Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gf ihe ọmụmụ 15 p. 24-25
  • Ndị Enyi Chineke Na-Eme Ihe Dị Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Enyi Chineke Na-Eme Ihe Dị Mma
  • Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezinụlọ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Gịnị ka ị ga-eme ka unu na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ unu?
    Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu?
  • Mkpịsị Ugodi Abụọ Na-eduga n’Alụmdi na Nwunye Na-adịgide Adịgide
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ndụ Ezinụlọ nke Na-atọ Chineke Ụtọ
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
gf ihe ọmụmụ 15 p. 24-25

IHE ỌMỤMỤ NKE 15

Ndị Enyi Chineke Na-eme Ihe Dị Mma

Mgbe i nwere enyi ihe ya masịrị gị, onye ị na-akwanyekwara ùgwù, ị na-agbalị ịdị ka ya. Bible na-ekwu na “onye dị mma na onye ziri ezi ka Jehova bụ.” (Abụ Ọma 25:8) Iji bụrụ enyi Chineke, anyị aghaghị ịbụ ndị dị mma na ndị ziri ezi. Bible na-ekwu, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya; na-ejegharịkwanụ n’ịhụnanya.” (Ndị Efesọs 5:1, 2) Lee ụzọ ụfọdụ isi mee nke ahụ:

Ebe ụmụ nwoke abụọ na-arụ ọrụ n’ebe a na-arụ ụlọ

Na-enyere ndị ọzọ aka. “Ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ.”—Ndị Galetia 6:10.

Na-arụsi ọrụ ike. “Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ: kama ka ọ dọgbuo onwe ya n’ọrụ, na-eji aka ya abụọ rụọ ezi ihe.”—Ndị Efesọs 4:28.

Nọgide na-adị ọcha n’anụ ahụ na n’omume. “Ka anyị sachapụ n’onwe anyị mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ, na-emezu ịdị nsọ n’egwu Chineke.”—2 Ndị Kọrint 7:1.

Ebe otu ezinụlọ na-aga iri nri

Na-emeso ndị ezinụlọ gị ihe n’ịhụnanya na ná nkwanye ùgwù. “Onye ọ bụla ya hụ nwunye nke aka ya n’anya, dị ka ọ na-ahụ onwe ya n’anya; ka nwunye leziekwa anya ka ọ na-atụ egwu di ya. Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu.”—Ndị Efesọs 5:33–6:1.

Hụ ndị ọzọ n’anya. “Ka anyị hụrịta onwe anyị n’anya: n’ihi na ịhụnanya bụ ihe si na Chineke pụta.”—1 Jọn 4:7.

Na-erube isi n’iwu obodo. “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru [gọọmenti] . . . Na-akwụghachinụ mmadụ nile ihe nile unu ji ha n’ụgwọ: tụọnụ ụtụ nye onye unu ji ụgwọ ụtụ.”—Ndị Rom 13:1, 7.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya