Mbọ Aka Gị—Ị̀ Na-elekọta Ha?
Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Sweden
Ọ BỤRỤ na mmadụ asị gị, “Ka m hụtụ mbọ gị” olee otú ị ga-esi meghachi omume? Ị̀ ga-eji obi ụtọ gosi mbọ gị i lekọtara nke ọma, ka ị̀ ga-ezo aka gị abụọ n’azụ gị ozugbo? Ị pụrụ inwe ezi ihe mere ị ga-eji zoo mbọ gị. E leghị anya ha adịghị nnọọ mma ile anya, ma ọ bụ ikekwe ị bụ onye na-ata mbọ. Ịmatakwu banyere ọdịdị dị ịtụnanya nke mbọ anyị ga-enyere anyị aka ịghọta ha nke ọma karị, ọ pụkwara ịkpali anyị ilekọta ha nke ọma.
Ihe bụ isi mejupụtara mbọ gị bụ mkpụrụ ndụ nwụrụ anwụ ndị siri ike bụ́ nke nwere protein yiri akwara bụ́ keratin. Ọ̀tụ̀tụ̀ mbọ aka ji eto na-adịgasị iche site n’otu mbọ aka gaa n’ọzọ na site n’otu mmadụ gaa n’ọzọ. Mbọ na-eto n’ọ̀tụ̀tụ̀ nkezi nke ihe dị ka milimita atọ kwa ọnwa. Mbọ a hapụrụ ka ọ na-eto n’ebeghị ya ebe pụrụ ito nnukwu ogologo. Dị ka The Guinness Book of World Records 1998 si kwuo, otu nwoke onye India hapụrụ mbọ ise dị n’aka ekpe ya ka o toruo ngụkọta nke sentimita 574 n’ogologo. Mbọ mkpịsị aka ukwu ya dị sentimita 132 n’ogologo.
Ihe Dị Mgbagwoju Anya
Anya mbụ i lere ya ị pụrụ iche na mbọ bụ nnọọ otu ihe mejupụtara ya, ya bụ ihu mbọ. Ya mere ọ pụrụ iju gị anya ịmata na a pụrụ iwere ya na mbọ nwere ọtụtụ akụkụ ndị bụ isi a na-ahụ anya nakwa ụfọdụ ị na-apụghị ịhụ anya. Ka anyị lerukwuo anya n’ọdịdị mbọ.
1. Ihu mbọ. Nke a bụ ihe ahụ siri ike anyị na-akpọkarị mbọ. Ihu mbọ dị ibe abụọ, nke elu na nke ala. E dokwara mkpụrụ ndụ dị n’akụkụ abụọ ndị a n’ụzọ dị iche iche, ha na-etokwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche. Ihu elu ya dị mụrụmụrụ, ebe nke ime ya nwere akụkụ gbalitere elu ndị dị n’usoro nke ya na ọwara ndị dị n’okpuru mbọ kwekọrọ. Ọwara ndị a pụrụ iche n’onye ọ bụla, a pụkwara iji ya amata mmadụ.
2. Lunule. Nke a bụ akụkụ na-acha ọcha nke dị ka ọnwa gbara ọkara nke dị n’úkwù ihu mbọ. Ọ bụghị mkpịsị aka nile nwere lunule a na-ahụ anya. Mbọ na-etopụta site n’otu akụkụ dị nta nke uru ahụ dị ndụ dị n’úkwù ihu mbọ, bụ́ nke a na-akpọ matrix. Nke a bụ akụkụ kasị mkpa nke mbọ. Lunule bụ njedebe nke matrix nke mbọ, sikwa otú a bụrụ akụkụ a na-ahụ anya nke mbọ dị ndụ. Akụkụ nile fọrọ afọ nke ihu mbọ bụ mkpụrụ ndụ nwụrụ anwụ mejupụtara ha.
3. Mpịakọta anụ ahụ nke mbọ, ndị dị ya n’akụkụ. Ndị a na-arụtụ aka n’akpụkpọ ahụ gbara ihu mbọ gburugburu. A na-akpọ akpụkpọ ahụ a mpịakọta anụ ahụ nke mbọ n’ihi na ọ dịghị akwụsị n’ihu mbọ kama ọ na-apịakọta n’okpuru ma na-ekpuchi ihu mbọ ka na-etopụta etopụta. Mpịakọta akpụkpọ ahụ ndị a na-echebe ma na-akwado akụkụ gbara mbọ gburugburu.
4. Eponychium. Nke a bụ ntakịrị mpịakọta akpụkpọ ahụ nke yiri ka ọ kwụsịrị n’úkwù ihu mbọ. Mgbe ụfọdụ, a na-akpọ nke a anya mbọ.
5. Anya mbọ. Nke bụ anya mbọ n’ezie bụ obere ihe topụtara n’okpuru eponychium. Ọ bụ otu ibe akpụkpọ ahụ pụrụ apụ nke na-enweghị àgwà nke na-arapagide n’elu ihu mbọ.
6. Ọnụ mbọ. Akụkụ ihu mbọ nke na-etofe ọnụ ọnụ mkpịsị aka.
7. Hyponychium. A na-ahụ ya n’okpuru ọnụ mbọ, uru ahụ nke a na-aghọ ihe mmiri na-apụghị ịba nke na-echebe okpuru mbọ pụọ n’ọrịa.
Abamuru Ha
Mbọ anyị bara uru n’ọtụtụ ụzọ, dị ka iji kọọ ọkọ. Ha bara uru mgbe a na-atụcha oroma, na-atọpe ákpụ̀, ma ọ bụ mgbe e ji ụmụ obere ihe na-eme ihe. Ọzọkwa, mbọ na-akwado ma na-echebe ọnụ ọnụ mkpịsị aka nke dị nro, nke pụkwara imebi ngwa ngwa.
Ihe a na-agaghị eleghara anya bụ mkpa mbọ dị n’ịma mma. Mbọ anyị pụrụ igosipụta àgwà dị mma—ma ọ bụ nke na-adịghị mma—nke iji ejiji. Ha na-arụ ọrụ dị mkpa ná mmegharị ahụ nkịtị, ọ bụrụkwa na e lekọta ha nke ọma, ha pụrụ ime ka aka anyị maa mma. Ma e nweghị ha, anyị ga-enwe nsogbu ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị, aka anyị ga-adịkwa ka o zughị ezu.
Nlekọta Kwesịrị Ekwesị Na-eme Ka Ha Sie Ike Karị
Dị ka akụkụ nke ahụ anyị dị ịtụnanya, anyị kwesịrị ilekọta mbọ anyị nke ọma. Ọ bụrụ na i nwere ọrịa mbọ siri ike, i kwesịrị ịga hụ dọkịta gị. Nke bụ eziokwu bụ na, n’ọnụ ọnụ mkpịsị aka gị, ị pụrụ inwe mgbaàmà nke ụfọdụ nsogbu anụ ahụ. Ee, a na-azọrọ na a pụrụ ịmata ụfọdụ ọrịa anụ ahụ site n’ile anya ná mbọ gị.
Irikwu calcium ma ọ bụ vitamin ọ̀ ga-eme ka mbọ sie ike karị? N’ịza ajụjụ a, Prọfesọ Bo Forslind, onye na-eme nchọpụta n’isiokwu banyere mbọ n’Ụlọ Akwụkwọ Karolinska dị na Stockholm, Sweden, gwara Teta!, sị: “Ọ dịghị ihe àmà ọ bụla e nwere iji kwadoo echiche ahụ. Nnyocha e mere banyere ọ̀tụ̀tụ̀ calcium dị ná mbọ dị otú o kwesịrị gosiri na o bughị ibu.”
Otú ọ dị, ihe na-enye aka kpọmkwem eme ka mbọ gị sie ike ma dị nro, bụ mmiri. Dị ka e kwuburu, mbọ nwere keratin. Keratin ndị a chọrọ mmiri iji dị nro. Prọfesọ Forslind na-enye ihe atụ: “Ọ bụ ezie na mbọ gị pụrụ ịdị nro mgbe mbụ i bepụrụ ya, otu mbọ ahụ i bepụrụ ga-agbaji agbaji ngwa ngwa mgbe ọ kpọrọ nkụ ná mberede.” Mmiri ga-eme ka mbọ gị na-adị nro ma sie ike. Ma olee ebe mmiri a si abịa? Ihu mbọ yiri ka o siri ike, ma ihe pụrụ idebanye n’ime ya. Mmiri sitere n’okpuru mbọ na-arịgo site n’ihu mbọ ruo n’elu ya, bụ́ ebe ọ na-ekupụ. Gịnị ka a pụrụ ime iji mee ka mbọ ghara ikpọ nkụ na ime ka mbọ gị sie ike? Prọfesọ Forslind na-ekwu, sị: “Ite ya mmanụ kwa ụbọchị ga-aba uru.”
Ilekọta Uto na Ịma Mma Ha
Ebe ọ bụ na mbọ na-esi na matrix na-etopụta, ilekọta akụkụ mbọ a nke ọma dị mkpa. Ịkpali matrix ahụ site n’ite ya ude ma ọ bụ mmanụ mgbe nile pụrụ ịdịrị ihu mbọ mma. Ọzọkwa, ịtanye otu ntapụ mmanụ n’okpuru ọnụ mbọ pụkwara inye aka, ebe ọ na-eme ka mbọ ghara ịkpọ nkụ.
Otú i si akpụcha ma ọ bụ ebe mbọ gị pụrụ ime ka ha sie ike ma ọ bụ ghara isi ike. A na-atụ aro ka ị na-akpụcha mbọ gị site n’akụkụ gaa n’etiti. Buru n’uche na ịkpụchapụsị akụkụ ya abụọ ga-eme ka mbọ ghara isi ike. Nke a ga-eme ka mbọ pịọ ọnụ, bụ́ ọdịdị kasị ghara isi ike, ebe ọ na-enweghị nkwado n’akụkụ ya abụọ. Maka mbọ ndị dị mkpụmkpụ, ndị siri ike, a na-atụ aro ka ị hapụ mbọ gị ka o toliteruo ihe dị ka milimita 1.5 n’akụkụ ya abụọ ma kpụchaa ya ka ọ dị gburugburu otú ọdịdị nke ọnụ mkpịsị aka dị.
Ọ pụrụ ịmasị ụfọdụ ndị inyom ka mbọ ha totụkwuo ogologo. Ma nara okwu ịdọ aka ná ntị a. Mbọ ndị toro oké ogologo pụrụ ịdọrọ mmasị ndị na-ekwesịghị ekwesị, ọ pụkwara ịkwụsị gị ịrụ ọrụ ị na-arụbu. Ya mere nọgide na-enwe echiche ziri ezi banyere ókè mbọ gị ga-etoru. Ọ bụrụ na i mee nke a, mbọ gị ga-abụ ihe bara uru ma nwee mmetụta dị mma n’ebe ndị ọzọ nọ.
Ya adịla mgbe ị ga-eji ihe dị nkọ ghụọ mbọ gị, ka ndị ọkachamara na-ekwu. Nke a pụrụ imebi hyponychium, bụ́ uru ahụ dị n’okpuru ọnụ mbọ. Uru ahụ a na-aghọ ihe nrachi siri ike na-echebe mbọ dị n’okpuru. Ọ bụrụ na e mebie akụkụ a, mbọ pụrụ ọbụna ikewapụ site n’okpuru mbọ ma bute nje. Jiri brọsh dị nnọọ nro wepụ unyi dị n’okpuru mbọ.
Mbọ siri ike, nke ahụ dị, bụtụ n’ihi ihe ndị e ketara eketa. Ọ bụ ya mere ụfọdụ ndị mmadụ ji enwe ihu mbọ ndị siri ike ma dị nro, ebe ndị ọzọ nwere mbọ ndị kpọrọ nkụ ma ọ bụ ndị na-agbaji ngwa ngwa. Otú ọ sọrọ mbọ gị dịrị, site ná nlekọta kwesịrị ekwesị na nke chiri anya ị pụrụ ime ka ọdịdị ha ka mma. Ee, ịghọta ọdịdị, ọrụ, na nlekọta dị mma nke mbọ na-eme ka ị mara otú e si elekọta ya. Iji ihe ọmụma dị otú ahụ eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya ga-arụpụta ihe ndị dị mma.
N’ezie mbọ aka bụ akụkụ dị ịtụnanya nke ahụ mmadụ. Ọdịdị na ọrụ ha na-agba àmà banyere ọgụgụ isi e ji mee ha. Eze Devid oge ochie ji obi umeala kwupụta mmasị o nwere n’ebe Onye Okike ya nọ, dị ka e dekọrọ n’Abụ Ọma 139:14: “M ga-ekele Gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ Gị nile dị; mkpụrụ obi m makwaara ya nke ọma.”
[Ihe Osise dị na peeji nke 19]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
1. Ihu mbọ;
2. lunule;
3. mpịakọta anụ ahụ nke mbọ, ndị dị n’akụkụ;
4. eponychium;
5. anya mbọ;
6. ọnụ mbọ;
7. hyponychium;
8. matrix;
9. okpuru mbọ