Mgbe Ọnwụ Gburu Onye Anyị Hụrụ n’Anya
“NA 1981 nne m nwụrụ n’ihi ọrịa “cancer.” Ọ bụ nwunye nna m. Ọnwụ ya siiri mụ na nwanne m nwoke otu nne na-ejighị mụ na ya ike ịnakwere. Agbara m 17 afọ, nwanne m nwoke dịkwa 11 afọ. Ọnwụ nne m metụtara m nke ukwuu. A zụlitere m dị’ ka onye Katọlik, otú ọ dị, dịkwa ka onye e ziworo ihe na ọ gawo eluigwe, achọrọ m igbu onwe m iji wee ga nọnyere ya. Ọ bụ enyi kachasị’ mma m nwere.”—Roberta, onye gbara 25 afọ.
Ì nwewo ahụmahụ yiri nke a? Ọ bụrụ otú ahụ, i nwewo ahụmahụ nke ihe mgbu na-esote ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya. O yiri nnọọ ka ọ bụ oké mmegbu na ọnwụ pụrụ inwe ike ịnapụ gị onye ị hụrụ n’anya. Mgbe o mekwara, echiche nke enwekwaghị ike gị na onye ahụ ị hụrụ n’anya ịdị na-ekwurịta okwu, na-achịkọrịta ọchị, ma ọ bụ ijide ya aka pụrụ ịbụ ihe siri oké ike ịnakwere. Dịkwa ka okwu ndị Roberta kwuru na-egosipụta, a dịghị
ehichapụ ihe mgbu ahụ site n’ịbụ onye a gwara na onye ị hụrụ n’anya nọ n’eluigwe.
Otú ọ dị, olee otú ị ga-esi nwee mmetụta ma ọ bụrụ na ị mara na ọ bụ ihe ga-ekwe mee gị na onye ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ịbụ ndị e jikọtara n’ọdịnihu dị nso, ee e, ọ bụghị n’eluigwe kama n’elu ala ebe a kpọmkwem, n’ọnọdụ udo na ezi omume? Oleekwa ma ọ bụrụ na ị mụtakwuru na n’oge ahụ ụmụ mmadụ ga-enwe olileanya nke inwe ọnọdụ ahụ ike zuru okè na ọ dịghịkwa mgbe ha ga-anwụ anwụ ọzọ? ‘Nke a bụ nnọọ ịmụ anya na-arọ nrọ!’ ka ị pụrụ ikwu.
Ma, laa azụ na narị afọ mbụ O.A., Jisọs Kraịst kwuru hoo haa, sị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na m, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” (Jọn 11:25) Nke ahụ bụ nkwa e kwere na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ọzọ—olileanya na-akpali akpali n’ezie!
Otú ọ dị, eleghị anya, ị na-atụgharị n’uche, sị: ‘È nwere ihe ndabere siri ike a ga-eji kwenye ná nkwa dị otú ahụ? Olee otú m pụrụ isi jide n’aka na ọ bụghị nnọọ ịmụ anya na-arọ nrọ? Ọ bụrụkwa na e nwere ihe ndabere a ga-eji kwenye na ya, olee ihe mmezu nke nkwa nke a ga-apụtara mụ onwe m na ndị m hụrụ n’anya?’ Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a na ndị ọzọ.