enwechaghị ihe n’ụzọ ihe onwunwe, anyị enwetawo ọtụtụ ngọzi ndị bara uru.

Dị ka ihe atụ, anyị na-eji ọtụtụ ụbọchị nke obi ụtọ na-eme njem irute ókèala dị anya ebe anyị ga-eme nkwusa, na-ebi na mbara èzí nkịtị, na-eji ọkụ e ji osisi fụnwuo na-esi anụ ézì na àkwá, na-abụkwa abụ Alaeze ka anyị na-eme njem. Nna m ga-eji ígwè egwu accordion ya na-etinye ya olu ụtọ. Ee, n’ụzọ ndị a anyị bụ n’ezie ndị bara ọgaranya. N’obodo ukwu ụfọdụ, anyị na-akwụ ụgwọ obere ụlọ nzukọ dị iche iche ma kpọsaa okwu ihu ọha, bụ́ ndị anyị na-ekwu n’ehihie Sunday.

Mgbe ụfọdụ, n’ihi nsogbu ahụ mgbu nke Nna m na-abịaghachi site na mgbe ruo na mgbe ọ dịrị mkpa na nne m ga-arụ ọrụ ego iji nye aka n’ego ọ na-akpata. Ruo ọtụtụ afọ o lekọtara nne ya na nna ya ochie na n’ikpeazụ nna anyị tupu ha anwụọ. O mere nke a n’atamughị ntamu. Ọ bụ ezie na m ka na-enwekwa ịda mbà n’obi site na mgbe ruo na mgbe, na-enwekwa mgbe mgbe echiche nke ịbụ onye na-abaghị uru, ihe nlereanya nke nne m na nkwali ya ndị dị nwayọọ nyere m ọchịchọ nke ịnọgide na-agbalị.

Ịnagide Ịda Mbà n’Obi

Mgbe ọ fọrọ nke nta ka m gbaa iri afọ abụọ, adịghị ike nile nke nwata bụ́ ndị m chere na ha akwụsịwo bịaghachiri n’ụzọ dị njọ. Ajụjụ dị iche iche banyere ndụ nyere m nsogbu. Amalitere m ịjụ, sị: ‘Mmadụ nịle hà nwere ohere hà nhata n’ịmata na ijere Jehova ozi?’ Dị ka ihe atụ, gịnị banyere nwa a mụrụ n’India ma ọ bụ China? N’ezie ohere ya ịmara Jehova ga-abụ nke a kpaara ókè n’ụzọ ka ukwuu karịa nke nwa nwere ihu ọma nke ịbụ onye nne na nna bụ Ndịàmà zụlitere. Nke a yiri ihe ikpe ziri ezi na-adịghị na ya! Ọzọkwa, usoro mkpụrụ ndụ na gburugburu ebe obibi, nke nwata na-enweghị ike ịchịkwa gaje ikere òkè buru ibu. N’ọtụtụ ụzọ, ndụ yiri ihe ikpe ziri ezi na-adịghị na ya. Mụ na ndị mụrụ m jiri ọtụtụ awa rụọ ụka n’ajụjụ ndị dị otú a. Ọdịdị m nyekwara m nsogbu. Ọ dị ọtụtụ ihe m na-enweghị mmasị na ha banyere onwe m.

Ka m na-atụgharị ihe ndị a n’uche, o mere ka m daa mbà n’obi, mgbe ụfọdụ ruo ọtụtụ izu ndị yiri ndị na-adịghị agwụ agwụ. Atara m ahụ. Ọtụtụ mgbe, m chere echiche igbu onwe m na nzuzo. Ọ di ọtụtụ ugbo m nwetara echiche nke afọ ojuju site n’imikpu onwe m n’ebere nke onwe onye. Ahụrụ m onwe m dị ka onye na-ata ahụhụ nke a ghọtahieworo. M malitere ịnọrọ onwe m, n’otu oge kwa, enwere m ahụmahụ nke oké mkpali na-atụ egwu nke bịara na mberede. Ihe nile dị m gburugburu yiri ihe na-eme ná nrọ, dị ka m na-elepụ anya site na windo nke aluluu kpuchitere.

Ihe a merenụ mere ka m mata na imere onwe onye ebere bụ ihe dị ize ndụ n’ezie. N’ekpere nye Jehova, ekpebiri m ime mgbalị siri ike ịghara imere onwe m ebere ọzọ. Amalitere m ịtụkwasị uche n’echiche ndị ziri ezi, ndị dabeere n’Akwụkwọ nsọ. Site na mgbe ahụ gaa n’ihu atụkwasịrị m uche karịa ka m na-eme na mbụ mgbe m na-agụ isiokwu ọ bụla n’ime magazin Ụlọ Nche na Teta! ndị kwuru okwu banyere àgwà onwe onye dị iche iche ndị e ji amata mmadụ, mgbe ahụkwa tinye ha n’ihe mpịakọta. M na-ejikwa nlezianya detuo isi ihe ndị e hotara n’Ozi Alaeze banyere ụzọ a ga-esi soro ndị ọzọ nwee mkparịta ụka.

Mgbaru ọsọ mbụ m bụ ịnwa isoro otu onye nwee mkparịta ụka ogologo oge ruo otú o kwere mee ná nzukọ ọ bụla nke ndị Kraịst. Ná mmalite, mkparịta ụka ọ bụla nke dị otú ahụ dịruru nanị ihe dị ka otu minit. Dị ka ihe si na nke a pụta, ọtụtụ mgbe m na-alọta ụlọ na-enwe echiche nke enweghị olileanya. Otú ọ dị, site n’ịnọgidesi ike, ikike m nke iso ndị ọzọ nwee mkparịta ụka jiri nke nta nke nta nwee ọganihu.

Amalitekwara m ime nnyocha onwe onye nke dị ukwuu n’ajụjụ ndị ahụ na-enye nsogbu m nwere. Ọzọkwa, m tụgharịkwara uche n’ebe nri nke anụ ahụ m dị ma chọpụta na site n’irikwu nri ndị na-enye ihe n’ahụ, echiche na uche m nwere ọganihu. M mesịrị mata na ihe ndị ọzọ pụrụ ịkpali ịda mbà n’obi. Dị ka ihe atụ, mgbe ụfọdụ m na-enwe oké mkpali banyere otu ihe masịrị m nke na m ga-enwe ọ̀tụ́tụ̀ mmetụta dị elu. Nke a n’ezie dubara n’ike ọgwụgwụ, na-arụpụta enweghị ume nakwa ịda mbà nke obi. Azịza ya bụ ịmụta ịnọgide mgbe nile na-enwe mmasị n’ihe ma ọ bụghị inwe oké mkpali. Ọbụna ruo ụbọchị taa, aghaghị m ịnọ na nche.

Nzọụkwụ ọzọ bụ ijide ihe mgbaru ọsọ ahụ nke ndị mụrụ m dobeworo mgbe nile n’ihu anyị bụ ụmụ ha, ya bụ, ozi oge nile. Mkpebi nwanne m nwanyị mere ijigidesi ihe ùgwù nke a nke ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ ruo ihe karịrị 35 afọ na-anọgide na-abụrụ m ihe nkwali bara uru.

Ịnagide Nsogbu nke Nwa M Nwoke

Mgbe afọ ụfọdụ gasịrị dị ka onye ọsụ ụzọ nke na-ejighị nwanyị, alụrụ m onye ọsụ ụzọ ibe m, bụ́ Josefa. Ọ bụworo m ezi onye inyeaka n’ụzọ nile. Ka oge na-aga, anyị mụtara ụmụ atọ. A mụrụ Craig, bụ nke kasị okenye na 1972, o wee buru oké nsogbu ụbụrụ nke na-akpata ahụ nkụnwụ pụta. Nsogbu ya abụwo ezi ihe ịma aka, ebe ọ na-enweghị ike imere onwe ya ihe ọ bụla e wezụga iji ngaji kpagharịa nri ya. N’ezie, anyị hụrụ ya n’anya nke ukwuu, ya mere m mere ihe nile iji nyere ya aka ịghara ịdaberekarị n’ebe mmadụ nọ. Emeere m ya ọtụtụ ihe ndị na-enye aka ịga ije. Anyị kpọtụụrụ ọtụtụ ndị ọkà ma e nwechaghị ihe ịga nke ọma. O mewo ka m mata na ọnọdụ ụfọdụ ná ndụ nke a aghaghị ịbụ ndị a nakweere.

N’ime 12 afọ nke mbụ ná ndụ ya, Craig ga-akwụsị iri ihe na ịṅụ mmiri na mberede. Ihe na-esochi nke a bụ ịgbọ agbọ n’enweghị ihe a na-agbọpụta. E chere na ihe kpatara nke a bụ mmebi nke usoro ụbụrụ. Ọ ga-amalite ịchagharị n’ụzọ a pụrụ ịhụ anya n’ihu anyị. Ekpere nyeere anyị aka ịnagide ya, ọgwụ ndị a tụụrụ anyị aro ha enyewokwara anyị aka ịlụso nsogbu ahụ ọgụ. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, o yiri ka Craig na-enwetaghachi onwe ya ọsọ ọsọ, ọ ga-ewerekwa ọchị ya na-adọrọ mmasị na usoro abụ ya na-adịghị agwụ agwụ mee anyị obi ụtọ ọzọ.

Na mbụ ọ bụụrụ Josefa ihe siri oké ike ime mgbanwe n’ebe ọnọdụ nke a na-agbawa obi dị. Ịhụnanya na ndidi o nwere n’ilekọta mkpa ọ bụla nke Craig mesịrị merie. Nke a pụtara na anyị enwewo ike ịnọgịde na-aga ebe ọ bụla e nwere mkpa ka ukwuu maka enyemaka ndị Kraịst. Site na nkwado na enyemaka bara uru nke Josefa, enwewo m ike ịrụ ọrụ nwa oge ruo ọtụtụ afọ, nke na-enyere m aka ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ma na-akwadokwa ezinụlọ anyị.

Mkpa Ọ Dị Iche Echiche Ziri Ezi

Mgbe Craig nwere ịda mbà n’obi n’ihi ịrịakarị ọrịa ma ọ bụ ike ọgwụgwụ n’ihi adịghị ike ya dị iche iche, anyị na-eji otu n’ime akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-amasịkarị m na-agba ya ume: “Anyị onwe anyị abụghị ụdị ndị na-ala azụ.” (Ndị Hibru 10:39, NW) O bu ya n’isi, ọ na-enwekwa mmetụta nke agbamume n’ebe ọ nọ mgbe nile.

Kemgbe Craig bụ nwata, o nwewo ịhụnanya pụrụ iche maka ozi ubi. Site n’iji oche e ji akpụgharị ndị na-adịghị aga ije mee ihe, mgbe mgbe ọ na-enwe ike isonyere anyị. Ọ na-enwe ọṅụ pụrụ iche isonyere anyị mgbe anyị na-elekọta ọgbakọ ndị ọzọ n’ọrụ sekit inyeaka site n’oge ruo n’oge. Azịza dị mkpirikpi ọ na-aza n’ọmụmụ ihe ógbè na okwu ọ na-ekwu mgbe nile banyere akụkọ dị iche iche nke Bible n’ụlọ akwụkwọ pụrụ iche ndị o jere, rụrụ ọrụ anyị bụ ndị na-enweghị nkwarụ na-arụghị. Otú a, Craig echetaworo m na n’agbanyeghị adịghị ike di iche iche anyị nwere, Jehova pụrụ iji anyị mee ihe ime ka a mara uche ya na nzube ya.

N’oge gara aga enwere m ihe ùgwù nke izi ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. Mgbe m nọsịworo afọ ndị a nile n’ije ozi a, ahụ ka makwara m jijiji ná mmalite. Ma n’oge na-adịghị anya, site n’ịdabere na Jehova, ahụ ịma jijiji m kwụsịlatara, ọzọkwa m nwere mmetụta nke ike enyemaka Jehova.

Ileghachi anya azụ ihe dị ka 50 afọ ná ndụ ugbu a, o dowo m anya na ọ bụ nanị Jehova pụrụ iji ịhụnanya zụọ onye dị ka m, na-eme ya ka ọ bụrụ mmadụ nke ime mmụọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya