Ịghọta Ihe Dị n’Akụkọ
Ọchịchọ Onwe Onye
N’oge na-adịghị anya mgbe ọ malitesịrị ịchị na 1933, onye ndú ndị Nazi bụ Adolf Hitler na Chọọchị Katọlik banyere ná nkwekọrịta. Nkwekọrịta nke a nyere Hitler ike ime mkpebi ikpeazụ banyere nhọpụta nke ndị bishọp nke Germany iji gbanwere ihe ùgwù ụfọdụ ndị e nyere chọọchị. Ma ole nke n’akụkụ abụọ ndị ahụ gaje irite uru kachasịnụ? Otu akwụkwọ encyclopedia ọhụrụ nke ndị Katọlik, bụ nke e bipụtara na France na-aza aịụịụ nke a n’ụzọ kwụ ọtọ.
“Pope Pius nke Iri na Otu n’onwe ya . . . tụlere ya dị ka ihe dị oké mkpa, ịhụ na nchekwa nke chọọchị nke Germany bụ ihe e ji n’aka site n’itinye aka ná nkwekọrịta. E mere nkwekọrịta nke a n’agbata ọnwa April na July 1933. Ọ bụ ezie na ná mmalite, nkwekọrịta nke a dịrị Chọọchị Katọlik mma n’ahụ, o wetaara Hitler ihe ịga nke ọma n’ezie ebe o mere ka ọchịchị ya bụrụ nke a ma ama. Ọzọkwa, ebe Hitler nọ na-emebi ya mgbe nile, e boro popu ebubo nke ime ka akọ na uche ndị Katọlik bụrụ nke na-adịghị arụ ọrụ na ime ka ndị bishọp ghara inwe ike site n’iji nzuzu banye n’ime nkwekọrịta.”
Taa, karịsịa n’ime France na Germany, a na-akatọ Chọọchị Katọlik n’ihu ọha n’ihi nkwenye nke ndị ndú ya kwenyeere ọchịchị nke Nazi. Nsogbu ndị a na-apụta mgbe ndị ndú chọọchị dara mba n’ige ntị n’okwu ndị ahụ na ihe atụ ndị ahụ nke Jisọs Kraịst, bụ onye kwuru banyere ezi ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị ka mụ onwe m na-abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:16, NW) N’eziokwu, nkwenye ndị dị otú ahụ site n’aka ndị ndú chọọchị e wetaworo ha ihu ọma nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma gịnị ka nke a meworo mmekọrịta nke ha na Chineke? Mgbe ọ na-edegara ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, onye na-eso ụzọ Jisọs bụ Jemes dọrọ aka ná ntị, sị: “ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onyeiro nke Chineke.” —Jemes 4:4.
Ndị Dara Okwe Lottery Ha
Ohere inwe ihe ịga nke ọma n’ịgbata okwe lottery gị bụ 1 n’ihe dị ka 14 nde ọ bụla. Ma, oge nile ọtụtụ nde mmadụ na-agba okwe lottery nke gọọmenti kwadoro, ka akwụkwọ akụkọ ndị Canada bụ The Globe and Mail, na-akọ. Nchọpụta na-egosi na ọ dịghị ihe na-adọrọ mmasị mmadụ gaa n’ịgba okwe lottery karịa olileanya ahụ e nwere nke irite nnukwute ego, nke ime mkpọsa ngwa ahịa na-elekwasị anya “n’ihe nrite na oké ihe ndị ga-efunahụ onye na-azụtaghị tiketi,” na-eme ka o siwanye ike mgbe nile. Ebe ihe ebu n’obi na-mebe okwe lottery bụ iji nweta uru ahịa na iwepụta mmadụ ole na ole nwere ihe nrite, ndị na-akwado ya na-akpọsa ya kwa ụbọchị “n’olileanya nke inwe ndị ọ ga-amata ahụ ịnọgide na-azụ.”
Nke a ọ na-enwe isi? Ee! Mgbe ọ na-ekwụ na magazin bụ American Health banyere ịba ụba nke ịgba chaa chaa n’etiti ndị ka na-eto etọ, Dr. Durand Jacobs na-ezo aka n’ebe ịgba okwe lottery dị dị ka ihe na-eduru ha gaa n’ịgba chaa chaa “n’ihi na ha dị ọnụ ala, dịrịkwa mfe inweta, bụrụkwa nke a na-akwalite dị ka ihe dị mma.” O kwukwara, sị: “Okwe lottery bụ Onye Nrafu nke na-eduba ndị na-eto eto n’ime ụdị àgwà ndị ọzọ dị njọ nke igba chaa chaa.” Otu onye Canada ọnụ na-eru n’okwu n’ihe banyere ịgba chaa chaa iri mmadu ahụ na-ekwu, sị: “Onye ọ bụla nke ga-achọ ịgwa gị na ịgba okwe lottery abụghị ịgba chaa chaa na-akpa àgwà dị ka onye nzuzu ma ọ bụkwanụ na ọ bụ onye nzuzu . . . A na-emefu ọtụtụ narị nde dollar n’ịgba okwe lottery n’olileanya nke irite ihe. Ọ bụ ịgba chaa chaa.”
Igba okwe lottery na-akwalite ịhụnanya nke ego. Dr. Marvin Steinberg, bụ onyeisi oche nke òtù Connecticut Council on Compulsive Gambling (Ụlọ ọrụ kansụl na-ahụ maka ịgba chaa chaa iri mmadụ ahụ), kwuru na ndị na-eto eto ndị na-agba chaa chaa bụ ndị isi ike jịiri ego nri ehihie ha mee ihe, zuuru ego, na ọbụna zuuru ihe ebe a na-akwasa ngwa ahịa n’ụlọ ahịa iji kwadoo àgwà ha nke ịgba chaa chaa. N’ezie, okwu ndị ahụ nke Pọl onyeozi bụ eziokwu: “ịhu ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike . . . ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.”—1 Timoti 6:9, 10.