Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yp1 p. 2
  • Azịza Ndị Na-adị Irè!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Azịza Ndị Na-adị Irè!
  • Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
yp1 p. 2

OKWU MMALITE

Azịza Ndị Na-adị Irè!

‘Olee otú m ga-esi na-agwa ndị mụrụ m okwu?’ ‘Olee otú m ga-esi emeta ndị enyi?’ ‘Gịnị mere ịkwa iko ji dị njọ?’ ‘Gịnị mere obi ji ajọkarị m njọ?’

Ọ bụrụ na ị jụtụla onwe gị ụdị ajụjụ ndị ahụ, ghọta na ndị ọzọ na-ajụ ha. Ihe a zara gị nwere ike ọ gaghị abụ otu ihe n’ihi na ndị zara ya dị iche iche. Iji nyere ndị na-eto eto aka inweta ezigbo ndụmọdụ ga-abara ha uru, na Jenụwarị 1982, a malitere ibipụta isiokwu ndị si na Baịbụl na magazin bụ́ Teta! A kpọrọ isiokwu ndị ahụ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . . ” N’agbanyeghị na ọtụtụ afọ agaala kemgbe ahụ, isiokwu ndị ahụ ka na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ. A na-eme nchọnchọ nke ọma tupu e bipụta nke ọ bụla. N’eziokwu, ndị na-ede Teta! gbara ọtụtụ ndị na-eto eto bi ná mba dị iche iche ajụjụ ọnụ iji mata ihe ndị na-eto eto na-eche na otú obi na-adị ha! Ma, ihe kacha mkpa bụ na ndụmọdụ ndị a na-ede n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” si n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl.

Mgbe mbụ e bipụtara akwụkwọ a bụ n’afọ 1989. Ma, e degharịrị isiokwu ndị dị na ya iji lebara ihe ndị na-eme n’oge anyị a anya. Ebe e si nweta ihe karịrị isiokwu iri atọ n’ime ha bụ ụfọdụ ihe e dere n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị,” bụ́ ndị gbara na Teta! malite n’afọ 2004 ruo 2011.

Akwụkwọ a bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1, ga-enyere gị aka ịmata ihe ndị ị ga-eme iji na-akpa àgwà ọma ma i too. Anyị bu n’obi na i mee ihe ị mụtara n’akwụkwọ a, ị ga-eso n’ọtụtụ nde mmadụ, ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto, bụ́ “ndị zụworo ikike nghọta ha azụ, site n’iji ya eme ihe, ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.”​—Ndị Hibru 5:14.

Ndị Bipụtara Ya

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya