Ị̀ Chọrọ Ịmụtakwu Banyere Baịbụl?
N’akwụkwọ a, a chịkọtara ihe na-enye obi ụtọ Baịbụl na-ekwu ka ọ dị mfe ọgụgụ. Ma, ọ bụghị ihe niile Baịbụl na-akụzi ka a kọwara n’akwụkwọ a.
Dị ka ihe atụ, ị̀ chọrọ ịma otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị dị ka: Chineke ọ̀ na-eche banyere m? Gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ? Olee otú m nwere ike isi nweta obi ụtọ ná ndụ?
Akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, zara ajụjụ ndị a na ajụjụ ndị ọzọ nwere ike ịgbagwoju gị anya. E ji akwụkwọ ahụ amụ isiokwu ndị dị na Baịbụl otu otu. Ụdị ọmụmụ ihe ahụ ga-enyere mmadụ aka ịchọta amaokwu Baịbụl ndị kọwara otu isiokwu. I nwere ike inweta akwụkwọ ahụ n’aka Ndịàmà Jehova bi n’ebe unu bi. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka mmadụ bịa n’ụlọ gị, dejupụta akụkụ e nwere ike ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma jiri adres kwesịrị ekwesị e depụtara n’okpuru zitere anyị ya.
□ Biko, wetara m akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
□ Biko, bịanụ n’ụlọ m kụziere m Baịbụl n’efu.