Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 4/15 p. 32
  • ‘Ọzụzụ Bụ Isi Banyere Omume’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ọzụzụ Bụ Isi Banyere Omume’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 4/15 p. 32

‘Ọzụzụ Bụ Isi Banyere Omume’

Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na anọ si Nigeria, West Africa, nwere ekele maka ịnata ọzụzụ dị mma site n’akwụkwọ ahụ bụ Ibu Nwa-okoro Na Abọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya. O dere, sị:

“Akwụkwọ nke a bụ aka ọrụ mara mma nke ukwuu, nke na-enye aka, na-ekwukwa eziokwu. Ọ ga-enyere onye ọ bụla nwere mmasị inweta ezi nduzi aka nke ukwuu, bụ́ onye chọrọ ịgabiga omume mmehie ndị ahụ jupụtara ná ndụ.

“Egosiwo m ụmụ akwụkwọ ibe m na ndị agbata obi m akwụkwọ nke a. Onye ọ bụla gụrụ ya na-ekwu okwu ọma banyere ihe osise unu ‘ndị na-ewulite ihe ọmụma’ na isiokwu ndị a tụlere n’akwụkwọ ahụ. Echiche anyị bụ na ọ bụghị nanị na eziokwu ndị dị n’akwụkwọ ahụ ga-enye ihe ọmụma ndị dị mkpa banyere ụkpụrụ akparamagwa, kama ha pụkwara inye ndị na-eto eto na ndị okenye ezi nduzi, bụ́ ndị chọrọ inweta ezi udo nke uche na ahụ ike, ndị chọrọ igosipụta ezi njide onwe onye, gosikwa inwe ike ịkwado ihe ziri ezi. . . .

“Karịsịa ihe nile, akwụkwọ a zuru nnoọ ezu, jupụtakwa n’ọzụzụ ndị bụ isi banyere omume mmekọahụ, nke a na-apụghị inweta site n’aka ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ na ndị nkụzi . . . Ọ ga-amasị m nnọọ ma a sị na e mee ka e jiri akwụkwọ ahụ na-ezi ihe kwa ụbochị n’ụlọ akwụkwọ dị iche iche, na-enwe olileanya nke iguzobe ụzọ ndụ dị n’udo karị, nwee ịhụnanya karị, na-amịpụtakwa ezi mkpụrụ karị, baakwa uru karị.”

Akwụkwọ Ibu Nwa-okoro Na Aḅọgho-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya na-aza ajụjụ ndị dị ka, N’ihi gịnị ka ndị na-eto eto kwesịrị iji mụọ ihe n’ụlọ akwụkwọ? Olee ụzọ ha kwesịrị isi lee ndị mụrụ ha anya? Hà kwesịrị itinye aka ná mmekọahụ tupu ha alụọ di na nwunye? Hà kwesịrị ịṅụ ihe ọṅụnụ na-aba n’anya? Nata akwụkwọ nke a nanị n’ọnụ ego ₦5 site n’idejupụta ma zite mpempe akwụkwọ nke a.

Biko ziterenụ m, n’anaghị m ego nzite ya, akwụkwọ ahụ e kwesiri mkpo ya ike, nke nwere 192 peji, bụ́

Ibu Nwa-okoro Na Aḅọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya. Etinyere m ₦5. (Ụtụ ego ya pụrụ igbanwe.)

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya