Sierra Leone—Igwupụta Nkume “Diamond” Ya Ndị Kasị Dị Òkè Ọnụ Ahịa
N’AFỌ 1462, otu igwè ndị ụgbọ mmiri Portugal egwu na-adịghị atụ tinyere isi n’ụsọ oké osimiri nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa ruo ebe dị 550 maịlụ [890 kilomita] n’akụkụ ebe ugwu nke akara a na-adịghị ahụ anya nke kewara ụwa ụzọ abụọ bụ́ equator. Egwu nke akụkọ ndị a na-akọ banyere ajọ anụ ndị buru ibu jupụtara ná mmiri ojii a sị na ọ dị n’ebe ndịda nke Morocco emeghị ka ha laghachị azụ. Ọzọkwa, ha anakwereghi nkwenkwe ahụ e nwere ebe nile nke bụ na anwụ na-achasi ike n’ebe dị nso n’akara ahụ a na-adịghị ahụ anya nke kewara ụwa ụzọ abụọ bụ́ equator nke na oké osimiri na-agbọ agbọ.
Dị nnọọ ka ndị njem ụgbọ mmiri ahụ nwere olileanya ya, ụgbọ ha ndị e ji osisi rụọ ereghị ọkụ, ha ahụghịkwa ajọ anụ ukwu ndị ahụ na-epughi isi a kọrọ n’akụkọ. Kama nke ahụ, ha hụrụ ọmarịcha ụsọ osimiri ndị jupụtara n’ájá ọcha, ndị mara mma, nke òkè ugwu ndị na-acha ezịgbo akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ nọ n’azụ ha, nke jupụtara n’òkè ọhịa na-eto nke ọma. Mgbe mmiri ozuzo nke ebe okpomọkụ zokwara, jupụta elu ala nile, àmụ̀mà mmiri jupụtakwa na mbara igwe, égbè eluigwe na-adakwa na-eme ụzụ n’elu oké ugwu ndị ahụ dị ka ụja nke óké anụ ọhịa ụfọdụ. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ndị ịkom ahụ na-eme njem ná mmiri kpọrọ ebe ahụ Sierra Leone—”Ugwu Ọdụm”!
Ka ọtụtụ afọ gafere, ụmụ mmadụ chọpụtara na ịba ụba nke Sierra Leone akwụsịghị n’ịma mma ya. E nwekwara akụ ndị dị n’ịme ala: igwe, bauxite, rutile, chromite, platinum, na ọlaedo. Ma ọ bụ nanị ruo na 1930 ka e mere nchọpụta nke mere ka ụwa azụmahịa rịba obere ala nke a ama. A chọpụtara nkume diamond! A chọpụtara akụ ndị a dị óké ọnụ ahịa n’ebe ọ bara ụba, nke dọtara ọtụtụ puku ndị na-eme nchọpụta ihe dị n’ala. Ụfọdụ atụtụtawo nkume dịamond n’elu ala nkịtị. Otu nwanyị chọtara dịamond buru ibu mgbe ọ na-asa akwa n’ime mmịri. Otu nwoke gwupụtara akụ dị oké ọnụ ahịa nke ọ̀tùtù ịdị arọ ya dị 153 karat mgbe ọ na-akọ jị bekee n’ubi. Otú ọ dị, n’akụkụ ka ukwuu, ịchọta nkume ndị a dị óké ọnụ ahịa achọwo mgbalị dị ukwuu. Dị ka ịhe atụ, nkume diamond ụfọdụ dị n’ebe dị anya n’ime ala, n’ebe otu ụdị nkume a na-akpọ kimberlite na-ekpuchịte ya. Iweta ha na-agụnye igwu ala, ịgbawasị okwute, igweri okwute, na ime nhọchasị. Ọ chọkwara nkà, ịhe ọmụma, na ndịdi.
Ọ bụ ezịe na ọrụ nke igwupụta nkume diamond n’ụzọ dị ukwuu ka nọgịdere na-aga n’ihu ruo taa, ịchọ akụ ndị dị ọnụ ahịa nke dị iche—nkume diamond ime mmụọ nke nwere abamuru dị ukwuu karị—anọgidewo na-aga n’ihu na Sierra Leone kemgbe 1915. N’afọ ahụ, otu nwoke aha ya bụ Alfred Joseph hapụrụ Barbados ma jiri ụgbọ mmiri steamer mee njem gaa n’ala nke a. Ọ malitere ọrụ nke “ịchọpụta akụ ịme ala,” ọ bụghị maka nkume diamond, kama maka ụmụ mmadụ ndị nwere ọchịchọ ife ezi Chineke ahụ ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) E mere nchọpụta nke a n’otu ụzọ ahụ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ si mee ya—’n’ihu ọha mmadụ na n’ụlọ n’ụlọ.’ (Ọrụ 20:20) Mgbe afọ asaa gasịrị, Willịam R. Brown onye sịkwa West Indịes bịara sonyere Alfred Joseph n’ọrụ nke a.
Mgbe ọ na-erule ọgwụgwụ nke 1923, e guzobewo otu ọgbakọ nta n’isi obodo, bụ Freetown. Ọgbakọ ahụ gụnyere 14 ndị ọhụrụ e mere baptịsm. Taa 632 ndị mmadụ n’ịme 30 ọgbakọ dị iche iche na-ekerechị òkè anya n’ọrụ nkwusa ịhu ọha ahụ dị ka Ndịàmà Jehova. Mgbalị ha n’ịchọpụta na igwupụta ịhe a pụrụ ịkpọ nkume dịamond ime mmụọ dị oké ọnụ ahịa nke Sierra Leone anọgidewo na-enwe ihe ịga nke ọma dị ukwuu.
Ndị Na-achọsi Eziokwu Ike
Ụfọdụ ndị ọhụrụ na-eso ụzọ Kraịst egosipụtawo onwe ha ịbụ ndị dị ka nkume diamond ndị dị mfe ịtụtụta n’elu ala nkịtị. Ha agbalisiwo ike ịchọpụta Ndịàmà Jehova. Otu n’ime ndị a bụ otu onye na-edozi agịri isi aha ya bụ Joan. O ji telifonu kpọọ isi ụlọ ọrụ nke Ndịàmà dị na Freetown ma rịọ maka ọmụmụ Bible.
Gịnị kpaliri Joan ịkpọ oku nke a na telifonu? “Apụghị m icheta mgbe ọ bụla ná ndụ m nke m na-adịghị achọ Chineke,” ka ọ na-ekwu. “Kemgbe m bụ nwata, esonyewo m ọtụtụ chọọchị na ìgwè dị iche iche nke okpukpe ma a pụghị m ịchọta afọ ojuju ime mmụọ.
“Ihe dị ka afọ iri gara aga, m bịara mata Ndịàmà, ma na-adịghị ihe kpatara ya ma ọlị, m wulitere echiche ahụ n’ime onwe m na ndị a bụ ndị a ga-ezere n’ụzọ nile ọ bụla. Mgbe otu enyi nke ezinụlọ m ghọrọ Onyeàmà, a tụrụ m ụtụ magazin Ụlọ Nche na Teta!. E mere m ya nanị iji mee ka obi dị ya mma; ọ dịghị mgbe m nyere onwe m nsogbu ịgụ ha. N’ezie, e jiri m ha na-ehicha windo m! Mgbe ahụ otu Teta! bịara nke dọọrọ mmasị m. Isiokwu dị n’elu ya bụ banyere mkpa ịhụnanya dị anyị. [September 22, 1986, (Bekee)] A gụrụ m ya, ọ masịkwara m nke ukwuu. Ọ bụ magazin ahụ kpaliri m ịrịọ maka ọmụmụ Bible.” Joan nwere ọganihu ọsọsọ, n’oge na-adịghịkwa anya ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova e mere baptism.
Onye ọzọ chọpụtaworo eziokwu ahụ bụ otu nwa okorobịa aha ya bụ Manso. Ọ chọburu ịbụ onye ụkọchukwu, ma jeekwa ụlọ akwụkwọ nke ndị ụkọchukwu. Ma mgbe ọ chọpụtara ihu abụọ nke ndị nkuzi ya, ọ kụdara aka ma hapụ ụlọ akwụkwọ ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, Manso malitere ije nzukọ dị iche iche nke okpukpe ndị ọzọ. Otu ụbọchị mgbe ọ na-eje ileta nwa nne nna ya nke nwoke, ọ hụrụ otu akwụkwọ nke Watch Tower Society bipụtara—bụ Is the Bible Really the Word of God? ka ọ tọgbọ n’ime mmiri apịtị. Ebe isịokwu ya masịrị Manso, ọ gụpụtara akwụkwọ ahụ, gbakọọ ya, ma gụọ ya. Ebe a ka ezịokwu ahụ ọ nọ na-achọ dị! Akwụkwọ ahụ gbara ndị na-agụ ya ume ka ha jee nzukọ dị iche iche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ogbe ha. Ya mere Manso gara malite iso Ndịàmà na-amụ Bịble, meekwa baptism n’oge na-adịghị anya. Ọ na-eje ozi ugbu a dị ka onye nkwusa ọsụ ụzọ oge nile!
Ịzaghachi n’Enyemaka E Ji Ndidi Na-enye
Otu ọ dị, ndị ọzọ bụ ndị ọhụrụ na-eso ụzọ egosipụtawo onwe ha ịbụ ndị dị nnọọ ka nkume diamond zoro n’ime ime nkume. Ọ dịwo mkpa ime ezi mgbalị iji “gwupụta” ha. Donald, otu onye Kraịst bụ okenye, na-echetaghachị ndidi o were iji nyere otu nwanyị aha ya bụ Martha aka. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na o kwetara ịmụ ịhe, mgbe nile o mere ka anyị chere ruo ogologo oge tupu a malite ya. Mgbe ụfọdụ ọ ga-elezi anya dote ọrụ ọ gaara arụ tupu mgbe ahụ. Mgbe ahụ ọ gwara anyị ka anyị chere. Gịnị ka ọ rụpụtara? Ka oge na-aga mmasị ya tolitere.
“Nsogbu ọzọ bụ ime ka Martha bịa nzukọ dị iche iche. M kpọọrọ Ndịàmà ndị ọzọ gaa maka ọmụmụ Bible ya ka ọ ga-abụ na ahụ ga-eru ya ala mgbe ọ bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma o gburu oge nke ukwuu nke na mgbe o mesịrị bịa n’ikpeazụ, ọ maara kpọmkwem ndị nịle nọ n’ọgbakọ!” Ndidi kwụghachịri ụgwọ. Martha emewo baptism ugbu a, ọ nọsikwara ike n’ogbakọ.
Ná mbụ, Pius guzogidere ezịokwu ahụ. N’oge di na nwunye bụ ndị ozi ala ọzọ malitere iso ya na-amụ Bible, Pius nọ n’afọ ndụ nke iri asaa na ụma, ọ bụ onye òtù siri ike nke otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ bụkwa ya na-ejidere ndị chọọchị ha ego. “Ọ rụrụ oké ụka n’isiokwu ọ bụla anyị kparịtara ụka banyere ya,” ka ndị ozi ala ọzọ ahụ kwuru. “N’izu ọ bụla ọ na-eji nwayọọ malite, ma ọ na-eji obi dị nwayọọ nwayọọ malite iwe iwe. Ọ bụ ezigbo agha kwa izu, ọtụtụ mgbe ọ na-adịkwa anyị ka anyị chịlie aka elu ma hapụ ya. Otu isi ịhe mere anyị jị na-agaghachị na nke ya bụ n’ihi na mgbe nile ọ na-akwado ihe ọmụmụ ahụ nke ọma.
“Mgbe nke a gara ihe dị ka otu afọ, Pịus kwupụtara na ya e mewo mkpebị ime nchọpụta ụfọdụ n’onwe ya. Ebe ọ bụ onye nkuzi laworo ezumike nká, ọ maara otú e si eme nchọpụta. Kwa ụbọchị ruo ịzu abụọ, ọ rịrị ugwu iru ebe ndebe akwụkwọ nke mahadum, ebe o mikpuru onwe ya n’akwụkwọ dị iche iche ndị na-akọ banyere Bịble na akwụkwọ ọgụgụ ndị na-ezo aka na Bible. O mesịrị kwupụta, sị: ‘O dowo m anya ugbu a na ịhe nile unu nọworo na-agwa m bụ eziokwu. Chineke abụghị Atọ n’Ime Otu, ọ dịghị ọkụ ala mmụọ dịnụ, mkpụrụ obị na-anwụkwa anwụ. O bụna ụfọdụ ndị n’ime chọọchị m na-ekweta na nke a dị otú a.’ Mgbe nke ahụ gasịrị Pius nwere ọganihu ọsọsọ, depụ aha ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa na chọọchị. Mgbe e mesịrị ya baptịsm, o jere ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka, na-etịnye 60 awa n’otu ọnwa n’ọrụ nkwusa ahụ ọtụtụ mgbe, dị ka o nwere ịke ruo oge ọnwụ ya na 1987.
“Otu ihe anyị na-amataghị ruo ogologo oge,” ka ndị ozi ala ọzọ ahụ kuziire Pius ihe chetaghachiri, “bụ na nne ya enwewo mgbe o sonyeere Ndịàmà Jehova. O chetara mgbe ya na ya so na-eje nzukọ dị iche iche mgbe ọ ka bụ nwata. Ma mgbe ọ nwụrụ, ọ gawaara onwe ya. Mgbe o mesịrị baptịsm, Pịus kwuru, sị: ‘Otu ihe m na-akwara arịrị bụ na nne m a pụghị ịhụ m ugbu a.’ Mgbe ahụ ọ mụmụrụ ọnu ọchị, kwuokwa, si: ‘Ma ọ ga-ahụ m n’ime ụwa ọhụrụ!’”
Ruo taa, ọchịchọ nke a na-achọ nkume diamond na ọchịchọ a na-achọ ndị na-eso ụzọ ka nọ na-aga n’ihu. Ihe osise ndị mara mma nke mkpọsa ngwa ahịa na-etu ọnụ na “nkume diamond na-adị ruo ebighị ebi”. Otu o sina dị, onye nwe akụ dị óké ọnụ ahịa dị otú ahụ anaghị ama ụtọ ya ruo mgbe ebighị ebi n’ihi na e wezụga kwa onyinye Chineke nyere maka nzọpụta, ọnwụ bụ ihe nketa nke mmadụ nile bụ ndị mmehie. (Jọn 3:16, 17) Ọrụ nke Ndịàmà Jehova nọ na Sierra Leone si otụ́ a na-eweta akụ dị óké ọnụ ahịa nke nwere abamuru dị ukwuu karịa nkume diamond nkịtị: ndị ohu Chịneke na ndị na-eso ụzọ Jịsọs Kraịst! Okwu Jehova na-ekwe nkwa, sị: “Onye na-eme ịhe Chịneke na-achọ na-anọgịde ruo mgbe ebighi ebi.”—1 Jọn 2:17.
[Map/Foto ndị dị na peeji nke 22, 23]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
[Foto]
N’ime ọnọdụ ndị yiri ndị a, ndị nkwusa Alaeze na-achota nkume “diamond” ime mmụọ na Sierra Leone