Ime Mkpo Akwụkwọ
Ezi Onye Na-agụ Akwụkwọ A:
Eze Sọlọmọn maara ihe dere, sị: “Ṅụrịa ọṅụ, nwa okorobịa, mgbe ị bụ okorobịa, ka obi na-atọkwa gị ụtọ n’oge ị bụ okorobịa, jeekwa ije dị ka ihe dị gị n’obi si dị nakwa dị ka ihe anya gị na-ahụ si dị.” (Ekliziastis 11:9) Ugbu a ị ka na-eto eto, ndụ na-atọ gị ụtọ, anyị chọkwara ka unu bụ́ ndị na-eto eto na-enwe obi ụtọ. Otú ọ dị, anyị na-agba gị ume ka i nwee obi ụtọ ahụ otú ọ ga-adị Jehova Chineke mma. Echefula na ọ na-ahụ ihe i ji ndụ gị na-eme, ọ ga-ekpekwa gị ikpe n’ihi ya. Ya mere, i kwesịrị iso ndụmọdụ a Sọlọmọn nyere, nke bụ́: “Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa.”—Ekliziastis 12:1.
Anyị na-ekpesi ekpere ike ka ihe e kwuru n’akwụkwọ a nyere gị aka imeri nsogbu na ọnwụnwa ndị na-abịara ndị na-eto eto taa, gosikwa gị otú ị ga-esi na-eme mkpebi ndị dabara n’uche Chineke. I mee otú ahụ, ị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova