Ime Mkpo Akwụkwọ
Onye Na-eto Eto Anyị Hụrụ n’Anya,
Nna gị nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, hụrụ gị n’anya nke ukwuu. Ọ chọrọ ka obi na-adị gị ụtọ. Ma, i nwere ike ịna-eche, sị: ‘N’oge anyị a, obi ò nwere ike ịdị mmadụ ụtọ?’ Ọ bụ ezigbo ajụjụ. A sị ka e kwuwe, ọtụtụ nsogbu na-abịara anyị. Ọ dị ka ihe na-abịara anyị kwa ụbọchị ọ̀ bụ ụdị nsogbu nwere ike ime ka obi ghara ịdị anyị mma mgbe ọ bụla. Ma, Nna anyị hụrụ anyị n’anya ga-enyere anyị aka! Okwu ya ga-eduzi anyị iji mee ka anyị nwee ike imeri nsogbu ndị na-abịara anyị. N’agbanyeghị na e dere Baịbụl ọtụtụ afọ gara aga, ndụmọdụ ndị dị na ya bara ezigbo uru otú ahụ ha bara mgbe e dere ha.—Abụ Ọma 119:98, 99; 2 Timoti 3:16, 17.
Ihe mere anyị ji bipụta akwụkwọ a bụ na anyị hụrụ gị n’anya. Anyị chọrọ ka obi dị gị ụtọ, ka i biekwa ndụ ga-akacha baara gị uru. N’ihi ya, anyị na-agba gị ume ka ị gụchaa akwụkwọ a, ka ị gụọkwa ya mgbe ọ bụla i nwere nsogbu. Otu ihe mere anyị ji dee akwụkwọ a bụ ka o mee ka gị na ndị mụrụ gị na-akparịta ụka nke ọma. Anyị bu n’obi na unu ga na-agụkọ ebe ụfọdụ ọnụ ma ọ bụ na-amụkọ ya ọnụ. Rite uru n’amamihe nne gị na nna gị!
Anyị hụrụ gị n’anya,
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova