Ihe Baịbụl Na-ekwu
NCHỊKỌTA
1 Jehova kere Adam na Iv ka ha dị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs. Setan kwutọrọ aha Chineke ma kwuo na ọchịchị ya ezighị ezi. Adam na Iv sooro Setan nupụ isi, wetara onwe ha na ụmụ ha mmehie na ọnwụ
2 Jehova mara ndị nnupụisi ahụ ikpe ọnwụ ma kwe nkwa na otu Onye Nnapụta, ma ọ bụ Mkpụrụ ga-apụta gwepịa Setan ma mezie ihe niile nnupụisi na mmehie ahụ mebiri
3 Jehova kwere Ebreham na Devid nkwa na Mkpụrụ ahụ ma ọ bụ Mesaya ga-esi n’agbụrụ ha. Ọ bụ ya ga-achị ruo mgbe ebighị ebi
4 Jehova mere ka ndị amụma buo amụma na Mesaya ahụ ga-akwụsị mmehie na ọnwụ. Ya na ndị ọchịchị ibe ya ga-achị n’Alaeze Chineke, nke ga-akwụsị agha, ọrịa, na ọnwụ
5 Jehova zitere Ọkpara ya bụ́ Jizọs n’ụwa ma kwuo na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ. Jizọs kwusara ozi ọma banyere Alaeze Chineke ma jiri ndụ ya chụọ àjà. Jehova kpọliteziri ya n’ọnwụ, ya aghọọ mmụọ
6 Jehova mere Ọkpara ya Eze n’eluigwe, nke na-egosi na oge ikpeazụ nke usoro ihe a amalitela. Jizọs na-eduzi ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekwusa Alaeze Chineke n’ụwa niile
7 Jehova gwara Ọkpara ya chịwa ụwa. Alaeze ahụ ga-ebibi ọchịchị ọjọọ niile, weta Paradaịs, meekwa ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi zuo okè. A ga-eme ka o doo anya na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị, a ga-edokwa aha ya nsọ ruo mgbe ebighị ebi