Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gf ihe ọmụmụ 16 p. 26-27
  • Gosi Ịhụnanya I Nwere n’Ebe Chineke Nọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gosi Ịhụnanya I Nwere n’Ebe Chineke Nọ
  • Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Chineke Hụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Enye Ihe n’Anya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ị Ga-abụli Enyi Jehova
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Chineke Na-Akpọ Gị Òkù Ịghọ Enyi Ya
    Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Jehova Na-ahụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-enye Ihe n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
gf ihe ọmụmụ 16 p. 26-27

IHE ỌMỤMỤ NKE 16

Gosi Ịhụnanya I Nwere n’Ebe Chineke Nọ

Ebe otu nwoke na-ekpe ekpere na-agụkwa Baịbụl

Iji mee ka mmadụ nọgide na-abụ enyi gị, ọ dị gị mkpa iso ya na-ekwurịta okwu. Ị na-ege ya ntị, ọ na-egekwa gị ntị. Ị na-akọkwara ndị ọzọ ihe ọma banyere enyi gị. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ịbụ enyi Chineke. Tụlee ihe Bible na-ekwu banyere nke a:

Na-agwa Jehova okwu mgbe nile n’ekpere. “N’akụkụ ekpere unu, na-anọgidesinụ ike.”—Ndị Rom 12:12.

Na-agụ Okwu Chineke, bụ́ Bible. “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie.”—2 Timoti 3:16.

Kụziere ndị ọzọ banyere Chineke. “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.

Ebe Ndịàmà Jehova abụọ na-ezi otu nwoke ozi ọma

Na-akpa ndị enyi Chineke nso. “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe.”—Ilu 13:20.

Na-aga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; . . . na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike.”—Ndị Hibru 10:24, 25.

Nye aka kwadoo ọrụ Alaeze ahụ. “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.”—2 Ndị Kọrint 9:7.

Ebe Ndịàmà Jehova nọ ná Ụlọ Nzukọ Alaeze ha
    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya